You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Ana m ewesara Putin iwe maka mkparịtaụka nkwụsị ọgụ - Onyeisiala Trump

Nchịkọta akụkọ ndị kachasị mkpa mere na mbaụwa n'ọnwa Maachị 2025.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Uzoamaka Ewuzie, Ikechukwu Kalu, Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Michael Ilediagu, Adline Okere

  1. Ụgbọelu ndịagha mba Saụt Korịa atụọla ogbunigwe n’ụlọ ndị nkịtị n’amaghịama

    Ndịagha na mba Saụt Korịa ejirila ụgbọelu agha tụọ ogbunigwe n’ebe ndị nkịtị bi ma meruo ọtụtụ ammadụ ahụ n’amaghịama.

    Ụgbọelụ agha ahụ tụrụ ogbunigwe ruru asatọ dịka ụlọọrụ ndị mgbasaozi na mba ahụ si kwuo.

    Mkpamkpa ahụ kpara na obodo Pocheon dị nso na Nọt Korịa n’ihe dịka elekere iri na mba ahụ.

    Ndịagha elu nke Saụt Korịa kwuru na ha na-eme nyocha banyere ihe mere ma kwuo na ha ga-enye ndị ogbunigwe ahụ meruru ahụ ihe ịtịaka n’obi.

    Akụkọ na-asị na mmadụ abụọ ka ogbunigwe ahụ gbajiri onu na isiaka ha dịka ndị Yonyap si dee.

    Ọtụtụ ndị ogbunigwe ahụ tụrụ kwuru sị na "a na m akwọ ụgbọala mgbe m nụrụ mkpọtụ” mana “n’oge m mepere anya ọzọ, a nọ m n’ime ụgbọala e ji ebu ndị meruru ahụ (ambulance)”

    N’ozi ndịagha mba Saụt Korịa zigara ndị BBC ka ha kwuru na “ọ bụ ụgbọelu agha nke KF-16 bụ ihe tụrụ ogbunigwe ahụ. Ọ tụrụ ogbunigwe MK-82 asatọ dara n’ebe na-abụghị ebe a chọrọ ịtụ ogbunigwe ”.

    Ha sị na ọ bụ mgbe otu onye agha na-eso ụgbọelu agha ahụ mere ka ogbunigwe daa n’ebe ndị nkịtị, ndị mmadụ nọ.

  2. Etu ị kwụsị ikekọrita ozi nchekwa US kwụsịrị ga-esi metụta ndịagha mba Yukren

    Dịka ọnọdụ si dị ugbua, e kwubeghị ihe niile gbasara ịkwụsị ikekọrịta ozi nchekwa n’etiti mba Amerika na Yukren mana e nwere ọtụtụ ihe ndị mmadụ kwusiri ịmara maka ọnọdụ a.

    Ndị maara ihe gbasara agha na-ekwu na ọ dị uru abụọ mba Amerịka na-abara ndị Yukren na ngalaba ikekọrịta ozi nchekwa.

    Nke mbụ bụ na Amerika na-enyere mba Yukren aka ịkpa nkata etu ha ga-esi wakpoo maọbụ busoo mba Rọshịa agha.

    Ọzọ bụ inye mba Yukren akụrụngwa nkanụzụ na enyereaka gbochie droonu na ogbunigwe Rọshịa na-atụ Yukren.

    US na-eji akụrụngwa Satellite were na-amara oge niile mba Rọshịa tụrụ ogbunigwe na-aga na mba Yukren, hụta ebe ogbunigwe ahụ na-aga na ebe ọ wereike ịkpa mkpamkpa.

    Enwepu ihe gbasara ozi nchekwa a, Yukren agaghi enweike kwụsị ogbunigwe Rọshịa na-atụ ha.

    Amerika na-enyere aka ka mba Yukren nweike ịtụ mba Rọshịa ngwaagha Amerika meputara a na-akpọ Himars maọbụ Stormshadow bụ nke mba Breten na Fransi bunyere Yukren.

    E nwepu agha, ozi nchekwa bụ ihe gbara ọkpụrụ nke mba Amerika na-enya Yukren. Amerika na-agwa ha ihe na-eme n’oge ahụ ọ na-eme.

    Ọ bụrụ na mba Amerịka kwụsi inye Yukren ozi nchekwa a, nke a nwereike mee ka mba Yukren hara inwe ike ha ga-eji chekwaa onwe ha dịka mba Rọshịa na-atu ha ogbunigwe agharaaghara.

  3. Ogbunigwe mba Rọshịa egbuola mmadụ atọ n’obodo Zelensky

    Opekatamkpe ihe uru mmadụ atọ anwụọla ebe mmadụ iri atọ na otu meruru ahụ n’oge mba Rọshịa turụ ogbunigwe na mpaghara Kyryvyi Rih dị na Yukren.

    Serhiy Lysak kwuru na ogbunigwe ahụ tụrụ n’obodo Onyeisiala mba Yukren bụ Volodomyr Zelensky.

    Ogbunigwe ahụ tụrụ ụlọ were ime ụlọ iri na atọ nakwa ụlọahịa iri na abụọ.

    Yuriy Sak bụ onye ndụmọdụ nke mịnsta na-ahụ maka ụlọọrụ na arụpụta ihe kowara ebe ogbunigwe ahụ dara dịka ụlọ ndị nkịtị na ụlọ olili na nkwari.

  4. Igbo anyị na-asị unu ụtụtụ ọma

    Ka chi foro taa bụrụ nnukwu aṅụrị na ndụ anyị niile.

    N'ụtụtụ a ọ bụ Michael Ilediagu ga-enye unu ụkụkọ ụwa n'ọgbakọ BBC News Igbo.

    Mana n'ehihe, Ikechukwu Kalu na Chinonso Ugorji ga-enwere oche.

    Ndewo.

  5. Etu ndị ntọrị si tọrọ ma gbuo Fada Sylvester Okechukwu na Kaduna Steeti

    Akụkọ na-eru anyị ntị na-ekwu na ndị bu egbe a na-enyo na ha bụ ndị ekperima egbuola otu ụkọchukwu ụka Katolik na Kaduna taa bụ ụbọchị Wenezde 5 Maachị,2025.

    A tọọrọ Fada Sylvester Okechukwu bụ ụkọchụkwu n’ụloụka St. Mary's Katọlik n'obodo Tachira dị n’Okpuruọchịchị Kaura nke Kaduna Steeti n’ụlọ ya n’abalị Tuzde n’ebe elekere Itoolu nke abalị.

    Katọlik Dayọsis nke Kachafan kwuru na akụkọ ọnwụ Fada a bụ eziokwu.

    N’ozi nke onye nchịkọta Dayọsis ahụ bụ Fada Jacob Shanet binyere aka kwuru sị “Dịka ndị tọọro ya kpụrụchara ya, anyị jị obi mwute ekwupụta na ha egbuola Fada Sylvester n’isi ụtụtụ taa bụ abalị ise nke ọnwa maachị afọ 2025 bụ ụbọchị ụka ntụ.”

    Fada Shanet onye kwuru na a mabeghị ihe mere e jiri gbuo Fada Okechukwu, kọwara ụkọchụkwụ ahụ e gburu egbu dịka ‘Odibo Chukwu’ ji obi ya kọọ n'ugbo Chukwu oge ọ dị ndụ.

    Cheta na a tọbuuru Fada Okechukwu na Disemba afọ 2022 oge ọ nọ n’ogige ụlọụka St. Anthony’s Katọlik dị na Fadan Konodị n’Okpuruọchịchị Kauru dị na Kaduna Steeti ma tọhapụ ya ka ọ gachara abalị atọ.

  6. Amerịka akwụsịtụla ikekọrịta ozi nchekwa n’etiti ha na Yukren

    Ndị ọchịchị Amerịka ekwuputala na Donald Trump akwụsịtụla ịkekọrịta ozi nchekwa dị oke mkpa n’etiti ha na mba Yukren.

    Ọnọdụ a na-abịa dịka Amerịka kwụsịkwara enyemaka ndịagha ha na mba Yukren.

    Onye ndụmọdụ nchekwa Amerịka bụ Mike Waltz kwuru sị: “Anyị alaala azụ, kwụsịtụ ma na-enyochagharị akụkụ mmekọrịta a niile.”

    Ọnọdụ a na-esochi nzukọ a haziri n’ụlọorụ Onyeisiala Amerịka n’ụbọchị Fraịde n’etiti Donald Trump na onyeisiala Yukren bụ Volodymyr Zelensky.

    Onyeisiala Yukren na-agba mbọ idozi mmekọrịta ha na Amerịka mana Waltz kwuru na Trump ga-adị njikere ịgbanwe ọnọdụ ahụ ọ bụrụ ma a malite mkparịtaụka udo.

  7. Ndị na-akwado Sịnetọ Natasha Akpoti emeela ngagharịiwe, gwa Akpabio ka ọ rịtuo n'ọkwa

    Ndị na-akwado onye omeiwu na-anọchite anya Kogi Central n’ụlọ omeiwu ukwu Naịjirịa bụ Natasha Akpoti-Uduaghan wuchiri n’ọnụụzọ ụlọ omeiwu Naịjirịa n’ụbọchị Wenezde 5 Maachị 2025.

    Ha kpọrọ oku ka e mee nnyocha miri emi gbasara ebubo nwaanyị ahụ boro onyeisi ụlọ omeiwu ụkwụ bụ Sịnetọ Godswill Akpabio.

    Ndị ahụ mere ngagharịiwe ji akwụkwọ ha dere ihe iche iche kpọọ oku ka Akpabio rịtuo n’ọkwa iji nye ohere maka nnyocha dabara adaba.

    Ha kpọkwara oku maka ikpe ziri ezi ma gwa Sịnetọ Akpabio ka ọ kwụsị ụdị omume ọbụla pụrụ imegide Sịnetọ Natasha Akpoti-Uduaghan.

    Cheta na Sịnetọ Uduaghan boro Akpabio ebubo inye ya nsogbu maka mmekọahụ oge ọ wuchiri n'ihe omume 'Morning Show' nke ụlọmgbasaozi Arise TV n'ụbọchị Fraịde 28 Febụwarị, 2025.

  8. Ndị uweojii ejidela otu nwoke ji isi mmadụ abụọ na egbe n'Ebonyi steeti

    Ndị uweojii Ebonyi steeti ekwuola na ha jidere otu nwoke bu isi mmadụ abụọ na egbe atọ dịka ha na-ebu agha megide mpụ na steeti ahụ.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Joshua Ukandu kwuru na nwoke ahụ a na-enyo enyo aha ya bụ Ovuta Chigozie bụ onye obodo Okoffia dị n'Ezza Saụt nke Ebonyi steeti.

    Ha kwuru na Chigozie bụ nwọke ahụ anwụchiri kwupụtara na e nyere ya isi mmadụ ahụ ka o were ya gwọ ọgwụ.

    Ukandu kwuru na ndị uweojii na-agba mgbọ ịhụ na ha jidere onye ahụ nwoke ahụ kpọrọ aha na ọ bụ ya nyere ya isi mmadụ ahụ.

    N'aka nke ọzọ, ndị uweojii nwetere otu ndị omempụ aka ha dị n'izu ụgbọ keke na pepe ma gbanwee otu osi acha.

    O kwuru na a nwụchiri mmadụ anọ aka ha dị na mpụ a nke gụnyere Nweke Chukwudi, Nwankwo Obinna, John Abba na Uche Abba.

    Ukandu kwuru na e nwetara keke na pepe atọ ezuru ezu n'aka ndị ahụ a na-enyo enyo bụ ndị kwetere na a na-ebutere ha ụgbọ ahụ ka ha gbanwee otu o si acha.

    O kwuru na ndị uweojii ga-akpụpụ ndị ahụ niile a na-enyo enyo ụlọikpe ma ọ bụrụ na ha mechaa nnyocha.

  9. EFCC anwụchiela mmadụ itoolu a na-enyo enyo na ha ji ịntanetị ezu ohi

    Ndị ụlọọrụ na-ebu agha megide mpụ na nrụrụka na Naịjirịa bụ Economic and Financial Crimes Commission (EFCC) ekwuola na ha anwụchiela mmadụ itoolu a na-enyo enyo na ha ji ịntanetị ezu ohi n'Abuja, isi obodo Naịjirịa,.

    Ọnụ na-ekwuru ndị EFCC bụ Dele Oyewale kwuru na anwụchiri ndị ahụ a na-enyo enyo n'ụbọchị Tuzde 4 Maachị 2025 na Sunnyville Estate nọ na Lokogoma ya na Open Heaven Estate nọ na mpaghara Dawaki dị n'isi obodo Naịjirịa.

    Oyewale kwuru na ihe ndị a napụtara ndị ahụ a na-enyo enyo gụnyere ụgbọala anọ dị oke ọnụ ahịa, igwe kọputa, iPads na ekwentị dị iche iche.

    O kwukwara na a ga-akpụpụ ndị ahụ a na-enyo enyo ụlọikpe na ọ bụrụ na ha mechaa nnyocha.

  10. Anyị agaghị akwụ Rwanda ụgwọ ọzọ maka nkwekọrịta ndị na-akwaga mba ọzọ - Mba UK

    Mba UK ekwuola na ha agaghị akwụ Rwanda ụgwọ ọzọ maka nkwekọrịta ndị na-akwaga mba ọzọ dịka ha kagburụ nkwekọrịta mbata dị n'etiti mba abụọ ahụ.

    Ọnụ na-ekwuru ndị ọchịchị mba Rwanda bụ Yolande Makolo kwupụtara nke a n'ụbọchị Mọnde, sị na mba UK agwala Rwanda ka ha jiri "ntụkwasị obi na ezi okwukwe" na nwayọ chefuo ụgwọ ruru nde dọla iri isii na anọ ($64m).

    Mana mba Rwanda agwala mba UK ka ha kwụghachi ha ego ole ha kwuru na ha ji ma na-ebo UK ebubo imebi ntụkwasị obi site n'ịkwụsị ụfọdụ enyemaka a na-enye mba ahụ.

    Ọnụ na-ekwuru ndị ọchịchị UK kwuru na ha agaghị akwụ ụgwọ ọ bụla banyere mmekọ UK na Rwanda maka nkwekọrịta mbata dị n'etiti mba abụọ ahụ.

    Nsogbu nkwụghachị ụgwọ a malitere kemgbe mba UK kwupụtara na ọ gaghị eziga ihe enyemaka mmadụ n'obodo dị n'ọwụwa anyawụ Afrịka ma ewezuga ịkwado ndị kacha daa ogbenye na ndị adịghị ike.

    Mba UK nwere mkpebi ịkagbu ịkwụ ụgwọ dịka a na-ebo mba Rwanda ebubo ịkwado ndịagha nnupụisi M23 bụ ndị weghaara ọwụwa anyawụ mba Democratic Republic Kongo n'ike.

    Mana Makolo kwuru na nkwụsị ihe enyemaka bụ "Usoro ntaramahụhụ na-ezighi ezi iji manye Rwanda imebi nchekwa obodo anyị".

  11. Trump agwala ndị omeiwu na obi dị ya mma maka akwụkwọ udo Zelensky detere ya

    Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump ekwuola na obi dị ya mma maka akwụkwo udo Onyeisiala mba Yukren bụ Volodymyr Zelensky detere ya.

    Trump kwuru nke a n’oge ọ na agwa ndị omeiwu okwu nke mbụ kemgbe ọ batara n’ochichi nke ugboro abụọ.

    Trump kwuru na ya wetere “akwụkwọ dị oke mkpa” Onyeisiala mba Yukren detere ya.

    Ọ sị n'akwụkwọ ahụ na Zelensky kwuru na “ya adịla njikere ime ihe Trump chọrọ maka udo ma mee ka udo tọrọatọ dị na Yukren.

    Trump kwuru na “obi dị ya mma maka akwụkwọ ahụ".

    Nke a na-eme abalị ole ma ole Trump na Zelensky wechara nghọtafe nke mere na ha abụọ ebinyeghị aka n’akwụkwọ nkwekorịta maka udo na ọnatarachi dị n’ime ala nke mba Yukren.

    Zelensky kwuru na ya ekwetela ihe Trump chọrọ dịka Trump kwụsịrị ndịagha mba Amerịka inyere ndị Yukren aka ma kwụsị nkwado niile mba Amerịka na-enye Yukren.

    Trump kwukwara na mba Rọshịa na-egosi na ha dịkwa njikere ịkpa maka udo.

  12. Zelensky ekwela nkwa imezi ọnọdụ ya na Onyeisiala Trump iji malite mkparịtaụka udo

    Onyeisiala mba Yukren bụ Volodymyr Zelensky ekwela nkwa imezi ọnọdụ ya na Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump iji malite mkparịtaụka udo.

    Onyeisiala Zelensky kwuru na ya dị njikere ịrụ ọrụ n'okpuru "ọchịchị siri ike nke Onyeisiala Trump iji weta udo na-adịgịde adịgịde dịka ọ gafere mkpụrụ ụbọchị ole na ole ya na Onyeisiala Trump nwechara nzukọ dara ụda n'obi ọchịchị 'Oval Office' dị na White House.

    Onyeisiala Yukren kwupụtara nwute banyere ihe mere n'etiti ya na Onyeisiala Trump na White House n'ime ozi o wepụtara n'akara soshịa midia ya n'abalị ụbọchị mba Amerịka kwupụtara atụmatụ ịkwụsị enyemaka ndịagha mba Amerịka na-enye Yukren.

    Onyeisiala Zelensky kwuru na oge erugo iji emezi ihe nke ọma dịka Onyeisiala Trump boro ya ebubo na ọ dịbeghị nkwadobe inwe mkparịtaụka.

    O kwupụtara na usoro nke mbụ agha ya na Rọshịa nwere ike iji akwụsị nke gụnyere ịtọhapụ ndị mkpọrọ ya na ịkwụsị ịtụ ogbunigwe na ịkwa mgbọ dị iche iche n'ụlọ ebe ndị nkịtị bi, n'ikuku ma n'ime oke osimiri ma ọ burụ na mba Rọshịa ga-emekwa otu ihe ahụ.

    O kwukwara na ya na mba Amerịka ga-arụkọ ọrụ iji nweta nkwekọrịta siri ike.

  13. Igbo ndị ọma, anyị ekele ụnụ ooo

    Ọ bụ Uzoamaka Ewuzie na Michael Ilediagu ga-ewetere ụnụ akụkọ ihe na-eme na Naịjirịa ya na mba ụwa niile.

    Dịka ụnụ nọnyere anyị taa n'ọgbakọ BBC News Igbo.

    Ka ụbọchị taa wetere anyị niile ihe ọma.

    Udo dịrị ụnụ.

  14. Nguema ekwuola na ya ga-azọ ọkwa onyeisiala mba Gabọn

    Onyeagha na-achị mba Gabọn bụ General Brice Oligui Nguema ekwuputala mmasị o nwere ịzọ ọkwa onyeisiala mba ahụ na ntuliaka a ga-ahazi n’ọnwa na-abịa abịa.

    Nguema weghaara ọchịchị n’afọ 2023 oge ndịagha chụpụrụ ezinaụlọ Bongo n’ọkwa. O kwere nkwa inyefe ọchịchị n’aka ndị nkịtị oge ahụ.

    Ka o sinadị, mba Gabọn ewepụtala iwu ọhụrụ nakwa usoro ntuliaka, nke ndị nkatọ kwuru na a haziri ya iji mee ka onyeagha ahụ nweta ọkwa onyeisiala.

    N’ụbọchị Mọnde 3 Maachị 2025, Nguema gwara ndị Gabọn na ya ekpebiela ịzọ ọkwa onyeisiala a ga-ahazị n’ụbọchị 12 Eprel “dịka o nwechara ntụgharịuche nakwa iji zaa ọtụtụ oku arịrịọ ndị mmadụ na-akpọ ya”.

    Oge ọ na-agwa ndị na-akwado ya okwu n’isi obodo Gabọn bụ Libreville, o kwuputara njikere ọ dị ịgbanwe ọnọdụ mba ahụ.

    Nkwuputa ahụ na-abịa dịka ndị mmadụ nọọrọ kemgbe ọnwa ole na ole na-ebugharị akụkọ gbasara mmasị nwaamadị ahụ nwere ịzọ ọkwa onyeisiala.

  15. Etu NDLEA si nwuchie onyeisi ndí na-ebu ọgwụ ike maka ọgwụ ike karịrị otu ijeri naira

    Ngalaba na-ebu agha megide ọgwụ ike na Naijiria bụ NDLEA n’ịchafụ anwụchiela otu nwoke Interpol na-achọ kemgbe afọ 17 maka ibu ntụ.

    A nwụchiri Ogbonnaya Kevin Jeff n’ebe o zoro na mpaghara Ojo dị na Legọs, dịka NDLEA si kwuo ụbọchị Monde.

    Onyeisi NDLEA bụ Buba Marwa gwara ndị ntaakụkọ na Ogbonnaya gbara afọ 59 na-alakọrọ ndị na-etoeto na iburu ya ntụ buga mba Saụt Koria.

    “Nnyocha gosiri na ọtụtụ ụmụ Naijiria e jidere na mba ndị ọzọ maka ibu ntụ si n'aka ya.”"Anyị chọpụtakwara na ọ na-asa ego o letara na n'ọgwụ ike site na iji ya azụ ngwa 'electronics' na ahịa ndị ọzọ.”

    Mba Saụt Koria na-achọ Ogbonna maka ebubo mpụ ịtụbata ntụ na mba ahụ ugboro ugboro n’agbata afọ 2023 na afọ 2024.

    Dịka NDLEA sị kwuo, nwaamadi ahụ na-esi ebe zoro ezo apịkọ ndị na-eburu ya ntụ site na mba Kamerun, Gana, Bọkina Faso, Liberia nakwa mba ndị ọzọ dị n’Ọwụwa Anyanwụ na Ndịda Afrịka.

  16. Ndị uweojii anwụchiela ndị ntọọ mmadụ anọ n'Imo steeti

    Ndị uweojii Imo steeti anwụchiela mmadụ anọ a na-enyo enyo n'aka ha dị n'ịtọọ mmadụ na steeti ahụ.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Henry Okoye kwuru na anwụchiri mmadụ anọ ahu n'obodo a na-akpọ Irete nke dị n'okporo ọchịchị Owerri West dịka Ndị uweojii mechara nnyocha nwere chọpụta ebe ndị ntọọ ahụ nwere ọnọdụ n'ime ọhịa Irete.

    Mmadụ anọ ndị ahụ gụnyere Sulieman Ahmed onye dị afọ iri abụọ na isii (26), Mohammed Salisu dị afọ iri atọ na otu (31), ya na Gambo Jefta dị afọ iri abụọ na isii (26). Ha atọ bụ ụmụamaala Jigawa steeti ebe onye nke anọ bụ Gabriel Ogbuzuru bụ nwaamala Ebonyi steeti.

    O kwuru na Ndị uweojii nwetere egbe nwere mgbọ isii na mma atọ n'ebe ndị ntọọ ahụ na-ezo n'ime ọhịa. O kwukwara na ndị ahụ a na-enyo enyo ga-anọ n'ụlọ mkpọrọ were ruo mgbe a ga-akpụpụ ha ụlọikpe.

    N'aka nke ọzọ, Kọmishọna ndị uweojii na steeti ahụ bụ Aboki Danjuma na ndị uweojii ndị ọzọ nwụchiri ndị ọzọ a na-enyo enyo gbara ọsọ n'ụbọchị Tuzde 3 Maachị 2025.

    Kọmishọna ndị uweojii gara n'ihu kwe ndị mmadụ nkwa na ndị uweojii ga-eme ihe ọ bụla dị n'ike aka ha ịhụ na-achọpụrụ ndị omekome na steeti ahụ.

    Ọ kpọkụrụ ndị mmadụ ka ha nyere ndị uweojii aka site na-ịgba ama ndị ọ bụla a na-enyo enyo n'aka ha dị n'ịtọọ ndị mmadụ.

  17. Chaịna na Kanada ga-emegwara dịka ụtụisi Trump manyere na ngwaahịa ha bidoro taa

    Mba Kanada na Chaịna edila njikere imegwara ma manye ụtụisi na ngwa ahịa e si mba Amerika atụbata na mba ha abụọ.

    Chaịna na Kanada kwuru nke a dịka iwu Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump manyere na ngwaahịa e si mba abụọ ahụ ebubata n’Amerịka bidoro taa.

    Kanada kwuru na ha ga-amanye ụtụisi ruru pasenti 25 na ngwaahịa si mba US abata na Kanada nke ọnụ ego ya ruru $150bn.

    Ozọ bụ na Chaịna kwuru na ha ga-amanye ụtụisi ruru pasenti iri ruo pasenti iri na isii na n’ihe niile a kọpụtara n’ubi e si mba Amerịka atụbata na mba Chaịna.

    Trump na-ebo mba Chaịna ebubo na ha adịghị akwụsị ọgwụ a na-akpọ 'fentanyl' na mba Amerịka ma mee ka ụtụisi na ngwahịa si mba Chaịna abata n’Amerịka ruo pasenti iri abụọ.

  18. Onyeisiala Trump akwụsịla ndịagha mba Amerịka inyere mba Yukren aka - White House

    Dịka onye ọchịchị mba Amerịka siri gwa ụlọọrụ mgbasa ozi CBS News bụ ndị ha na BBC na-arụkọ ọrụ na US, mba Amerịka akwụsịla ndịagha ya inyere mba Yukren aka.

    Onye ọchịchị ahụ kwuru na mba Amerịka ga-akwụsị ma nyochaa ụdị enyemaka ha na-enye mba Yukren iji ahụ na ọ bụ enyemaka ga a baara Yukren uru.

    kemgbe mba Rọshịa wakporo Yukren n'afọ atọ gara aga, ọ bụ mba Amerịka bụ mba kachasị enyere ndịagha Yukren aka site na-inye ha ihe gụnyere ngwa agha dị iche iche na ego.

    Ozi a pụtara awa ole na ole Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump katọrọ Onyeisiala mba Yukren bụ Volodymyr Zelensky maka ikwu na nkwụsị agha mba Yukren na Rọshịa ka tere ezigbo aka.

    Cheta na Praịm Mịnịsta mba UK bụ Keir Starmer ewepụta ụzọ anọ ha na Yukren ga-esi arụkọ ọrụ iji akwụsị agha ma gbachitere Yukren n'ebe Rọshịa nọ.

    Mana ndị ọchịchị mba dị ọzọ dị na Yurop kwuru na ha agaghị ekwe nkwa udo na Yukren ma ọ bụrụ na mba Amerịka enyeghị aka

  19. Ndị be anyị ụtụtụ ọma nụ ooo

    Anyị na-asị unụ nnọọ n'ọgbakọ BBC News Igbo.

    Ọ bụ Uzoamaka Ewuzie na Michael Ilediagu ga-enwetere nụ akụkọ ihe na-eme na mba ụwa niile.

    Dịka nụ nọnyere anyị taa, ka ụbọchị taa nwetere anyị niile ihe ọma.

    Ndewo.

  20. Yukren na Rọshịa ga-enwe mkparịtaụka ma ha kwụsị ịwakpo anyị – Onyeisiala Zelensky

    Onyeisiala Yukren bụ Volodymyr Zelensky agwala Onyeisiala Vladimir Putin na-achị Rọshịa ka ọ kwụsị ịwakpo Yukren ma ọ bụrụ na ọ chọrọ ka ha nwee mkparịtaụka ọbụla.

    Okwu a na-abịa dịka mba Rọshịa ka na-aga n’ihu n’ịwakpo mba Yukren. O kwuru na n’ime izuụka gara aga, enweela mwakpo dronu ruru 1,500 ebe Rọshịa tụrụ ogbunigwe ruru 1,300 na Yukren nakwa Kharkiv.

    Zelensky kwuru nke a dịka o nwere mkparịatụka na mba Amerịka nakwa Yurop n’ime izuụka gara aga.

    N’aka nke ọzọ, Onyeisiala Putin katọrọ mpụtara mkparịtaụka ahụ dị n’etiti Zelensky na Onyeisiala Trump na-achị Amerịka n’izuụka gara aga ma kwuo na Zelensky amaghị ihe ọbụla banyere mkparịtaụka udo.