Amerịka na Putin nwere mkparịtaụka bara uru gbasara agha Rọshịa na Yukren – Donald Trump
Onyeisiala Amerịka bụ Donald Trump ekwuola na obi dị ya ụtọ maka mkparịtaụka ya na onyeisiala Rọshịa bụ Vladimir Putin nwere gbasara nkwekọrịta nkwụsị ịkwa mgbọ na Yukren, bụ nke Amerịka na-akwado.
Trump kọwara mkparịtaụka ahụ dịka nke “dị mma na nke mịtara mkpụrụ”.
Ọnọdụ a na-abịa dịka Putin na onye nnọchiteanya Amerịka bụ Steve Witkoff zutere na Mosko n’abalị Tọzde.
Oge ha nwechara nzukọ ahụ, Kremlin kwuru na ya kwụ n’ebe Amerịka kwụ nke bụ “inwe mkpachapụanya n’olileanya ha” banyere usoro ga-eweta udo.
Trump depụtara na soshal midịa sị mkparịtaụka ahụ wepụtara “ezigbo ohere iji weta agha a dị egwu, tarala ọtụtụ isi mmadụ na njedebe”.
Ka o sinadị, onyeisiala Yukren bụ Volodymyr Zelensky boro Putin ebubo igbu oge na mkparịtaụka ahụ ka o nwee ike gaa n’ihu na-ebu agha.
Mana Praịm Minista mba United Kingdom bụ Sir Keir Starmer kwuru na agaghị enye Onyeisiala Rọshịa ohere iji atụmatụ nkwụsị ịkwa mgbọ ahụ “mee ihe egwuruegwu”.
Na mmalite izuụka a, Yukren nabatara nkwekọrịta ịkwa mgbọ nke Amerịka wepụtara mana ka ọ dị ugbua, Rọshịa anabatabeghị ya.