Ndị ọrụ ahụike amalitela ọrụ gbatagbata na Legọs steeti n’isochi
ntiwapụ ọrịa mgbapịa akpịrị bụ ‘diphtheria’ nke butere ọnwụ nwataakwụkwọ dị afọ
iri na abụọ (12).
Opekatampe, mmadụ iri atọ na anọ (34) ka a na-elebara ezigbo
anya ugbua ebe ụmụakwụkwọ iri na anọ (14) bi n’ogige ụlọakwụkwọ Kings College gosirila
njirimara ọrịa ahụ.
Ka ọ dị, n’ime ha bụ ụmụakwụkwọ iri na anọ, a chọpụtara na
iri na abụọ (12) n’ime ha ebutela ọrịa ahụ dịka ha na-anara ọgwụgwọ n’ụlọọgwụ
ugbua.
Dịka kọmịshọna na-ahụ maka ahụike na Legọs steeti siri kwuo,
a chọpụtara na otu nwataakwụkwọ nwoke nwere olu mgbu na ahụọkụ oge e mere ya
nnyocha n’ụlọọgwụ dị n’ụlọakwụkwọ Kings College n’abalị 22 Febụwarị, 2025. O
mechara nwụọ n’abalị 6 Maachị, 2025.
Ka ọ dị ugbua, a malitela ịgba ọgwụ mgbochi n’igwe, ọkachasị
maka ụmụakwụkwọ na ndị ọrụ ahụike e nwere n’ụlọakwụkwọ dị iche iche dịka ndị ọchịchị
na-atụle ime ya ka ọ gaa gburugburu Legọs steeti.
Ka o sinadị, e nyela ndị bi na steeti ahụ ndụmọdụ ka ha were
okwu adịmọcha kpọrọ ihe dị oke mkpa, wezuga onwe ha ebe e nwere ọtụtụ mmadụ ma
chọọ enyemaka n’ụlọọgwụ oge ọbụla ha malitere ịhụ njirimara dịka nke ọrịa mgbapịa
akpịrị.
Mgbapịa akpịrị bụ ọrịa bakterịa na-efe efe nke ukwuu, nke
na-emetụta imi na akpịrị ma na-efesa site n’ụkwara maọbụ mgbe onye nwere ya
mara uzere.
Mmadụ nwekwara ike ibute ọrịa ahụ site n’imetụ aka n’ihe ọbụla
nje ahụ metụtara tụmadị ebe e nwere ọtụtụ mmadụ maọbụ ebe ikuku anaghị abanye
nke ọma.
Ntiwapụ ọrịa mgbapịa akpịrị n’afọ 2023 gburu mmadụ karịrị
narị isii (600) ọkachasị ụmụaka. Ọ metụtara steeti iri na itoolu (19) ọkachasị
na mgbago ugwu.