Onyeisiala
mba Amerịka bụ Donald Trump ekwuola na mba Amerịka esila n'elu wakpoo ndịagha
nnupụisi Houthis nke Yemen, ma kwuo na mwakpo ahụ bụ maka etu ndịagha nnupụisi
ahụ siri wakpoo ụgbọmmiri na oke osimiri a maama dịka ‘Red Sea’.
Onyeisiala
Trump kwuru na akara soshịa midia ya ‘Truth social’ na ndịagha nnupụisi ahụ mba
Iran na-akwado tụrụ ogbunigwe n’ụgbọelụ mba Amerịka iji gbuo ndịagha mba Amerịka.
O kwuru na ndịgha
nnupụisi ahụ na-awakpo ụgbọmmiri, na-eme ihe ike, na iyi ọha egwu nke napụrụ ndị
mmadụ ọtụtụ ijeri dọla ma tinye ndị mmadụ n'ihe ize ndụ.
Mịnịstrị
na-ahụ maka ahụike nke Houthi na-ahụ maka ya kwuru na ihe ruru mmadụ iri atọ na
otu (31) anwụọla ebe mmadụ otu narị na otu ndị ọzọ (101) merụrụ ahụ mgbe mba
Amerịka wakporo ha.
Ndị otu ahụ
nke malitere ịwakpo ụgbọmmiri n’ihi agha dị n’etiti mba Izrel na Hamas na Gaza,
kwuru na ndịagha ya ga-azaghachi mwakpo mba Amerịka ahụ.
Ndị Houthis
kwuru na e nwere ọtụtụ mgbawa na mgbede Satọde 15 Maachị 2025 na Sanaa na
mpaghara ugwu Saada - ebe ndị nnupụisi ahụ siri ike na okeala Saudi Arabia.
Otu nnupụisi
ahụ nke mba Iran na-akwado, nke na-ahụta mba Izrel dịka ndị iro ya, na-achịkwa
Sanaa na ugwu ọdịda anyanwụ nke Yemen, mana ọchịchị ahụ abụghị ọchịchị mba ụwa
nabatara.
Ihe onyonyo
enyochabeghị na-egosi nnukwu anwụrụ ọkụ ojii n'akụkụ ọdụ ụgbọelu Sanaa - nke gụnyere
ebe ndịagha nwe.
N’ozi ha wepụtara,
ndị Houthis tara mba Amerịka na mba UK ụta maka “ajọ mwakpo ahụ” e zubere ebe
obibi mmadụ n’isi obodo Yemen, Sanaa.
Mba UK
etinyeghị aka na mwakpo ahụ mba Amerịka mere n’abalị Satọde megide ndị Houthi
mana o nyere mba Amerịka nkwado mmanụ ụgbọala ọ na-enye ya oge niile.