Mba ndị ọnụ na-eru n’okwu na Yurop akwadola atụmatụ Arabụ
nwere maka ịrụzie Gaza nke ga-eri ego ruru ijeri dọla iri ise na atọ ($53
billion) ma mekwa ka a ghara ịchụpụ ndị Palestine n’okeala ha.
Mba Izrel na Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump jụrụ ịnabata
atụmatụ ahụ nke mba Ijipụt wepụtara tupu ndị ọchịchị Arabụ ndị ọzọ were kwado
ya.
Cheta na Onyeisiala Trump wepụtara atụmatụ chọrọ gbanwee ụzọ
Gaza ka ọ bụrụ "Middle East Riviera.
N’ụbọchị Satọde, 8 Maachị 2025, ndị mịnịsta na-ahụ maka ihe na-eme
na mba ofesi na Fransị, Jamini, Ịtali na Breten nabatara atụmatụ a ga-ewe ihe
karịrị afọ ise iji rụzie Gaza.
Ha kwuru na atụmatụ ahụ kwere “nkwa na-adịgide adịgide maka ọnọdụ
ibi ndụ nke ndị Gaza dị egwu" ugbu a.
Atụmatụ a na-akpọ oku ka eziga na mpaghara ahụ, kọmitii nke ndị
ọkachamara nọọrọ onwe ya na ndị na-ahụ maka udo mba ụwa, ka ha chịa Gaza nwa
oge.
O kwuru na ọ bụ kọmitii ahụ ga-ahụ maka ihe enyemaka mmadụ
ya na ịhazi ihe niile banyere mba Gaza n'okpuru nlekọta nke Palestine Authority.
Ha wepụtara atụmatụ a dịka a na-enwe nchegbu na nkwekọrịta
nkwụsị ịkwa mgbọ nke mba Izrel na Gaza nwere ike imebi dịka agba nke mbụ ya nọrọ
izuụka isii bịara na ngwụcha n’ụbọchị mbụ nke ọnwa Maachị 2025.
Cheta na mba Izrel amalite igbochi ihe enyemaka ịbanye Gaza
iji manye Hamas ịnabata atụmatụ ọhụrụ mba Amerịka maka ịgbatị ogologo oge nke nkwụsị
ọgụ ahụ, n'oge a ka a ga-ahapụ ndị ọzọ ejidere na Gaza iji agbanwe ndị mkpọrọ
Palestine.