You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Ana m ewesara Putin iwe maka mkparịtaụka nkwụsị ọgụ - Onyeisiala Trump

Nchịkọta akụkọ ndị kachasị mkpa mere na mbaụwa n'ọnwa Maachị 2025.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Uzoamaka Ewuzie, Ikechukwu Kalu, Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Michael Ilediagu, Adline Okere

  1. Gọọmentị Enugwu adọọla ụlọakwụkwọ aka na ntị maka ụgwọ WAEC/NECO akwadoghị

    Mịnịstrị na-ahụ maka mmụta n’Enugwu steeti adọọla ụlọakwụkwọ niile nọ na steeti ahụ aka na ntị maka ịnapụ ndị nne na nna na ụmụakwụkwọ ụgwọ WAEC/NECO akwadoghị.

    Ozi si n’aka Kọmishọna na-ahụ maka mmụta na steeti ahụ bụ Ọkankụzi Ndubueze Mbah wepụtara, kwuru na mịnịstrị ahụ enwetala ozi na ọtụtụ ụlọakwụkwọ na-anapụ ụmụakwụkwọ ego buru ibu dịka ụgwọ WAEC na NECO.

    O kwuru na ego ole gọọmentị kwadoro maka WAEC n’afọ 2025 bụ puku iri abụọ na asatọ N28,000 ebe ụgwọ NECO bụ puku iri atọ N30,000.

    Mbah kwuru na Mịnịstrị ahụ edebala aha ụmụakwụkwọ mmadụ puku anọ 40,000 ebe ọ malitere ideba aha ụmụakwụkwọ ndị ga-ede ule NECO.

    Ọ dọrọ ndị isi ụlọakwụkwọ aka na ntị ma kwuo na onye ọbụla a hụrụ na-eme ihe ọjọọ ga-anata ntaramahụhụ.

    O gwara ndị nne na nna ka ha ghara ikwe ka ụlọakwụkwọ na-anapụ ha ego ezighị ezi maka ule WAEC na NECO.

  2. Amerịka na Rọshịa ga-ewepụta ozi banyere mkparịtaụka ha maka nkwụsị agha Yukren

    A na-atụanya na mba Amerịka na Rọshịa ga-ejikọ aka ọnụ wepụta ozi dịka ha nwere mkparịtaụka n’obodo Riyadh di na Saudi Arabịa n’ụbọchị Mọnde 24 Maachị 2025.

    Ekwuru na isiokwu ga-abụ mweghachi nkwekọrịta ha nwere n’afọ 2022 maka mkpụrụ nri ọka nke nyere Yukren ikike mbupụ ihe nri na mba ofesi site n’oke osimiri ojii ‘Black Sea’ – n’aka nke ọzọ, ekwuru na Rọshịa na-achọ enyemaka site na mmachi mba dị na mpaghara ndịda.

    Otu onye achọghị ka akpọọ aha ya nọ nso n’obi ọchịchi mba Amerịka ‘White House’ gwara ụlọọrụ mgbasa ozi Reuters na Mọnde na mkparịtaụka ahụ na-aga nke ọma na-atụ anya "nkwuputa dị mma" "n'ọdịnihu dị nso".

    Ụlọọrụ mgbasa ozi steeti Tass kwukwara na otu onye ọrụ gọọmentị Rọshịa bụ onye so na ndị otu mkparitauka ahụ kọwara okwu ahụ dịka ihe “bara uru,”.

    Cheta na mgbe mkparịtaụka ahụ na-aga n’ihu, mba Rọshịa tụrụ ogbunigwe nke na-achọ imebe ihe n’ugwu ọwụwa anyanwụ mba Yukren nke ọtụtụ mmadụ merụrụ ahụ.

    N’aka nke ọzọ, ndị nnọchianya mba Yukren na Amerịka ga-enwe nzukọ na Saudi Arabịa dịka ụlọ mgbasa ozi mba ahụ bụ Suspilne siri kọọ.

  3. Nde mmadụ ga-anwụ n’ihi mbelata ego enyemaka mba Amerịka maka ịgwọ nje HIV - Onyeisi UNAids

    Onyeisi ụlọọrụ na-ahụ maka enyemaka mmadụ na mba ụwa bụ UNAids ekwuola na mbelata ego enyemaka mba Amerịka maka ịkwọ nje HIV ga-egbu ihe karịrị mmadụ nde isii n’afọ anọ na-abịa abịa.

    O dọrọ aka na ntị na nke a ga-akpata nje HIV ọhụrụ ọzọ ruru puku abụọ (2,000) kwa ụbọchị.

    O kwuru na ọ ga bụte ịlaghachiazụ na mgbọ mba ụwa ibuso nje HIV agha nke mere ka ọnwụ sitere na nje HIV karịrị mmadụ nde abụọ n’afọ 2004 were gbadata na narị puku isii n’afọ 2023.

    Onyeisi oche UNAIDS bụ Winnie Byanyima kwuru na atụmatụ ndị ọchịchị mba Amerịka ịkwụsị enyemaka mba ụwa gụnyere ego maka nje HIV – nke maliterela imebe ihe.

    Ọ kpọkuru mba Amerịka ka ọ gbanwee obi maka mbelata ndị ahụ ozugbo dịka ọ dọrọ aka na ntị na ọ bụ ụmụnwaanyị na ụmụagbọghọ ka ọ ga-akacha njọ.

    Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump kwupụtara nkwụsị enyemaka ahụ ga-eru ihe ụbọchị iri itoolu (90) n’agba nke mbụ, n’ụbọchị mbụ ọ malitere ọrụ na Jenụwarị dịka ọ na-agbanwe etu gọọmentị Amerịka si emefu ego.

    Ọtụtụ n'ime ụlọọrụ mba Amerịka dịka US Agency for International Development (USAID) akwụsịla kemgbe.

    Kemgbe ọtụtụ afọ, mba Amerịka bụ otu nnukwu onye na-enye ego maka ọgwụgwọ na mgbochi nje HIV, nke a mere Nwada Byanima jiri kele mba Amerịka maka mmesapụ aka ya.

    Cheta na ọtụtụ usoro ọgwụgwọ na mgbochi nje HIV nke Amerịka nwetara n'iwu nkwụsị ọrụ, nke kpatara mmechi nke ụlọọgwụ nne na nwa n'Africa, na oke ụkọ ọgwụ na-azọpụta ndụ ‘anti-retroviral’ (ARV).

  4. Igbo ndị ọma, ụnụ abọọla chi?

    Anyị na-asị gị nọọ n'ọgbakọ BBC News Igbo taa.

    Dịka ụnụ na-esonyere anyị taa bụ Tuzde, ya dịkwara gị mma mgbe ị na-eji eji, na-abata abata.

    Ọ bụ Uzoamaka Ewuzie na Michael Ilediagu ga na-ewetere ụnụ akụkọ ihe na-eme n'ala Igbo, Naịjirịa nakwa mba ụwa niile.

    Chinonso Ugorji ga-esonyere anyị n'oge ehihie.

    Ndewo!

  5. Nnukwu Ọkaikpe Abịa steeti agbagharaala ndị mkpọrọ ise

    Nnukwu Ọkaikpe Abịa steeti bụ Lilian Abai atọhapụla mmadụ ise na-eche oge a ga-ekpe ha ikpe n’ụlọmkpọrọ dị n’Ụmụahịa.

    Ọ gakwara n’ihu tọhapụ mmadụ iri na anọ (14) e ji eji na beelụ.

    Ihe omume ahụ bụ otu akụkụ nnwogharị ngalaba ikpe ziri ezi na-aga n’ihu ugbua nke ebumnobi ya bụ ibelata ọnụọgụ mmadụ ndị nọ n’ụlọmkpọrọ ahụ n’ihi oge a na-egbu gbasara okwu ha nakwa enweghị ndị akaebe ga-agba ama n’ikpe ha.

    Oge ọ na-ahụ maka ihe omume ahụ, Ọkaikpe Abai kwara arịrị n’ihi ahụhụ ụfọdụ ndị mkpọrọ na-ata, bụ ndị nọferela afọ isii n’ụlọmkpọrọ na-enweghị ikpe ọbụla e kpere ha.

    O kwuru na ihe butere ọnọdụ ahụ bụ ịda mba ndị boro ha ebubo ịkpọta ndị akaebe maọbụ weta ihe mgbaama n’ụlọikpe.

    Ụfọdụ n’ime ndị mkpọrọ a tọhapụrụ bụ ndị e nyere nnwereonwe n’ihi ọnọdụ ahụike ha oge e lebachaara okwu ha anya nke ọma.

    Iji busoo ya bụ ọnọdụ agha, Nnukwu Ọkaikpe ahụ nyere ntụziaka ka ndị Majie nọ n’Ikwuano na Umuahia South malite izukọ kwa izu n’ụlọmkpọrọ ahụ.

    Dịka o siri kwuo, atụmatụ ahụ ga-enye aka belata ibu arụ dịịrị ndị ọrụ ụlọmkpọrọ ahụ, bụ ndị na-ahụ maka ibuga ndị mkpọrọ n’ụlọikpe.

    Ọ gwakwara ndị Majie ka ha were ọrụ ha kpọrọ ihe ma gbochie igbu oge na-ekwesịghị ekwesị.

  6. A tọhapụla Fada Stephen Echezona a tọọrọ n’Ichida Anambra steeti – Ndị Uweojii

    Ndị uweojii Anambra Steeti ekwuola na ha nwetala ntọhapụ Fada Stephen Echezona bụ onye a tọọrọ n’Ichida dị n’Anambra steeti.

    Ozi ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Tochukwu Ikenga wepụtara kwuru na ọ bụ ụbọchị Sọnde 23 Maachị 2025 ka ndị ọrụ nchekwa gụnyere ndị uweojii, ndịagha, ndị nchekwa obodo na ndị ọzọ nwetara ntọhapụ Fada ahụ ma gbaa mgbọ ịhụ na Fada ahụ lọtara ụlọ n’udo.

    Ikenga kwuru na a tọọrọ Fada ahụ n’ebe a na-ere mmanụ ụgbọala mgbe ndị ọrụ nchekwa na ndị jiegbe emempụ ji ụgbọala enweghị nọmba nọ na-akwakọrịta mgbọ tupu ndị ojiegbe ahụ a tọọrọ Fada ahụ, were gbaa ọsọ.

    O kwuru na ndị uweojii nwetara ụgbọala Lexus ahụ ndị omempụ ahụ bu, mana mgbe ndị ntọọ ahụ rutere ebe ndị uweojii na-eme nnyocha n’Ihiala, ha tọhapụrụ Fada ahụ were si ọhịa gbaa ọsọ.

    O kwuru na ndị uweojii enwerela ọnọdụ ebe ihe ahụ mere n’Ihiala iji gbaa mgbọ nwụchie ndị omempụ ahụ ma nwete ụgbọala Fada ndị ọjọọ ahụ buru.

  7. Ndị uweojii anwụchiela ndị ntọọ mmadụ atọ n’Imo steeti

    Ndị uweojii anwụchiela mmadụ atọ a na-enyo enyo n’aka ha dị n’ịtọrọ otu nwoke dị afọ iri anọ na asatọ (48) bi n’Owerre aha ya bụ Maazị Sabinus Ibe.

    Ndị ahụ a na-enyo enyo anwụchiri na 18 Maachị 2025, gụnyere otu nwata nwaanyị dị afo iri abụọ na abụọ aha ya bụ Favour Dike, Ifeanyi Kingsley dị afọ iri atọ na Wisdom Chikodi dị afọ iri atọ na otu.

    Ozi si n’aka ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Okoye Henry kwuru na nwụchị ahụ na-esochi nnyocha nke ndị ngalaba na-ahụ maka ịtọọ mmadụ, mere.

    O kwuru na atọrọ Maazị Ibe n’abalị 22 Febụwarị 2025 mgbe ọkụrụ elekere asatọ nke abalị n’ebe a na-akpọ Egbu n’Owerre. Ndị ntọọ ahụ kpụrụ ya n’ike gawa ebe mmadụ amaghị.

    Okoye kwuru na ndị ahụ tọọrọ ya kwuru ka a kwụọ ha ụgwọ maka ịtọhapụ ya nke ha ji igwe POS were kwụọ, mana ndị uweojii mechaara chọpụta na ọ bụ otu n’ime ndị ahụ a na-enyo enyo bụ Favour Dike nwee nọmba akaụntụ ahụ akwụnyere ego ahụ.

    Mgbe anwụchiri ya, Favour Dike kwetara na ya natara ego ruru nde naịra abụọ nke Ifeanyi Kingsley na-azụ ahịa na ‘Timber and Allied Market Naze’ nọ n’Owerre gwara ya nata.

    Kingsley kwupụtara na ọ bụ ya nyere akaụntụ nọmba Dike ka enwere kwụọ ụgwọ ahụ dịka Wisdom Chikodi bụ onye Umuezuo Ekwereazu dị n’okpuru ọchịchị Ahiazu, a na-enyo na ọ bụ ya wepụtara atụmatụ ịtọrọ nwoke ahụ.

    Mgbe anwụchiri Chikodi, ọ kpọrọ ndị uweojii gaa ebe ndị otu ha na-anọ na ‘Old Township Stadium’ mana ndị ahụ gbara ọsọ mgbe ha hụrụ ndị uweojii.

    Ndị uweojii nwetara otu ụgbọala, egbe abụọ na mgbọ egbe iri na asatọ n’ebe ahụ.

  8. Ụlọikpe ewechịtara Praịm minista mba Saụt Korịa n’ọkwa, mee ya Onyeisiala

    Ụlọikpe na-ahụ maka ikpe gbasara iwu obodo na Saụt Korịa weghachịtara Praịm Minịsta mba ahụ bụ Han Duck-soo n’ọkwa dịka Praịm mịnịsta mba ahụ ma mee ya Onyeisiala.

    Cheta na Han Duck-soo rigoro n’ọkwa Onyeisiala mba ahụ nke nchere oge n’ọwa Disemba afọ garaaga n’oge ndị omeiwu wepụrụ Onyeisiala ha bụ Yoon Suk Yeol n’ọkwa maka atụmatụ ịmanye iwu ọchịchị ndịagha.

    Han nọrọ n’ọkwa dika Onyeisiala, mana n'ihe dịka izu ụka abụọ ọ rigoro n´ọkwa ahụ ka ndị omeiwu wepụkwara ya n'oche.

    Kemgbe ahụ, ọ bụ Osote Praịm mịnịsta mba ahụ bụ Choi Sang-mok na-achị ha tupuu ụlọikpe enwee mkpebi banyere Han ma nyeghachị ya ọkwa ya.

    Mba Saụt Korịa nọ n’ihe ọgbaaghara kemgbe onye bụbu Onyeisiala ha bụ Yoon chọrọ ịmanye ọchịchị ndịagha nke mere e jiri wepụ ya n’ọkwa.

  9. Amerịka na Rọshịa ga-ezukọ na Saudi Arabia maka mkparịtaụka nkwụsị ọgụ Yukren

    Ndị ọchịchị mba Amerịka na nke Rọshịa ga-ezukọ na Saudi Arabịa iji mkparịtaụka maka nkwụsị ọgụ na Yukren dịka Rọshịa na-aga n’ihu iji doronu wakpoo Yukren.

    Mkparịtaụka a na-abịa mgbe Yukren na Amerịka nwechaara mkparịtaụka nke ha na Saudi, mana Rọshịa ka na-aga n’ihu iwakpo Yukren dịka Yukren na-ekwu na Rọshịa ji doronu iri itoolu na itoolu (99) wakpoo ha.

    Doronu mba Rọshịa jiri wakpoo Yukren n’izuụka gara aga gburu mmadụ atọ nke gụnyere otu nwatakịrị dị afọ ise.

    N’aka nke ọzọ, mba Yukren na-eji doronu atụ ogbunigwe na Rọshịa dịka ndịagha Rọshịa kwuru na ha jidere doronu iri abụọ na asatọ (28) n’abalị.

    N'abalị ụnyaahụ, ndị nnọchịanya Onyeisiala mba Amerịka zutere ndị nnọchianya Yukren - nke Mịnịsta na-ahụ maka nchekwa bụ Rustem Umerov bụ onye ndu ha.

    Umerov kwuru n’akara X ya na mkparịtaụka ahụ bara uru dịka ha kwuru okwu banyere ike ọkụ ya na ime ka ebumnuche Onyeisiala Zelensky banyere ịchọta "udo ziri ezi na nke na-adịgide adịgide" bụrụ eziokwu.

  10. E gbuola ndị uweojii Kenya isii dịka awakporo ha n’akụkụ Somalia

    E gbuola ndị uweojii mmadụ isii n’ugwu ọwụwa anyanwụ Kenya mgbe awakporo ha n’akụkụ okeala ha na Somalia, onye ọrụ mpaghara ahụ kwuru.

    O nwebeghị ndị otu kwuru na ọ bụ ha mere ihe ọjọọ a mana Kọmishọna obodo Garissa bụ Mohamed Mwabudzo gwara BBC na mwakpo a yiri nke otu ndịagha nnupụisi Islamist al-Shabab hibere na Somalia na-eme.

    O kwuru na awakporo ndịagha ahụ mgbe o jiri ọkara gafee elekere ise n’ụbọchị Sọnde oge ha n’ejikere ikpe ekpere ụtụtụ.

    N’agbanyeghị ndịagha isii ahụ nwụrụ, a kpọgara mmadụ anọ ndị ọzọ merụrụ ahụ n'ụlọọgwụ.

    Ndị otu Al-Shabab na-emekarị mwakpo n’okeala nọ na mpaghara ahụ, ma na-elekwasị anya n’ebe ndịagha mba Kenya na ndị nkịtị nọ.

    Mazị Mwabudzo kwuru na ụdị mwakpo a bụ ụdị mbuso agha nke okeala nke al-Shabab ji na-achọ itinye nsogbu na mpaghara ahụ”.

  11. Igbo bụ Igbo, ụtụtụ ọma nụ.

    Anyị na-asị ndewo nụ n'ọgbakọ BBC News Igbo taa.

    Dịka ụnụ na-esonyere anyị taa bụ Mọnde, izu ọhụru a ga amịtara anyị niile mkpụrụ ọma n’uju.

    Ọ bụ Uzoamaka Ewuzie na Michael Ilediagu ga na-ewetere ụnụ akụkọ ihe na-eme n'ala Igbo, Naịjirịa nakwa mba ụwa niile.

    Chinonso Ugorji ga-esonyere anyị n'oge ehihie.

    Daalụ nụ oo!

  12. “Ọ naghị ewute m” - Onye nnọchiteanya mba Saụt Afrịka a gbaara ụgbọ nwamkpi n’Amerịka

    Onye nnọchiteanya mba Saụt Afrịka a gbaara ụgbọ nwamkpi n’Amerịka n’ihi nsogbu dapụtara n’etiti ya na gọọmenti Donald Trump ekwuola na “ọ naghị ewute ya”.

    Ebrahim Rasool wuchiri Saụt Afrịka n’ụbọchị Sọnde 23 Maachị 2025 dịka ọtụtụ ndị nkwado gara zute ya n’ọdọụgbọelu Cape Town International Airport.

    Esemokwu tọpụrụ ọgọdọ gbara ọtọ n’etiti mba Saụt Afrịka na Amerịka kemgbe Donald Trump banyere n’ọchịchị dịka onyeisiala n’ọnwa Jenụwarị.

    Amerịka gwara Rasool dị afọ iri isii na abụọ (62) na ha achọghị iji anya ahụ ya na mba ha ọzọ oge odeakwụkwọ mba ahụ bụ Marco Rubio kpọchara ya “onye ndọrọndọrọ ọchịchị na-akpa oke agbụrụ kpọrọ Amerịka asị”.

    Ọnọdụ ahụ sochiri okwu Rasool kwuru na Trump “chọrọ igosipụta nkwenye o nwere na agbụrụ ya kachasị mma” dịka ọnụọgụ agbụrụ ndị ọcha mba Amerịka na-ebelata nke ukwuu.

  13. Ogbunigwe Izrel si n’elu tụọ na Gaza egbuola onyendu Hamas

    Onye otu Hamas gwara BBC na ogbunigwe Izrel si n’elu tụọ na Khan Younis dị na mpaghara ndịda Gaza egbuola onyendu ndọrọndọrọ ọchịchị Hamas bụ Salah al-Bardaweel.

    Ndị bi n’obodo ahụ sịrị na ya bụ ogbunigwe gburu Bardaweel a hụtara dịka onye ndọrọndọrọ ọchịchị ọkwa ya kachasị elu n’otu Hamas na nwunye ya.

    Mana ka ọ dị, enwebeghị ihe ndị ọchịchị Izrel kwuru oge a na-ebipụta akụkọ a.

    Ụlọọrụ ahụike nke Hamas na-ahụ maka ya kwuru na mmadụ karịrị puku iri ise (50,000) anwụọla na Gaza kemgbe agha ahụ malitere.

    Ha sịrị na e gburu opekatampe mmadụ iri atọ (30) na Khan Yunis nakwa Rafah n’ụbọchị Sọnde 23 Maachị 2025.

    Izrel malitere ịkwa mgbọ aghara aghara na Gaza na mmalite izuụka a dịka ha kwụsịchara ịkwa mgbọ ihe ruru ọnwa abụọ.

    Ha tara Hamas ụta maka ịjụ atụmatụ ọhụrụ Amerịka wepụtara iji gbatikwuo oge nkwekọrịta ahụ.

  14. Onyeisiala Trump akagbuola ikike nchekwa Harris, Clinton ndị ọchịchị ọzọ

    Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump kagbuola ikike nchekwa enyere onye bụbu osote onyeisiala bụ Kamala Harris, Hillary Clinton na ọtụtụ ndị ọzọ chịburu mba Amerịka ya na ndị na akatọ ọchịchị ya.

    Cheta na Onyeisiala Trump kwuru n’ọnwa Febụwarị 2025 na ya ga-akagbu ikike nchekwa nke onye bụbu onyeisiala bụ Joe Biden.

    Iwu ọhụrụ a kwadoro mkpebi ahụ, o kwuru na ọ na-akagbukwa nchebe nke "onye ọ bụla ọzọ" bụ nke ezinụlọ Biden.

    “Ekpebiri m na ọ bụghị maka ọdịmma mba anyị na ndị a na-eso ịnweta ozi nkewa," akwụkwọ ozi Trump gụrụ.

    Cheta kwa na ndị isiala chịburu mba Amerịka na ndị ọrụ nchekwa na-edobe ikike nchekwa ha dịka nkwanye ugwu.

    Mana Onyeisiala Trump nyere ndị isi ngalaba na ụlọọrụ iwu ka ha "kagbuo ohere na-akwadoghị iji nchekwa ụlọọrụ gọọmentị nke mba Amerịka maka ndị a."

    Iwu ahụ kwuru na ndị ahụ akpọrọ aha ha agaghị anata nkọwa nkewa, dịka akwụkwọ akụkọ onyeisiala, yana ịnweta ozi nkewa.

    Iwu a nwere ike igbochi ihe ndị ọchịchị a nwere ike inyocha, maọbụ gbochie ohere ịbanye ụfọdụ ụlọ gọọmentị maọbụ akụrụngwa echekwara.

  15. Onyeisi ọchịchị Rivas steeti ekwela nkwa ịrụchapụ ụlọ omeiwu steeti ahụ

    Onyeisi ọchịchị Rivas steeti ekwela nkwa ịrụchapụ ụlọ omeiwu ma nye iwu ka ụlọọrụ ji ọrụ ahụ mee ngwa ngwa iji rụchapụ ya dịka akwụkwọ nkwekọrita ọrụ ahụ siri kwuo.

    Ụlọọrụ mgbasa ozi Channels tv kwuru na onyeisi ọchịchị Rivas steeti kwupụtara nke oge ọ gara nleta iji anya ya hụru etu ọrụ ịrụgharị ụlọ omeiwu Rivas steeti ahụ dị n’okporoụzọ a na-akpọ Moscow dị na Pọtakọt si aga, n’ụbọchị Satọde 22 Maachị 2025.

    O kwuru na otu n’ime ọrụ ya gụnyere iweghachi ọrụ mmebe iwu zuru oke ma dị irè na steeti ahụ.

    Ọ bụ ụlọọrụ Monier Construction Company (MCC) Limited, na-arụ ụlọ omeiwu Rivas steeti ahụ.

    Dịka e siri kwuo, ọrụ agaala nke ọma n'ụlọ a nwere ihe dịka ụlọ ọrụ iri atọ na anọ 34 n'elu ụlọ nwere okpukpu abụọ ma nwekwa igwe mbuli elu, gallery, ọnụ ụlọ nzukọ, na ụlọ nzukọ.

  16. Popu Francis ga-ahapụ ụlọọgwụ ụbọchị taa bụ Sọnde

    Onyeisi ụka Katọlik na mba ụwa niile bụ Popu Francis ga-ahapụ ụlọọgwụ Rome Gemelli hospital ụbọchị taa bụ Sọnde 23 Maachị 2025.

    Mana ndị dọkịta na nlekọta ya kwuru na ọ ga-enwe ihe dika ezumike ọnwa abụọ na Vatican.

    Cheta na a nabatara Popu ahụ dị afọ iri asatọ na asatọ (88) n’ụlọọgwụ na 14 Febụwarị 2025 n’ihi ọrịa iku ume nke butere ya oyi baa.

    Otu n’ime ndị dọkịta na-elekọta Popu bụ Sergio Alfieri kwuru na n’ime izuụka ise gara aga, Popu nwere ọnọdụ gbatagbata ugboro abuọ nke tinyere ya na ọnọdụ ihe ize ndụ.

    Alfieri kwuru na ọ dịghị mgbe e tinyere Popu Francis na tubu ma na-anọ na nche mgbe niile ma na-atụgharị uche.

    Dịka ndị dọkịta ya siri kwuo, a gwọtaghị Popu kpamkpam, mana o nwekwaghị oyi baa mana ọ nọ n'ọnọdụ kwụsiri ike.

    “Obi dị anyị ụtọ ikwu na Popu ga-ala ụlọ ya n’ụbọchị Sọnde,” dọkita Alfieri gwara ndị ntaakụkọ na Satọde.

    Popu ga-esi na wido ya n’ụlọọgwụ Gemelli nye ngọzi ụbọchị Sọnde tupu ọ lọta n’ụlọ ebe obibi ya dị na Vatican - nke a ga-abụ mbụ ọ ga-apụta n’ihu igwe mmadụ kemgbe anabatara ya n’ụlọọgwụ.

    Alfieri kwuru na olu ndị ọrịa nwere oyi ịba okpukpu abụọ na-efunahụ ha ntakịrị "karịsịa na ndị agadi, ọ ga-ewe oge tupu olu onye ahụ ịlaghachi.

  17. Onye nnọchianya Onyeisiala Trump ajụla atụmatụ Praịm Mịnịsta Starmer maka Yukren

    Onye nnọchianya Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump ajụla atụmatụ Praịm Mịnịsta Keir Starmer maka nkwụsị ọgụ na a ga-n’ihu na mba Yukren.

    Atụmatụ Praịm Mịnịsta Starmer bụ ka ndịagha mba ụwa kwado nkwụsị ọgụ na Yukren.

    Steve Witkoff kwuru na echiche ahụ bụ maka na Praịm Mịnịsta Starmer na ndị ọchịchị ndị ọzọ nọ na Yurop na-eche na "anyị niile ga-adị ka Winston Churchill”.

    Mgbe onye ntaakụkọ na-akwado Onyeisiala Trump bụ Tucker Carlso na-agba ya ajụjụ ọnụ, Witkoff toro Vladimir Putin, ma kwuo na onyeisiala Rọshịa "masịrị" ya.

    "Anaghị m ewere Putin dịka onye ọjọọ," ka o kwuru. "Ọ mara oke ihe."

    Witkoff, ya na Onyeisiala Putin nwere nzukọ abalị iri gara aga, kwuru na Onyeisiala mba Rọshịa nwere “amara” na “guzo aka ya ọtọ” na mmekọ mụ na ya.

    O kwuru na Onyeisiala Putin gwara ya na o kpere Onyeisiala Trump ekpere mgbe ahụ a chọrọ igbu ya n’afọ gara aga.

    O kwukwara na Putin nyere ọrụ iwepụta ihe osise nke onyeisiala mba Amerịka dịka ihe onyinye, mana nke a “metụrụ Onyeisiala Trump n'ahụ nke ọma”.

    Cheta na Witkoff na-edu mkparịtaụka nkwụsị ọgụ nke Amerịka, Rọshịa na Yukren na-enwe, mana ọ nweghị ike ịkpọ mpaghara ise nke Yukren ndịagha Rọshịa weghaara.

    O kwuru, sị: "Ihe kacha eseokwu bụ mpaghara anọ a na-akpọ Donbas, Crimea, ya na abụọ ndị ọzọ."

  18. Igbo ndị ọma, ụtụtụ ọma

    Anyị na-asị ụnụ nọọ n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Sọnde.

    Dịka ụnụ na-esonyere anyị taa, ọ ga adịrị anyị niile mma.

    Ọ bụ Uzoamaka Ewuzie ga na-ewetere ụnụ akụkọ ihe na-eme n'ala Igbo, Naịjirịa nakwa mba ụwa niile.

    Chinonso Ugorji ga-esonyere anyị n'oge ehihie.

    Ndewo nụ oo!

  19. Ụlọikpe enyeela iwu ka amalite atụmatụ iwepụ Sịnetọ Natasha n’ụlọmeiwu

    Ụlọikpe Ukwu dị na Lokoja enyela iwu ka a gaa n’ihu ịtụ vootu maka iwepụ nwada Sịnetọ Natasha Akpoti-Uduaghan site n’ụlọomeiwu Naịjirịa nke a kpọrọ ‘recall’ na Bekee.

    N’ikpe e kpere n’ụbọchị Fraịde 21 Maachị 2025, ụlọikpe a kwuru na atụmatụ ahụ bụ ihe iwu kwadoro ma wepụ ikpe machiburu ụlọọrụ Inec ileba anya n’usoro ahụ.

    Ụlọikpe a gakwara n’ihu gwaa ụmụafọ Kogi Central bụ ndị Natasha na-anọchiteanya ha ka ha gaa n’ihu n’ịtụ vootu maka ịchụpụ ya dịka iwu si kwadoo ha ime nke a.

    Nke a na-abịa dịka ụlọikpe nọọrọ n’ụbọchị Tọzde nye Inec iwu ka ha anabatala mkpesa ọbụla banyere atụmatụ iwepụ Sịnetọ Natasha site n’ụlọomeiwu.

    Mana ikpe ahụ ka ga-aga n’ihu n’ụbọchị isii nke ọnwa Mee, 2025 bụ ụbọchị e bugara ya.

    Cheta na Sịnetọ Natasha na Onyeisi ndị ụlọomeiwu bụ Sịnetọ Godswill Akpabio nwere nsogbu ebe Natasha boro ebubo na Akpabio chọrọ ịwakpo ya, nke mere ndị ụlọomeiwu jiri kwụsịtụ Natasha ọrụ ruo ọnwa isii maka inupu isi n’iwu na-achịkwa ndị omeiwu.

  20. Anyị enwetala ego Riva steeti e jichiri ejichi – Ibok-Ete Ibas

    Onyeisi ọchịchị Riva steeti bụ Ibok-Ete Ibas kwuru na e meela ka ego okpuruọchịchị niile e jichiri ejichi ruo ha aka ma kwuo na ya ga-eme ihe niile kwesịrị ekwesị iji hụ na a kwụrụ ndị ọrụ ụgwọọnwa ha n’oge.

    Oge ọ na-ekwu okwu na nzukọ ya na ndị isi ọrụ okpuruọchịchị nwere na Pọtakọt, Ibas kọwara ọgbakọ ahụ dịka oge dị oke mkpa na mbọ ha jikọtara aka agba iweghachi udo na ọganịihu na steeti ahụ.

    Ya bụ onyeisi ọchịchị kwara arịrị gbasara ihe isiike dị na Niger Delta, dịka o kwuru sị n’agbanyeghị akụ ndị si na chi jupụtara na mpaghara ahụ, ụmụafọ ha agaala n’ihu na-ata ahụhụ.

    O gosikwara mmetụta gbasara oge a na-egbu ịkwụ ụgwọọnwa n’okpuruọchịchị niile dị na Riva steeti.

    Ka o sinadị, Ibas dọrọ aka na ntị sị na ya ga-ahụ na e nyere ngụkọ gbasara ego ọbụla e mefuru n’okpuru ọchịchị ya.