You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Ana m ewesara Putin iwe maka mkparịtaụka nkwụsị ọgụ - Onyeisiala Trump

Nchịkọta akụkọ ndị kachasị mkpa mere na mbaụwa n'ọnwa Maachị 2025.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Uzoamaka Ewuzie, Ikechukwu Kalu, Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Michael Ilediagu, Adline Okere

  1. NYSC ekwuola na ha na-akwado ịmalite ịkwụ ndị kọpa ụgwọọnwa ọhụrụ N77,000

    Ndị isi ụlọọrụ National Youth Service Corps (NYSC) ekwuola na ha ga-amalite ịkwụ ndị kọpas ụgwọọnwa N77,000 n’oge na-adịghị anya.

    Ha kwuru nke a na nzaghachi maka ihe mere ha ka ji ghara ịmalite ịkwụ ụgwọ ahụ n’agbanyeghị na gọọmenti ebuliela ụgwọọnwa opekatampe ndị ọrụ.

    Cheta na gọọmenti etiti kwere nkwa na ha ga-amalite ịkwụ ụgwọ ahụ kemgbe ọnwa Julaị 2024 mana ha amalitebeghị ịkwụ ya.

    N’ọnwa Jenụwarị 2025, onyeisi ụlọọrụ NYSC bụ Ọchịagha Yushau Ahmed kwuru na ha ga-amalite ịkwụ ndị kọpas ụgwọọnwa N77,000 n’ọnwa Febụwarị mana ha akwụghị ya.

    Onye na-ahụ maka mgbasaozi ụlọọrụ NYSC bụ Caroline Embu kwuru na ha na-eche ego ahụ nakwa ntụziaka tupu ha amalite ịkwụ ụgwọ ahụ, mana o kwughị mgbe ọ ga-amaliye ịkwụ ya.

    Ọ gara n’ihu kwuo na ha ahaziziela usoro ha ga-eji kwụọ ụgwọ ahụ.

  2. NLC ekpebiela ịmalite ngagharịiwe ma gọọmentị gaa n'ihu iweli ụgwọ ọkụ eletriki

    Otu jikọtara ndị ọrụ bekee na Naịjirịa bụ Nigeria Labour Congress (NLC) ekpebiela ịmalite ngagharịiwe ma ọ bụrụ na gọọmentị gaa n'ihu imezu atụmatụ iweli ụgwọ ọkụ eletriki.

    Ndị otu a kwupụtara nke a ozi odeakwụkwọ ya bụ Emmanuel Ugboaja na onyeisi otu ahụ bụ Joe Ajaero binyere aka, nke ha wepụtara ụbọchị Sọnde 2 Maachị mgbe ndị National Executive Council nke otu ahụ mechara nzukọ n'isi obodo Yola dị n'Adamawa steeti.

    Ndị otu ahụ kwuru na ha agaghị ekwe ka e bụgharị ndị nọ n'obere usoro esi akwụ ụgwọ bụ 'Baand A,B, CH' tinye ha n'usoro 'Baand A'.

    Ha kwuru na i bugharị usoro esi akwụ ọgwọ ọkụ nke Mịnịsta na-ahụ maka ọkụ na-akwado bụ mmegịde akụ na ụba ndị na-arụ ọrụ bekee ya na nke ụmụ Naịjirịa niile.

    Ha kwukwara na o doro anya na ndị ọchịchị chọrọ ime ka ụmụ Naịjirịa na-ahụsianya site na-iwelite ụgwọ ọkụ tarifu ya na iwelite ụtụ isi.

  3. Mba Arabụ na ụlọọrụ UN akatọla Izrel maka igbochi ihe enyemaka mmadụ ịbata Gaza

    Ọtụtụ mba dị n'Arabụ na ụlọọrụ na-ahụ maka udo na nchekwa na mba ụwa niile akatọọla ndị Izrel maka igbochi ihe enyemaka mmadụ ịbanye na Gaza.

    Mba Ijipụt na Kataa kwuru na ihe ndị Izrel mere ụbọchị Sọnde 2 Maachị 2025 megidere ihe dị na nkwekọrịta nkwụsị ịkwa mgbọ ebe onye na-ahụ maka enyemaka mmadụ n'ụlọọrụ UN bụ Tom Fletcher kọwara ya dị ka ihe dị egwu.

    Praịm Mịnịsta mba Izrel bụ Benjamin Netanyahu kwuru na ndị Hamas na-ezu ihe ndị ahụ ezu iji na-enweta ego ha ji akwado akụrụngwa eji eyi ọha egwu.

    O boro ndị otu ahụ si na mba Palestine ebubo ịjụ atụmatụ mba Amerịka wepụtara iji agbatị nkwekọrịta nkwusị ọgụ na Gaza dịka agba nke mbụ gwụchara ubọchị Satọde 1 Maachị 2025.

    Ọnụ na-ekwuru ndị otu Hamas kwuru na mba Izrel wepụtara atụmatụ ọhụrụ nke na-achọ naanị ọ dị mma ha, ma kwuo na o megịdere nkwekọrịta nkwụsị ịkwa mgbọ.

    Nkwekọrita ịkwụsị ọgụ mere ka Izrel na Hamas lụrụ ọgụ ihe ruru ọnwa iri na ise nkwụsị ịlụ ọgụ ma mee ka atọhapụ mmadụ iri atọ na atọ ndị Izrel e ji eji iji agbanwe ndị mkpọrọ Palestine mmadụ otu puku na narị itoolu.

    N'ozi Mịnịsta na-ahụ maka ihe banyere mba ofesi na Kataa wepụtara ụbọchị Sọnde, ọ katọrọ omume ndị Izrel ahụ ma kwuo na o megịdere ihe dị na nkwụsị ọgụ ya na usoro iwu enyemaka mmadụ na mba ụwa.

    Ụlọ mgbasa ozi AFP kwuru na Mịnịsta na-ahụ maka ihe na-eme na mba ofesi nke Ijipụt boro Izrel ebubo iji agụụ mere mma agha eji emegịde ndị Palestine.

    Saudi Arabia katọkwara Izrel maka igbochi ihe enyemaka mmadụ ịgafee na Gaza.

  4. Zelensky ekeleela mba Amerịka maka ikwado Yukren

    Onyeisiala mba Yukren Volodymyr Zelensky ekeleela mba Amerịka maka nkwado ha na-enye mba Yukren.

    Zelensky mere ka a mata nke a n’akara X soshal midia ya ka ọ hapụrụ United Kingdom bụ ebe ndị ọchịchị na mpaghara Yurope mere ọgbakọ maka agha dị n’etiti mba Yukren na Rọshịa nakwa ihe gbasara usoro udo nke mba Amerịka nweputara.

    N’okwu Zelensky “anyị ma nke ọma na mba Amerịka dị oke mkpa. Afọ juru anyị na nkwado niile ha nyere anyị.

    Cheta na Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump na nke mba Yukren bụ Volodymyr Zelensky were nnukwu nghọtafe n'oge Zelensky gara mba Amerịka ka ọ binye aka n’usoro udo ahụ mba Amerịka weputara ijiri nyere mba Yukren aka.

    Cheta na usoro udo ahụ gunyere ka mgba Yukren were ọnatarachi ha dị icheiche nwere kwụọ ụgwọ ego niile mba Amerịka mefuru n’isi ha kemgba agha dara n’etiti ha na Rọshịa.

    N'iihe Zelensky dere n’akara X ya ka ọ sị 'na-enweghị ụbọchị mba Yukren adịghị egosi na obi dị ha mma maka nkwado mba Amerịka na-enye ha”.

  5. DR Kongo ekwuola na ya na ndị nnupụisi a gaghị enwe mkparịtaụka

    Ndị ọchịchị Democratic Republic of Kongo ekwuola na ọ bụghị ha na ndị otu nnupụisi M23 weghaara ọtụtụ obodo na ọwụwa anyawụ nke mba ahụ n'ọnwa na-adịbeghị anya, ga-enwe mkparịtaụka, agbanyeghị na mba ofesi na-etinye ọnụ n'okwu ahụ.

    N'ime izu gara aga, ndị ọchịchị mba UK manyere ọnụ n'okwu akpụ n'ọnụ nke na-akpọ oku ka enwe mkparịtaụka gụnyere onye ọ bụla maka iji chọpụta usoro a ga-eji nwete udo.

    Mana Praịm Mịnịsta DR Kongo bụ Judith Suminwa Tuluka gwara BBC na ọchịchị ya chọrọ ka ha na ndị agbataobi ha bụ Rwanda, ndị e kwuru na ọ bụ ha na-akwado ndị nnupụisi M23, nwee kparịtaụka.

    Dịka ndị ọchịchị Kongo siri kwuo, ihe ruru mmadụ puku asatọ na narị ise anwụọla kemgbe agha ahụ baara ọkụ n'ọnwa Jenụwarị.

    A chụpụkwala ọtụtụ narị puku mmadụ n'ụlọ ha kemgbe ọgbaaghara ahụ malitere, bụ nke ndị ụlọọrụ UN na ndị ọzọ kwuru na Rwanda nwere aka na ya.

    O kwuru na nke bụ eziokwu bụ na ọ bụ mba Rwanda na-ebuso iguzosi ike nke okeala na ọchịchị nwere onwe nke DR Kongo agha na mpaghara ahụ.

  6. Igbo ndị ọma, daalụ nụ ooo

    Anyị na-asị ụnụ nnọọ n'ọgbakọ BBC News Igbo.

    Ọ bụ Uzoamaka Ewuzie and Michael Ilediagu ga-enwetere unu akụkọ na-eme na mba ụwa niile.

    Ekpere anyị bụ ka izuụka ọhụrụ a wetere anyị niile ihe ọma.

    Ndewo.

  7. UK na Frans ga-enye Onyeisiala Donald Trump atụmatu ga-enweta udo na Yukren

    Praịm Mịnịsta mba UK Keir Starmer ekwuola na UK, Frans na mba Yukren ga-arụkọ orụ iji chepụta atụmatụ ga-enweta udo n’agha dị n’etiti ha na mba Rọshịa.

    O kwuru na ha mee nke a, ha na mba Amerịka ga-enwe mkparịtaụka banyere atụmatụ ahụ.

    Nke a pụtara ihe oge Onyeisiala Volodymyr Zelensky gara ọgbakọ ndi isi mba Yurop mere ụbọchị Sọnde 2 Maachị, 2025 na London.

    Praịm Mịnịsta Keir Starmer gwara BBC na ebumnobi ya bụ inweta udo n’etiti Zelensky na Trump.

    Oge BBC jụrụ ya ihe o chere banyere mpụtara mkparịtaụka Trump na Zelensky n’obi ọchịchị White House Amerịka, Starmer kwuru na ọ bụ ihe jụgburu onwe ya.

  8. O meela izuụka atọ Popu anọghị na St Peter Square

    O meela izuụka atọ nọ n'usoro Onyeisi ụka Katọliki bụ Popu Francis enwebeghị ike ikpe ekpere ọdịnala ndị ụka Katọliki bụ Angelus n'onwe ya, kama Vatican bipụtara okwu ederede nke Popu.

    Vatican kwuru na n'ime okwu ederede a Popu si n'ụlọọgwụ ebe ọ nọ na Rome nwere zite, bụ ihe o dere mkpụrụ abalị ole na ole garaaga.

    N'ime ozi ya ahụ, o kelere ndị mmadụ maka ekpere ha na-ekpere ya ma kelekwa ndị otu ahụike na-elekọta ya anya n'ụlọọgwụ.

    Dịka o siri kwuo, "Enwere m n'ime obi m 'ngọzi' nke zoro ezo n'ime adịghị ike, maka na ọ bụ n'oge ndị a ka anyị na-amụta karịa ịtụkwasị Onyenwe anyị obi."

    O kelere Chineke maka inye ya ohere ikere oke n'anụ ahụ na mmụọ, ọnọdụ nke ọtụtụ ndị ọrịa na ndị na-ata ahụhụ nọọ.

  9. Ndị ọchịchị Yurop na-ezukọ na London maka agha na nsogbu nchekwa nke Yukren

    Praịm Mịnịsta UK bụ Keir Starmer amalitela ịnabata ndị ọchịchị mba dị na Yurop, bụ ndị na-ezukọ na London, isi obodo UK maka inwe mkparịtaụka banyere nkwụsị agha na nsogbu nchekwa dị na Yukren.

    Ndị a na-atụ anya isonye na nzukọ a gụnyere Praịm Mịnịsta Ịtali bụ Giorgia Meloni, Onyeisiala mba Fransị bụ Emmanel Macron, Chanselọ mba Jamini bụ Olaf Scholz na Praịm Mịnịsta mba Kanada bụ Justin Trudeau.

    Onyeisiala mba Yukren bụ Volodymyr Zelensky ga-esonyekwa na nzukọ ahụ ebe a na-atụ anya na ndị ọchịchị si mba dị iche iche dịka Denmark, Netherlands, Norway, Poland, Spain, FInland, Sweden, Czechia, Romania na Tọọkị, ga-abịakwa nzukọ ahụ.

    Ndị ọzọ bụ Onyeisi Nato bụ Mark Rutte, Onyeisi nke European Commission bụ Ursula Von der Leyen ya na Onyeisi Kansụl bụ Antonio Costa.

    Praịm Mịnịsta Starmer gwara BBC na UK na Fransị ga-akwado Yukren ịhụ na-akwụsịrị ọgụ. O kwuru na ha ga-ewepụta atụmatụ nke ha na mba Amerịka ga-eji enwe mkparịtaụka mgbe ọ dị n'ihu.

    Nke a na-abịa mgbe ọ gachara mkpụrụ abalị ole na ole Onyeisiala Zelensky na Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump nwechara nghọtahie na Obi ọchịchị mba Amerịka bụ White House.

    Praịm Mịnịsta Starmer kwuru na nghọtahie a dị n'etiti ndị ọchịchị abụọ wutere ya nke nnukwu mere ka ọ kpọọ oku ndị ọchịchị Yurop.

    O kwuru na ihe atọ ya kwenyere ga-eweta udo ga-adịgịde na Yukren gụnyere - inwe Yukren siri ike ịlu ọgụ gawa ma ọ dị mkpa na ị nọ n'ọnọdụ siri ike enwe mkparịtaụka; nke abụọ bụ ịhe ndị Yurop ga-eme banyere ihebe nchekwa ya na nkwado mba Amerịka.

  10. Popu 'kwụsiri ike' mgbe o nwechara nsogbu iku ume n'ụlọọgwụ - Vatican

    Onyeisi ụka Katọliki na mba ụwa niile bụ Popu Francis malitere inwe ọrịa oyi ka mgbe izuụka abụọ garaaga, kwụsiri ike dịka o nwechara nsogbu iku ume n'ụbọchị Fraịde 28 Febụwarị 2025.

    Popu dị afọ iri asatọ na asatọ malitere ịgbọ agbọọ nke mere ka nsogbu iku ume o nwere kawanye njọ n'ụlọọgwọ n'abalị ahụ mana eji ihe mkpuchi ihu iji nyere ya aka iku ume.

    Mana Vatican kwuru na mgbede ụbọchị Satọde na Popu enwebeghị nsogbu iku ume ọbụla ọzọ dịka ọ na-anabata ọgwụgwọ oxygen nke ọma.

    Ha kwupụtaghị ihe kpatara ọrịa ahụ, mana ha kwuru na Popu mụ anya ma nọgide nke ọma.

  11. Izrel egbochiela ihe enyemaka mmadụ niile ịbata na Gaza

    Ndị ọchịchị mba Izrel kwuru na ha amalitela igbochi ihe enyemaka mmadụ niile ịbata na Gaza dịka agba nke mbụ nke nkwekọrịta nkwụsị ịkwa mgbọ gafechara.

    Ụlọọrụ Praịm Mịnịsta Benjamin Netanyahu kwuru na ndị otu Hamas ekweghị ịnabata ihe dị n'atụmatụ nkwekọrịta nkwụsị ịkwa mgbọ nke onye nnọchịte Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump aha ya bụ Steve Witkoff.

    Ọnụ na-ekwuru ndị otu Hamas kwuru na mba Izrel wepụtara atụmatụ ọhụrụ nke na-achọ sọnsọ ọ dị mma dị Izrel, nke ha kpọrọ mmebị nkwekọrịta nkwụsị ịkwa mgbọ. Ha gwara ndị ogbugbo ka ha gwa ndị Izrel ka ha malitekwa ikwe ka ihe ndị mmadụ chọrọ na-abata Gaza.

    Ndị otu Hamas nke mba Palestine chọrọ ka agba nke abụọ nke nkwekọrịta nkwụsị ịkwa mgbọ soro usoro nke ha kwekọrịta na mbụ nke gụnyere ịtọhapụ ndị e ji eji na ndị mkpọrọ Palestine ya na mba Izrel iwepụ ndịagha na Gaza.

    N'abalị Fraịde 28 Febụwarị 2025, Hamas kwuru na ha agaghị ekwenye na mgbakwunye ọ bụla nke e mere n'usoro nke mbụ na-enweghị nkwa sitere n'aka ndị ogbugbo gunyere mba Amerịka, Kataa na Ijipụt na usoro nke abụọ ga-emecha mee.

    Ụlọọrụ Praịm Mịnịsta bụ Benjamin Netanyahu kwuru, "Izrel agaghị ekwe ka nkwụsị ọgụ na-ahapụghị ndị anyị ji eji, ọ bụrụ na Hamas gaa n'ihu na ịjụ ya, a ga-enwe ihe nsonaazụ ọzọ."

  12. Ndị ọchịchị Izrel akwadola ịgbatị oge nkwụsị ịkwa mgbọ na Gaza

    Ndị ọchịchị mba Izrel akwadola ịgbatị oge nkwụsị ịkwa mgbọ na Gaza nke ga-abụ naanị izu ụka isii, bụkwa oge Muslim Ramadan na oge ndị Juu ji ebu ọnụ.

    Ụlọọrụ Praịm Mịnịsta mba Izrel bụ Benjamin Netanyahu kwupụtara nke a, dịka agba nke mbụ nke nkwekọrịta nkwụsị ịkwa mgbọ gwụchara n'ime abalị Satọde1 Maachị 2025.

    Ụlọọrụ Netanyahu kwuru na dịka atụmatụ nkwekọrịta nkwụsị ịkwa mgbọ nke onye na-anọchite Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump, aha ya bụ Steve Witkoff depụtara, a ga-atọhapụ ọtụtụ n'ime ndị Hamas ji eji na Gaza bụ ma ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ n'ụbọchị nke mbụ.

    O kwuru na a ga-atọhapụ ndị ọzọ e ji eji fọrọ nụ mgbe e nwere nkwekọrịta nkwụsị ịkwa mgbọ na-adịgide adịgide.

    Mana ndị Hamas ekwubeghị ihe ọbụla banyere ihe ọhurụ a mba Izrel kwuru.

    Ụlọọrụ Praịm Minista kwuru na Hamas "ajụla" ịkwado atụmatụ onye nnọchite Onyeisiala Trump bụ Witkoff, nke kwadoro na Izrel ga-amalite mkparịtaụka ozugbo ma ọ bụrụ na otu Hamas gbanwee ọnọdụ ha.

    Atụmatụ a na-atụ anya na mba Izrel nwere ike ịlaghachi n'ọgụ ka ụbọchị iri anọ na abụọ gachara ma ọ bụrụ na ha kwenyere na mkparitauka ha na ndị Hamas banyere agba nke abụọ nke nkwụsị ịkwa mgbọ ahụ dara.

  13. Ndị be anyị daalụ nụ ooo

    Anyị na-asị unụ nnọọ n'ọgbakọ BBC News Igbo.

    Ọfọ anyị bụ ka ụbọchị taa nwetere anyị niile ihe ọma.

    Ndewo.

  14. Ndị isi ala mba Yurop akwadola Zelensky dịka ya na Onyeisiala Trump bara mba na White House

    Ndị isi ala mba Yurop ekwuputala nkwado ha nye mba Yukren ka Onyeisiala Zelensky na Onyeisiala Trump bara mba n’Oval Office dị n’obi ọchịchị White House mba Amerịka.

    Ozi ụfọdụ ndị isi a wepụtara mere ka o doo anya na ha na-akwado onyeisiala mba Yukren dịka ọ na-achọ ịkwụsị agha ha na mba Rọshịa.

    Onyeisiala Frans bụ Emmanuel Macron kwuru na Rọshịa emekpaala Yukren ahụ site na ọtụtụ mwakpo ha wakporo ha ma kwuo na ha kwụrụ chịm inye Yukren nkwado ma nye Rọshịa ntaramahụhụ zuru ezu.

    Chanselọ mba Jamini bụ Olaf Scholz kwuru na Yukren chọrọ udo ma kwuo ka Yukren tụkwasịobi na mba Jamini na mba Yurop ndị ọzọ.

    Praịm Mịnịsta mba Itili bụ Giorgia Meloni na ọ dị mkpa ka e nwee ọgbakọ mba Amerịka, Yurop na mba ndị ọzọ na-akwado iji nweta udo ma kwụsị agha ahụ.

    Ozi ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ Praịm Mịnịsta mba UK wepụtara mere ka a mata na Keir Starmer akpọọla Onyeisiala Trump na Onyeisiala Zelensky oku ekwenti iji nweta udo.

    Onyeisi otu European Commission bụ Ursula von der Leyen kwuru na ha ga-enye Yukren nkwado niile ha chọrọ ugbua.

    Mana mkparịtaụka ahụ mechara bụrụ ihe a na-atụghị anya ya oge Onyeisiala Trump boro Onyeisiala Zelensky ebubo ma kwuo na ọ chọrọ ịmalite agha ‘World War 3’.

    Onyeisiala Zelensky kwuru na mpụtara mkparịtaụka ahụ abụghị ihe ọ tụrụ anya ya mana ọ kwuru na mmekọ dị n’etiti Yukrn na Amerịka bụ nke e nwereike idozi.

  15. Onyeisiala Tinubu ebinyela aka na bọjetị afọ 2025

    Onyeisiala Bola Tinubu ebinyela aka na bọjetị puku ijeri iri ise na anọ na ụma (N54.99tn) nke afọ 2025.

    Cheta na ụlọomeiwu Naịjirịa binyere aka na bọjetị ahụ n’ụbọchị Tọzde 13 Febụwarị 2025 ka ha buliri ọnụegọ bọjetị site N49.7tn ruo N54.99tn nke Onyeisiala Tinubu zitere ha.

    Onyeisiala Tinubu binyere aka na bọjetị ahụ ụbọchị Fraịde 28 Febụwarị, 2025 n’obi ọchịchị dị n’Abuja.

  16. Mmadụ 500 bu ọrịa mpox agbapụla n’ụlọọgwụ dịka ndịagha nnupuisi wakporo DR Kongo

    Ihe ruru mmadụ 500 bu ọrịa agbapụla n’ụlọọgwụ dị na mpaghara ọwụwa anyanwụ mba DR Kongo kemgbe ndịagha nnupisi malitere ịwakpo mba ahụ n’ime otu ọnwa gara aga.

    Ndị ọrụ Africa Centres for Disease Control and Prevention (Africa CDC) bụ ụlọọrụ na-ebuagha megide nfesa ọrịa, kwuru na ọ bụ ihe mwute nye ha maka na nke a nwereike ibute nfesa ọrịa mpox nke akụkọ kwuru na o gburu mmadụ 900 na mba DR Kongo n’afọ 2024.

    E kwuru na ndị ahụ gbapụrụ n’ụlọọgwụ dị na Goma na Bukavu, mba abụọ e kwuru nọ n’ọgbaghara kemgbe ndịagha nnupuisi M23 nwere ọnọdụ ma machie n’ime izuụka ole na ole gara aga.

    Dọkịnta na-ahụ etu ihe si aga na Goma bụ Dọkịnta Samuel Muhindo, kwuru na ndịagha nnupuisi ahụ wakporo ha ma zuru akụrụngwa ọrụ dị iche iche.

    Mpox - ọrịa a maburu dịka monkeypox, bụ ọrịa njirimara ya gụnyere isi ọwụwa, ike ọgwụgwụ na oyi.

    Dịka ụlọọrụ Africa CDC si kwu, kemgbe afọ 2025 malitere, mmadụ 2,890 ebutela ọrịa mpox ebe mmadụ 180 nwụrụ site n’ọrịa ahụ namba DR Kongo.

  17. Mkparịtaụka mụ na Onyeisiala Trump agaghị nke ọma mana anyị nwereike idozi mmekọ anyị - Onyeisiala Zelensky

    Onyeisiala Yukren bụ Volodymyr Zelensky ekwuola na ọgbaghara pụtara ihe na mkparịtaụka ya na Onyeisiala Donald Trump na osote ya bụ JD Vance n’obi ọchịchị White House Amerịka abụghị ihe ọ tụrụ anya ya.

    Cheta na Onyeisiala Zelensky gara Amerịka ka ya na Onyeisiala Trump nwee mkarịtaụka banyere inweta udo n’agha dị n’etiti Yukren na Rọshịa tinyere nkata banyere ihe ọnatarachi ‘minerals’ mba Yukren.

    Mana mkparịtaụka ahụ mechara bụrụ ihe a na-atụghị anya ya oge Onyeisiala Trump boro Onyeisiala Zelensky ebubo ma kwuo na ọ chọrọ ịmalite agha ‘World War 3’. Na nzaghachi ya n’ebubo ahụ, Onyeisiala Zelensky mere ka o doo anya na ekwesighị inwe ihe echiche ọbụla banyere ahụhụ na ajọ ọnọdụ onyeisiala Roshịa bụ Vladimir Putin tinyere mba Yukren n’ime ya.

    A tụrụ anya na Onyeisiala Trump na Onyeisiala Zelensky ga-ebinye aka n’akwụkwọ nkwekọrịta banyere ihe ọnatarachi ‘mineral’ mba Yukren, mana nke ahụ emeghị.

  18. Ndị be anyị nnọọ nụ ooo

    Anyị na-anabata gị n'ọgbakọ BBC News Igbo.

    Ọfọ anyị bụ ka ọnwa Maachị matara anyị niile ihe ọma n'otu n'otu.

    Ndewo.