You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Samia Suluhu Hassan emeriela ntuliaka Onyeisiala mba Tanzania

Nchịkọta akụkọ niile si na mbaụwa niile

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Uzoamaka Ewuzie, Ikechukwu Kalu, Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Michael Ilediagu, Adline Okere, Marvelous Obomanu

  1. Ndị uweojii Tanzania adọọla ndị obodo aka na ntị maka ikesa okwu ụgha na soshal mịdịa

    Ndị uweojii na Tanzania adọọla ndị amaala ha aka na ntị maka iji soshịal midia na-ekesasị onyoonyo maọbụ ozi na-abụghị eziokwu nke nwere ike itinye obodo na nsogbu.

    Ịdọ aka na ntị a na-abịa dịka ihe oyoonyo na-efegharị na sohịal midia na-egosi ebe otu onyeagha nọ na-akatọ gọọmenti dịka Tanzania na-akwado ime ntuliaka n'izu ụka atọ na-abịa.

    Onyeagha ahụ nke kpọrọ onwe ya ‘Capt Tesha” na-ebo gọọmenti ebubo nrụrụ aka, imebi ikike mmadụ nakwa ihe ndị ọzọ.

    Ọ gara n’ihu gwaa onyeisi ndịagha Jacob Mkunda ka o mee ihe gbasara ihe ndị ahụ ma kpọọ ndị amaala Tanzania ka ha mee ngagharịiwe na ndị nchekwa nọ ha na-azụ.

    Na nzaghachị oyoonyo ahụ, onu na-ekwuchitere ndịagha Tanzania Bernard Masala Mlunga kwuru na onye mere ihe oyoonyo ahụ abụghị ndị otu ha.

    Ọ gwara ndị mmadụ ka ha kpachara anya ha etu ha si ekwu okwu ma hapụ ịdọba ndịagha n’ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị.

  2. Ndị Al-Shabab na-eyi ọha egwu mwakporo ụlọmkpọrọ tọghapụ ndi otu ha na mba Somalia

    Otu na-eyi ọha egwu na mba Somalia bụ Al-shabab wakporo ụlọmkpọrọ Godka Jilicow nọ na isi obodo Somalia Mogadishu ịzọpụta ndị otu ha gọọmenti ji eji.

    Akụkọ kwuru na o nwere ndị nụrụ ụda ogbunigwe na ụda egbe na ụlọmkpọrọ ahụ.

    Ndị Al-shabab si na ha tọhapụrụ ndị okpukperechi alakụba niile e ji na mkpọrọ ma merụọ ndị na-echekwa ụlọmkpọrọ Godka Jilicow ahụ.

    Gọọmenti Somalia kwuru na ha egbuole ndị Al-Shabab mere mwakpo ahụ

    Ma gọọmenti Somalia na Al-Shabab, onwebeghị onye kwupụtara mmadụ ole nwụrụ mgbe emere mwakpo ahụ.

  3. Praịm Minista mba Fransị Sébastien Lecornu agbaala arụkwaghịm na-erughị otu ọnwa n’ọkwa

    Praịm Minista mba Fransị bụ Sébastien Lecornu agbaala arụkwaghịm, na-erubeghị otu ụbọchị o kpughechara ndị ọrụ ya.

    Lecornu kwuru n'ụtụtụ Mọnde na, "Ọnọdụ ezughị ezu ka m gaa n'ihu dịka praịm minista," ma katọọ ekweghị ekwe nke ndị otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị n’inwe nkwekọrịta.

    Obi ọchịchị Elysée kwupụtara nke a mgbe Lecornu zutere Onyeisiala Emmanuel Macron otu awa n'ụtụtụ Mọnde.

    Nke a na-abịa naanị ụbọchị iri abụọ na isii ka ahọpụtara Lecornu dịka praịm minista n’ihi ọdịda ọchịchị nke François Bayrou gara aga.

  4. A kpụpụrụ onye ntaakụkọ ụlọikpe maka ebubo ịsị na “Gọvanọ Delta Steeti na-ehi ụra” - Inibeng Effiong

    Otu ọkaiwu a maama bụ Inibehe Effiong ekwuola na a kpụpụrụ onye ntaakụkọ ụlọikpe maka ebubo ịkparị ndị nọ n’ọchịchị na Delta steeti.

    Effiong bụ onye kwuru na aha onye ntaakụkọ ahụ a kpụpụrụ ụlọikpe bụ Fejiro Oliver kọwara na e na-ebo ya ebubo “ị sị na Gọvanọ Delta steeti na-arahụ ụra”.

    Effiong ji akara X soshal midia ya kesaa akwụkwọ ụlọikpe dị elu n’Asaba, Delta steeti na-egosi ebubo a na-ebo onye ntaakụkọ Fejiro Oliver.

    Ebubo ahụ gunyere na “Oghenedoro Tega Fejiro Oliver dị afọ 38 site n’ọnwa Mee ruo Julaị 2025 ji akara ‘Facebook’ gị ebe ị na-aza aha 'Fejiro Oliver' dee na Sịnetọ Ede Dafinone bụ sịnetọ na-ehi ụra”.

    Akwụkwọ ebubo ahụ depụtara ihe ndị ọzọ a sị na o dere gunyere ịkpọ Sịnetọ Ede Dafinone “POS sịnetọ” na onye nrụrụaka ma kwuo na o zuru ụgbọala ụmụakwụkwọ o kwesiri ike na mpaghara ọ na-anọchịanya ya na ihe ndị ọzọ.

  5. Izrel na Hamas ga-amalite mkparịtaụka n’Ijipt taa maka imejuputa atụmatụ udo Gaza nke Trump

    Izrel na Hamas ga-amalite mkparịtaụka n’Ijipt taa, maka imejuputa atụmatụ udo Gaza nke Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump.

    Ka ọ dị ugbua, Hamas ekwenyela n’ụfọdụ atụmatụ ahụ ruru ọnụ iri abụọ - gụnyere ntọhapụ nke ndị Izrel eji eji - mana ha anabataghị ọnọdụ nkwekọrịta ahụ niile.

    Ọzọ, ndị nnọchiteanya Hamas nke Khalil al-Hayya na-edu bụ onye Izrel nwara igbu na Kataa n'ọnwa gara aga - rutere isi obodo Cairo n'abalị Sọnde ebe ndị otu Izrel rutere n’ụbọchị Mọnde.

    Onye ntaakụkọ anyị bụ Hugo Bachega kwuru na ọnọdụ na-asara nnukwu ọkụ ugbua, mana odoghị anya na a ga-enweta nkwekọrịta.

    Cheta na n'abalị Sọnde, Onyeisiala Trump kpọrọ oku ka "onye ọ bụla gawa ngwa ngwa", n’agbakwunye "a gwara m na ekwesịrị ịmecha agba nke mbụ n'izu a."

    Chetkwa na n'abalị Satọde, Praịm Minista Izrel Benjamin Netanyahu kwuru na ya nwere olile anya ikwuputa maka ntọhapụ ndị eji eji "n'ụbọchị na-abịa."

    Mana e kwuru na mwakpo Izrel na Gaza na-aga n'ihu, ebe ndị nchekwa obodo kwuru na egburu ndị Palestine mmadụ iri abụọ na anọ n'ime otu ụbọchị gara aga.

  6. Ụmụ Igbo ndị ọma, ụtụtụ ọma

    Nnọọ n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Mọnde 6 Ọktoba 2025.

    Anyị na-asị na izu ọhụrụ a ga-adịrị onye ukwu nma dịkwara onye nta nma.

    Biko, gaa n’ihu ka isonyere anyị dịka anyị na-ewetere gị akụkọ ihe na-eme na Naịjirịa nakwa ụwa niile.

    Sonyekwara anyị n'akara soshal midịa anyị dị iche iche nke gụnyere WhatsApp Chanelụ, Facebook na Instagram maka akụkọ ndị ọzọ dị na vidiyo na foto.

    Biko sonyere anyi!

  7. NDLEA ejidela ndị isi otu na-ere ọgwụ ọjọọ na Naịjirịa chọrọ ibuba ya UK

    Ụlọọrụ na-ahu maka iwu gbasara ọgwụ ọgọọ na Naịjirịa bụ National Drug Law Enforcement Agency (NDLEA) ejidela ndị isi otu abụọ na-ere ọgwụ ọjọọ na Naịjirịa.

    NDLEA mere ka a mata nke a n'akwụkwọ ozi onyeisi ngaraba mgbasaozi ha bụ Femi Babafemi binyereaka n'ụbọchị Sonde, Ọktoba 5 2025.

    Ọ si na ndị ahụ na-azụ ahịa ọgwụ ọjọọ na-ezo ya n'azụ ihe dị icheiche nakwa akụkụ ihe dị iche iche nke gụnyere iko, ude na ihe ndị ọzọ.

    Ọ kọwara na ha jedere Alhaji Hammer Toafeek bụ onye a na-enyo enyo na ọ bụ onye isi otu n'ime otu ndị ahụ na-ere ọgwụ ike.

    NDLEA kwuru na ha jidekwara mmadụ abụọ ọzọ a na-akpọ Ogunbiyi Oluseye Taiwo na Popoola Francis Olumuyiwa maka ọgwụ ọjọọ ha chọrọ ibuga UK.

    Ha bippụtakwara aha ndị ọzọ dị icheiche ha jidere na mpaghara Naịjirịa niile nke gunyere Dahiru Salisu maka ebubo ire mkpụrụ ọgwụ a na-akpọ Tramadol na Zaria, Kaduna Steeti nakwa ndị ọzọ.

  8. Trump enyela ụmụaka ndị mbịarambịa ego ruru $2,500 ka ha pụọ n’Amerịka

    Gọọmentị Donald Trump na-enye ụmụaka ndị mbịarambịa n’Amerịka ego ruru puku dọlla abụọ na narị ise ka ha pụọ n'Amerịka.

    A chọpụtara nke a n’akwụkwọ ozi e degara ndị mbịarambịa n’ebe ha ji mere ebe obibi dịka ụlọ mgbasaozi Reuters si kwuo.

    Ụlọọrụ na-ahụ maka mbata na ọpụpụ n’Amerịka bụ "Department of Homeland Security's Immigration and Customs Enforcement" kwuru na ọ bụ eziokwu na e nwere ego a sị ka enye ndị chọrọ isi Amerịka pụọ mana ha ekwughị ego ole ọ bụ dịka akụkọ Reuters si kwuo.

    Nke a bụ atụmatụ ọhụrụ ọchịchị Trump wepụtara ka ndị mbịarambịa jiri aka ha laa.

    E tinyere ego ruru $250m na DHS maka ndị mbịarambịa chọrọ isi Amerịka laa ma kwee ha nkwa inye ha ego ruru $1000 maka ijiri aka ha pụọ n’Amerịka.

  9. Yukren kwuru na ogbunigwe mba Rọshịa tụrụ na mba ha egbuola mmadụ ise

    Mmadụ ise anwụọla dịka puku kwuru puku ndị ọzọ nọ n’ụkọ ọkụ latrik na mba Yukren oge mba Rọshịa jichara ogbunigwe mee ha mwakpo dị egwu n’abalị.

    Ọ bụ onyeisiala mba Yukren bụ Volodymyr Zelensky kwupụtara nke a.

    Ndị agbataobi Yukren bụ Poland kwuru na ha kwọpụrụ ụgbọelu ndịagha ha n’ọdụrụkụọ iji hụ na ihu eluigwe ha nwere nchekwa.

    Ndịagha mba Poland kwuru na ha kwọpụkwara ụgbọelu ndịagha Nato.

    Mmadụ anọ si n’otu ezinaụlọ, gụnyere nwata nwaanyị dị afọ iri na ise so na ndị e gburu oge ogbunigwe mba Rọshịa dara na Lapaivka, dịka mwakpo ahụ lekwasara anya n’obodo Lviv.

    Mịnịstrị nchekwa mba Rọshịa kwuru na ha emeela "nnukwu" mwakpo gara nke ọma n’ogige ndịagha Yukren ha lekwasara anya.

  10. Trump enyeela ikike iziga ndịagha nchekwa mba 300 na Chicago

    Onyeisiala Donald Trump enyeela ikike ka eziga ndịagha nchekwa mba narị atọ na steeti Chicago iji lebara anya n’ihe ọ na-ekwu bụ mpụ na-enweghị nchịkwa.

    Nke a mere awa ole na ole ndị ọrụ mbata na ọpụpụ kwuru na ha na ndị ngagharịiwe na steeti ahụ pati Democrat na-achị na-enwe esemokwu.

    Cheta na ndị ọrụ ahụ gbagburu otu nwanyị jiegbe mgbe ya na ndị ọzọ gbabatara ụgbọala ha n'ụgbọala ndị ọrụ nchekwa iwu.

    N’aka nke ọzọ, ndị isi steeti na nke ime obodo akatọọla atụmatụ iziga ndịagha nke Onyeisiala Trump wee kpọọ ya imetọ ike na ime ihe n'ụzọ na-ezighị ezi.

    Gọvanọ Illinois JB Pritzker kwuru na Trump "na-achọ imepụta nsogbu".

    Chetakwa na onye ọkaikpe gọọmentị etiti na Portland, Oregon - steeti ọzọ na-emesapụ aka - gbochiri ọchịchị Trump ibubata ndịagha narị abụọ n’ebe ahụ.

  11. Benjamin Netanyahu ekwuola na ya nwere olileanya ikwupụta ntọhapụ ndị e ji eji oge na-adịghị anya

    Praịm Minista mba Izrel bụ Benjamin Netanyahu ekwuola na ya nwere olileanya ikwupụta maka ntọhapụ ndị e ji eji na Gaza “n’ime ụbọchị ndị na-abịa abịa”.

    N’ozi ọ gbasara n'igwe onyonyoo, o kwukwara na “a ga-anapụ ndị Hamas ngwaọgụ ma wepụ ndịagha na Gaza – n’ụzọ dị mfe maọbụ n’ụzọ siri ike, mana a ga-enweta ya.”

    O kwuru nke a dịka Hamas wepụtara ozi n’ụbọchị Fraịde, bụ nke ha jiri kweta ịtọhapụ ndị e ji eji site n’iji atụmatụ udo nke mba Amerịka.

    Mana o kwughị gbasara nnapụ ngwaagha, ma chọọ mkparịtaụka maka okwu ndị ọzọ.

    N’ụbọchị Satọde ka Hamas kwuru na Izrel na-aga n’ihu “na-egbu mmadụ n’igwe” oge ha tụchara ogbunigwe na Gaza n’ụtụtụ Sọnde, ma gwa mbaụwa ka ha kwanye Izrel ọkụ n’ahụ.

    A na-atụ anya na mkparịtaụka nkwụsị ịkwa mgbọ ga-amalite n’etiti ndị o metụtara na mba Ijipt n’ụbọchị Mọnde.

  12. Ndị be anyị, ụnụ asaala chi?

    Anyị na-asị gị nnọọ n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Sọnde 5 Ọktoba 2025.

    Ka Chineke zaa ekpere anyị niile n’ụbọchị taa.

    Biko, gaa n’ihu sonyere anyị dịka anyị na-ewetere gị akụkọ ihe na-eme na Naịjirịa nakwa ụwa niile.

    Sonyekwara anyị n'akara soshal midịa anyị dị iche iche nke gụnyere WhatsApp Chanelụ, Facebook na Instagram maka akụkọ ndị ọzọ dị na vidiyo na foto.

    Udo dịrị gị!

  13. Ụlọikpe na Saụt Afrịka ekpebiela ka e nye ndị nna oge ezumike dịka e nyere ndị nne mụrụ nwa ọhụrụ

    Ụlọikpe kachasị na mba Saụt Afrịka ekpebiela na nne na nna nwata a mụrụ ọhụrụ kwesịrị inwe ohere ezumike na nhatanha.

    Mkpebie a nke ọtụtụ mmadụ nabatara ya ka e kwuru na ọ bụ iji kwalite ikpe ziri ezi nakwa ikike dịịrị ezinaụlọ.

    N’iwu nke dị bu tupu mkpebie a, a na-enye ndị nne oge ezumike ọnwa anọ ebe ndị nna bụ naanị ụbọchị iri.

    N’ikpe ya, ụlọikpe kwuru na ụfọdụ akụkụ iwu ahụ adịghị mma, ma sị na ọ bụ ịkpa oke megide ndị nna, ma kpebie na nne na nna ga-eke ụbọchị ezumike ahụ etu ha siri chọọ.

    “Nke a bụ ụzọ dị oke mkpa iji kwalite nhatanha, ọdịmma ezinaụlọ nakwa ọdịnihu ndị nna na mba Saụt Afrịka,” ka Sthembiso Phakathi bụ onyeisi otu ‘Single Dada Network’ kwuru.

    Mgbe ọ na-achabi ikpe ahụ, Ọkaikpe Zukisa Tshiqi kwuru na nne na nna ga-eke ụbọchị ezumike ahụ etu ha si chọọ, ma kwuo na iwu dịbu na mbụ “nyere ndị nne ibu arụ ma kpachapụ ndị nna”.

    “A na-emegbu ndị nna ma na-apụ ha ohere itinye aka na nzulite nwata a mụrụ ọhụrụ,” ka o kwuru.

  14. Nghagharịwe Moroko: Úlọọgwụ ka ama egwuregwu mkpa – ndị ntorobia

    Kemgbe izuụka gara aga ndị ntorobia Moroko nọ na-eme ngagharịwe maka ebubo ha boro gọọmenti ha ileda ọnọdụ ha anya nakwa etu ihe isi ike na ndakpó akụnaụba nke na-akawanye njọ.

    Na-agbanyeghị ọnọdụ ha, ndị Gen’Z na Moroko si na gọọmenti ha werela ego akụnaụba e kwesịrị iji nyere ndị mmadụ aka weere na-arụ ama egwuregwu kachasị ibu n’ụwa maka nkwado ihazi asompi iko mba ụwa afọ 2030.

    Dịka ha si kwuo, amaegwuregwu a nke ngalaba ya ruru 115,000 ga-eri gọọmenti ha ọnụego $5bn (£3.7bn).

    Ha katọrọ nke a ma kọwa na ọ dika atụmatụ a na-egosi gọọmenti na amaghị ihe kwesịrị ibute ụzọ n’ihe gọọmenti kwesịrị imere ụmụamaala.

    Ozi ndị na-eme ngagharịwe bụ,"Anyị achọghị asompi mbaụwa, ahụike ka anyị chọrọ".

    Akụkọ kwuru n’Ihe kpaliri iwe ha bụ ụmụnwannyị dị ime nwụrụ n'ọnwa Sepụtemba n'ihi enweghị ụlọahụike dị mma nakwa ndị ọrụ ahụike tozuru etozu.

    N’afọ 2023, ndị dọkinta nọ na Moroko dị mmadụ asatọ n’ọnụọgụgụ mmadụ puku iri (7.8 doctors per 10,000 Morocans) nke na-erughị ọnụọgụgụ nke ụlọọrụ ahụike mba ụwa(WHO) kwuru na o kwesịrị ịbụ.

    Cheta n'oge na-adịbeghị anya, ụmụ ntorobia na mba Nepal, Madagascar na Kenya mere ngagharịiwe nke ha maka ọn odụ akụnaụba mba ha.

  15. Ụlọikpe India enyela iwu ka ndi dọkịta ga mụọ ka e si edema ihe

    Ụlọikpe Ukwu Punjab na Haryana ekwuola na dọkịta idere mmadụ ọgwụ etu ọ ga-esi agụtali ya bụ "ikike dịịrị onye" nke nwere ike ikpebi ọnwụ na ndụ.

    Mkpebi a na-abịa n'ikpe metụtara akwụkwo idina mmadụ n'ike, ịgba n'iro nakwa ịkpụ ederede nke otu nwaanyị gbara otu nwoke nke Ọkaikpe Jọstịs Jasgurpreet Singh Puri nọ n'isi ya.

    Nwaanyị wetara ikpe na-ebo ebubo na nwoke naara ya ego ya kwe ya nkwa inweta ọrụ gọọmentị, gbaa ya ajujụọnụ ụgha na dina ya n'aghụghọ.

    Nwoke gọrọ sị n'aka ya dị ọcha na ya na nwaanyị ahu na-ayị, na o wetara ikpe ha n'ihi nghọtaghie ego butere ha.

    Oge Jọstis Puri lere anya n'akwụkwọ nchọpụta dọkịta nyochara nwaanyị ahụ dere, o nweghị ike ịgụtali ihe dọk ita ahụ n'arụ n'ụlọgwụ gọọmentị dere .

    "O nweghịdị otu ihe e dere n'akwụkwọ ahụ doro anya."

  16. Sanae Takaichi: Japan achọọla inwe nwaanyị mbụ ga-abụ Praịm minista

    Patị nọ n' ọchịchị na mba Japan bụ 'Liberal Democratic arty' ahọpụtala Sanae Takaichi dịka onye ndu ha ọhụrụ.

    Cheta na n'ọnwa gara aga, Praịm Minista Shigeru Ishiba,onye nke oge ọchịchi ya gụchara ọtụ afọ ugbua kwupụtara na ọ ga-arịtu n'ọkwa mgbe e meriri ya n’ọtụtụ ntuliaka nke mere ka patị ha Liberal Democratic Party (LDP) ji kpụọ afọ n’ala.

    Takaichi gbara afọ iri asaa na anọ bụ onye ndọrọndọrọ ọchịchị a ma ama na Japan.

    O nwere ọtụtụ ihe ga-echere ya aka mgba ma ọ bụrụ na-akwado ya nke gunyere ihazi akụnauba Japan ebe ọtụtụ ezinaụlọ na-adọga n'ihi ihe oriri.

  17. Trump agwaala Izrel ka ha kwụsị ịtụ ogbunigwe na Gaza

    Onyeisiala mba Amerịka bú Donald Trump agwala Izrel ka ha kwụsị itụ ogbunigwe na Gaza maka na o kwenyere na Hamas dị njikere ime udo.

    Nke a na-abịa dịka Trump wepụtara atụmatụ ọhụrụ iji nweta ezi udo n’etiti mba abụọ n’alụ ọgụ.

    Praịm Minista Izrel Benjamin Netanyahu nabatara atụmatụ a ma kwuo na ha na-akwado imejupụta nkebi nke mbu n' atụmatụ ahụ Trump wepụtara.

    Ndị Hamas na-achọ ka e nwee mkparitaụka n' ụfọdụ okwu nọ n’ime atụmatụ ahụ mana ha achọghị itinye ọnụ n' okwu ndị ọzọ gbara ọkpụrụkpụ n’ime atụmatụ ahụ nke gunyere ịtọgbọ ngwaagha nakwa ị wepụ onwe ha n’ihe gbasara ọchịchị Gaza.

    Ezinaụlọ ndị amaala Izrel nke ndịagha Hamas jidere nwere olileanya na a ga-enwe nkwekọrịta dịka Hamas kwenyerela na ha ga tọhapụ ndị niile ha ji eji fọdụrụ na Gaza.

  18. Ụtụtụ ọma Igbo bụ Igbo

    Anyị ji obi aṅụrị anabata gị n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ ụbọchị Satọde 4 Ọktoba 2025.

    ka ụbọchị taa gara gị nke ọma

    Gaa n'ihu sonyere anyị n'akara soshal midia anyị dị iche iche WhatsApp Chanelụ, Facebook na Instagram.

    Ọ bụ Marvelous Obomanu ka gị na ya ga anọkọ n'ụtụtụ a, ebe Ikechukwu Kalu ga awuchie n'ehihe.

    Ndewo.

  19. Dave Umahi nọchitereanya Onyeisiala Tinubu na njem ọrụ n'Abia Steeti

    Onyeisiala Bola Tinubu abịaghizi Abia Steeti ịgbapụ ọrụ gọọmenti Gọvanọ Alex Otti rụrụ dịka e si tụọ anya ya kama o zigara mịnịsta na-ahụ maka ọrụ na Naịjirịa bụ Dave Umahi.

    Dave Umahi nọchiri anya Onyeisiala Tinubu wuchiri n’Umuahia bụ isiobodo Abia Steeti dịka Gọvanọ Alex Otti nabatara ya.

    Ọ gbapere ụlọ ezumezu Michael Okpara dị n’Umuahia, bụ nke a rụzigharịrị arụzi, tupu ha gaa n’Aba bụ obodo azụmaahịa dị na steeti ahụ.

    E mere mmemme nnabata Umahi n’aha Onyeisiala Tinubu n’ọgbọegwuregwu Enyimba dị n’Aba tupu ha gawa ịgbape ụfọdụ okporoụzọ ndị Gọvanọ Otti rụrụ.

    Ụfọdụ ụzọ ndị a gụnyere, okporoụzọ si Aba-Portharcourt, Okporoụzọ Ohanku

    Ụfọdụ ndị ndu mpaghara ọwụwa anyanwụ so mee njem ahụ gụnyere, Benjamin Kanu bụ osote onyeisi ụlọomeiwu nta, Sịnetọ Enyinnaya Abaribe na-anọchiteanya mpaghara Abia South n’ụlọomeiwu Sịnetị na ndị ọzọ.

    N’okwu ha, Benjamin Kanu kpọkuru gọọmenti Legọs Steeti ka ha mee akwụkwọ ụlọ zuruoke ma doo anya nye ụmụafọ Igbo bi na steeti ahụ karịa ikutusi ụlọ ha.

    O kwuru ka gọọmenti etiti gbalịa mepee ọdọụgbọmmiri n’ọwụwa anyanwụ ebe a ga-esi na-ebubata ngwaahịa.

    Sịnetọ Abaribe rịọrọ Onyeisiala Tinubu ka ọ tọhapụ Nnamdi Kanu, na ọ bụ ya bụ mkpa kachasị akpa ndị mpaghara ọwụwa anyanwụ.

  20. Trump agwala Hamas ka ha nabata atụmatụ udo na Gaza maọbụ zute "ọkụ mmụọ" n'uju ya

    Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump enyela ndị Hamas ọgwụgwụ oge ịnabata atụmatụ udo maka obodo Gaza maọbụ zute “ọkụ mmụọ” n’uju ya.

    Trump depụtara nke a n’akara soshal midia ‘Truth’ n’ụbọchị Fraịde ma kwuo na a ga-enweriri nkwekọrịta ma ọ kụọ elekere isii nke ụbọchị Sọnde 5 Ọktoba, 2025.

    Atụmatụ ahụ kwuru na a ga-akwụsị ịkwa mgbọ na-eme n’obodo Gaza ma tọhapụ mmadụ iri abụọ bụ ụmụafọ Izrel ka dị ndụ n’ime ụbọchị abụọ, tinyekwara ozu ndị nke e chere nwụrụla anwụ iji gbanwere isi ọtụtụ ụmụafọ Gaza e ji eji.

    Ndị na-ekpe udo si na mba Arab na Tọkị na-agba mbọ ime ka ndị Hamas nabata atụmatụ udo ahụ, mana otu onyeisi ndị Hamas kwuru na ha nwereike ịjụ ya.

    Nkwupụta ọgwụgwụ oge a na-abịa dịka Trump kwuru na Tuzde na ọ na-enye otu Hamas “ụbọchị anọ” iji zaghachị banyere atụmatụ udo a.

    Ndị na-ekpe udo a kpọtụrụla onyendu ndị Hamas nọ na Gaza, onye gosiri na ọ nabataghị atụmatụ nkwụsị ịkwa mgbọ nke Amerịka wepụtara.

    Mana a na-eche na ụfọdụ ndị ndu Hamas nọ na Qatar na-atụle oche ịnabata ya mana o nweghi ihe ha pụrụ ime maka na ndị ahụ e ji eji anọghị ha n’aka.