You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Samia Suluhu Hassan emeriela ntuliaka Onyeisiala mba Tanzania

Nchịkọta akụkọ niile si na mbaụwa niile

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Uzoamaka Ewuzie, Ikechukwu Kalu, Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Michael Ilediagu, Adline Okere, Marvelous Obomanu

  1. Somtochukwu Maduagwu: Kirie etu ụka a kaara nwaada ahụ nwụrụ anwụ si gaa na Pọtakọt

    Ezinaụlọ nwaada Somtochukwu Maduagwu nwụrụ anwụ, nna ya bụ Ifeanyi Maduagwu, nne ya, ụmụnne na ndị ọnyị ha bịara n’igwe nonyere ha n’ụlọụka Corpus Christi dị na Pọtakọt, Rịvas steeti ebe a nọ kaara ya ụka ọnwụ.

    Cheta na Somtochukwu Maduagwu bụ onye ntaakụkọ ụlọọrụ Arise-Tv ndị ojiegbe mwakporo ma gbuo n’ụlọ ya n’Abuja.

  2. Gọvanọ Bayelsa Steeti bụ Douye Diri apụọla n’otu PDP

    Gọvanọ Beyelsa steeti ekwuola na ya apụọla n'otu ndọrọndọrọ ọchịchị Peoples Democratic Party (PDP).

    Gọvanọ Diri mere ka a mata nke a na Yenagoa, isi obodo Bayelsa Steeti.

    O kwuru na ya na ndị omeiwu steeti ya dị iri abụọ na atọ ga-eso pụọ na PDP.

    Tupu akụkọ a apụta, Gọvanọ Diri ekwubeghi otu ndọrọndọrọ ọchịchị ọzọ ọ ga-abanye mana cheta na nke a na-eme dịka Gọvanọ Enugwu steeti bụ Peter Mbah hapụrụ PDP banye na All Progressives Congress (APC).

  3. Di na nwunye ndị Izrel Hamas tọọrọ ahụla onwe ha anya ka ọ gachara abalị 738

    Di na nwunye ụmụ amaala mba Izrel so na ndị Hamas tọọrọ ejirila anya ha abụọ hụta onwe ha ka ọ gachara abalị 738 ha nọrọ n’aka ndị ntọ.

    Ha abụọ Hamas tọọrọ ma jichie na mpaghara dị icheiche anọọla ihe karịrị afọ abụọ na-ejighị anya hụta onwe ha.

    Hamas tọọrọ Noa Argamani na Avinatan mgbe ha gara ebe a na-eme emume egwu a nakpọ Nova n’Izrel.

    Vidiyo ebe ndị Hamas ji ọgbatumtum tọrọ Argamani n’oge ahụ so na vidiyo wuruewu mana a tọghapụrụ ya n'ọnwa Juun 8, 2024 mgbe Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump tinyereaka nweta nwekọrịta udo na Gaza.

    Argamani bụ onye kenerere Donald Trump maka etu di ya si nweta ntọhapụ kwuru na ugbua “m na dị m ga-ebido na-enweta onwe anyị”.

  4. Ndị nche obodo Ụmụleri ejidela mmadụ ise maka ebubo ire anụ nwụrụ anwụ n’Anambra Steeti

    Aka ndị nche obodo Ụmụleri akparala mmadụ ise a na-enyo enyo na ha na-ere anụ nwụrụ anwụ ejiri chụọ aja na mmiri Omambala dị n’Anambra steeti.

    Ya bụ ihe mere oge ndị nche obodo Umudiana Ụmụleri jidere mmadụ ise na be ha, bụ ndị na-esi nri ma na-erekwa anụ ndụ.

    E kwuru na ndị ahụ ji ụgbọala keke na bọọsụ buru anụ ehi, anụ ọkụkọ, nakwa anụ ewu nwụrụ anwụ nke ụfọdụ n’ime ha maliterela ire ere.

    Ka e siri kwuo, ndị nche obodo jidere ha n’ihi na anụ ndị ahụ n’ebutezi ijiji.

    Ka a gbara ha ajụjụ ọnụ, ndị ahụ kwuru na ọ bụ na mmiri Omambala, ebe a na-achụ aja dị iche iche ka ha butere ụfọdụ anụ ndị ahụ.

    Ha gara n’ihu kwuo na ọ bụ Ọnịcha ka ha bu anụ ahụ aga, ebe ha ga-eresị ya ndị na-ere anụ ndụ nakwa ndị na-esi nri ahịa.

    E kwuru na aha ndị ahụ a na-enyo enyo gụnyere Uchenna Onwurah dị afọ iri abụọ na ise, Chibogu Ogechi dị afọ iri abụọ na ise, Obalim Chukwujekwu dị afọ iri abụọ na ise, Onyemaechi chukwuemeka dị afọ iri abụọ na asaa, nakwa Onyibo John dị afọ iri abụọ na asaa.

    E kwuru na anụ ndị e nwetere n’aka ha gụnyere ehi, ewu na ọkụkọ.

    Ndị nche ahụ ji ohere ahụ yọọ ndị mmadụ ka ha nnyochaa anụ ọbụla ha chọrọ iri maka na mmadụ nwereike isi n’anụ ahụ adịghị mma bute ọrịa.

  5. Ihe ọmụmụ Maths abụghịzi iwu maka ụmụakwụkwọ nọ na ngalaba 'Arts'

    Ọ bụkwaghị iwu na ụmụakwụkwọ na-achọ ịbata na ngalaba ‘Arts’ na mahadum Naịjirịa ga-enwete kredit na mgbakọ na mwepụ bekee kpọrọ Mathematics n’ule asambodo Senior School Certificate Examination (SSCE), dịka ntuziaka Mịnịstrị na-ahụ maka agụmaakwụkwọ na Naịjirịa degharịrị maka ịbanye ụlọakwụkwọ mahadum Naịjirịa, si kwuo.

    Ọnụ na-ekwuru mịnịstrị ahụ bụ Folasade Boriowo kwuru na n’ozi mịnịstrị ahụ wepụtara n’ụbọchị Tuzde 14 Ọktoba 2025 na ntuziaka a edegharịrị, bụ iji wepụ ihe mgbochi, mee ka enwe ọchịchị onyekwuouche n’usoro agụmakwụkwọ mahadum ma inye ndị ntoroọbịa Naịjirịa ike.

    O kwuru na usoro ọhụrụ a metụtara mahadum, politekịnịc, kọleji agụmakwụkwọ, na Innovation Enterprise Academies (IEAs) dị n'ofe Naịjirịa.

    Ọ na-ekwu na ahaghị nhata a bụ n'ihi ihe mgbe ochie na nke siri ike kwesịrị ịpụ n’ụzọ ka ikpe ziri ezi na oghere bata n’agụmakwụkwọ nke Naịjirịa.

    O kwukwara na a kagbuola asambodo National Industrial Diploma (NID) nke Innovation Enterprise Academies na-enye na mbụ ma jiri National Diploma (ND) dochie ya.

    Nkwupụta ahụ gara n’ihu kwuo na minista na-ahụ maka agụmaakwụkwọ bụ Tunji Alausa kwuru na mgbanwe ahụ dị mkpa maka ịkwụsị ọtụtụ afọ nke amachibidoro oghere ndị tozuru etozu enweghị ike ibanye na mahadum.

    "Kwa afọ, ihe karịrị mmadụ nde abụọ na-ede ule Unified Tertiary Matriculation Examination (UTME), mana ọ bụ naanị ihe dịka mmadụ narị puku asaa ka a na-anabata na mahadum," Alausa kwuru.

  6. A chọpụtala njirimara ozu ndị Izrel mmadụ atọ ebughachitere dịka Trump gwara Hamas ka ha wezuga ngwaagha

    A chọpụtala njirimara na aha ozu mmadụ atọ nwụrụ mgbe e jidere ha nke ndị Hamas bughachitere ndị Izrel.

    Ezinụlọ ndị eji eji na ndị a na-achọ achọ kwuru na aha ha gụnyere Tamir Nimrodi, Etian Levy na Uriel Baruch mana a chọpụtabeghị njirimara maọbụ aha onye nke anọ.

    Nke a na-abịa dịka Izrel dọrọ aka na ntị na ọ ga-amachibido ihe enyemaka ịbanye na Gaza ma gbuo oge na-ịgbape ụzọ Rafah ruo mgbe Hamas weghachiri ozu mmadụ iri abụọ na asatọ nwụrụ anwụ.

    E weghachighị ozu ndị nwụrụ anwụ ọsọ ọsọ akpalitela iwe n’Izrel, mana ndị Palestine na-enwewanye nchegbu na igbu oge ahụ nwereike iweta ejighị n'aka na ọdịnihu nke nkwụsị ọgụ ahụ.

    N’aka nke ọzọ, ụlọọrụ Red Cross kwuru na ozu ndị Palestine mmadụ iri anọ na ise nwụrụ anwụ bụ ndị ejidere n’Izrel alọghachitela na Gaza na Tuzde.

    Ka ọ dị ugbu a, onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump na-ekwu na ọ bụrụ na Hamas ewepụghị ngwaagha "anyị ga-anapụ ha ngwaagha".

  7. Ụtụtụ ọma, Igbo ndị ọma

    Nnọọ n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Wenezde 15 Ọktoba 2025.

    Anyị na-asị ka ọ dịrị onye ukwu mma ma dịkwara onye nta mma.

    Biko, gaa n’ihu sonyere anyị dịka anyị na-ewetere gị akụkọ ihe na-eme na Naịjirịa nakwa ụwa niile.

    Sonyekwara anyị n'akara soshal midịa anyị dị iche iche nke gụnyere WhatsApp Chanelụ, Facebook na Instagram maka akụkọ ndị ọzọ dị n'ụdị onyonyoo na foto.

    Ya gazie!

  8. Ndịagha mba Madagaskar achụpụla Onyeisala Andry Rajoelina ma weghara ọchịchị

    Ndịagha mba Madagaska ewerela ọchịchị ma chụpụ Onyeisala Andry Rajoelina.

    Nke a na-abịa dịka Rajoelina gbagara ebe ọ ga-enwe nchekwa oge a nwachara imemila ndụ ya dịka ụmụntoroọbịa kpọrọ onwe ha “Gen-Z Mada” na-eme ngagharịiwe.

    Otu ndịagha weghaara ọchịchị a ma ama ka CAPSAT akwụsịla ndị ọrụ ọchịchị onye kwuo uche ya na mba ahụ nke gunyere ụlọikpe na ndị na-ahazi ntuliaka ma kwuo na ha ga-eme ntuliaka n’ime afọ abụọ na-abịa abịa.

    Cheta na ndị ọmeiwu mba Madagaskar chọrọ ịchụpụ onyeisiala Andry Rajoelina n'oche, mana ọ jụrụ ajụ. Ka ọ dị ugbua, o nweghị onye ma ebe ọ nọ.

  9. Kashim Shettima na ndị APC anabatala Gọvanọ Peter Mbah

    Aka na-achị Enugwu steeti bụ Gọvanọ Peter Mba ahapụla pati o jiri banye n’ọkwa bụ PDP ma kpọrọ ndị otu ya niile banye na pati APC.

    Osote onyeisiala Naịjirịa bụ Kashim Shetima na ọtụtụ ndị mmadụ jupụtara n’ogige Okpara Square dị n’Enugwu ịnabata Mbah.

    N’okwụ nnabata ya, Shettima kwuru na oge eruola mgbe ndi Igbo ga-abata ma soro n’ihe a na-eme site n'ịbanye na pati APC.

    “Obi dị m ụtọ na Gọvanọ Mbah esila na mbụlarị bata na pati ji azịza azapụ ihe ọjọọ” ka osote onyeisiala kwuru.

    Shettima gara n’ihu kwuo na ọ bụ pati APC ji ọkwa niile nwere isi n'obodo Naịjirịa, ma sị na ugbua ka ndị Enugwu ga-enweta oke ruuru ha n'Abuja.

    N’ozi ekele ya, Gọvanọ Peter Mbah kwuru na ya banyere APC iji wetara ndị Enugwu ọchịchị zuru oke.

    Onyeisi pati APC bụ Ọkammụta Nentawe Yilwatda nyefere Gọvanọ Peter Mban ọkọlọtọ pati APC nakwa azịza iji gosi na ha anabatala ya na pati ahụ.

    Gọvanọ chịburu Enugwu steeti bụ Sullivan Chime kelere ndị niile bịara ịnọnyere ha na nnukwu mmemme ahụ.

    Ndị Gọvanọ niile nọ na pati APC, ndị omeiwu ukwu na nke nta, nakwa ọtụtụ ndị nwere agba na pati ahụ bịara n’Enugwu ịnabata Gọvanọ Peter Mba na APC.

  10. Lee iwu ntuliaka ndị omeiwu Naịjirịa chọrọ ịgbanwe tupu ntuliaka 2027

    Ndị omeiwu na Naịjịrịa ewepụtara ọtụtụ ihe ha chọrọ igbanwe n'usoro ntuliaka tupu n'afọ 2027.

    Mgbawa ndị ahu gunyere ka eme ntuliaka Onyeisiala na Gọvanọ na abalị 185 tupuu ọnwa Mee abalị iri abụọ na itoolu nke afọ 2027. Nke a pụtara na e nwereike ime ya na Nọvamba 2026.

    Ndị omeiwu chọrọ ka ụlọdikpe nwee ohere ikpecha ikpe gbasara ntuliaka tupuu ndị ọchịchị abanye n’ọkwa.

    Ha chọrọ ka Permanent Voter Card (PVC) hara ịbụ naanị ihe onye tozuru ịtụ vootu ga-eji tụọ vootu. Ha chọrọ ka onye ahụ nweike iji akwụkwọ njiri mara Naịjirịa, akwụkwọ ndeba aha n’obodo bụ National Identification Number (NIN) nakwa asambodo mgbe a mụrụ mmadụ nwere tụọ vootu

    Ha chọrọ ka ọ bụrụ iwuriri na igwe eletrọnịk na ide n’akwụkwọ nkịtị bụrụ ụzọ e si edekọ ma na-eziga mpụtara na ntuliaka. Ha chọrọ ka ndị nhazị ntuliaka na-eji eletrọnịk na-eziga mpụtara na ntuliaka bido n’ebe a tụrụ vootu ruo n’ebe a ga-akpọpụta ya.

    Ha na-achọ ntaramahụhụ dịala ndị ụlọọrụ nhazị ntuliaka ọbụla kesere akwụkwọ vootu na akwụkwọ ndekọ mpụtara nke e binyeghị aka n’ime maọbụ nke ekwesighị. Onye ahụ ga-eje nga opekatampe out afọ maọbụ kwụọ ụgwọ otu ijeri naịra maọbụ mee ha abụọ.

  11. Ndị ngagharịiwe emechiela ụlọọrụ EEDC nọ n’Ụmụahịa maka oke ụgwọ ọkụ latrik

    Ndị ngagharịiwe emechiela ụlọọrụ Enugu Electricity Distribution Company (EEDC) dị na okporoụzọ Bende n'isi obodo Ụmụahịa maka oke ụgwọ ọkụ latrịk ndị mmadụ na-akwụ na steeti ahụ.

    E kwuru na iwe ndị ngagharịiwe ahụ bụ maka na ụgwọ ọkụ ụlọọrụ ahụ na-enye ha ugbua dị elu n’agbanyeghị ụfọdụ mgbenwe ụlọọrụ EEDC mere.

    Onyeisi ụlọọrụ ahụ n’Abịa Steeti bụ Festus Iwuala kwere ndị na-eme ngagharịiwe ahụ nkwa na ha ga-etinye anya na mkpesa ha wetere ya.

    Ọ gara n'ihu kwuo na ndị na-eme ngagharịiwe ahụ bụ ndị mere ngagharịiwe afọ gara aga maka ha anaghị enwe ọkụ latrik etu ha kwesịrị mana ugbua e bidoro inye ha ọkụ ọfụma, ha na eti mkpu na ụgwọ ọkụ na-arị elu.

    Iwuala kọwaara na ụgwọ ọkụ gbagoro elụ bụ n’ihi ọkụ a na-enye ndị nọ na tarifu band A.

  12. Gọvanọ Enugwu Steeti apụọla na PDP ma banye APC

    Gọvanọ Enugwu Steeti agbaala otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị People's Democratic Party (PDP) arụkwaghịm ma banye otu pati All Progressives Congress (APC) nọ n'ọchịchị ugbua.

    O kwupụtara nke a n'agbasa ozi o nyere ndị Enugwu ma kwuo na mkpebie ya ịbanye pati APC bụ iji jikọta steeti ndị nọ na mpaghara ọwụwa anyanwụ Naịjirịa na Gọọmenti Etiti.

    O kelere patị PDP maka oghere na nkwado ha nyere ya kemgbe ọ batara pati ahụ.

    Ndị so Mbah banye pati APC gụnyere ndị otu ọgbakọ omeiwu nke gọọmenti etiti, ndị otu ọgbakọ omeiwu steeti, ndị isi ọchịchị steeti, ndị isi ọchịchị obodo na ndị kansụl niile, ndị ndọrọndọrọ ọchịchị niile na ihe karịrị pasent iri asatọ nke ndị isi pati.

  13. Ezinụlọ ndị Izrel eji eji nwụrụ anwụ ji iwe eche nlọghachi ozu ndị nke ha

    Odobeghị anya ihe ọzọ ga-eme na Gaza ugbua dịka ezinụlọ ndị Izrel eji eji nwụrụ anwụ ji iwe na-eche nloghachi ozu ndị nke ha.

    Nke a na-abịa dịka nkwekọrịta nkwụsị ọgụ kpalitere ntọhapụ ndị Izrel mmadụ iri abụọ dị ndụ na ọtụtụ narị ndị mkpọrọ Palestine ma mee ka ha zute ndị ezinụlọ ha.

    Ka ọ dị ugbua, ezinụlọ ndị Izrel nwụrụ anwụ na-ekwupụtala n’iwe na e nyefere ozu naanị mmadụ anọ n'oge mgbanwe ahụ n'ime mmadụ iri abụọ na asatọ ndị nwụrụ anwụ.

    Mana nkwekọrịta nkwụsị ọgụ nke ndị mgbasa ozi Izrel wepụtara, na-egusi na e nwereike ndị Hamas na ndị otu Palestine ndị ọzọ agaghị enwe ike ịchọta ebe ụfọdụ ozu nọ n’ime oge e enyere ha.

    Ka ndị a tọhapụrụ n'Izrel na-enwe nnyocha ahụike, ụlọọrụ mgbasa ozi Izrel na-ekwu maka oke ahụhụ ha nwere nke gụnyere agụụ na mmekpa ahụ.

    Na Gaza, ọtụtụ n'ime narị ndị Palestine ndị Izrel tọhapụrụ n'enweghị ebubo n'oge agha ahụ, na-ebo ebubo mmekpa ahụ na mmegbu; ụfọdụ ndị a na-atụ anya na ha ga-ezute ezinaụlọ ha ka a chọpụtara na egbuola.

    Ọzọ, Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump na ndị isi mpaghara ahụ bịanyere aka n’akwụkwọ iji kwado nkwekọrịta nkwụsị ọgụ Gaza ya - ọ laghachitela na Washington DC.

  14. Onyeisiala mba Madagaska agbaala ọsọ ga zoo na-eti mkpu mgbanwe ọchịchị

    Onyeisiala mba Madagaska bụ Andry Rajoelina agbagaala “ebe ọ ga-enwe nchekwa” ka a wachara igbu ya dịka e bidoro ngagharịiwe na mba ahụ ma na-akpọ oku ka ọ rituo n’ọkwa.

    N’ozi Rajoelina ji akara ya na Facebook gbasaa ka ọ sị na “ndịagha na ndị ndọrọndọrọ ọchịchị gbara mbọ ka ha gbuo m”.

    O gara n’ihu kwuo na ọ bụ eziokwu na ya ji ụgbọelu ndịagha mba Fransị gbapụ na mba ya, mana o kwughị ebe ọ gbagala.

    Nsogbu Rajoelina bidoro dịka ụmụ ntorobịa kpọrọ onwe ha “Gen-Z Mada” bidoro ime ngagharịiwe na-akpọ oku ka ọ pụọ n’ọchịchị.

  15. Ndị be anyị, ụnụ asaala chi!

    Nnọọ n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Tuzde 14 Ọktoba 2025.

    Anyị na-asị ka ihe ọbụla anyị tinyere aka n’ụbọchị taa gaa nke ọma.

    Biko, gaa n’ihu sonyere anyị dịka anyị na-ewetere gị akụkọ ihe na-eme na Naịjirịa nakwa ụwa niile.

    Sonyekwara anyị n'akara soshal midịa anyị dị iche iche nke gụnyere WhatsApp Chanelụ, Facebook na Instagram maka akụkọ ndị ọzọ dị n'ụdị onyonyoo na foto.

    Daalụ!

  16. ASUU: Ndị nkụzi mahadum Naịjirịa amalitela abụbụọrụ

    Otu jikọtara ndị nkuzi mahadum ọha na Naịjirịa bụ Academic Staff Union of Universities (ASUU) amalitela ịgba abụbụọrụ ịdọ aka na ntị izuụka abụọ site n’ụbọchị Mọnde 13 Ọktoba 2025.

    ASUU kwuru na nke a bụ maka na gọọmentị emezughị ihe ha chọrọ kemgbe ogologo oge.

    Nke a na-abịa dịka o mere naanị izu ole na ole mahadum maliteghachiri maka oge agụmakwụkwọ ọhụrụ.

    Onyeisi otu ASUU bụ Ọkankụzi Chris Piwuna, kwuru na nke a abụrụla ihe a na-apụghị izere ezere n’ihi na dịka o si kwuo, gọọmentị emeghị ihe ọbụla maka ya.

    "O nweghị ihe zuru ezu a pụrụ iji kwụsị abụbụọrụ ịdọ aka na ntị izu abụọ bụ nke ga-ejedebe na mkpụrụ ụbọchị iri na anọ e nyere bụ 27 Ọktoba 2025.

    N'ihi ya, ngalaba ụlọọrụ ASUU niile ga-ewepụ aka n’ọrụ site n’etiti abalị Mọnde 13 Ọktoba 2025,"

    N’aka nke ọzọ, Mịnịstrị na-ahụ maka agụmaakwụkwọ ekwuola na abụbụọrụ ahụ abaghị uru n’ihi na gọọmenti emezuola ọchịchọ ASUU niile.

    Minista na-ahụ maka agụmaakwụkwọ na Naịjirịa bụ Tunji Alausa kwupụtara nke a n’ụbọchị Mọnde 13 Ọktoba 2025 oge ya na ndị ntaakụkọ na-akparịta ụka n’ụlọmgbasaozi Channels TV.

    N’oge gara aga ka mịnịstrị ahụ kwuru na ‘onye rụọ ya erie’ ka bụ iwu na-achịkọta usoro ndị ọrụ Naịjirịa.

  17. Mali amanyela $10,000 maka ụmụafọ Amerịka na-achọ inweta akwụkwọ njem visa

    Mba Mali ekwuola na ụmụafọ mba Amerịka na-achọ akwụkwọ njem visa mba ha ga-akwụ ụgwọ nkwụghachi ruru $10,000 (£7,500) maka inwete visa azụmahịa na njem nlegharịanya, n'ihi ihe yiri nke ahụ ọchịchị Onyeisiala Trump nyere iwu ịmanye n’isi ụmụafọ Mali.

    Na nzaghachi, ụlọọrụ nnọchianya mba Amerịka dị na Mali kwuru na Fraịde na ha manyere ego ahụ iji mee ka Washington sikwuo ike " n’ọrụ chekwaa okeala Amerịka na ọnọdụ nchekwa mba Amerịka".

    Cheta na mịnịstrị na-ahụ maka mba ofesi nke Mali kwuru na Sọnde na ejikọrọ aka tinye ụgwọ nkwụghachi ahụ, ma kpebie "ịwepụta usoro visa yiri ya" maka ụmụafọ Amerịka.

    Mgbanwe usoro inwete visa a na-abịa n'agbanyeghị mbọ iji mezie ọnọdụ mmekọrịta mba ụwa dị n'etiti mba abụọ ahụ.

  18. Mmadụ asaa mbụ a tọhapụrụ na Gaza alọghachitala n'Izrel - IDF

    Ndị IDF ekwuola na a tọhapụla ndị Izrel mmadụ asaa eji eji na Gaza dịka ha na ndịagha Izrel nọ ugbua.

    E kwuru na ndị mmadụ tiri oke mkpu ọṅụ n’ogige ‘Hostages Square’ ka akụkọ banyere ntọhapụ ahụ pụtara ihe dịka Alice Cuddy si Tel Aviv siri kwuo.

    Ka ọ dị ugbua, Hamas ewepụtala ndekọ nke ndị mmadụ iri abụọ dị ndụ a ga-atọhapụ taa.

    Cheta na e jidere ha na Gaza kemgbe ndị Hamas wakporo Izrel na 7 Ọktọba n’afọ 2023.

    Iji mgbanwee ndị eji eji, Izrel ga-atọhapụ ndị mkpọrọ Palestine mmadụ narị abụọ na iri ise na ihe karịrị otu puku na narị assa ndị eji eji.

    E kwuru na a na-atụ anya onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump na mba Izrel n’oge na-adịghị anya – tupu ọ gawa mba Ijipt isonye n’ọgbakọ ndị isi mba ụwa mmadụ iri abụọ ga-esonye na ya.

    Ka ọ na-aga na mpaghara ahụ, Onyeisiala Trump kwupụtara na "agha agwụla" na Gaza - ọ bụ ezie na a ka ga-enwe mkparịtaụka banyere nkwekọrịta Izrel na Hamas.

  19. Igbo ndị ọma, ụtụtụ ọma ụnụ!

    Nnọọ n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Mọnde 13 Ọktoba 2025.

    Ekpere anyị bụ na izu a ga-amara anyị niile mma.

    Gaa n’ihu sonyere anyị dịka anyị na-ewetere gị akụkọ ihe na-eme na Naịjirịa nakwa ụwa niile.

    Sonyekwara anyị n'akara soshal midịa anyị dị iche iche nke gụnyere WhatsApp Chanelụ, Facebook na Instagram maka akụkọ ndị ọzọ dị n'ụdị onyonyoo na foto.

    Udo dịrị ụnụ!

  20. A na-achọ iweghara ọchịchị n'ụzọ iwu na-akwadoghị na mba Madagaska - Andry Rajoelina

    Ụlọọrụ Onyeisiala mba Madagaska bụ Andry Rajoelina ekwuola na e nwere ndị na-achọ iweghara ọchịchị mba ahụ n’ụzọ iwu obodo na-akwadoghị maọbụ n’aka ike.

    Ka ọ na-ekwucha ya ka ngalaba ụlọọrụ ndịagha na mba Madagaska a na-akpọ CAPSAT mara ọkwa kwuo na ha enwerela ikike nhazị ndịagha na mba ahụ ma n’elu ala, na ikuku ma na mmiri.

    CAPSAT bụ ngalaba ụlọọrụ ndịagha so nyereaka mee ka Rajoelina banye n’ọchịchị n’afọ 2009 n’oge ha nwere ọgbaaghara ndọrọndọrọ ọchịchị Malagasy

    Ngagharịiwe maka oke agụụ, enweghị ọrụ, mpụ na nrụrụaka nakwa etu ọnụahịa ihe nri si arị elu bidoro na Madagaska na Sepụtemba 25.

    Dịka Rajoelina na-akatọ ihe ndị CAPSAT mere ma kọwaa ya dịka atụmatụ itisa mba ahụ, ndị CAPSAT kwuru na ha ewepụtara Onyeisi ọrụ ọhụrụ aha ya bụ ọchịagha Demosthene Pikulas.

    Ndị na-eme ngagharịiwe gwara BBC na ha ga-akwụsị naanị mgbe Onyeisiala Rajoelina gbara arụkwaghịm ma rituo n'ọkwa.