Aka ndị
nche obodo Ụmụleri akparala mmadụ ise a na-enyo enyo na ha na-ere anụ nwụrụ anwụ
ejiri chụọ aja na mmiri Omambala dị n’Anambra steeti.
Ya bụ ihe
mere oge ndị nche obodo Umudiana Ụmụleri jidere mmadụ ise na be ha, bụ ndị na-esi
nri ma na-erekwa anụ ndụ.
E kwuru na ndị ahụ ji ụgbọala keke na bọọsụ buru anụ ehi, anụ ọkụkọ, nakwa anụ ewu nwụrụ
anwụ nke ụfọdụ n’ime ha maliterela ire ere.
Ka e siri
kwuo, ndị nche obodo jidere ha n’ihi na anụ ndị ahụ n’ebutezi ijiji.
Ka a gbara
ha ajụjụ ọnụ, ndị ahụ kwuru na ọ bụ na mmiri Omambala, ebe a na-achụ aja dị
iche iche ka ha butere ụfọdụ anụ ndị ahụ.
Ha gara
n’ihu kwuo na ọ bụ Ọnịcha ka ha bu anụ ahụ aga, ebe ha ga-eresị ya ndị na-ere
anụ ndụ nakwa ndị na-esi nri ahịa.
E kwuru na
aha ndị ahụ a na-enyo enyo gụnyere Uchenna Onwurah dị afọ iri abụọ na ise,
Chibogu Ogechi dị afọ iri abụọ na ise, Obalim Chukwujekwu dị afọ iri abụọ na
ise, Onyemaechi chukwuemeka dị afọ iri abụọ na asaa, nakwa Onyibo John dị afọ
iri abụọ na asaa.
E kwuru na
anụ ndị e nwetere n’aka ha gụnyere ehi, ewu na ọkụkọ.
Ndị nche ahụ ji
ohere ahụ yọọ ndị mmadụ ka ha nnyochaa anụ ọbụla ha chọrọ iri maka na mmadụ
nwereike isi n’anụ ahụ adịghị mma bute ọrịa.