You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Samia Suluhu Hassan emeriela ntuliaka Onyeisiala mba Tanzania

Nchịkọta akụkọ niile si na mbaụwa niile

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Uzoamaka Ewuzie, Ikechukwu Kalu, Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Michael Ilediagu, Adline Okere, Marvelous Obomanu

  1. Ndịagha Naịjirịa agọọla na ha enweghi atụmatụ iweghara ọchịchị n'ike

    Ndịagha Naịjirịa ekwuola na ọ bụghị eziokwu na o nwere ndị otu ha chọrọ iwere ọchịchị n’ike.

    Nke a na-abịa dịka kepu kepu na-ekwu na a nwuchiri ndịagha mmadụ iri na isii maka ebubo na-akpa nkata ịkpachi ọchịchị n’ike.

    Ọtụtụ ụlọọrụ ntaakụkọ kwuru na ọ bụ n’ihi nke a mere na e meghi ngagharị ngosi ndịagha iji cheta afọ iri isii na ise Naịjirịa nweere onwe ya site n’aka mba Briten. Akụkọ kwuru na a nwuchiri ndịagha mmadụ iri na isii maka na ha chọrọ igbu Onyeisiala na ndị ọzọ ọkwa ha dị elu na Naịjirịa ma nara ọchịchị n’ike.

    Mana ozi ọnụ na-ekwuru ndịagha bụ Ọchịagha Tukur Gusau wepụtara kwuru na nke ahụ bụ asị ọcha. “Akụkọ ahụ bụ asị ọcha bụ nke ndị wepụtara chọrọ itinye ọgbaghara n’obodo nakwa n’etiti ndị mmadụ,” ka ozi ahụ kwuru.

    Ọ gara n’ihu kwuo na ihe mere e jiri kagbuo ngagharị ngosi ndịagha na ncheta ụbọchị mnwereonwe ahụ bụ ka Onyeisiala nwee ohere izute ndị mmadụ n’ofesi nakwa ka ndịagha nwee ike ilekwasị anya n’agha ha na-ebu megide iyi ndụ egwu.

    Ọchịagha Gasau kwuru na nnyocha a na-eme maka ndịagha mmadụ iri na isii ahụ a nwụchiri bụ ihe dị n’usoro ha ji arụ ọrụ iji hụụ na nrubeisi na agwa dị mma dị n’etiti ndịagha. “E hiwe ndị ga-eme nnyocha banyere nke a, ihe ọbụla ha chọrọ a ga-eme ka ọ pụta ihe.”

    Ọ gara n’ihu kwuo na ndịagha Naịjirịa nwere ntụkwasị obi n’ebe ọchịchị onye kwuo uche ya nọ na o nweghi atụmatụ iwere ọchịchị n’ike.

    Kamgbe Naịjirịa nweere onwe ya n’afọ 1960 enweela ọtụtụ nnapụ ọchịchị n’ike nke ndịagha malite n’agba afọ 1966 ruo 1999 mgbe ọchịchị onye kwuo uche lọghachịrị rute ugbua.

  2. Ndị uweojii sị ha ejidela ndị gburu Onye Eze n'Oguta Imo Steeti

    Ngalaba ndị uweojii na-ebuagha megide ntọrị mmadụ n’Imo Steeti achọpụtala ndị gburu onye Eze ọdịnala nke obodo Obudi Agwa dị n’Oguta nke Imo Steeti bụ Igwe Ignatius Asor na ndị ọzọ n’ọtụtụ mwakpo ha mere na steeti ahụ.

    Ụlọọrụ Channels TV kwuru na nke a dị n’akwụkwọ nnyocha Oladimeji Odeyeyiwa bụ osote Kọmishọna ma bụrụkwa onyeisi ngalaba ndị uweojii ahụ degaara Kọmishọna ndị uweojii.

    Akwụkwọ ahụ kwuru na a nwuchiri mmadụ isii bụ ndị aka ha dị n’ogbugbu ahụ nke gụnyere; Milletus Ihueze (e ji Egede mara), Magnus Ejiogu (e ji Emu mara), Paschal Ibuaku, Uzoechi Okechukwu, Mgbojisor Odunze, na Iwuji Chima Bright.

    Nnyocha gosiri na ndị ojiegbe e cheere bụ ndị otu IPOB/ESN nke onye ndu ha bụ Uzondu Nneji gburu onye Eze ahụ n’ụbọchị 14 Nọvemba afọ 2022 n’obi ọchịchị ya.

    Ozi si n’akwụkwọ kwuru na ndị kwadoro nke a bụ Ihueze na Ejiogu, bụ ndị a sị kwụrụ ndị ojiegbe ahụ ego dị nde naịra anọ nakwa otu nde naịra maka ogbugbu ndị a.

    Ndị a a na-enyo enyo gbara ama na ọ bụ ha kpara arụ a n’ihi esemokwu metụtara okeala.

    Nnyocha a gara n’ihu kwuo na ndị ojiegbe a gburu ọtụtụ ndị mmadụ n’agbata afọ 2022 ruo 2025 , nke gụnyere ndị uweojii isii na-arụ ọrụ ụlọ uweojii dị n’Agwa, ndị ọcha abụọ na ọtụtụ ndị ọzọ n’Oguta na gburu gburu ya.

    Ndị a ọzọ e ji eji gụnyer; Ibuaku, Okechukwu, Odunze, na Bright, kwuru na ha bụ ndị otu IPOB/ESN, ụfọdụ ha ka a hụrụ n’ihe onyonyo ka ha na-akpa ike.

    Akwụkwọ ahụ kwuru na Uzondu Nneji, onye si n’ụlọmkpọrọ Owerri gbaa ọsọ n’ụbọchị 5 Eprelụ, 2021 bụ onyendu ndị ESN n’Agwa.

    Ndị uweojii kwuru na ọ haziri ọtụtụ mwakpo dị iche iche n’Imo steeti tupu ọ gbaa ọsọ, na ha na-agba mbọ inwuchi ya.

  3. Agaghị m azọsa Tinubu ọkwa Onyeisiala - Nyesom Wike

    Mịnịsta isiobodo Naịjirịa bụ Nyesom Wike agọnarịla akụkọ kwuru na ọ chọrọ ịzọ ọkwa onyeisiala, ma kwuo na ebumnobi ya bụ ịkwado Onyeisiala Bola Tinubu ka o merie ọzọ.

    Kepukepu malitere ifegharị na ụfọdụ ndị ndu pati PDP kpọkuru Wike ka ọ bịa zọọ ọkwa onyeisiala dịka ntuliaka afọ 2027 na-abịa nso.

    N’ozi ọnụ na-ekwuru ya bụ Lere Olayinka, nke ụlọọrụ Channels TV wepụtara kwuru na “nke a bụ akụkọ ụgha nke ndị na-enweghi aka ọrụ.”

    “Mịnịsta ekwuola ya ugboro ugboro na ọ na-akwado Onyeisiala Tinubu n’afọ 2027.”

    “Onye ọbụla maara na Wike anaghị ezo ihe ọbụla, ọ na-ekwupụta ihe niile ọ chọrọ ime, na-emekwa ya n’ihu ọha,” ka o kwuru.

    Olayinka kwuru na nzuko Wike na ndị ndu PDP mere n’ọnwa Ọgọstụ bụ mkparịtaụka ya na ndị ndu pati ahụ si na mpaghara ndịda bụ nke e nyere ndị ntaakụkọ mpụtara mkparịtaụka ahụ.

  4. Mahadum Ebonyi State University achụọla ụmụakwụkwọ atọ n'ihi ibu egbe

    Onyeisi ụlọọrụ mahadum Ebonyi steeti ọkammuta Michael Awoke achụpụla ụmụakwụkwọ atọ maka ịnwe egbe n'ụzọ iwu na-akwadoghị.

    Awoke onye kwupụtara nkea mgbe ọ na-anabata ndị ndụ otu ọchịchị ụmụakwụkwọ mahadum ‘student union government’ kwuru na nchụpụ ahụ bụ iji dọọ ụmụakwụkwọ aka na ntị na otu ndị ozuzo abughị ihe mahadum ga-anabata.

    Ọ gara n’ihu dọọ ụmụakwụlwọ aka na ntị na ụlọakwụkwọ agahị anabata ndị ọ bụla aka ha soo na ịme mpụ ụle, iji ngwa agha ọgụ nke iwu na-akwadoghị nakwa ndị otu na-eyi ụmụakwụkwọ egwu akpọrọ ‘secret cult’

    Awoke si na ọkpọnyele ha na-aka ndị uweojii ebe a ga-akpọrọ ha ga ụlọikpe.

    Aha ndị achụpụrụ n’ụlọakwụkwọ mahadum Ebonyi bụ Azubuike Lawrence onye na-agụ Sayensị ụlọ nyocha ahụike (Medical Laboratory Science), Enyinnaya Ibe Kenneth onye na-agụ ka esi ese ụlọ (Archictecture) nakwa Njoku Joshua sayensi ụmụ anụmanụ (Animal Science).

    E jidere ha mgbe ndị otu ọchịchị ụmụakwụkwọ mahadum student union government, na-eme ntuliaka ebe ha gbara egbe iji manye ụmụakwụkwọ n’ujọọ ma chọrọ igbu onye na-elekọta ihe gbasara ọdimma ụmụakwụkwọ (Dean student affairs).

  5. Mmadụ atọ anwụọla dịka a na-akwa Raila Odinga na Kenya

    Opekata mpe mmadụ atọ anwụọla dịka a na-eme mmemme akwamozi Onye bụbụ Praim Minista mba Kenya bụ Raila Odinga.

    Ụlọọrụ ebere 'Médecins Sans Frontières' gbara ama na mmadụ abụọ nwụrụ dịka ndị mmadụ na-apụta n’igwe ịbịa lere ozu Odinga,

    Médecins Sans Frontières kọwara na ha nwetara mkpesa ma nnyocha mmadụ ruru otu nari na iri isii na atọ ebe ndị ụlọọrụ ha nọ n' ama egwuregwu ndị merụrụ ahụ.

    Cheta na n’ụbọchị Tọzde mgbe e bu ozu Raila Odinga bụbụ Praim Minista mba Kenya si India abata n'ala ha, mmadụ atọ nwụrụ dịka ndị uweojii gbara anwụrụ anyammiri iji kposaa igwe ndị mmadụ bịara n' ụdọugbọelu ịnabata ahụ ya.

    Akwa rịrị ibe ya elu n'oliliozu Odinga, onye a ma dịka 'nna ọchịchị onyekwuouche ya na Kenya, dịka igwe mmadụ gbakọrọ na Nairobi inye ya nsọpụrụ ikpeazu.

    Ọtụtụ n’ime ha yi uwe esere foto Raila Odinga n’ihu ya ma jiri okooko osisi dịka ha nọ na-ebe akwa ma na-agụ egwu mwute n' ama egwuregwu Nyayo.

    Onyeisiala Kenya bụ William Ruto gwara ndị gbakọrọ na-eru uju na Railo Odinga bụ onye ọrụ ọma ya metụtara ebe niile.

  6. Mba Liberia na-achọ inyocha ụmụakwụkwọ maka ọgwụ ike

    Ministri na-ahụ maka agụmakwụkwọ na mba Liberia egbochiela atụmatụ itinye iwu ka a na-enyocha ụmụakwụkwọ maka ọgwụ ike.

    Onye ndu ụlọọrụ na-ahụ maka nnyocha na mgbochi ọgwụ ike ‘Liberia Drug Enforcement Agency’ Fitzgerald Biago kwupụtara na ha chọrọ nnyocha ụmụakwụkwọ iji gbochie nsogbu iji ọgwụ ike eme ihe iwu na-akwadoghị.

    Afọ gara aga, Onyeisiala Liberia Joseph Boakai kwuputara nsogbu ọgwụ ike dịka ihe mberede mba mgbe nnyocha otu si Yurop mere gosiri na otu n’ime mmadụ ise ndị ntorobia Liberia na-aṅụ ọgwụ ike.

    Ministri agụmakwụkwọ si na ha amaghị maka atụmatụ nnyocha ụmụakwụkwọ ma kọwa na ọ dika atụmatụ a kwesịrị inwe ezigbo akaebe na ụmụakwụwkọ na-aṅụ ọgwụ ike.

  7. Zelensky gbaa aka laa n'arịrịọ ka Trump bunye Yukren ogbunigwe 'tomahawk' oge ha zutere

    Onyeisiala mba amerịka Donald Trump agwala onye ogbo ya na Yukren bụ Volodymyr Zelensky na ọ dighị njikere inye ya ogbunigwe Tomahawk nke ọ na-atụ anya ya.

    Dịka ha nwechara nzukọ na Amerịka, Zelensky si na o nweghị ihe o nwere ikwu gbasara etu ihe si dapụta na mkparịtaụka ha maka n’Amerịka achọghị ka ọgwu ha na Rọshị gbawanye.

    N’agbanyeghị na Zelensky nwere okwukwe na ogbunigwe ahụ ga-enyere ya aka imebi ọtụtụ ihe ndị Rọshịa nwe, Trump si na Amerịka nwere mkpa i ji ogbunigwe ahụ echekwa onwe ha mana mkparịtauka gbasara ya ga-aga n’ihu.

    Zelensky kelere Trump maka mbọ ọ gbara maka nkwụsị ọgụ n’etiti Izrel na Hamas ma kwuo na o nwere olileanya na Trump nwere ike iji otu aka ahụ kwụsị agha dị n’etiti ha na Rọshịa.

  8. Ndị be anyị, ụnụ asaala chi!

    Nnọọ n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Satọde 18 Ọktoba 2025.

    Anyị na-asị ka ihe ọbụla anyị tinyere aka n’ụbọchị taa gaa nke ọma.

    Biko, gaa n’ihu sonyere anyị dịka anyị na-ewetere gị akụkọ ihe na-eme na Naịjirịa nakwa ụwa niile.

    Sonyekwara anyị n'akara soshal midịa anyị dị iche iche nke gụnyere WhatsApp Chanelụ, Facebook na Instagram maka akụkọ ndị ọzọ dị n'ụdị onyonyoo na foto.

    Daalụ!

  9. Gọọmenti Anambra steeti anwuchiela mmadụ atọ ji ụzọ aghụghọ ana ụtụ

    Ụlọọrụ Anambra State Internal Revenue Service (AIRS) anwuchiela mmadụ atọ ji ụzọ aghụghọ ana ụtụ n’Oye Uga dị n’okpuru ọchịchị Aguata na steeti ahụ.

    Oge ọ na-agba mmadụ atọ ahụ n’anwụ, Onyeisi otu pụrụiche na-ebu agha megide ndị iwu na-akwadoghị ịna ụtụ n’ụlọọrụ AIRS bụ Nathan Obikwelu kwuru na ndị ahụ a na-enyo enyo gụnyere ụmụnwoke abụọ na otu nwaanyị.

    Maazị Obikwelu kwuru na ha nwuchiri Ikechukwu Dim, Adibe Kosarachi na Patrick Umeudu oge ha na-anara ndị mmadụ ụtụ n’ụzọ iwu megidere.

    Obikwelu kpughere na ụfọdụ ndị a na-enyo enyo riri mbọmbọ oge ha hụrụ ndị ọrụ AIRS.

    Ọ dọrọ aka na ntị megide iji ụzọ aghụghọ anakọ ụtụ n’akụkụ Anambra steeti niile, ma kwuo na gọọmenti Chukwuma Soludo anabataghị ya chaa chaa.

  10. Enwere m olileanya na nzukọ anyị na Putin ga-akwụsị agha dị na Yukren - Trump

    Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump ekwuola na ya nwere olileanya na mkparịtaụka ya na onyeisiala mba Rọshịa bụ Vladmyr Putin ga-enwe na Budapest dị na mba Hungary ga-enye aka weta agha dị na Yukren n’isi njedebe.

    Praịm Minista mba Hungary bụ Viktor Orban kwuru na a malitela ikwado maka nzukọ ahụ dịka ya na Trump nwechara mkparịtaụka n’ekwentị.

    E mesịa n’ụbọchị Fraịde, Onyeisiala Trump ga-ezute onyeisiala mba Yukren bụ Volodymyr Zelensky n’obi ọchịchị White House.

    A tụrụ anya na ọ ga-akpọtụrụ Maazị Trump iji nabata mkpebi Amerịka ire ụfọdụ ogbunigwe mba ahụ ndị na-agate aka (nwereike iru Rọshịa).

    Onye ntaakụkọ BBC na mba Amerịka kwuru na Rọshịa nwereike ime ka Trump ghara iresi mba Yukren ngwaagha.

    Kremlin kwuru na Putin adọọla Trump aka na ntị na atụmatụ ahụ nwereike imejọ mmekọrịta dị n’etiti Rọshịa na Amerịka.

  11. E duola Kọnelụ Randrianirina iyi ọrụ dịka Onyeisiala Madagaska

    E duola Kọnelụl Michael Randrianirina n’ihu ọrụ dịka onyeisiala onye agha nke mba Madagaska.

    Ndị ntorobia mere ngagharịiwe na otụtụ ndị ọzọ gbakọrọ n' ụlọikpe nọ n' isiobodo Antananarivo ebe e mere emume a.

    Kọnelụichael Randrianirina yipụrụ uwe nchekwa ya ma yiri uwe nwa Bekee iji nnọchie Onyeisala Andry Rajoelina achụpụrụ n' ọche nyere ngagharịiwe ndị umuntorobia Madagaska mere.

    Onyeisioche ụlọikpe iwu Magaska katọrọ ndị kọwara n’ihe mere na mba ha bụ nchipu ndịagha ma kwuo n’ihe niile e mere sonyere iwu ndị Madagaska.

  12. Raila Odinga: Ọtụtụ ndị mmadụ agbakọla maka oliliozu onye bubu Praim Minista Kenya

    Igwe ndị mmadụ na-eru uju agbakọla n' amaegwuregwu isiobodo Kenya maka mmemme oliliozu Raila Odinga onye bubu Praịm minista mba ahụ.

    Ọtụtụ ndị mmadụ ji ọkọlọtọ mba Kenya na ihe akaebe ndị ọzọ ji foto na uwe esere ihu Odinga iji nye ya nsọpụrụ ikpeazu.

    Ndị nchekwa nọ ebe ahụ maka ichekwa ndị mmadụ n'ihi obere nsogbu e nwere ụbọchị Tọzde mgbe a bịara nlele ozu ya.

    Ihe ruru mmadụ atọ nwụrụ ka ndị uweojii gbara anwụrụ anyammiri iji nwere ike ibelata ọtụtụ ndị bịara na ụdọugbọelu ị nabata ozu Odinga mgbe ọ na-abata Kenya site na India ebe ọ nwụrụ.

    E buru ozu ya ga n'ụlọomeiwu ndị Kenya ka ndị nnọchiteanya nwe ohere lee ozu ya anya n’ụbọchị Fraịde.

    Odinga onye akpọrọ nna ọchịchị kwụọ uche ya na Kenya nwụrụ n’ụbọchị Wenezde dịka ọ gbachara afọ iri asatọ

  13. Zelensky ga-ezute Trump dịka Amerịka na-atule ma a ga-enye Yukren ogbunigwe

    Onyeisiala Yukren Volodymyr Zelensky ga-ezute Onyeisiala Amerịka Donald Trump na Washington na Fraịde 17 ọktoba dịka Trump na-atụle ma ọ ga-enye Yukren ogbunigwe 'Tomahawk'.

    Nzukọ ha na-abịa dịka Trump na Onyeisiala Rọshịa Vladimir Putin nwechara nzukọ ebe ha kwenyere ga-enwe nzukọ ihu na ihu.

    Cheta na Zelensky rịọrọ Amerịka ka ha nye Yukren ogbunigwe 'Tomahawk' oge gara aga.

  14. Ndị be anyị, ụnụ asaala chi!

    Nnọọ n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Fraịde 17 Ọktoba 2025, Ahịa Orie.

    Anyị na-asị ka ihe ọbụla anyị tinyere aka n’ụbọchị taa gaa nke ọma.

    Biko, gaa n’ihu sonyere anyị dịka anyị na-ewetere gị akụkọ ihe na-eme na Naịjirịa nakwa ụwa niile.

    Sonyekwara anyị n'akara soshal midịa anyị dị iche iche nke gụnyere WhatsApp Chanelụ, Facebook na Instagram maka akụkọ ndị ọzọ dị n'ụdị onyonyoo na foto.

    Daalụ!

  15. E meela ngagharịiwe megide oku a na-akpọ ka a tọhapụ Nnamdi Kanu

    Otu ụmụafọ Naịjirịa mere ngagharịiwe n'Abuja n'ụbọchị Tọzde 16 Ọktoba 2025.

    Ha jiri ngagharịiwe ahụ katọọ ọnọdụ enweghị nchekwa na-arị elu na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa.

    Ndị ahụ mere ngagharịiwe zukọtara n'ọnụụzọ ụlọomeiwu Naịjirịa ma buru mpempe akwụkwọ e dere ihe dị iche iche.

    Ụfọdụ mpempe akwụkwọ ahụ gosiri foto ndị e gburu egbu site mwakpo ndị ojiegbe na mpaghara South East.

    Ndị ahụ mere ngagharịiwe katọkwara ọtụtụ oku a na-akpọ ka a tọhapụ onye ndu otu Indigenous Peoples of Biafra (IPOB) bụ Nnamdi Kanu.

    Ha kpọkuru Onyeisiala Bola Tinubu na ụlọomeiwu Naịjirịa ka ha ghara ige ntị n'oku a na-akpọ ka ha kwụsị ikpe Nnamdi Kanu.

  16. Ụgbọala ‘Trailer’ dakwasịrị keke ma gbuo mmadụ atọ n’Onitsha

    Njinji jiri n’Onitsha mgbe ụgbọala ukwu ‘trailer’ dakwasịrị ọgbatumtum keke ma gbuo mmadụ atọ nọ n’ime ya n’otu ntabi anya.

    Nke a mere n’ihu ebe a na-ere mmanụ ụgbọala dị n’okporoụzọ si Onicha gawa Owerri n’ihe dịka elekere isii nke isi ụtụtụ.

    Otu onye hụrụ ka ihe a si mee kwuru na ụgbọala tanka ukwu ahụ chọrọ ịgbafe ebe olulu dị n’okporoụzọ ahụ ma daa dakwasị ọgbatumtum keke ahụ ma gbuo onye na-akwọ ya na mmadụ abụọ o bu.

    Otu onye nọ na-agafe n’ụzọ kwuru na otu n’ime ndị ahụ nwụrụ bụ nwanne yan woke. Mbọ ndị mmadụ gbara ka a zọpụta ndị a lara n’efu maka na ha nwụrụ tupu a na-ebuli tanka ahụ.

    Ndị bi na mpaghara ahụ arịọla gọọmentị ka ha biko bịa rụzie okporọụzọ ahụ maka na ọ bụ ọnya ọnwụ nyere ndị ọkwọụgbọala.

  17. Ndị uweojii mba Kenya agbaala ndị mmadụ anwụrụ anyammiri oge ha gbakọrọ ikiri ozu Praịm Minista ha nwụrụ anwụ

    Ndị uweojii mba Kenya agbaala ìgwè mmadụ anwụrụ anyammiri oge ha gbakọrọ n'ọgbọ egwuregwu maka ikiri ozu Praịm Minista mba ahụ n'oge ochie bụ Raila Odinga.

    Ọ bụ na mba Indịa ka Odinga nwụrụ, dịka e si mba ahụ bulata ozu ya na mba Kenya maka olili.

    Ndị uweojii gbakwara egbe mana o doghị anya ma ọ bụ ezigbo mgbọ ka ọ bụ mgbọ rọba ka ha gbapụrụ.

    Akụkọ kwuru na ọtụtụ mmadụ merụrụ ahụ n'ihi ọnọdụ ahụ, dịka ndị ọrụ nchekwa gbara mbọ ịchụsa ìgwè mmadụ ahụ.

    Ọtụtụ ndị na-eru uju buuru igu nkwụ pụta n'ụtụtụ Tọzde maka ịnabata ozu Odinga n'ọdọụgbọelu, bụ nke gbochiri njem ụgbọelu nwa obere oge.

  18. Ọkaikpe Omotosho enyela iwu banyere Nnamdi Kanu

    Ọkaikpe James Omotosho enyeela Nnamdi Kanu iwu ka ọ malite ịzọ isi onwe ya n'ụlọikpe bido Ọktọba 23, 2025.

    Omotosho kwuru nke a n'ụbọchị taa bụ Tọzde 16 ọktọba 2025 mgbe ọ na-enyocha mpụtara otu Nigerian Medical Association (NMA) mere maka ahụike Nnamdi Kanu.

  19. "Nye anyị obere oge ịchọta ọzu ndị Izrel anyị ji" otu Hamas

    Ndị otu Hamas ekwuola ka enye ha ohere ịchọta ozu ndị Izrel ha ji ka fọrọ dịka ha zitere ozu iri abụọ na asato na ndị dị ndụ mmadụ iri abụọ.

    Nke a na-abịa dịka ndị ndụmọdụ mba Amerịka kwuru na Hamas dị njikere ime ihe ndị ha kwekọrịtara ime maka nkwụsị ịkwa mgbọ.

    Ka ọ dị ugbua, Hamas zitere ozu abụọ na-abalị nke Izrel si aha ndị a ahụ bụ Muhammad al-Atarasha dị afọ iri atọ na itolu n'Inbar Hayman dị afọ iri abụọ na asaa.

  20. Ndị be anyị, ụnụ asaala chi!

    Nnọọ n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Tọsde 16 Ọktoba 2025.

    Anyị na-asị ka ihe ọbụla anyị tinyere aka n’ụbọchị taa gaa nke ọma.

    Biko, gaa n’ihu sonyere anyị dịka anyị na-ewetere gị akụkọ ihe na-eme na Naịjirịa nakwa ụwa niile.

    Sonyekwara anyị n'akara soshal midịa anyị dị iche iche nke gụnyere WhatsApp Chanelụ, Facebook na Instagram maka akụkọ ndị ọzọ dị n'ụdị onyonyoo na foto.

    Daalụ!