You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Samia Suluhu Hassan emeriela ntuliaka Onyeisiala mba Tanzania

Nchịkọta akụkọ niile si na mbaụwa niile

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Uzoamaka Ewuzie, Ikechukwu Kalu, Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Michael Ilediagu, Adline Okere, Marvelous Obomanu

  1. Ndị be anyị, ụtụtụ ọma ụnụ

    Nnọọ n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Fraịde 10 Ọktoba 2025.

    Anyị na-asị na ụkwụ ọjọọ agaghị akpọ onye ọbụla n’ụbọchị taa.

    Gaa n’ihu sonyere anyị dịka anyị na-ewetere gị akụkọ ihe na-eme na Naịjirịa nakwa ụwa niile.

    Sonyekwara anyị n'akara soshal midịa anyị dị iche iche nke gụnyere WhatsApp Chanelụ, Facebook na Instagram maka akụkọ ndị ọzọ dị na vidiyo na foto.

    Daalụ!

  2. Christopher Kolade anwụọla ka ọ gbachara afọ 93

    Nwaafọ Naịjirịa a ma ama bụ Christopher Kolade anwụọla ka ọ gbachara afọ iri itoolu na atọ.

    Nke a dị n’ozi ndị ezinaụlọ ya wepụtara n’ụbọchị Tọzde 9 Ọktoba, 2025.

    Ha kelere Chineke maka ezigbo ndụ nna ha biri n’ụwa nakwa ngọzi ya niile.

    Ozi ahụ kwuru na nwoke ahụ bụ odogwu na mgbasaozi nwụrụ n’udo n’ụbọchị Wenezde 8 Ọktoba, 2025.

    A mụrụ Maazị Kolade n’ụbọchị 28 Disemba, 1932 n’Erin-Oke dị n’Ọshụn steeti, dịka o tiri ịgba pụrụiche n’ọtụtụ ngalaba.

    Kolade rụrụ ọrụ dị iche iche ma mechaa bụrụ odogwu na mgbasaozi, nke o jiri ruo n’ọkwa Nnukwu Onyeisi ụlọmgbasaozi Nigerian Broadcasting Corporation (NBC).

    O mechara rụọ ọrụ dịka Nnukwu Onyeisi ụlọọrụ Cadbury Nigeria Plc ma jide ọkwa Nnukwu Onye Nnọchiteanya Naịjirịa na mba United Kingdom.

  3. Ụlọọmeiwu Abia steeti na-atule ịkwado iwu ga-ahazi ụgwọụlọ

    Iwu na-achọ ka gọọmenti tinye anya n. ego ndị nwe ụlọ obibi ma ọbụ ụlọahịa na-etinye n'a Abia steeti agafeela ọgụgụ nke abụọ n’Ụlọọmeiwu steeti ahụ.

    Osote onyeisioche Ụlọọmeiwu Abia steeti bụ Augustin Okezie bụ onye kwadoro akwụkwọ iwu a nke ọ chọrọ ka ọ bụrụ iwu.

    Dịka ndị otu ya n’ụlọọmeiwu kwadoro ya, e nyere kọmitii ụlọọmeiwu na-ahụ maka ala na ụlọ ka ọ kpọkọta ọha ka ha tinye ọnụ n' iwu a a chọrọ iwepụta ma laghachite n' izuka atọ nke na-abia.

  4. Nde ụmụ Naijiria 139 nọ n'ụbịam- World Bank

    Ụlọ ọbaego mbaụwa bụ ‘World Bank’ ekwuola na nde139 ụmụ Naịjirịa nọ n'ụbịam.

    Onye nduzi 'World Bank' na Naịjiria bụ Mathew Verghis jara gọọmenti Naịjirịa ike etu ha si na-eme ka akụnaụba guzosie ike mana o kwuru na ụfọdụ ndị amaala ka nọ na ntaramaahụhụ.

    Ọ si na ihe kachasi uru bụ ka Gọọmenti Naịjirịa gbanwe ọnọdụ ndụ ndị Naịjirịa ka ọ dị mma.

  5. Ebonyi etinyela mmadụ 29000 bu ọrịa HIV n'atụmatụ nleta ahụike n'efu

    Ngalaba na-ahụ maka nchekwa ahụike nke Ebonyi steeti bụ 'Ebonyi State Health Insurance Agency' (EBSHIA) ekwuola na ha amalitela ndebanye aha mmadụ 29,000 persons bu nje HIV (PLHIV) n'atụmatụ nchekwa ahụike bekee kpọrọ 'health insurance scheme' n'efu.

    Dịka Odeakwụkwọ Ukwu nke EBSHIA bụ Dkta Divine Okemefuna Igwe,si kwuo n'ọgbakọ otu jikọrọ ndị nwere ọrịa ahụ akpọrọ 'Network of People Living with HIV/AIDS in Nigeria' (NEPWAN) nwere n' Abakaliki, nke a bụ iji hụ na ndị nwere nsogbu ahụ na-enweta nletahụike zuru ezu.

    Ọ gara n'ihu kelee aka na-achị steeti ahụ bụ Gọvanọ Francis Ogbonna Nwifuru maka obi ọma ya n'ibinye aka na atụmatụ nleta ahụike n'efu maka ndị a nọ na nnukwu mkpa n'obodo.

    “Atụmatụ a na-egosi mkpebi anyị na o nweghị onye Ebonyi agaghị enweta nleta ahụike n'ihi enweghị ego."

    Ndị Ebonyi na-erite elele site na nkwado nke otu Global Fund Project Nakwa National Health Insurance Authority (NHIA) nakwa 'National Tuberculosis, Leprosy and Buruli Ulcer Control Programme' (NTBLCP), ebe ngalaba 'National Identity Management Commission' (NIMC) na-enyere ha aga ịhụ na-enwere ndebanye aha na-enweghị nsogbu ọbụla.

  6. Onyeisiala Madagascar arịọla ka umuntorobịa nye ya otu afọ ka o dozie nsogbu ndị ha kwupụtara

    Dịka ụbọchị ndị ntorobia nyere onyeisiala Madagascar Andry Rajoelina ka ọ gba arụkwaghịm bịara na njedebe, Rajoelina arịola ka ndị ntorobia na-eme ngagharịiwe nye ya otu afọ ka o dozie nsogbu ndị ha kwupụtara.

    Ọ gara n’ihu kwuo na ya bụrụ na o meghị ihe ọbụla tupu otu afọ agwu na ọ ga-agba arụkwaghịm.

    O kwuru nke a mgbe ọ na-eme mkparịtaụka ha na ndị otu ya na obi ọchịchị ya.

    N’agbanyeghị na onyeisiala kpọrọ ndị na-eme ngagharịiwe okwu ka ha nwe nzukọ ndị Gen Z jụrụ ị za okwu ahụ.

  7. Mba Izrel na Hamas ekwenyela na nkwekọrịta udo iji kwusi ọgụ

    Mba Izrel na Hamas ekwenyela na nkwekọrịta udo iji kwusi agha ha na ebuso onwe ha.

    Ụfọdụ ihe ndị ha kwenyere na nkwekọrịta ọhụrụ a bụ ka Izrel na Hamas tọhapụ ndị ha jidere oge ha na kwakọrịta mgbọ.

    Ihe ọzọ ha kwenyere bụ na ndịagha Izrel ga-ewezuga ndịagha ha.

    Onyeisiala Amerịka, Donald Trump, Praịm Minista Izrel Benjamin Netanyahu na Hamas si na nkwekọrịta a dị oke mkpa.

  8. Lee ihe Gọvanọ Fubara kwuru mgbe ọ gara leta ebe ọkụ gbara n’ụlọọrụ gọọmenti

    Gọvanọ na-achị Rịvas Steeti bụ Siminalayi Fubara akọwaala ọkụ ahụ gbara mpaghara ụlọọrụ gọọmenti dị na Pọtakọt dịka ihe ọdachi.

    Fubara nyere nkọwa ahụ mgbe ọ gara jiri anya ya abụọ hụta etu ọkụ si mebie ọtụtụ ihe n’ebe ahụ.

    N’okwu ya “a bịara m ka m jiri anya m hụta ihe mere. Ekenerere m Chukwu maka na mmadụ anwụghị na ya”.

    Fubara ji ohere ahụ kwuo na ya ga-eme ngwangwa ka e dozie ihe ọkụ mebiri.

    Mana etu ọnụdụ si dị tuipuu akụkọ a apụta, amabeghị ihe butere ọkụ ahụ maọbụ ego ele ihe o mebiri bụ.

  9. E kwesịrị inyocha asambodo ndị niile nọ n'ọchịchị Tinubu - Atiku

    Atiku Abubakara jibu aha Peoples Democratic Party PDP zọọ ọkwa Onyeisiala Naịjirịa akatọọla Onyeisiala Bola Tinubu maka inye ndị ọ sị ji asambodo adịgboroja ọkwa n’ọchịchị ya.

    Nke a na-abịa dịka Mịnịsta na-ahụ maka Sayensị na Tekịnụzụ bụ Uche Nnaji gbara arụkwaghịm n’ọrụ ya n’ihi ebubo iji asambodo mahadum adịgboroja nwete nhọpụta n’ọrụ mịnịsta.

    N’ozi o wepụtara n’akara soshal midia X, Atiku kwuru ka e nyochaa asambodo ndị niile na-arụ ọrụ n’obi ọchịchị Onyeisiala Tinubu nke gụnyere Tinubu n’onwe ya.

    Ọ gakwara n’ihu katọọ ụlọọrụ nchekwa DSS maka na ha emeghi nnyocha ọfụma banyere asambodo ndị a e nyere ọchịchị.

    O kwuru na ịgba arụkwaghịm n’ọrụ nke Mịnịsta Uche Nnaji n’ihi ebubo asambodo adịgboroja gosiri na ọchịchị Tinubu enweghi ezi ntọala.

    O kwuru na akụkụ banyere asambodo adịgboroja ahụ bụ imechu Naịjirịa niile ihu kama na ọchịchị a hụtara ya dịka na ọ kpara ezi agwa site n’ịgba arụkwaghịm n’ọrụ.

    O kwuru na e kwesịrị ịchụ Uche Nnaji n’ọrụ karịa ịhapụ ya ka ọ gbaa arụkwaghịm.

    Atiku gbakwụnyere na ụmụafọ Naịjirịa kwesịrị ịma nke bụ eziokwu banyere ndụ ndị na-achị ha.

  10. Onye agha Naịjirịa bụ Samson nwunye ya gbaraọkụ anwụọla

    Samson Haruna bụ onye agha Naịjirịa anwụọla n'aka nwunye ya mgbe ha na-enwe ọgbaaghara.

    Nwunye Samson bụ Retyit Obadiah Haruna munyere ọkụ n'ụlọ ha mgbe ha na-enwe nsogbu mana ọkụ ahụ metụtara ma gbuo Samson.

    Samson na-arụ ọrụ n’ụlọgwụ ndịagha a na-akpọ 'Regimental Medical Officer nke 6 Battalion'.

    Dịka ozi ndịagha Naịjirịa wepụtara nke Lawal Bala Muhammed binyere aka, ha sị na ọ bụ n’ụlọ Samson Haruna dị na Wellington Bassey Barracks, Ibagwa, Akwa Ibom Steeti ka nwunye ya bụ Retyit Haruna gbara ọkụ.

    Ha sị na mpamkpa ahụ kpara na Septemba 22, 2025 mana Haruna nwụrụ n’ụbọchị Tuzde, Oktoba 7, 2025.

    Ha ji ohere ahụ katọọ ọnọdụ ọgbaaghara n’etiti ezinaụlọ ọkachasị n'etiti di na nwunye ma gwa ezinaụlọ Haruna ndo dịka ha na-eche ka ndị uweojii ndịagha mechaa nnyocha banyere ihe mere.

  11. Ndịagha Amerịka awụjuola na Chicago maka ọrụ metụtara ndị mbịarambịara

    Narị kwuru narị ndịagha Amerịka si Texas awụchiela n'ogige ọzụzụ ndịagha dị na Chicago maka ịkwado atụmatụ Onyeisiala Donald Trump inye ndị akwụkwọ ha ezughị ezu ọsọ.

    Trump kpọrọ Chicago "ihu agha", dka ngagharịiwe megide ihe ndị ọrụ mbịara mbịara na ebe na mpaghara ahụ bụ nke atọ n'ebe ndị mepere emepe n'Amerịka kachasị nwee ọnụọgụgụ ndị mmadụ.

    Ndị ndọrọndọrọ ọchịchị anaghị n'ọchịchị akwadoghị Nziga e zigara ndị agha ebe ahụ.

    Gọvanọ na-achị Illinois bụ JB Pritzker boro Trump ebubo iji "aka ike" eso okwu mbịarambịara ma kwuo sị, " anyị ga-eji ihe ọbụla dị anyị n'aka ikwụsị akpamike ike a ".

    O nwere ndị gwara ụlọ ntaakụkọ 'CBS News' bụ ụlọntaakụkọ Amerịka ha na BBC na-arụkọ na ndịagha ahụ amalitela ọrụ e ziri ha n'ụzọụtụtụ Wenezde.

    Ndíagha (National Guard troops) enweghí ikike inwúchi mmadú maóbú inyocha maóbú chóó mmadú kama órú ha bú ichekwa ndí órú góómentí na ihe góómentí nwe.

    Trump ezigala ndíagha Los Angeles, Washington, DC, ma nyekwa ha iwu íba Memphis naPortland.

  12. Ndi uweojii mba ụwa anwụchiela nwoke Naịjirịa maka mpụ iji ịhụnanya aghọgbu ụmụnwaanyị

    Otu ndị uweojii na-ahụ maka mpụ na mba ụwa a kpọrọ International Criminal Police Organization (Interpol) ekwuola na ndị ọchịchị Argentina ejidela otu nwoke onye Naịjirịa maka mpụ iji ịhụnanya egwu ụmụnwaanyị chadum.

    E kwuru na nwoke ahụ aha ya bụ Ikechukwu N. bụ onye a na-enyo enyo n’ebubo ọtụtụ mpụ ịhụnanya aghụghọ nke metụtara puku kwuru puku ụmụnwaanyị, ya na idukwa otu ndị na-eji ịntanetị eme mpụ na mba ụwa.

    Ha kwuru na njide a sokwa n’ọrụ nke Operation Jackal, ọrụ ndị uweojii mba ụwa bụ nke gbadoro anya n'otu ndị omempụ ahaziri ahazi na mpaghara ndịda anyanwụ Afrịka.

    Ha gara n’ihu kwuo na ọ bụ nke mbụ Argentina na-ejide onye gbara ọsọ nke ndị uweojii mba ụwa rịọrọ otu mba ụwa ka ha nyereaka jide ‘Red Notice’ dịka ọ bụkwa onye mbụ a na-achụ n’ọrụ ịchọ ihe onwunwe ndị omempụ ‘Silver Notice’.

    Cheta na ọrụ ịchọ ihe onwunwe ndị omempụ nke Interpol malitere n’ọnwa Jenụwarị n’afọ 2025 iji nyere ọtụtụ mba aka ịchọta na nwetaghachi akụ na ihe onwunwe ndị omempụ.

  13. Onye nnọchianya mba Amerịka na ọgọ nwoke Trump ga-esonye na mkparịtaụka udo Gaza na Ijipt

    Onye nnọchianya mba Amerịka pụrụ iche bụ Steve Witkoff na ọgọ nwoke Onyeisiala Donald Trump bụ Jared Kushner ga-esonye na mkparịtaụka udo Gaza na-aga n'etiti ndị mkparitaụka Izrel na Hamas n’Ijipt na Wednezde.

    Ọbịbịa ha na-abịa dịka ụbọchị nke abụọ nke mkparịtaụka na-apụtaghị ihe ha nwere n’ụbọchị Tuezde kwụsịrị na-enweghị nkwekọrịta a na-ahụ anya, dịka otu onyeisi ọrụ Palestine maara maka mkparịtaụka ahụ nke ọma gwara BBC.

    Cheta na okwu Onyeisiala Trump nyere olilianya udo dịka ndị Izrel na-eme emume ncheta abụọ ndị Hamas wakporo ha na 7 Ọktoba.

    Onyeisiala Trump na-ekwu na "e nwereike inwe udo na mpaghara Etiti Ọwụwa Anyanwụ ‘Middle East’.

    N’aka nke ọzọ, Praịm Minista Izrel Benjamin Netanyahu ekwughị okwu banyere ọnọdụ mkparịtaụka ahụ, mana ọ gwara ndị Izrel na ha nọ n'oge inwe mkpebi siri ike.

  14. Ndị be anyị, ụtụtụ ọma ụnụ

    Nnọọ n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Wenezde 8 Ọktoba 2025.

    Anyị na-asị na ụkwụ ọjọọ agaghị akpọ onye ọbụla n’ụbọchị taa.

    Gaa n’ihu sonyere anyị dịka anyị na-ewetere gị akụkọ ihe na-eme na Naịjirịa nakwa ụwa niile.

    Sonyekwara anyị n'akara soshal midịa anyị dị iche iche nke gụnyere WhatsApp Chanelụ, Facebook na Instagram maka akụkọ ndị ọzọ dị na vidiyo na foto.

    Daalụ!

  15. Mahmood achịsala ọwa dịka Onyeisioche Inec

    Mahmood apịachiele akwụkwọ dịka onyeisioche ulọọrụ na ahazị ntuliaka na Naịjiria 'Independent Electoral Commission' INEC ma nyefee May Agbamuche-Mbu ọchịchị na-aka.

    Ọ nọro n'emume e mere n'isi ụlọọrụ Inec n'Abuja n'ụbọchị Tuzde 7 Ọktọba 2025, pịachie akwụkwọ dịka ọ nọchara afọ ịrị dịka onyeisioche ụlọọrụ ahụ.

    Ọ chịrị afọ ise ugboro abụọ site afọ 2015 ruo 2025. Agbamuche Mbu ga-anọ n'ọkwa ahụ nwa mgbe nta tupu onyeisiala Naịjiria a họpụta Onyeisioche Inec ọhụrụ.

    May Agbamuche-Mbu onye nwafọr Delta steeti bụ onye ọkaiwu ama ama nọrọla na-ọrụ iwu kemgbe afọ iri atọ

  16. Izrel na-eme ncheta afọ abụọ nke mwakpo ndị Hamas n’Ọktoba 7

    Praịm Minista UK arịọọla ụmụakwụkwọ ka ha ghara isonye na ngagharịiwe ndị na-akwado ndị Palestine dịka a na-eme ncheta afọ abụọ ndị Hamas wakporo Izrel n’Ọktoba 7.

    Keir Starmer kwuru na ọ gaghị adị mba Briten mma ma ọ bụrụ na ngagharị ahụ a haziri ahazi gaa n'ihu, na-agbakwụnye na ụfọdụ ejirila ya wakpoo “ndị Juu bụkwa ndị Briten."

    Ncheta na-abịa dịka mkparịtaụka na-aga n'etiti Izrel na Hamas n'Ijipt iji nweta nkwekọrịta nkwụsị agha Gaza.

    Ndị nnọchianya ha na Sharm El-Sheikh na-atụle atụmatụ udo nke Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump - nke Hamas kwenyere ụfọdụ mana ọ bụghị ọnọdụ niile.

    Ka ọ dị ugbu a, a na-eme mmemme afọ abụọ kemgbe Hamas wakporo Izrel na 7 Ọktoba 2023, bụ nke e gburu ihe dịka mmadụ otu puku na narị abụọ ma jide mmadụ narị abụọ na iri ise na otu ndị ọzọ.

    Na nzaghachi, ndịagha Izrel bidoro mwakpo na Gaza, nke gburu opekatampe mmadụ puku iri isii na asaa na otu narị na iri isii ebe ahụ, dịka ndị ọrụ ahụike Hamas siri kwuo.

    Cheta na ndị ojiegbe Hamas gburu ma tọrọ ọtụtụ ndị ọzọ n'ebe ha na-eme emume Nova Music Festival.

    Ka ncheta ahụ na-aga n’ihu, ezinụlọ ndị mmadụ nwụnahụrụ na ndị lanarịrịnụ na-agbakọta icheta ndị ihe metụtara.

  17. Ụtụtụ ọma, ụmụ Igbo anyị ji eme ọnụ

    Nnọọ n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Tuzde 7 Ọktoba 2025.

    Ekpere anyị bụ na taa ga-amịtara onye ọbụla mkpụrụ ọma.

    Gaa n’ihu sonyere anyị dịka anyị na-ewetere gị akụkọ ihe na-eme na Naịjirịa nakwa ụwa niile.

    Sonyekwara anyị n'akara soshal midịa anyị dị iche iche nke gụnyere WhatsApp Chanelụ, Facebook na Instagram maka akụkọ ndị ọzọ dị na vidiyo na foto.

    Ndewo!

  18. Janjaweed: Ụlọikpe mpụ mba ụwa amala onye ndu ndịagha Sudan ikpe maka mpụ agha n'oge agha Darfur

    Ụlọikpe mpụ mba ụwa ‘International Criminal Court’ amala onye ndu ndịagha ọlụọ ọla maka mpụ agha megide mmadu nke mere ihe karịrị afọ iri abụọ gara aga na mpaghara Darfur.

    Ali Muhammad Ali Abd-Al-Rahman onye nke e jikwa Ali Kushayb mara duru otu na-eyi ndị mmadụ egwu akpọrọ Janjaweed nke gọọmenti mgbe ahụ kwadoro wakporo obodo Darfur ma gbuo ọtụtụ mmadụ

    Mgbe a na-ekpe Ali Kushayb ikpe, ndị lanarịrịnụ oge ahụ kọwara etu esi gbaa obodo ha ọkụ, ka esi gbuo ọtụtụ ndị okenye na ụmụnotorobia nakwa etu esi manye ọtụtụ n’ohu mmekọahụ.

    Esemokwu ahụ bidoro afọ 2003 ruo afọ 2020 bụ nke amara dịka otu n'ime ọdachi ndị mmadụ kacha njọ n'ụwa.

    Mana ka afọ ise gachara mgbe esomokwu ahụ kwụshịrị obodo Darfur enwerebeghị onwe na agha obodo ka ndịagha Sudan na ndị otu ‘Rapid Support Forces’ ndị ekewapụtara na ndịagha Janjaweed ka na akwakọrịta mgbọ

  19. Gọvanọ Francis Nwifuru nke Ebonyi steeti amalitela ịkwụ ndị lara azumike nka ụgwọ (gratuity) ha

    Aka na-achi Ebonyi steeti bụ Gọvanọ Ogbonna Nwifuru amalitela ị kwụ ụgwọ ezumike nka (nke Bekee kpọrọ gratuity) nye mmadụ ruru pụkụ anọ na steeti ahụ ndị rụrụ ọrụ na ọchịchị ime obodo tupu ha laa ezumike nka.

    Dịka odeakwụkwọ ụlọorụ na-ahụ maka ezumike nke nke ọchịchị ime obodo Emeka Nwonwu si kwuo, "usoro ịkwụ ụgwọ ebidola site n'otu ọchịchị ime obodo gaa n'ọzọ"

    Ọ kọwara na etinyela usoro niile dị mkpa iji hụ na enweghị nsogbu ọbula.

    Kọmishọna na-ahụ maka mgbasozi Ikeuwa Omabe kwuru na gọvanọ Nwifuru nyere iwu ka a kwụọ ndị lara ezumike nka kemgbe afọ 1996 ruo ugbua ụgwọ ha.

    Ụfọdụ ndị ihe metụtara kelere gọvanọ Nwifuru maka ịmalite ịkwụ ha ụgwọ ezumike nka ma kọwa na-egọ ahụ ga-abara ha uru nke ọma dịka ha si na ọtụtụ n’ime ha na arịa ọrịa.

  20. Ọkụ agbaala ụlọọrụ gọọmentị Riva steeti

    Ọgbaghara na ụjọ nọ n’ikuku ụlọọrụ Riva steeti “Secretariat Complex” na mgbede taa bụ ụbọchị Mọnde 10 Ọktọba 2025 dịka ọkụ nọ na-agbapụta n’ime ụlọọrụ ahụ.

    Akụkọ kwuru na ndị ọrụ gbara ọsọ dịka mpaghara ‘Podium Block” ebe ụlọọrụ mịnịstri dị iche iche nọ na Riva steeti nọ malitere ịgba ọkụ.

    Onye isi ụlọoru gọọmenti Riva steeti Inyingi Brown si na nyocha ha mere gosiri na ọ bụ ọkụ eletrik nwere nsogbụ kpatara ọkụ ahụ gbara nụ.

    Ndị na-ahụ maka mgbanyụ ọkụ a biala ebe ahụ iji kwụsị ọkụ ahụ na-agba