Gọọmenti Enugwu akụtuola ụlọ ebe ndị ntọri ji eme ọnọdụ na Nkanu
Gọọmenti Enugwu akụtuola otu ụlọ n’obodo Umueze Awkunanaw dị n’okpuru ọchịchị Nkanu West dị n’Enugwu Steeti ebe a chọpụtara na ndị a na-enyo enyo na ha bụ ndị ntọri mmadụ ji eme ebe ha na edobe ndị ha tọọrọ.
Ha kwaturu ụlọ ahụ ụnyiahụ bụ Tuzde 21 Ọktoba dịka ndị nchekwa gara n’ime obodo ahụ were zọpụta onye eji eji n’ime ụlọ ahụ.
Dịka ozi gọọmenti wepụtara siri kọwaa, onyeisi ndị ntọrị ahụ bụ onye omekome Igwenagu Ogbodo bụ onye ya ndị otu ya ji ya bụ ụlọ mere isi oche.
Onyeisioche okpuru ọchịchị Nkanu West bụ Maazị John Ogbodo gwara ndị nta akụkọ na onye ntọri Igwenagu na ndị otu ya tọọrọ otu onye, dobe ya n’ụlọ ahụ ma na akpọzị ezinụlọ onye ahụ ka ha bute nde kwụrụ nde naịra maọbụ ha egbuo ya.
“Igwenagu Ogbodo na ndị otu ya gbara ọsọ, mana ụfọdụ n’ime ha bu mgbọ egbe n’ahụ. Nwoke ha ji eji enwerela onwe ya,” ka ha kwuru.
Ha gara n’ihu mezuo iwu gọọmenti Enugwu Steeti wepụtara site na ịkwatu ụlọ ahụ kpamkpam.
Onyeisioche ahụ dọrọ aka na nti na onye ọbụla kwesiri ima ihe eji ụlọ ya eme, n’ihi na achọpụta na ndị ntọri maọbụ ndị ohi ji ụlọ ọbụla eme arụ, gọọmenti ga-akụtuya n’eleghi anya n’azụ.