You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Samia Suluhu Hassan emeriela ntuliaka Onyeisiala mba Tanzania

Nchịkọta akụkọ niile si na mbaụwa niile

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Uzoamaka Ewuzie, Ikechukwu Kalu, Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Michael Ilediagu, Adline Okere, Marvelous Obomanu

  1. Onyeisiala Tinubu ga-eje ọgbakọ AQABA na Rome, Itali

    Onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Tinubu ga-eme njem Rome bụ isi obodo mba Itali n’ụbọchị Sonde, Oktoba 12, 2025.

    Gọọmenti etiti mere ka a mata nke a site n’akwụkwọ ozi ọnụ na-ekwuru Onyeisiala pụrụiche bụ Bayo Onanuga kesere n’akara soshal mịdịa ya.

    Dịka ozi ahụ si kwuo “Tinubu na-aga Rome maka ọgbakọ ‘Aqaba Process Heads of State and Government’ bụ ọgbakọ na-etinye anya n’ọnọdụ nchekwa n’ọdịda anyanwụ Afrịka”.

    Ọgbakọ ahụ ga-amalịte n’ụbọchị Oktoba 14 ka a na-atụanya na ndị isi ala mba Afrịka dị icheiche na-kwa ndị isi ọrụ nchekwa ma ndịagha n’ọtụtụ mba ga-abịa makwa ndị ọrụ obi ebere dị icheiche.

    Ọgbakọ Aqaba bụ nke eze Abdullah nke abụọ mba Jordan wepụtara n’afọ 2015 maka ibuso agha megide ndị na-eyi ọha egwu ma bụrụ ebe a na-akpa banyere usoro a ga-esi kwụsị ndị na-eyi ọha egwu.

    Ndị ga-eso Onyeisiala Bola Tinubu mee njem ahụ gunyere mịnịsta na-ahụ maka mmekọ Naịjirịa na mba ofesi nke steeti bụ Bianca Odumegwu–Ojukwu, mịnịsta nchekwa bụ Mohammed Badaru Abubakar, Onye ndụmọdụ onyeisiala banyere nchekwa bụ Nuhu Ribadu, onyeisi ụlọọrụ National Intelligence Agency (NIA) bụ Ambassador Mohammed Mohammed, ma ndị ọzọ.

  2. Hamas na-achịkọta ndịagha maka egwu ọgbaaghara ịda na Gaza

    Hamas akpọghachila ihe ruru ndị ọrụ nchekwa puku asaa ka ha weghaara ikike na mpaghara Gaza nke ndịagha Izrel hapụrụ na nso nso a, dịka ndị obodo si kwuo.

    Otu ndị Palestine ahụ họpụtakwara ndị gọvanọ ise ọhụrụ bụ ndị niile nwere ọzụzụ ndịagha, ụfọdụ n'ime ha na-achịbu ndị birigedi.

    E kwuru na e nyere iwu mkpokọta ahụ site na oku ekwentị na ozi ederede nke kwuru na ebumnuche ya bụ "ihichapụ Gaza nke ndị omeiwu na ndị ha na Izrel na-arụkọ ọrụ" ma gwa ndịagha ka weghachite ozi n'ime otu ụbọchị.

    Akụkọ sitere na Gaza na-atụ aro na ezigala ndị otu Hamas ji ngwaagha na mpaghara dị iche iche, ụfọdụ yi uwe ndị nkịtị ebe ndị ọzọ yi uwe na-acha anụnụ anụnụ nke ndị uweojii Gaza.

  3. Praịm Minista mba UK na-akwado isonye Trump n’Ijipt maka mkparịtaụka udo gbasara Gaza

    Praịm Minista mba UK bụ Keir Starmer ga-esonyere onyeisiala Amerịka bụ Donald Trump n’ọgbakọ udo mbaụwa na-ahazi n’Ijipt.

    Downing Street kwuru na Starmer ga-aga ọgbakọ udo ahụ n’ụbọchị Mọnde, bụ ebe a ga-anọ binye aka na nkwekọrịta ịkwụsị ịkwa mgbọ na Gaza.

    Praịm Minista mba UK ga-eso n’ime ndị ndu mbaụwa iri abụọ ga-aga Sharm El-Sheikh, bụ ebe ndị ọchịchị Ijipt kwupụtara dịka ebe ha haziri maka ịnọ kpaa maka “udo na ịdịmma nke mpaghara Middle East”.

    Ndị ọrụ enyemaka na-amụbawanye mbọ ha na-agba ịgbatara ndi mmadụ ọsọ enyemaka na Gaza.

    Ndị Hamas nwere ohere ịtọhapụ ndị Izrel niile ha ji eji ruo mgbe ọ ga-akụ elekere iri nke ụtụtụ n’ụbọchị Mọnde.

    A tụkwara anya na Izrel ga-atọhapụ ndị Gaza otu puku na narị asaa ha ji eji nakwa ndị Palestaịn ruru narị abụọ na iri ise ha tụrụ mkpọrọ.

    N’aka nke ọzọ, Hamas amalitela ịkpọku ndịagha ha ka ha jiri ike wereghachi mpaghara Gaza, nke bụ ọnọdụ nwereike ibute agha ime.

  4. Ndị be anyị, ụnụ abọọla chi, Ụbọchị ụka ọma nụ ooo!

    Nnọọ n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Sọnde 12 Ọktoba 2025.

    Gaa n’ihu sonyere anyị dịka anyị na-ewetere gị akụkọ ihe na-eme na Naịjirịa nakwa ụwa niile.

    Sonyekwara anyị n'akara soshal midịa anyị dị iche iche nke gụnyere WhatsApp Chanelụ, Facebook na Instagram maka akụkọ ndị ọzọ dị n'ụdị onyonyoo na foto.

    Daalụ!

  5. E kwesighi ikpe Nnamdi Kanu ikpe ya fọdụzie ikpe ịma ya - Ejimakor

    Ọkaiwu Nnamdi Kanu ekwuola na ha agaghị anabata ka e kpee Kanu ikpe ọbụla dịka ụlọikpe gwara ya ka ọ bịa zara ọnụ ya n’ebubo ndị e boro ya.

    Nke a dị n’ozi ọkaiwu ya bụ Aloy Ejimakor wepụtara n’akara soshal midia X ma zigaara ya ndị ntaakụkọ n’ụbọchị Satọde.

    O kwuru na ọtụtụ ndị mmadụ na otu na-ahụ maka ikike dịịrị onye e kwuola na ha ga-eleba anya n’etu e si ekpe ikpe Nnamdi Kanu bụ nke dị mma ma ha mee nke a.

    Kama na ọ dị mkpa ka o mee ka o doo anya na e kwesighi ikpe Nnamdi Kanu ọbụla ka ọ fọdụzie ile anya n’etu o si aga maọbụ ịma ya ikpe.

    O kwuru na a gaghị ekpe Kanu ikpe n’ọnọdụ ọjọọ ahụ e jiri si na mba Kenya kpọlata ya na Naịjirịa.

    Ọ gara n’ihu kwuo na onye ọbụla chọrọ ịkwado Kanu maọbụ hụrụ ikpe ziri ezi n’anya kwesịrị ịgba mbọ hụụ na e gbochiri ikpe ya ikpe.

    Ejimakor ji ọnọdụ mkpọlata Kanu tụnyere nke Umaru Dikko bụbu mịnịsta na-ahụ maka ime njem na Naịjirịa bụ onye gọọmenti chọburu isi na mba Briten kpọlata Naịjirịa n’uzọ iwu na-akwadoghi mana atụmatụ ahụ kụrụ afọ n’ala.

    O kwuru na nke ahụ bụ mbụ megide iwu na-achị mbaụwa nke mere mba Briten jiri nye Naịjirịa ntaramahụhụ ma nwuchie mmadụ anọ so n’atụmatụ ahụ.

    Ejimakor kwuru na ihe nwafọ Naịjirịa ọbụla kwesịrị ime bụ ikwusi okwu ike ka a kwụsị ikpe a na-ekpe Kanu ma tọhapụ ya.

  6. Ụlọọrụ 'FHA' akwatuola ụlọahịa na Festac, Legọs

    Akụkọ na-erụ anyi ntị ugbua na-ekwu na ụlọọrụ 'Federal Housing Authority'(FHA) bịara na isi ọtụtụ ụbọchị taa bụ Satọde, abalị 11 Ọktọba 2025 kwatụsịa ụlọahịa na ngwaahịa ndị mmadụ na-ere ahịa na Festac, Legọs.

    Ndị na-azụ ahịa n'ime Festac town na-akwa akwa arịrị ugbua.

    Otu onye na ndị o metụtara achọghị ka a kpọọ aha ya gwara BBC na e kweghị ya wepụta ihe ọbụla n'ime ụlọahịa ya.

    N'okwu ya "mgbe m nụrụ ihe na-eme n'ogbe ụlọahịa m ka m jikere ngwangwa gaa ebe ahụ mana ndị uweojji ekweghị ka m bupu ngwaahịa m."

    Anyị anụbeghị olu ndi FHA mara ije kpatara e ji kwatụọ ụlọahịa na azụmaahịa ndị mmadụ n' ogbe Festac

  7. Gọvano Riva steeti Fubara enyochala okpọrọụzọ 6.5 kilomita Woji-Aleto-Alesa-Refinary nke aka na-arụ

    Aka na-achi Riva steeti bụ Siminalayi Fubara emeela n nyocha okpọrọụzọ 6.5 kilomita Woji-Aleto-Alesa-Refinary ma gwa onye na-arụ ụzọ ahụ ka o me ngwa ngwa.

    Fubara kọwara nọ ya bụrụ na-arụchasịa ụzọ ahụ, ọ ga-enya Riva steeti ọtụtụ uru dị ukwụ dịka ọ ga-enye ohere ka ndị mmadụ nwere ike ị na-esi n' ime obodo na-abata n' obodo mepere emepe.

    Ọ gara n’ihu kwuo n’ụzọ ahụ ga-ebulite akụnaụba ma kwalite mmepe obodo Riva steeti nakwa Naịjirịa.

  8. Burkina Faso ajụla ịnabata ndị mbịarambịa Amerịka chọrọ izitere ha

    Akụkọ kwuru na ndịagha nọ n' ọchịchị na Burkina Faso ajụla ịkpọrọ ndị mba ọzọ Amerịka chụpụrụ nke mere Amerịka ji kwụsịtụ inye ha akwụkwọ ikike e ji abata mba bú‘visa’ na Bekee.

    Minista Burkina Faso na-ahụ maka mba ofesi bụ Karamoko Jean-Marie Traoré jụrụ ma ọ bụ n’ihi na ha jụrụ ime ihe Amerịka si ha mee nke bụ ịkpọrọ ndị mba ọzọ ha chụpụrụ mere Amerịka ji kwụsị inye ha akwụkwọ ikike ịbata mba Amerịka.

    Cheta na ọchịchị Donald Trump na-ebuso agha megide ndị mbịarambịa bi n'Amerịka na-enweghị akwụkwọ.

    Trump tụgharịrị anya na mpaghara Afrịka iziga ndị ha chụpụrụ na obodo ha.

    Ewezuga Naịjịrịa na Burkina Faso ugbua, ọtụtụ mba ndị nọ n' Afrịka gunyere; Eswatini, Gana, Rụwanda na Saụt Sudan anabatala ndị mmadụ Trump chụpụrụ n' Amerịka .

  9. Macron ahọpụtagharịala Lecornu dịka Praịm minista mba Fransị

    Onyeisiala mba Fransí Emmanuel Macron ahọpụtagharịala Sébastien Lecornu ka ọ lọghachite n' ọkwa Praịm Minista nke ọ gbara arụkwaghim ụbọchị ole na ole gara aga.

    Macron kwupụtara nke a n’ụbọchị Fraịde dịka o nwechara nzukọ ya na ndị pati na ndị ọchịchị n' obi gọọmentị bụ Élysée Palace.

    A na-atụ anya na Praịm minista Sebastien Lecornu ga-ahazi mwepụta mkpata na mmefu ego Gọọmenti Fransị ga-eji arụ ọrụ tupu afọ 2025 a bịa na njedebe.

    Cheta na Lecornu gbaburu arụkwaghịm ka o rubeghị otu ọnwa ọ banyere n'ọkwa.

  10. O pekata mpe mmadụ 27 anwụọla n'oke idemmiri na Mexico

    Akụkọ kwuru n’Ihe rụrụ mmadụ iri abụọ na asaa anwụọla dịka aka na-achọ ndị ọzọ dịka idemmiri kwatụshịrị ụlọ ndị mmadụ na ọtụtụ ihe onwunwe ha na mba Mexico.

    Ndị ọchịchị kwuru na ọ bụ oke mmiri zoro n’ụbọchị Tọsde na Fraịde kpatara idemmiri ahụ metụrụ ebe dị iche iche na mpaghara Mexico.

    Onyeisiala Mexico bụ Claudia Sheinbaum si na gọọmenti ezigala ndị ọrụ mmadụ puku ise na nari anọ nke gunyere ndị nchekwa ka ha gaa n’ime obodo dị ịche ịche nyere ndị mmadụ aka.

  11. Melania Trump edeela akwụkwọ arịrịọ nye Putin ka ọ tọhapụ ụmụaka ndị gbanahụrụ ezinụlọ ha n'ihi agha

    Nwannyị onyeisiala Amerịka bụ Melania Trump ekwuola na ụmụaka a chupuru achupu n’ihi ọgụ Yukren na Rọshịa alaghachitela n ezinụlọ ha ugbua.

    Melania si na o degara Onyeisiala Rọshịa bụ Vladimir Putin akwụkwọ ka o nwere ike ime ka ụmụaka ndị gbapụrụ oge ha na Yukren na akwakọrịta mgbo ka lọghacite ezinaụlọ ha nke Putin kwenyere.

    Ka ọ dị ugbua, ụmụaka mmadụ asatọ alọghacitela ezinaụlọ ha.

    Gọomenti Yukren si na ụmụaka ha ruru puku iri na itoolu na nari ise bụ ihe gbapụrụ n’aka ezinaụlọ ha gaa Rọshịa kemgbe afọ 2022 mana ọ bụ sọọsọ otu puku, nari isii na ise bụ ihe lọghachitere azụ ugbua.

  12. A na-achọ mmadụ 19 dịka ogbunigwe gbara na Tennessee n'Amerịka

    Mmadụ 19 aghọọla ndị a na-achọ achọ dịka ogbunigwe ndịagha gbara n'ụlọrụ ebe a na-emepụta ogbunigwe na Tennessee na Mba Amerịka ụbọchị Fraide..

    Onyeisi uweojii nke Humphreys County bụ Chris Davis kwuru na e bugara mmadụ anọ maobụ ise n'ụlọgwụ dị nso dịka ogbunigwe gbara n'kụsara n'ụlọrọ ebe a na-emepụta ya, ebe ọtụtụ ndị mmadụ nwụrụ.

    O kwuru sị, "E nweghị ihe a ga-eji akọwa ya, ọ laala, bThere's nothing to describe, it's gone."

    Ụlọọrụ ahụ nke dị na Bucksnort, Tennessee - bụ nke dị mailụ 56 miles (90km) ma site na Ọdịda anyanwu Nashville bụ maka nchọpụta, mmepụta nakwa idokwa ogbunigwe.

    A mabeghị ihe butere ọgbụgba ogbuniwe ebe ahụ.

  13. Hamas na-achịkọta ndị Izrel ha jichiri ugbua,ebe ndị Palestine na-alaghachite n' Ugwu Gaza

    Onyeisiala Amerịka bụ Donald Trump ekwuola na ndịagha Hamas na-achikọta ndị amaala Izrel ha jichiri maka ịtọhapụ ha ka ha nwere onwe.

    Trump kwukwara na obi siri ya ike na nkwekọrịta udo e nwere n’etiti Hamas na Izrel bụ nke ga-adigide

    Hamas ka nwere ruo ụbọchị Mọnde ịtọhapụ ndị amaala Izrel niile ha chiri.

    Izrel na-akwado ịtọhapụ ndị Palestine mmadụ narị abụọ na iri ise ha tunyere na mkpọrọ nakwa mmadụ otu puku na nari asaa ndị ha jichiri na Gaza.

    Ka ọ dị ụgbua, ọtụtụ ndị mmadụ na-alọghachite na mpaghara Ugwu Gaza dịka ha hiri ụra abalị nke mbu ha ebe ahụ kemgbe nkwekọrịta ịkwụsị ịkwa mgbọ malitere n’ụbọchị Fraịde.

  14. Ndị uweojii Abịa steeti anapụtala ụmụaka 20 n'aka ndị a na-enyo enyo na ha bụ ndị ntọrị

    Ndị uweojii Abịa steeti ekwupụtala gbasara obere ụmụaka asatọ na ụmụntakịrị iri ha napụtara.

    Ha kwuru na a napụtara ụmụaka ndị ahụ n'aka otu a na-enyo enyo na ha bụ ndị na-atọrọ, na-ezu ma na-azụkwa ụmụaka n'Abịa steeti maka ịresị ha ndị otu ha nọ na mpaghara Naịjirịa ndị ọzọ.

    Oge ọ na-ekwu okwu gbasara ọnọdụ a n'ụbọchị Fraịde, Kọmịshọna ndị uweojii n'Abịa steeti bụ Isa Danladi kpughere na ndị ọrụ ya anwuchiela mmadụ iri a na-enyo enyo na ha so n'otu ndị ntọrị ahụ.

    Isa kwuru na aha mmadụ ndị ha nwuchiri bụ:

    • Best Ndubuisi dị afọ iri anọ na otu ma bụrụ nwaanyị, onye obodo Apaa Osokwa dị n'okpuru ọchịchị Osisioma n'Abịa steeti
    • Charles Enyinnaya dị afọ iri abụọ na ise ma bụrụ nwoke, onye obodo Umuogele Ovom dị n'okpuru ọchịchị Aba South n'Abịa steeti
    • Eunice Ezekiel dị afọ iri atọ na ise ma bụrụ nwaanyị, onye bi na No. 1 Foursquare, Umukalika dị n'okpuru ọchịchị Aba South n'Abịa steeti
    • Nnenna Kalu dị afọ iri isii ma bụrụ nwaanyị, onye si n'okpuru ọchịchị Osisioma dị n'Abịa steeti
    • Gideon Esther dị afọ iri abụọ na ise ma bụrụ nwaanyị, onye bi na Amalek by Amencha 7Up, Aba, n'Abịa steeti
    • Obiegbunam Von dị afọ iri isii na ise ma bụrụ nwaanyị, onye Aba dị n'Abịa steeti
    • Ezeoma Rejoice dị afọ iri abụọ na otu, onye Aba dị n'Abịa steeti
    • Ngozi Owoh dị afọ iri abụọ ma bụrụ nwaanyị, onye Aba dị n'Abịa steeti
    • Favour Ernest dị afọ iri abụọ na abụọ ma bụrụ nwaanyị, onye Aba dị n'Abịa steeti
    • Brittney Oyemuwa Zion dị afọ iri abụọ na abụọ ma bụrụ nwoke, onye Amuoji Uku dị n'okpuru ọchịchị Obingwa n'Abịa steeti

    Ndị uweojii ahụ kwuru na ike agaghị agwụ ha ruo mgbe ha kpochapụrụ ndị omekome kpamkpam n'Abịa steeti.

  15. Ụka Katọlik mba Kenya agbanweela mmanya oriri nsọ ha dịka a malitere ịṅụ ya aghara aghara n’ọgbọ mmanya

    Ụka Katọlik na mba Kenya ewebatala ụdịrị mmanya ọhụrụ maka oriri nsọ, dịka mmanya ha naara eji eme ya bịara jupụta n’ọgbọ mmanya dị iche iche.

    Mmanya ọhụrụ a ha kpọrọ “Mmanya Maasị” nwere akara ikike nke otu jikọtara ndị Bishọpụ ụka Katọlik na mba Kenya bụ KCCB.

    O nwekwara akara njirimara ndị otu ahụ iji kwado na ọ bụ ezigbo ya.

    “Mmanya ọhụrụ a kwadoro abụghị nke a ga-ere n’ụlọ azụmahịa ọbụla, kama ọ bụ nke otu KCCB nwe ma tụbatakwa”.

    “Ọ bụ naanị na dayọsis anyị ka a ga-ekesa ya,” ka Achbishọpụ mpaghara Nyeri bụ Anthony Muheria gwara BBC.

    Ndị ụka Katọlik nabatara atụmatụ a, dịka ha kwenyere na mmanya nke mbụ ha naara eji eri oriri nsọ enwezighị nkwanyeugwu n’ihi ụzọ e si ekesa ya n’ọgbọ mmanya dị iche iche.

  16. Onye omeiwu mba Zimbabwe anwụọla ka ụgbọala ya suchara enyi

    Onye omeiwu mba Zimbabwe nọ na pati na-agba gọọmenti ụkwụ anwụọla oge ụgbọala o ji eme njem suru enyi.

    Dịka ụlọmgbasaozi dị na mba ahụ siri kwuo, Desire Moyo nwụrụ n’ụtụtụ ụbọchị Fraịde.

    Ụlọmgbasaozi Zibabwe bụ ZBC kwuru na ọdachi ahụ mere oge Maazị Moyo na ndị omeiwu anọ ndị ọzọ na-eme njem n’okporoụzọ si Bulawayo gawa Gweru.

    Ụlọmgbasaozi ahụ gbakwunyere na Moyo nwụrụ ozugbo ebe ndị nke ọzọ nwetara mmerụahụ.

    Ndị mmadụ amalitela izibata ozi nkwanyeugwu ha maka nwoke ahụ a ma ama na-ede akwụkwọ, dịka ha toro ya maka ntụnyeoke ya n’ihe gbasara edemede.

    Ozi anyị nwetara na-ekwu na Desire Moyo nwụrụ dịka ọ fọdụrụ otu mkpụrụ ụbọchị ka o cheta afọ iri anọ na isii a mụrụ ya.

    Ọ bụụrụ onye otu ndọrọndọrọ ọchịchị na-agba gọọmenti ụkwụ bụ Citizens Coalition for Change (CCC), nke onye ndu ha bụ Nelson Chamisa.

    Ọ bụkwaara onye otu kọmitii na-ahụ maka egwuruegwu, mmegharịahụ, nka na omenala n’ụlọomeiwu mba Zimbabwe.

  17. Nkwekọrịta udo Izrel na Hamas amalitela ugbua

    Nkwekọrịta udo a n'etiti Izrel na Hamas malitere n'elekere iri nke ụbọchị Fraịde Ọktoba 10, 2025.

    Ka ọ di ugbua ndị amaala Palestina amalitela ịlọghachite azu na mpaghara ugwu Gaza dịka ndịagha Izrel kwuru na ịkwụsị ịkwa mgbọ abịala na mmezu.

    Dịka Trump si kwuo, ndịagha Izrel nọ na ahịrị ugbua mana Izrel si ha ga aga n’ihu ịwepụ ihe ọbụla yiri ihe iyi egwu.

    A na-atụ anya na ụgbọala bu ihe enyemaka kwesịrị ị batawa na Gaza ugbu ị nyere ndị mmadụ aka.

    Cheta na nkwekọrịta ahụ Hamas na Izrel nwere kwuru na ha abụọ ga-atọhapụ ndị ha ji eji ka ha nwere onwe ha ma lọghachitere ezinụlọ ha.

  18. Corina Machado onye na-akwado ọchịchị onye kwuo uche ya na Venezuela bụ onye nwetara Nrite ‘Nobel Peace’ nke afọ 2025

    Corina Machado, onye ndụ ndị na-achọ iweghara ọchịchị na Venezuela nọ na-nzuzo kemgbe emechara ntuliaka onyeisiala na Venezuela afọ gara aga bụ onye nwetara Nrite ‘Nobel Peace’ nke afọ 2025

    Kọmitti mere nyocha Nobel Peace nabatara ya maka “ọrụ niile ọrụrụ gbasara ị kwalite ikike ọchịchị onye kwuo uche ya nke ndị amaala mba Venezuela”

    Ihe ọzọ bụ maka mbọ ọ gbara iji nweta mgbanwe ziri ezi na e nyefee ọchịchị site n’aka onye ntuzi gaa n'ọchịchị onye kwuo uche ya na-enweghị nsogbu ọbụla

    Onyeisioche kọmittii Nobe peace Jørgen Watne Frydnes si na Machado bụ otu n'ime ihe atụ pụrụiche mmadụ ị nwe obi siri ike na mpaghara Latin America.

    Ọ gara n’ihu kọwa na Machado na-egosipụta “olileanya maka ọdịnihu", ebe a na-echebe ikike ụmụ amaala.

  19. Rịọ Dave Umahi mgbaghara - Ndị ntoroọbịa Ebonyi steeti na-agwa Rufai Oseni

    Akụkọ na-eru anyị ntị bụ na o nwere otu ndị ntoroọbịa mere ngagharị n’ụbọchị Tọzde 9 Ọktọba 2025 n'isiobodo Ebonyi steeti iji kwado Minista na-ahụ maka ọrụ bụ David Umahi.

    Otu ahụ kpọrọ onwe ha ‘Concerned Youths for Senator Engr David Umahi’ kpọrọ oku ka onye ntaakụkọ ụlọmgbasaozi Arise TV bụ Rufai Oseni nakwa ndị nwe ụlọọrụ ahụ rịọ Umahi mgbaghara maka mkparị ha sị Rufai kparịrị Umahi.

    Ha nyere Rufai na Arise TV otu abalị ka ha rịọ mgbaghara, ma dọọ aka na ntị ịmụba ngagharị ha ma ọ bụrụ na Rufai na Arise TV emeghị ọchịchọ ha.

    Ndị ntoroọbịa ahụ kpọkwara oku ka ụlọọrụ na-achịkọta mgbasaozi na Naịjirịa bu Nigerian Broadcasting Commission (NBC) tinye ọnụ n'okwu a.

  20. Ndị uweojji anwụchiele ndị oji egbe ezu bịara oshi n’ụlọ onye ntaakụkọ ‘Arise TV’ Somtochukwu Maduagwu nwụrụ anwu

    Ndị uweojii na Abuja anwuchiele ndị oji egbe ezu soo zuo oshi ma gbuo onye ntaakụkọ ‘Arise TV’ Somtochukwu Christella Maduagwu ebe obibi ya na obodo Gishiri nke nọ na mpaghara Katampe nọ na Abuja.

    Cheta na ndị oji egbe ezu bịara na ụlọ Somtochukwu na Sepụtemba 29, 2025, gbaa onye nche ha Barnabas Danlami egbe. Site n’ụjọ, akụkọ kwuru na Somtochukwu si n’elu ụlọ ya wutuo nke mere o ji merụọ ahụ. Ọ nwụrụ mgbe a kpọrọ ya ga ụlọọgwụ. Onye nche Danlami sokwa nwụọ.

    Ndị uweojii skọpiọn squad na ntuziaka kọmishọna ndị uweojii na Abuja jidere mmadụ iri abụọ so mee mkpa mkpa ahụ ma nakọrịta egbe na ihe ndị ọzọ ha ji ezu oshi.

    Aha ndị ebipụtara a na-enyo enyo gunyere:

    Shamsudeen Hassan ‘nwoke’ si ọchịchị ime obodo Malumfashi na Katsina steeti, Hassan Isah ‘nwoke’, gbara afọ 22 si Zaria na kaduna steeti. Abubakar Alkamu ‘nwoke’, dị afọ 27 ọchịchị ime obodo Musawa na katsina steeti.

    Ndị ọzọ bụ Sani Sirajo nwoke gbara afọ 20 si ọchịchị ime obodo Malumfashi na katsina, Mashkur Jamilu nwoke dị afọ 28 si ọchịchị ime obodo Igabi na kaduna state ya na Suleiman Badamasi afọ 21 si otu ebe na katsina.

    Aha ndị ọzọ ebipụtara bụ Abdul Salam nwoke si ọchịchị ime obodo katsina, Zaharadeen Muhammad afọ 23 si ọchịchị ime obodo chikun na kaduna steeti.

    Musa adamu afọ 30 si ọchịchị ime obodo malumfashi na katsina, Sumayya Mohammed afọ 27 years si ọchịchị ime obodo Sammaka na Kaduna steeti, Isah Abdulrahman gbara afọ 25 si ọchịchị ime obodo Zaria na Kaduna steeti ha na Musa Umar nwoke dị afọ 31 si ọchịchị ime obodo Maiduguri na Borno steeti bụ ndị ewpụtara aha ha.

    Akụkọ kwuru na mmadụ ndị a niile kwenyere na ha mere ihe eboro ha ebubo ime. Aka na-eme nyocha.