Gọọmenti mba Amerịka apịachiela dịka ụlọomeiwu sịnetị jụrụ ịnabata atụmatụ ego nke ikpeazụ
Gọọmenti mba Amerịka apịachiela ọrụ dịka ụlọomeiwu Sịnetị jụrụ ịnabata atụmatụ ego nke ikpeazụ ya.
E kwuru na mmechi a, nke mbụ kemgbe afọ 2018, nwereike ịkwụsịtụ ụfọdụ ọrụ gọọmenti Amerịka nwa oge mana ọ bụghị ha niile.
Cheta na Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump na-eyi egwu ịchụ ọtụtụ ndị ọrụ gọọmenti “nke enweghị ike ịgbagha” ma ọ bụrụ na mmechi ahụ gaa n'ihu.
Ka ọ dị ugbua, ndị ọrụ dị mkpa ga-aga n'ihu na-arụ ọrụ - ụfọdụ na-akwụghị ụgwọ - mana ndị ọrụ gọọmentị ndị ọzọ nọ n’ezumike akwụghị ụgwọ ugbua.
Ọzọ, ụfọdụ ngalaba dịka Ngalaba Nchekwa ‘Homeland Security’, kwuru na ọtụtụ ndị ọrụ ha ga na-abịa ọrụ. Mana ọtụtụ ndị ọzọ kwuru na iwu abụghị na ndị ọrụ ha ga na-abịa ọrụ.
N’okwu ya, onye omeiwu nke pati Republican bụ John Thune na-ekwu na a gaghị ejide pati ahụ, ebe onyeisioche pati Democrat n’ụlọomeiwu Sinetị Chuck Schumer kwuru na ndị Republican "na-ekwu okwu ụgha"