Amerịka ga-ewepụrịrị mwakpo tupu a malite mkparịtaụka ọhụrụ - Minista Ịran gwara BBC

Nchịkọta akụkọ ndị kachasị mkpa mere na mbaụwa n'ọnwa Juun 2025.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Uzoamaka Ewuzie, Ikechukwu Kalu, Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Michael Ilediagu, Adline Okere, Marvelous Obomanu

  1. Onyeisiala Trump chọrọ ire ụgbọala Tesla ma kwuo na ọchọghị ka ya na Musk nwee mkparịtaụka

    Elon Musk bụ onyeisi ụlọọrụ na-arụpụta ụgbọala ahụ.

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, Elon Musk bụ onyeisi ụlọọrụ na-arụpụta ụgbọala ahụ.

    Dọnald Trump ekwuola na ọ chọrọ ire ụgbọala Tesla ya dịka esemokwu ya na Elon Musk na-aga n’ihu.

    Elon Musk bụ onyeisi ụlọọrụ na-arụpụta ụgbọala ahụ.

    Obi ọchịchị White House Amerịka kwuru na Onyeisiala Trump achọghị ka ya na Musk nwee mkparịtaụka n’agbanyeghị na akụkọ kwuru na ha abụọ ga-enwe mkparịtụka n’ekwenti ụbọchị Fraịde 6 Juun, 2025.

    Oge ọ gwara ndị ntaakụkọ okwu, Trump kwuru na Elon Musk bụ onye na-amaghị ihe ọ na-eme. Anyị anụbeghị nzaghachi Musk maka nke a.

    Cheta na esemokwu dị n’etiti Trump na Musk pụtara ihe na soshal midịa ụbọchị Tọzde 5 Juun, 2025 oge Trump kwuru na ọ ghọtaghị ihe mere Elon Musk jiri katọọ atụmatụ ụtụisi ọhụrụ ọchịchị wepụtara.

  2. Gọvanọ Umo Eno na-achị Akwa Ibom Steeti agbaala pati PDP arụkwaghịm

    Gọvanọ Umo abanyela otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị All Progressives Congress (APC)

    Ebe foto si, Akwa Ibom State Government/Facebook

    Nkọwa foto, Gọvanọ Umo abanyela otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị All Progressives Congress (APC)

    Gọvanọ Umo Eno nke Akwa Ibom steeti agbala Peoples Democratic Party (PDP) arụkwaghị dịka ọ banyere otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke All Progressives Congress (APC).

    Gọvanọ Eno kwupụtara nke a n’ụbọchị Fraịde 6 Juun 2025 mgbe ya na ndị ntaakụkọ nwere ọgbakọ n’Uyo, isi obodo steeti ahụ, kwuru na ya banyere pati APC mgbe ya mechachara agba ndụmọdụ dịka onye ozi.

    "Anyị anaghị abanye APC site n'ọnọdụ adịghị ike, anyị na-abanye na APC site n'ọnọdụ ike," ka ọ gbakwụnyere.

    Eno kwuru na ya banyere APC iji kwado ngbanwe akụnaụba nke Onyeisiala Bola Tinubu na-eme.

    Cheta na nke a bụ izuụka isii nke ogbo ya nke Delta steeti bụ Sheriff Oborevwori hapụrụ PDP banye APC.

  3. Chad akwụsịla inye ụmụafọ Amerịka akwụkwọ visa na mmegwara machi njem Onyeisiala Trump

    Chad ga-echekwa ugwu na nganga ya

    Ebe foto si, CHESNOT / GETTY IMAGES

    Nkọwa foto, Chad kwuru na ha ga-echekwa ugwu na nganga ha

    Chad, mba ahụ dị na mpaghara etiti Afrịka kwuru na ọ ga-akwụsị inye ụmụafọ mba Amerịka akwụkwọ visa iji megwara dịka mba ahụ so na ndị Onyeisiala mba Amerịka Donald Trump machiri ịbata Amerịka.

    “Chad enweghị ihe ọbụla maọbụ ijeri dọla ọ ga-enye, mana Chad ga-echekwa ugwu na nganga ya,” Onyeisiala Mahamat Idriss Déby Into kwuru na asụsụ Frenchị n’ozi o bupụtara na Facebook n’ụbọchị Tọzde 5 Juun 2025.

    Mba ndị nọ na mpaghara Afrịka bụ ndị machi Onyeisiala Trump kwupụtara kachasị metụta, dịka mba asaa n’ime iri na otu si Afrịka.

    Cheta na iwu machi ahụ ga-amalite n’ụbọchị Mọnde 9 Junn 2025 nke na-abịa, metụtara mba ndị ọzọ gụnyere Congo-Brazzaville, Equatorial Guinea, Eritrea, Libya, Somalia na Sudan – yana Afghanistan, Myanmar, Haiti, Iran na Yemen.

  4. Netanyahu kwuru na Izrel na-akwado otu ndị ezinụlọ megide Hamas na Gaza

    Ọtụtụ ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị Izrel ebuola Netanyahu ebubo itinye nchekwa mba Izrel na-eyi egwu

    Ebe foto si, AFP via Getty Images

    Nkọwa foto, Ọtụtụ ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị Izrel ebuola Netanyahu ebubo itinye nchekwa mba Izrel na-eyi egwu

    Praịm minista Izrel Benjamin Netanyahu ekwuola na mba Izrel na-enye otu ndị ezinaụlọ na Gaza ngwaagha iji megide ndịagha nnupụisi Hamas.

    O kwuru nke a dịka ụlọ mgbasa ozi dị n’Izrel bupụtara akụkọ sị na ndị nchekwa kwuru na Netanyahu nyere iwu inye otu otu nọ na mpaghara ndịdị Gaza ngwaagha.

    Ọtụtụ ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị Izrel ebuola Netanyahu ebubo itinye nchekwa mba Izrel na-eyi egwu.

    Otu Yasser Abu Shabab ahụ, nke ụfọdụ na-ele anya dịka ndịagha nnupụisi maọbụ ndị omekome, gosipụtara onwe ha dịka ndị mmegide Hamas.

    Mana ndị ahụ kwuru na ha na-echekwa gwongworo na-ebubata ihe enyemaka na Gaza.

  5. Izrel awakpola ndịda Beirut imegide mmepụta duronu nke ndị Hezbollah

    Mgbe mba Izrel wakporo Lebanon n'ọnwa Eprel nke gburu mmadụ atọ ma merụọ asaa ahụ

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Mgbe mba Izrel wakporo Lebanon n'ọnwa Eprel nke gburu mmadụ atọ ma merụọ asaa ahụ

    Mba Izrel esila n’elu wakpoo mpaghara ndịda Beirut ma kwuo na ọ bụ imegide mmepụta duronu nke ndị Hezbollah.

    Mwakpo ahụ mere n'abalị Tọzde 5 Juun nke ga-abọọchi ụbọchị emume Eid Al Adha nke ndị okpukperechi Alakụba.

    Nke a sochiri ihe ịdọ aka na ntị ka ndị mmadụ pụọ n’ọtụtụ ụlọ dị nso ebe ndị otu Hezbollah nọọ n’isi obodo ahụ.

    Akụkọ ekwughị na o nwere ndị merụrụ ahụ.

    Mana ndị ọrụ nchekwa Izrel kwuru na ha chọpụtara ebe ndị Hezbollah na-emepụta ọtụtụ puku duronu n’ime ala, nke ndị nnupụisi Iran na-akwado.

    Mwakpo a mere n’agbanyeghị nkwekọrịta nkwụsị ịkwa mgbọ nke dị n’etiti mba Izrel na otu ndịagha nnupụisi ahụ nke malitere kemgbe ọnwa isii.

    Praịm minista Lebanon katọrọ mwakpo ahụ.

    N’aka nke ọzọ, Onyeisiala mba Lebanon Joseph Aoun kọwaara mwakpo ahụ dịka megide nkwekọrịta udo mba ụwa dịka o kwuru na o mere n’abalị pụtara ụbọchị emume nke okpukperechi.

  6. ‘Obi adala ụnụ mba’ – Ka Tinubu gwara ndị Naịjirịa n’emume Eid-El-Kabir

    ‘Obi adala ụnụ mba’ – Ka Tinubu gwara ndị Naịjirịa n’emume Eid-El-Kabir

    Ebe foto si, Bayo Onanuga/X

    Onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Tinubu ekwetala na Naịjirịa erubeghị ogogo a chọrọ mana ọ rịọrọ ndị Naịjirịa ka obi ha ghara ịda mba.

    Tinubu kwuru nke a n’ozi Eid-el-Kabir o zigaara ụmụafọ Naịjirịa, bụ nke o tinyere aka n’ụbọchị Tọzde 5 Juun 2025.

    Onyeisiala kwupụtara na mmemme Eid-el-Kabir na-echetara onye niile ihe ndị ha nwereike ime iji gosi nkwụdosiike, nnagide, obi ebere na ịnyepụchasị onwe ha maka ọdịmma nke Naịjirịa.

    Ọ sịrị na ọ bụ eziokwu na njem ọchịchị ya adịghị mfe dịkwa ka ụfọdụ mmadụ nwere obi abụọ gbasara ebe ọchịchị ya chewere ihu, mana nkwụdosiike nke ndị ndu na ngalaba ọhanaeze na nke ndị nkịtị, tinyere nkwado ọtụtụ ndị Naịjirịa na-amịta mkpụrụ.

    O kwere nkwa na Naịjirịa na-abanye n’agba ọhụrụ nke nnwogharị olileanya gọọmenti ya kwere nkwa afọ abụọ gara aga.

  7. Rọshịa awakpola Yukren ma gbuo mmadụ anọ

    Nwoke nọ n'akụkụ ụgbọala mwakpo ahụ mebiri

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, Nwoke nọ n'akụkụ ụgbọala mwakpo ahụ mebiri

    Ndị ọchịchị Yukren ekwuola na Rọshịa ji nnukwu ogbunigwe wakpo isi obodo ha bụ Kyiv n’abalị Tọzde 5 Juun 2025 ma gbuo mmadụ anọ ebe mmadụ 20 ọzọ meruru ahụ.

    Ozi onyeisi obodo Kyiv bụ Vitali Klitschko kwuru na nnyocha ndị ọrụ gbatagbata mere chọpụtara na mmadụ nwụrụ bụ ndị ọrụ gbatagbata ibe ha.

    Kyiv ekwuola ma dọọ ndị obodo aka na nti banyere mwakpo ọzọ nwereike ime.

    Rọshịa ji ogbunigwe na dronu ruru 21 wakpo obodo Lutsk dị na mpaghara ugwu Kyiv ma meruo mmadị ise ahụ.

    Na mbido izuụka a, Onyeisiala Trump na-achị Amerịka kwuru na oge ya na Onyeisiala Vladimir Putin nwere mkparịtaụka n’ekwenti, ọ gwara ya na Rọshịa ga-azaghachi mwakpo ahụ Yukren wakporo ogige ndịagha ugboelu mba Rọshịa.

    Ndị ọrụ gbatagbata na-agbanyụ ọkụ ebe mwakpo ahụ mere

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, Ndị ọrụ gbatagbata na-agbanyụ ọkụ ebe mwakpo ahụ mere
  8. Donald Trump na Elon Musk enyela onwe ha mkpaarị n’ihu ọha mmadụ

    Donald Trump na Elon Musk enyela onwe ha mkpaarị n’ihu ọha mmadụ

    Ebe foto si, Getty Images

    Esemokwu etiwapụla n’etiti onyeisiala Amerịka bụ Donald Trump na Elon Musk bụbu onye ndụmọdụ ya, dịka ha nyere onwe ha mkpaarị n’ihu ọha mmadụ.

    Ọnọdụ a dapụtara oge akajiakụ ahụ ihe banyere teknụụzụ doro anya katọrọ otu atụmatụ gbara ọkpụrụkpụ Trump tinyere n’Amerịka.

    Ndị akajiakụ abụọ ahụ busoro onwe ha agha ụbọchị ahụ niile ma were ọbaozi social media ha nye onwe ha mkpaarị dị iche iche.

    A na-eche na o nwereike ịbụ etu a ka ịdị na mma ha ga-esi fanye n’ogwu.

    N’ụtụtụ Tọzde ka Trump kwuru na Musk “gharịpụrụ ya” site n’ịkatọ atụmatụ ụtụisi na mmefu ego nke ọchịchị ya, ma tupenye azụ na nke a nwereike ịbụ njedebe “ezigbo mmekọrịta” dịịrị n’etiti enyi abụọ ahụ.

    Elon Musk pụtaziri boo Trump ebubo “enweghị obi ekele” ma gbakwunye sị: Ewezuga m, Trump gaara akụ afọ n’ala na ntuliaka.”

  9. Igbo Chukwu mere eze, ụnụ asaala chi, Ka ụbọchị taa maara onye niile mma

    Obiụtọ ka anyị ji asị gị nnọọ n'ọgbakọ BBC News Igbo n'ụbọchị taa bụ Fraịde Eke 6 Juun 2025.

    Chinonso Ugorji abịala n'ụtụtụ a iwetere gị akụkọ niile na-akpọtụ na mpaghara ụwa dị iche iche, mana Uzoamaka Ewuzie na Michael Ngene ga-emecha sonyere ya na mgbede.

    Biko gaa n'ihu nọnyere anyị taa.

  10. Ndị Burundi malitere ntuliaka ndị omeiwu na okpuru ọchịchị n'ime oke ọnụ ahịa

    Ndị otu ndọrọ ndọrọ na-achị na mba Burundi na-achọ ijedesi ọchịchị ike

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, Ndị otu ndọrọ ndọrọ na-achị na mba Burundi na-achọ ijedesi ọchịchị ike

    Ndị otu ndọrọ ndọrọ na-achị na mba Burundi na-achọ ijedesi ọchịchị ike dịka mba ahụ malitere ntuliaka ịhọpụta ndị omeiwu na ndị isi oche ọchịchị ime obodo.

    N’aka nke ọzọ, Évariste Ndayishimiye nọsiri ike n'ọrụ ya dịka onyeisiala maka na ọ ka nwere afọ abụọ iji mezuo ọchịchị afọ asaa ya nke ga-agwụ n’afọ 2027.

    Ntuliaka a na-aga n’ihu agbanyeghị oke ọnụ ahịa na-arị elu, ụkọ mmanụ ụgbọala na mkpesa nke mmegide ndọrọ ndọrọ ọchịchị na mba ahụ.

    E kwuru na ntuliaka a ga-egosịpụta ụdị ịhụnanya ndị mba ahụ nwere ebe pati CNDD-FDD na-achị, bụbu otu ndị nnupụisi nọgoro n'ọchịchị kemgbe afọ iri abụọ (20).

    Burundi, bụ mba dị na mpaghara ọwụwa anyanwụ nke Afrịka bụ nke a mara dịka mba kachasị daa ogbenye n’ụwa, mana ndị bi na ya malitere ịgabiga mmụba nke ọnụ ahịa ngwaahịa dịka nri.

    Ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị ndị ọzọ na-eme mkpesa na ndị ntorobịa nke otu pati CNDD-FDD na-akpagbu ma na-etinye egwu n’ime ndị na-akwado ha.

  11. Abdulrasheed Bawa ekpughela nrụrụaka nọ n'ego mbelata mmanụ ụgbọala gọọmenti na-akwụ

    Cheta na Abdulrasheed Bawa rụrụ ọrụ dịka onyeisioche ụlọọrụ EFCC site n'afọ 2021 ruo 2023 oge Muhammadu Buhari bụ onyeisiala Naịjirịa.

    Ebe foto si, EFCC/X

    Nkọwa foto, Cheta na Abdulrasheed Bawa rụrụ ọrụ dịka onyeisioche ụlọọrụ EFCC site n'afọ 2021 ruo 2023 oge Muhammadu Buhari bụ onyeisiala Naịjirịa.

    Onye bụbu onyeisi ụlọọrụ Economic and Financial Crime Commission (EFFC) bụ Abdulrasheed Bawa, agbaala ama banyere nrụrụaka na mpụ dị n’ego gọọmenti Naịjirịa na-akwụ maka mbeleta ego mmanụ ụgbọala.

    O mere ka amata nke a n’akwụkwọ ya ‘The Shadow of Loot & Losses: Uncovering Nigeria’s Petroleum Subsidy Fraud,’ nke kọwaara etu ọtụtụ ijeri naịra si efunarị Naịjirịa site na nrụruaka dị iche iche.

    Bawa kwuru na ọtụtụ ụlọọrụ gọọmenti na-eme nrụrụaka a site n’ibuli ọnụego mmanụ ụgbọala e bubatara ma tụọ asị banyere mmanụ ụgbọala ole ha bubatara iji nweta ego nke onwe ha.

    Ụzọ ọzọ bụ site n’ịmanye ọnụahịa dị elu na mmanụ ụgbọala a na-ebubata, isi n’ụzọ nzuzo bupu mmanụ nakwa izu ohi.

    Bawa kwuru na ndị na-akpa ajọ agwa a na-eresi ndị otu ha mmanụ ụgbọala ahụ ma manye ego na ya tupu ha ereis ya ọhanaeze maọbụ buga ya mba ofesi iji nweta uru nke ha.

    Cheta na Abdulrasheed Bawa rụrụ ọrụ dịka onyeisioche ụlọọrụ EFCC site n'afọ 2021 ruo 2023 oge Muhammadu Buhari bụ onyeisiala Naịjirịa.

  12. Tanzanịa amachịela akara soshal midia X maka igosi foto ndị gba ọtọ

    Mịnịsta na-ahụ maka mgbasaozi bụ Jerry Silaa kwuru igosi foto ndị gba ọtọ megidere iwu, nkwenye na omenaala mba Tanzanịa.

    Ebe foto si, NurPhoto via Getty Images

    Nkọwa foto, Mịnịsta na-ahụ maka mgbasaozi bụ Jerry Silaa kwuru igosi foto ndị gba ọtọ megidere iwu, nkwenye na omenaala mba Tanzanịa.

    Gọọmenti mba Tanzanịa amachiela akara soshal midia X na mba ahụ maka igosi foto ndị gba ọtọ.

    Mịnịsta na-ahụ maka mgbasaozi bụ Jerry Silaa kwuru igosi foto ndị gba ọtọ megidere iwu, nkwenye na omenaala mba Tanzanịa.

    N’izuụka abụọ gara aga ka akụkọ kwuru na akara X ndị uweojii mba ahụ bụ nke ndị a na-amaghị machiri ebe ndị mba Tanzanịa kwuru na ha enweghịike ịbanye n’akara soshal midi X ha dị cihe iche dịka e nwere nsogbu ndọrọndọrọ ọchịchị.

    Otu na-ahụ maka nchekwa ikike ndị mba Tanzanịa kwuru na ozi a minista na-ahụ maka mgbasaozi wepụtara bụ nke na-egosi na gọọmenti nwere atụmatụ ịmachi mgbasaozi n’igwe dijital dịka a na-akwado ntuliaka Onyeisiala na ndị omeiwu n’ọnwa Ọktoba, 2025.

    Ọtụtụ mmadụ ebola gọọmenti Onyeisiala Samia Suluhu Hassan ebubo ịmachi ma megide ikike ndị obodo dịka ọ na-achụnta vootu na ntuliaka afọ a.

  13. Ụlọ akụ mba ụwa akwụsịla mmachibido ịgbazinye mba Uganda ego

    Ụlọ akụ mba ụwa akwụsịla mmachibido ịgbazinye mba Uganda ego

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Ụlọ akụ mba ụwa akwụsịla mmachibido ịgbazinye mba Uganda ego

    Ụlọ akụ mba ụwa a kpọrọ World Bank ekwuola na ya akwụsịla mmachibido ịgbazinye mba Uganda ego nke ọ malitere afọ abụọ gara mgbe mba ahụ wepụtara iwu megidere ikike nwoke maọbụ nwaanyị nwere mmasị ebe nwoke maọbụ nwaanyị ibe ya - ndị LGBTQ.

    Cheta na mba Uganda wepụtara iwu n’afọ 2023 nke megidere nwoke maọbụ nwaanyị inwe mmasị na mmekọ ebe nwoke maọbụ nwaanyị ibe ya nọọ.

    Ọzọ, iwu ahụ kwadoro ịma onye ọbụla e jidere dara ya na mba ahụ ikpe ọnwụ.

    Kemgbe ahụ, a chụpụla ọtụtụ narị mmadụ n'ụlọ ha, mee ihe ike megide maọbụ jide ha n'ihi mmekọahụ ha na nwoke maọbụ nwaanyị ibe ha, dịka otu na-ahụ maka ikike dịrị mmadụ na mba Uganda si kwuo.

    Mana ụlọ akụ mba ụwa kwuru na obi siri ya ike na usoro ọhụrụ o wepụtara ga-ahụ maka inye mba Uganda ego n’ụzọ agaghị emegịde ndị LGBTQ.

    Chetakwa na mba Uganda so na mba ndị nọ na mpaghara Afrịka gụnyere Gana na Kenya bụ ndị na-eme ọtụtụ ihe n’afọ ndị adịbeghị anya megide ndị LGBTQ.

  14. Onyeisiala Trump amachiela ụmụamaala nke mba 12 ịbata Amerịka

    Onyeisiala Trump mezuru nke a mgbe o binyere aka n’akwụkwọ mmachibido iwu njem ịga mba Amerịka

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Onyeisiala Trump mezuru nke a mgbe o binyere aka n’akwụkwọ mmachibido iwu njem ịga mba Amerịka

    Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump emezuola nkwa o kwere oge ọ na-adọ ọchịchị ị kwusị ụmụamaala si mba ụfọdụ ịbata Amerịka iji chekwaa ụmụamaala Amerịka n’aka ndị si mba nwereike itinye ndụ ha na nsogbu.

    Onyeisiala Trump mezuru nke a mgbe o binyere aka n’akwụkwọ mmachibido iwu njem ịga mba Amerịka site na mba ndị gụnyere Afghanistan, Haiti, Myanmar, Cuba, Yemen na Iran nke ga-amalite n’ụbọchị Mọnde 9 Juun 2025.

    Mba ndị mmachibido nke a metụtara na mpaghara Afrịka gụnyere Chad, Congo-Brazzaville, Equatorial Guinea, Eritrea, Libya, Somalia, Sudan, Burundi, Sierra Leone, na Togo.

    Akwụkwọ mmachibido a kwuru na Onyeisiala Trump nyere ụmụamaala mba asaa ọzọ mmachibido ezughị oke.

    Mba ndị ahụ gụnyere Cuba na Venezuela dịka o kwuru na ndị na-eme njem maka ihe banyere asọmpi egwuregwu, ụmụamaala Afghanistan nwere akwụkwọ amaala abụọ na mba ndị mmachi ahụ emetụtaghị.

    Ọzọ, Onyeisiala Trump kwụsịkwara ụmụakwụkwọ si mba ọzọ ịbanye Mahadum Harvard ruo ọnwa isii, ma nye iwu ka a malite nnyocha n’ọchịchị nke aka chịburu mba Amerịka bụ Joe Biden.

  15. Igbo ndị ọma, ụtụtụ ọma

    Nnọọ n'ọgbakọ BBC Igbo taa bụ Tọzde abalị ise nke ọnwa Juun 2025. Biko nọnyere anyị dịka anyị na-ewetara gị akụkọ ihe na-eme n’ụwa niile, mpaghara Afrịka na ala Igbo.

    Ndewo!

  16. Onyeisiala Tinubu ewepụtala nde naịra abụọ, gwongworo osikapa 20 maka ndị ideimmiri metụtara

    Onyeisiala Tinubu kwere ndị mmadụ nkwa na gọọmentị ga-elenye anya n’ihe ọ bụla metụtara ha

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Onyeisiala Tinubu kwere ndị mmadụ nkwa na gọọmentị ga-elenye anya n’ihe ọ bụla metụtara ha

    Onyeisiala Bola Tinubu akwadola ka gọọmentị etiti wepụta nde naịra abụọ maka ịrụgharị ụlọ ndị ideimmiri mebiri na Mokwa nke Nịja steeti.

    Osote onyeisiala Kashim Shettima kwupụtara nke a mgbe ọ gara nleta n’obodo Mokwa maka ideimmiri nke gburu ọtụtụ mmadụ, mebie ọtụtụ ụlọ ebe obibi ma chụpụ ọtụtụ mmadụ n’ụlọ.

    Osote onyeisiala kwuru na Onyeisiala Tinubu kwadoro inye ndị obodo ahụ ihe meberede ahụ metụtara gwongworo osikapa iri abụọ (20).

    Onyeisiala Tinubu kwere ndị mmadụ nkwa na gọọmentị ga-elenye anya n’ihe ọ bụla metụtara ha.

    Dịka o siri kwuo, Onyeisiala Tinubu nyere iwu ka arụzie akwa mmiri niile mebiri emebi n’obdo ahụ.

    Cheta na ihe ruru ozu mmadụ narị abụọ ka e bupụtara n’ideimmiri nke kpalitere ọgbaaghara n’obodo Mokwa n’ụbọchị Wenezde 28 Mee 2025.

    Ụlọ mgbasa ozi Channelstv kwuru na Kọmishọna na-ahụ maka ọdịmma mmadụ na steeti Nịja bụ Ahmad Suleiman kwuru na a ka na-agba mbọ iji achọta ndị ọzọ furu efu.

  17. Ihe anyị ma maka ụkọchukwu a sị gburu ụmụaka anọ n'Ibagwa Aka, Enugwu Steeti

    A nwuchiri ụkọchukwu Chinedu Ezedike maka ebubo na o gburu ụmụaka anọ si n'otu ezinaụlọ

    Ebe foto si, Screenshot

    Akụkọ si n’onodo Ibagwa Aka dị n’Okpuruọchịchị Igboeze South nke Engwu Steeti kwuru na a nwuchiela otu ụkọchukwu a na-enyo na o gburu ụmụaka anọ si n’otu ezinaụlọ.

    Ihe onyonyo malitere ifesa na soshal midia n’ụbọchị Tuzde ebe ndị obodo Ibakwa Aka gbakọtara na-eme ngagharịiwe megide ụkọchukw a a kpọrọ Chinedu Ezedike a sị na aka ya d i n’ọnwu ụmụaka anọ ahụ.

    Ha jicha akwụkwọ ndụ ndụ na-agaghari n’obodo na-ekwe ukwe sị “Emeri o! Emeri o! ozu adaa n’Ibagwa” nakwa “say no to fake pastọ”

    Onyeisioche Igbo Eze South mechara bịa n’Ibagwa Aka ebe ihe a mere, tie ndị obodo aka na n’obi ma rịọ ha nye gọọmentị ohere inyocha nwamadị a.

    Gọọmentị mechara kutuo ụlọ onye ụkọchukwu ahụ ebe a hụrụ ọtụtụ ụgbọala. A kutukwara ebe o ji mere ụlọụka ya.

    Odochabeghi anya etu ihe a siri mee mana BBC Igbo ka na-agba mbọ ịnụta n’ọnụ Onyeisioche Igbo Eze South nakwa ndị uweojii Enugwu Steetị.

    Cheta n’izuụka gara aga ka akụkọ pụtara na otu onye dibia bụ Ozo Ezeani na-egbu ndị mmadụ ma were ha na-eme ọgwụego.

    A hụrụ ozu abụọ e tinyere n’olulu ebe dibia na-arụ ụlọ ma zọpụta nwata nwaanyị dị afọ iri na atọ ha tọọrọ ma chọrọ igbu.

    A nwụchiri mmadụ abụọ na-enyere dibia ahụ aka ma mechaa nwuchi Ezeani n’okeala Naịjirịa na mba Benin dịka ọ na-achọ ịgba ọsọ apụ na Naịjirịa

  18. A chụọla onye ndọrọndọrọ ọchịchị Saụt Afrịka n'ọrụ maka ileta pastọ gbapụrụ agbapụ

    E kwuru na Shivambu ga-anọchite pati ya n'ọgbakọ ndị omeiwu

    Ebe foto si, Gallo Images via Getty Images

    Nkọwa foto, E kwuru na Shivambu ga-anọchite pati ya n'ọgbakọ ndị omeiwu

    Otu onye ọkwa ya dị elu n’otu pati ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke Saụt Afrịka ka a chụrụ n’ọrụ maka ije leta otu pastọ onye Malawị n’ọnwa Eprel.

    E wepụrụ Floyd Shivambu dịka odeakwụkwọ otu pati uMkhonto weSizwe (MK) n’ihe dịka ọnwa isii ọ malitere ọrụ dịka ọ gara ụka Ista n’ụlọ ụka Shepherd Bushiri nke pastọ ahụ.

    Mazị Shivambu kwuru na ya nabatara mkpebi ndị otu pati ahụ mere ma na-atụ anya iwere ọrụ ọhụrụ ya na nzuko omeiwu.

    E kwuru na Shivambu ga-anọchite pati ya na nzuko omeiwu.

    Maazị Bushiri bụ onye Malawị, bụ otu onye ozi a ma ama na mpaghara ndịda Afrịka e jidere ma bo ya ebubo igwu wayo na Saụt Afrịka n’afọ 2020.

    Mgbe a tọhapụrụ ya na mgbapụta beelu, o jisiri ike gbaga obodo ya n'ọnọdụ edoghị anya. Mana mba Saụt Afrịka na-anwa ịchụpụ ya kemgbe ahụ.

    Maazị Bushiri gọnarịrị ebubo ndị ahụ.

  19. E gbuola mmadụ ise mgbe a wakporo ụgbọala UN bu ihe enyemaka mmadụ na Sudan

    Ụgbọala ndị njem ahụ gụnyere gwongworo ụlọọrụ World Food Programme nke UN

    Ebe foto si, AFP via Getty Images

    Nkọwa foto, Ụgbọala ndị njem ahụ gụnyere gwongworo ụlọọrụ World Food Programme nke UN

    Ndị otu United Nations mmadụ ise na-ebuga ihe enyemaka mmadụ n’obodo el-Fasher nke agha tisasịrị na Sudan, ka egburu mgbe a wakporo ha, ụlọọrụ UN kwuru.

    Ọtụtụ mmadụ merụrụ ahụ ebe a gbara ọtụtụ gwongworo ọkụ na mwakpo abalị Mọnde ahụ nke mere n’akụkụ el-Koma na steeti nke Nọt Darfur, ha gbakwunyere.

    Cheta na ndị otu abụọ ahụ n’agha obodo Sudan gụnyere ndị Rapid Support Forces (RSF) na ndịagha Sudan - boro ibe ha ebubo na ha ji duronu wakpoo ọtụtụ ụgbọala UN ahụ.

    Ụlọọrụ UN ekwughụ etu mwakpo ahụ siri mee mana ha kpọrọ oku maka ime nnyocha iji chọpụta ma mee ka ndị kpara ajọ agwa ahụ nata ntarama ahụhụ.

    Ndị njem ahụ bu gwongworo iri na ise sitere n’ụlọọrụ UN na-ahụ maka nri na ụmụaka, bụ ndị kwuru na ọ bụ ihe na-agbawa obi na ihe enyemaka ahụ eruteghị ndị agụụ ji n’obodo el-Fasher.

  20. Aka akparala nwoke ji shọveelụ gbuo agadi nwaanyị n'Ebonyi Steeti

    Nwoke ji shọveelụ kwụrụ n'otu ebe

    Ebe foto si, Getty Images

    Ndi uweojii n'Ebonyi Steeti ekwuola na ha anwuchiela otu nwoke a na-akpọ Ezeoke Chidera bụ onye ji igwe shọveelụ gbụọ onye agbataobi ya bụ nwada Awoke Rose gbara afọ iri isii (60).

    Ihe ọdachi a mere na Mọnde ụbọchị abụọ nke ọnwa Juun na mpaghara Egugho, Ezzagu dị n'okpuruọchịchị ime obodo Ishielu nke steetị ahụ.

    Dịka ọnu na-ekwuru ndị uweojii n'Ebonyi Steeti bụ Joshua Ukandu si kwuo na Ezeoke a na-enyo enyo wakporo agadi nwaanyị ahụ n'ihe dị ka elekere isii nke ụtụtụ ma were shọveelụ kụọ ya ọtụtụ ugboro ma hapụ ya n'ime ọdọ ọbara ya.

    Ọ gara n’ihu kọwaa na ha jidere Ezeoke ozugbo ka a kpọtụụrụ ndị uweojii ma kwuo na e tinyela ozu nwaanyị ahụ n'ụlọ ebe a na-echekwa ozu, dịka nnyocha na-aga n'ihu iji chọpụta ihe kpatara ajọ omume nwamadị a.