Onyeisiala Trump chọrọ ire ụgbọala Tesla ma kwuo na ọchọghị ka ya na Musk nwee mkparịtaụka

Ebe foto si, Reuters
Dọnald Trump ekwuola na ọ chọrọ ire ụgbọala Tesla ya dịka esemokwu ya na Elon Musk na-aga n’ihu.
Elon Musk bụ onyeisi ụlọọrụ na-arụpụta ụgbọala ahụ.
Obi ọchịchị White House Amerịka kwuru na Onyeisiala Trump achọghị ka ya na Musk nwee mkparịtaụka n’agbanyeghị na akụkọ kwuru na ha abụọ ga-enwe mkparịtụka n’ekwenti ụbọchị Fraịde 6 Juun, 2025.
Oge ọ gwara ndị ntaakụkọ okwu, Trump kwuru na Elon Musk bụ onye na-amaghị ihe ọ na-eme. Anyị anụbeghị nzaghachi Musk maka nke a.
Cheta na esemokwu dị n’etiti Trump na Musk pụtara ihe na soshal midịa ụbọchị Tọzde 5 Juun, 2025 oge Trump kwuru na ọ ghọtaghị ihe mere Elon Musk jiri katọọ atụmatụ ụtụisi ọhụrụ ọchịchị wepụtara.


















