Amerịka ga-ewepụrịrị mwakpo tupu a malite mkparịtaụka ọhụrụ - Minista Ịran gwara BBC

Nchịkọta akụkọ ndị kachasị mkpa mere na mbaụwa n'ọnwa Juun 2025.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Uzoamaka Ewuzie, Ikechukwu Kalu, Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Michael Ilediagu, Adline Okere, Marvelous Obomanu

  1. Hamas awakpola ma gbuo ndị ọrụ Palestine asatọ - Otu enyemaka mba Amerịka na-akwado kwuru

    Otu ọhụrụ ahụ mba Izrel na Amerịka na-akwado malitere ọrụ na 26 Mee 2025 iji ekesa ihe enyemaka mmadụ

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, Otu ọhụrụ ahụ mba Izrel na Amerịka na-akwado malitere ọrụ na 26 Mee 2025 iji ekesa ihe enyemaka mmadụ

    Otu ọhụrụ mba Izrel na Amerịka na-akwado maka ikesa ihe enyemaka mmadụ na Gaza kwuru na ndị Hamas wakporo ụgbọala bọs bu ụfọdụ ndị ọrụ Palestine ma gbuo opekata mpe mmadụ asatọ.

    Ụlọọrụ Gaza Humanitarian Foundation (GHF) kwuru na mwakpo ahụ mere n’abalị Wenezde dịka ụgbọala bọs ahụ bu ihe karịrị ndị ọrụ iri abụọ na anọ na-aga njem n’ebe a na-eke ihe enyemaka mmadụ na mpaghara ndịda anyanwụ na Gaza.

    Ha kwuru na nke a mere mgbe ọtụtụ ụbọchị ndị Hamas yiri ha egwu gachara.

    Ụlọ mgbasa ozi BBC enwebeghị ike ịchọpụta ma ebubo ahụ a bụ eziokwu maka ndị Hamas ekwubeghị ihe ọbụla mana ha gọnarịrị mgbe e kwuru na ha yiri ndị ọrụ ụlọọrụ ahụ egwu.

    Otu ahụ malitere ọrụ na 26 Mee 2025 iji ekesa ihe enyemaka mmadụ na Gaza na-esiteghị n’aka United Nations (UN) na òtù ndị ọzọ e guzobere iji kesaa ihe enyemaka na Gaza.

  2. Ehihie ọma nu ndị ọma

    Ka ụbọchị a wetara gị ihe ọma ga-atụ gị anya.

  3. Mba Amerịka ekpebiela iwepụ ndị ọrụ n’ụlọọrụ nnọchi anya dị n’Irak maka esemokwu Iran

    Onyeisiala Trump kwuru na a na-ewepụ ndị ọrụ Amerịka na mpaghara etiti Ọwụwa Anyanwụ nke ụwa

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Onyeisiala Trump kwuru na a na-ewepụ ndị ọrụ Amerịka na mpaghara etiti Ọwụwa Anyanwụ nke ụwa

    Mba Amerịka ekpebiela iwepụ ndị ọrụ ụlọọrụ nnọchi anya Amerịka na ndị ezinaụlọ ha nọ na Baghdad n’Irak n'ihi nnukwu ihe egwu banyere nchekwa, gọọmentị Amerịka kwuru.

    Ndị ọrụ Amerịka ekwughị ihe kpalitere nwepụ ahụ mana akụkọ kwuru na mba Izrel adịla njikere imalite mbuso agha na mba Iran, ụlọọrụ CBS ha na ụlọ mgbasa ozi BBC na arụkọ ọrụ kwuru.

    Nke a so na ihe mere ejiri gwa ọtụtụ ndị Amerịka ka ha hapụ mpaghara ahụ, ndị ọrụ kwuru ma gbakwụnye na ha na-atụ anya na mba Iran nwereike imalite mmegwara n’ebe ndị Amerịka nọ n’Irak.

    Nke a na-abịa dịka mkparịtaụka mba Amerịka gbasara atụmatụ nuklia nke Iran kwụsịrị n'ụbọchị ndị na-adịbeghị anya.

  4. Ụgbọelu bụ ndị njem 244 si Indịa aga London akpọkasiala

    Ụgbọelu bụ ndị njem 244 na-aga London akpọkasiala
    Nkọwa foto, Ụgbọelu bụ ndị njem 244 na-aga London akpọkasiala

    Ụgbọelu bụ ndị njem na-aga London ihe ruru mmadụ 244 akpọkasiala dịka ọ malitere ifepụ na mpaghara Ahmedabad n'Ịndịa gaa London na mba Briten.

    Onyeisi ngalaba na-ahụ maka ụgbọelu na mba Indịa si na ụgbọelu “Flight AI171" ahụ bu ndị njem 232 na ndị ọrụ ụgbọelu mmadụ 12.

    A chọpụtala na ndị mmadụ nwụrụ n'ugbọelu ahụ gụnyere 169 ndị mba Indịa, 53 ndị mba Briten na otu onye Kanada nakwa mmadụ asaa abụrụ ndị Pọtugal.

    Air India nwe ụgbọelu nke nwere ihe mberede.

    Ebe foto si, Getty Images/BBC

    Nkọwa foto, Air India nwe ụgbọelu nke nwere ihe mberede.
  5. Ka a ga-esi me mmemme Juun 12 bụ ụbọchị ọchịchị onyekwuoucheya na Naịjirịa

    Nke afọ a bụ afọ iri abụọ na isii Naịjirịa nwere ọchịchị onyekwuoucheya akwụsịghị akwụsị kemgbe njedebe nke ọchịchị ndịagha n’afọ 1999

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Nke afọ a bụ afọ iri abụọ na isii Naịjirịa nwere ọchịchị onyekwuoucheya akwụsịghị akwụsị kemgbe njedebe nke ọchịchị ndịagha n’afọ 1999

    Onyeisiala Naịjirịa Tinubu akagbuola okwu mgbasaozi Juun 12 kama ọ ga-agwa ndị Naịjirịa okwu n’ụlọomeiwu.

    Ọ bụ ụbọchị etinyere icheta ihe gbasara ọchịchị onyekwuoucheya n'oge Muhamadu Buhari bụ onyeisiala.

    Tinubu kagburu mmemme a na-eme n'ọba Eagles Square iji nweike igwa ndị ụmụamaala okwu site na nzụko ndị omeiwu niile ma ndị nke ukwuu ma ndị nta ga-enwe n'ụlọomeiwu Naijiria n'ụbọchị Tọzdee Juun 12, 2025.

    Nke a dị na nkwupụta nke onyeisi mgbasa ozi na mmekọrịta ọha na eze, Segun Imohiosen kwuru dịka ọ si na atụmatụ ndị ọzọ niile enwere ime taa ka nọ kwa ya

  6. A nwụchiela ọtụtụ narị mmadụ dịka udo laghachitara na Los Angeles

    Ndị uweojii na-anwụchi mmadụ

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Ndị uweojii na-anwụchi mmadụ

    Udo alaghachitela na Los Angeles dịka otu abali gara e tinyere iwu onye apụla ezi e tinyere na Los Angeles, ebe a na-atụanya na e nwereike inwe ngagharịiwe n’ebe ndị ọzọ n’Amerịka.

    Akụkọ kwuru na a nwụchiela ihe ruru mmadụ 400 na Los Angeles nke gụnyere mmadụ 330 bịara abịa aha na-adịghị n’akwụkwọ na mmadụ 157 a nwụchiri maka imebi ihe tinyere otu onye e kwuru na ọ chọrọ igbu onye uweojii.

    E zigala ndị ọrụ nchekwa National Guard 4,000 na ndịagha Marine 700 na Los Angeles iji hụ maka nchekwa ọhanzeze ma mee ka udo laghachita.

    Oge ọ gwara ndị ntaakụkọ ogwu ụbọchị Wenezde 11 Juun, 2025, onyeisi mpaghara ahụ bụ Mayor Karen Bass kwuru na ọ bụ iwu ọpụpụ na mbata ọhụrụ Onyeisiala Donald Trump wepụtara kpatara ngagharịiwe ahụ.

    O kwuru na iwu ahụ kpaliri ọtụtụ mmadụ ma tinye ha egwu n’ahụ.

    Mayor Bass kpọkuru Onyeisiala Trump ka ọ kwụsị ngagharịiwe ahụ.

    Ndịagha nọ na Los Angeles iji weta udo

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Ndịagha nọ na Los Angeles iji weta udo
  7. Trump ekwuola na nkwekọrịta azụmahịa Amerịka na Chaịna enweela isi

    Onyeisiala Chaịna Xi Jinping na Onyeisiala Amerịka Donald Trump

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Onyeisiala Chaịna Xi Jinping na Onyeisiala Amerịka Donald Trump

    Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump ekwuola na nkwekọrịta azụmahịa dị n’etiti Amerịka na Chaịna enweela isi.

    Nke a na-abịa dịka ndị isi mba Chaịna na Amerịka nwere mkparịtaụka na Lọndọn.

    Onyeisiala Trump kwuru na ya na onyeisiala Chaịna bụ Xi Jinping ga-ebinye aka na nkwekọrịta a iji hụ na Amerịka ga-eweta igwe ọ natarachi ha chọrọ n’aka Chaịna ebe ụmụakwụwkọ Chaịna ga-eweta ohere n’ụlọakwụkwọ mahadum mba Amerịka.

    Cheta na Amerịka na Chaịna kwuru na ekwenyela n’atụmatụ iweta udo n’okwu azụmahịa dị n’etiti ha abụọ.

    N’ọnwa Mee, 2025, mba abụọ kwekọrịtara ma kwụsịtụ esemokwu azụmahịa ha na-enwe mana mba abụọ ebola ibe ha ebubo dị iche iche banyere ha.

    Ndị ọchịchị Chaịna na Amerịka nwere mkparịatụka na Lọndọn n'izuụka a

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Ndị ọchịchị Chaịna na Amerịka nwere mkparịatụka na Lọndọn n'izuụka a
  8. June 12: Onyeisiala Tinubu ga-agwa ndị Naịjirịa okwu n'ụbọchị ncheta ọchịchị onyekwuouche ya

    Ozi kwuru na a gahị eme ngagharị kama a ga-enwe arụmụka ọhanaeze

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Ozi kwuru na a gahị eme ngagharị kama a ga-enwe arụmụka ọhanaeze

    Onyeisiala Naịjirịa Bola Tinubu ga-agwa ndị Naịjirịa okwu n'ụtụtụ Tọzde 12 Juun ụbọchị ọchịchị onye kwuo uche ya nke afọ 2025.

    Na nkwupụta kọmitii na-ahazi ụbọchị ọchịchị onye kwuo uche ya wepụtara, Onyeisiala Tinubu kwuru na ya ga-esonyere ọgbakọ jikọrọ ndị omeiwu ukwu na ndị omeiwu nta.

    Ozi ahụ kwupụtara na a gahị eme ngagharị kama a ga-enwe arụmụka ọhanaeze n'ọnụ ụlọ ogbako “Presidential Villa” n'elekere anọ nke mgbede.

    Cheta na ụbọchị ọchịchị onye kwuo uche ya nke afọ a ga-eme afọ iri abụọ na isii Naịjirịa na-enwe ọchịchị onye kwuo uche ya akwụsịghị akwụsị kemgbe njedebe nke ọchịchị ndịagha n’afọ 1999.

    Chetakwa na Naịjirịa na-emebụ ụbọchị ọchịchị onye kwuo uche ya na Mee 29 ma na gọọmentị etiti gbanwere ya ka ọ bụrụ Juun 12 iji sọpụrụ ntuliaka a kagburu na 1993 - nke MKO Abiola meriri.

  9. A chọtara ozu ụmụakwụkwọ asatọ nke idei mmiri buru ụgbọala ha na Saụt Afrịka

    Oke mmiri ozuzo na mpaghara Eastern Cape dị na Saụth Afrịka ebelatala

    Ebe foto si, Gift of the Givers

    Nkọwa foto, Oke mmiri ozuzo na mpaghara Eastern Cape dị na Saụth Afrịka ebelatala

    A chọtara ozu ụmụaka asatọ gụnyere onye ọkwọ ụgbọala bụ ndị ideimmiri buru ụgbọala ha na mpaghara Eastern Cape nke mba Saụt Afrịka, dịka onye ọrụ nchekwa obodo Eastern Cape Xolile Nqatha siri gwa ụlọọrụ TV nkeonwe Newzroom Afrịka.

    Ịchọ ụmụakwụkwọ ahụ ideimmiri buru nke kwụsịrị n’abalị Tuzde malitere ọzọ n’ụtụtụ dịka ndịọrụ kwuru.

    Cheta na ụmụakwụkwọ ahụ na-aga akwụkwụ n’obodo Mthatha mgbe ideimmiri buru ụgbọala bọs ha dịka ha na-agafe akwammiri n’ụtụtụ Tuzde 10 Juun 2025.

    Ndị ọrụ ndị ọzọ kwuru na a napụtara ụmụakwụkwọ atọ n’ụbọchị Tuzde mana o doghị anya ụmụakwụkwọ ole nọ n’ime ụbọala bọs ahụ nke a chọtara kemgbe n'akụkụ osimiri na-enweghị onye ọ bụla nọ n'ime ya.

  10. Ndị Austria amụọla anya abalị iji kwaa ozu ụmụakwụkwọ e gburu egbu

    Ọtụtụ ndị gbakọtara n'obodo Austria maka akwamozu ụmụakwụkwọ e gburu

    Ọtụtụ ndị n’Austria amụọla anya abalị iji kwaa ozu ụmụakwụkwọ iri a gbagburu n’ụlọakwụkwọ ha n’obodo Graz n’ụbọchị Tuzde.

    Ndị uweojii kwuru na onye a na-enyo kpara arụ a bụ otu nwoke dị afọ iri abụọ na otu bụbu onye ụlọakwụkwọ ahụ gburu onwe ya dịka ọ gbagbuchara ndị ahụ.

    Akụkọ kwuru na nwakpo bụ nke kachasị ọjọọ kamgbe afọ ahụ malitere.

    Ihe a mere n’ụlọakwụkwọ sekọndịrị Dreierschützengasse dị na mpaghara ugwu nke obodo ahụ.

    Mmadụ iri na abụọ ọzọ merụrụ ahụ, ụfọdụ merụrụ nnukwu ahụ. A ka na-enyocha ihe mere nwamadị a jiri kpaa arụ ahụ.

    Ụmụakwụkwọ ụmụnwaanyị isii na ụmụnwoke atọ so na ndị e gburu, ebe otu nwaanyị ọzọ nwụrụ n’ụlọọgwụ. Ụlọọrụ ntaakụkọ APA na Austria kwuru na mmadụ asaa n’ime ndị a bụ obere ụmụakwụkwọ.

    N’ebe a na-amụ anya akwamozu ndị a, ndị mmadụ kwuru na ha chọrọ ime ka etiti obodo ahụ bụrụ naanị ire ọkụ bụkwanụ nke ha mere.

  11. Oke idemmiri na ifufe ekpochapụla ụmụaka na-aga n'ụlọakwụkwọ na Saụt Afrịka

    Ijiriji ọcha na-egbochi ọtụtụ mmadụ ime njem n'okporoụzọ dị na Saụt Afrịka

    Ebe foto si, KwaZulu-Natal government

    Oke idei mmiri na uzuoku ikuku oyi achụpụla ụmụakwụkwọ na Saụt Afrịka

    Oke idemmiri na ikuku oyi ekpochapụla obere ụgbọala bụ ụmụakwụkwọ na-aga n'ụlọakwụkwọ dị mba na Saụt Afrịka.

    Onye na-ekwuruchitere ọchịchị mpaghara Eastern Cape bụ Khuselwa Rantjie si na a mabeghị ụmụaka ole nọ n’ime obere ụgbọala ahụ mana achọtala mmadụ atọ dịka a na-agba mbọ ịchọta ndị ọzọ.

    N'ebe ọzọ, a hụla ozu mmadụ asaa bụ ndị idemmiri buuru n'akụkụ OR Tambo dị na mpaghara ahụ.

    N'ihi ọdachi so ọnọdụ ihuigwe a, e mechiela ime njem n'okporoụzọ dị na mpaghara abụọ iji kwụsi mmeru ahụ.

  12. Ndị uweojii ejidela ọtụtụ mmadụ dara iwu onye apụla ezi e tinyere na Los Angeles

    Otu nwoke ndị uweojii jidere so na-eme ngagharịiwe na Los Angeles

    Ebe foto si, Reuters

    Ndị uweojii kwuru na ha ejidela ọtụtụ mmadụ site na n'ọnọdụ onye apụla ezi n'abalị nke Onyeisi obodo Los Angeles bụ Karen Bass tinyere.

    Karen Bass tinyere ọnọdụ onye apụla ezi n'abalị iji kwụsị ohi a na-ezu ngwongwo ndị mmadụ nakwa mmebi ihe site na ngagharịiwe a na-eme megide nwuchi ndị mbịarambịa.

    Bass kwuru na a ga-akwụsị ndị mmadụ ime ngagharị na mpaghara ihe karịrị kilo mịta 500sq malite n'elekere asatọ nke abalị ruo elekere isii nke ụtụtụ n'obodo ha.

    Ndị uweojii jupụtara n'okporoụzọ dị na ndịda obodo Los Angeles na-amanye iwu onye apụla ezi n'abalị e tinyere

    Ebe foto si, Getty Images

    O kwuru na nke a gaghị emetụta ndị bi ebe ahụ, ndị ntaakụkọ na ndị ọrụ gbata gbata.

    Gọvanọ Steeti California bụ Gavin Newsom boro Onyeisiala Donald Trump ebubo ọ kwanyere ngharịịwe ahụ ọku site "n'izipụ ndịgha na ndị National Guard ebe a na-eme ngagharịiwe ahụ na Los Angelesa na-enwetụbeghị ụdịrị ya dịka omume ahụ na-emegide ọchịchị onye kwuo uche ya."

  13. Ndị Australịa amụọla anya abalị iji kwaa ozu ụmụakwụkwọ e gburu egbu

    Ọtụtụ ndị gbakọtara n'obodo Australia maka akwamozu ụmụakwụkwọ e gburu

    Ọtụtụ ndị n’Australia amụọla anya abalị iji kwaa ozu ụmụakwụkwọ iri a gbagburu n’ụlọakwụkwọ ha n’obodo Graz n’ụbọchị Tuzde.

    Ndị uweojii kwuru na onye a na-enyo kpara arụ a bụ otu nwoke dị afọ iri abụọ na otu bụbu onye ụlọakwụkwọ ahụ gburu onwe ya dịka ọ gbagbuchara ndị ahụ.

    Akụkọ kwuru na nwakpo bụ nke kachasị ọjọọ kamgbe afọ ahụ malitere.

    Ihe a mere n’ụlọakwụkwọ sekọndịrị Dreierschützengasse dị na mpaghara ugwu nke obodo ahụ.

    Mmadụ iri na abụọ ọzọ merụrụ ahụ, ụfọdụ merụrụ nnukwu ahụ. A ka na-enyocha ihe mere nwamadị a jiri kpaa arụ ahụ.

    Ụmụakwụkwọ ụmụnwaanyị isii na ụmụnwoke atọ so na ndị e gburu, ebe otu nwaanyị ọzọ nwụrụ n’ụlọọgwụ. Ụlọọrụ ntaakụkọ APA kwuru na mmadụ asaa n’ime ndị a bụ obere ụmụakwụkwọ.

    N’ebe a na-amụ anya akwamozu ndị a, ndị mmadụ kwuru na ha chọrọ ime ka etiti obodo ahụ bụrụ naanị ire ọkụ bụkwanụ nke ha mere.

  14. Igbo mma mma nụ ooo!

    Anyị ji ọkpa ekele anabata unu n'ụbọchị taa.

    Gbalịa na-esonyere anyị n'ọgbakọ BBC Igbo niile.

    Ndewo!

  15. Onye gburu ụmụakwụkwọ n’ụlọakwụkwọ Austria bụbu nwatakwụkwọ ụlọakwụkwọ ahụ - Minista Nchekwa

    Ndị ọrụ ahụike na-ebupu ozu ndị nwụrụ n'ọdachi

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Ndị ọrụ ahụike na-ebupu ozu ndị nwụrụ n'ọdachi

    Nnyocha e mere banyere ọnwụ ụmụakwụkwọ iri n’ụlọakwụkwọ Dreierschützengasse high school dị n’Ọstrịa, chọpụtara na ọ bụ onye bụbu nwataakwụkwọ ụlọakwụkwọ bụ ihe gbagburu ụmụakwụkwọ ahụ.

    Nwaamadị gbara afọ 21 ka akụkọ kwuru na o gburu ụmụakwụkwọ iri gụnyere ụmụnwaanyị isii na ụmụnwoke atọ.

    Nchọpụta ndị uweojii kwuru na nwaamadị bụbu nwataakwụkwọ ụlọakwụkwọ ahụ si mpaghara Graz, gburu onwe ya n’ụlọ mposi ụlọakwụkwọ ahụ.

    Ndị uweojii nọ n'ụlọakwụkwọ ahụ.

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Ndị uweojii nọ n'ụlọakwụkwọ ahụ.

    E kwuru na nwaamadị ahụ e nwetara egbe abụọ n’aka ya, agụchaghị akwụkwọ ya n’ụlọakwụwkọ tupu ọ pụọ.

    Akụkọ kwuru na ụfọdụ ụmụakwụkwọ ndị ọzọ meruru ahụ site n'ajọ ọdachi a.

    Onye Chancellor mba Ọstrịa bụ Christian Stocker kpọrọ ịkwa mgbọ ahụ “ihe ọdachi zuru mba niile ọnụ” ma sị na okwu apụghị ịkọwa ihe mgbu na iru uju mba ahụ na-agabiga ugbua.

    Ka ọ dị ugbua, onyeisi obodo Graz bụ Elke Kahr kwuru na ndị ọchịchị na ezinaụlọ ndị ụmụakwụkwọ ahụ nwụrụ ga-enwe ọgbakọ iji mara ihe a ga-eme n’ọdachi a.

    Onyeisi obodo Graz bụ Elke Kahr na ndị uweojii oge ọ na-agwa ọhanaeze okwu

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Onyeisi obodo Graz bụ Elke Kahr na ndị uweojii oge ọ na-agwa ọhanaeze okwu
    Onye uweojii nọ n'ogige ụlọakwụkwọ ahụ

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Onye uweojii nọ n'ogige ụlọakwụkwọ ahụ
  16. A chọpụtala okpokoro isi mmadụ n'ụlọekpere ụkọchukwu a nwuchiri n'Enugwu Steeti

    Okporoisi na mkpara ụkọchukwu Chinedu Ezedike ji arụ ọrụ ya n'ime ọhịa

    Ebe foto si, Screenshot

    Ndị ọrụ nchekwa sị ha chọpụtara okpokoro isi mmadụ n’ogige ụlọ ekpere otu ụkọchukwu a kpọrọ Chinedu Ezedike onye e boro ebubo na o gburu ụmụaka anọ si n’otu ezinụlọ n’obodo n’Ibagwa-Aka di n’Enugwu Steeti.

    Onyeisioche okpuruọchịchị Igboeze South bụ Ferdinand Ukwueze kwuru na kamgbe ha nwuchiri ụkọchukwu ahụ n’izuụka gara aga na ha ka na-achọpụta ọtụtụ ihe n’ụlọekpere ya.

    Ukwueze na ndị uweojii gara njem nchọpụta n’ọtụtụ ụlọ ụkọchukwu ahụ dịka gọọmenti kutuchara ha n’izuụka gara aga.

    Ha bara n’ime ọhịa ebe nwoke a ji mere ebe ekpere ọ kpọrọ ‘synagogue’ ma chọpụta otu okpokoro isi mmadụ e gburu egbu, na mkpanaka o ji achụ aja.

    jikwa ohere ahụ rịọ ndị Ibagwa nakwa mmadụ nille ka ha kpọtụrụ ndị ọrụ nchekwa ngwa ngwa ha hụrụ ihe ọjọọ dị aṅaa.

    “Onye ọbụla emechila ọnụ ma ọ hụ onye na-eme ihe ọjọọ n’obodo. “Nyerenụ anyị bụ gọọmenti aka ịchọpụta ma jide ndị ọjọọ niile nọ n’etiti anyị”

    Ukwueze kwuru na ụlọ na ala niile Ezedike nọ mee mpụ ndị a ga-abụzi nke gọọmentị.

    E burula okpokoro isi mmadụ ahụ gawa ebe a ga-eme nyocha nakwa nchọpụta iji mata onye ọ bụ.

  17. A gbagbuola mmadụ iri n’ụlọakwụkwọ mba Austria

    A gbagbuola mmadụ iri n’ụlọakwụkwọ mba Austria

    Ndị uweojii kwuru na mmadụ iri anwụọla oge a kwara mgbọ n’ụlọakwụkwọ sekọndịrị dị na Graz nke mba Ọstrịa.

    Ndị nwụrụ anwụ gụnyere ụmụakwụkwọ na opekatampe otu okenye tinyekwara onye a na-enyo enyo kwara mgbọ ahụ, ebe ọtụtụ ndị ọzọ nwetara nnukwu mmerụahụ.

    Ọ bụ n’ụlọakwụkwọ Dreierschützengasse high school dị na Ọstrịa ka ọdachi ahụ mere, mgbe ọ kụrụ ihe dịka elekere iri nke ụtụtụ na mba ahụ.

    Ka o sina dị, ndị uweojii kwuru na ha echekwaala ụlọakwụkwọ ahụ.

    Onye Chancellor mba Ọstrịa bụ Christian Stocker kpọrọ ịkwa mgbọ ahụ “ihe ọdachi zuru mba niile ọnụ” ma sị na okwu apụghị ịkọwa ihe mgbu na iru uju mba ahụ na-agabiga ugbua.

  18. A malitela ngagharịiwe na Kenya n’ihi nwaokoroọbịa nwụrụ n’aka ndị uweojii

    A malitela ngagharịiwe na Kenya n’ihi nwoke nwụrụ n’aka ndị uweojii

    Ebe foto si, Andalou via Getty Images

    Ọtụtụ ndị ọnụ na-eru n’okwu amalitela ngagharịiwe n’otu ọbaozu dị n’isi obodo Kenya bụ Naịrobi.

    Nke a sochiri ọnwụ nwaokoroọbịa dị afọ iri atọ na otu aha ya bụ Albert Omondi Ojwang, onye nwụrụ oge ọ nọ n’aka ndị uweojii.

    Ọnwụ Ojwang akpaliela iwe na ọnụma na Kenya. A nwụchiri ya n’ụbọchị Fraịde oge osote onyeisi ndị uweojii mba Kenya bochara ya ebubo imebi aha ya na soshal midịa.

    N’ozi ndị uweojii wepụtara, ha kwuru na Ojwang “nwetara mmerụahụ n’isi, oge ọ kụrụ isi ya n’ahụ aja n’ụlọnga,”.

    Ka o sina dị, Ọkaiwu ezinaụlọ Ojwang bụ Julius Juma kwuru na ọtụtụ mmerụahụ dị n’ozu nwaamadị ahụ, nke gụnyere akpụ dị ya n’isi, n’imi nakwa na ntị.

  19. Trump ezigala ndị 'National Guard' 2000 ọzọ na ndịagha 'Marine' gawa na Los Angeles

    Nchekwa National Guard ezipuru na Los Angeles nọ n'ọrụ ebe a na-eme ngagharịiwe.

    Ebe foto si, Reuters

    Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump ezipụla ndị nchekwa National Guard ọzọ ruru puku abụọ ma na-akwado izipukwa ndịagha pụrụiche a kpọro ‘Marines’ ruru narị asaa gawa obodo Los Angeles iji nye aka kwụsị ngagharịiwe a na-eme megide nwuchi ndị mbịarambịa.

    Mgbe Trump na-ezipụ ndị ọrụ nchekwa a pụrụiche, o kwuru na ha ga-ememina ndị a na-eme ngagharịiwe.

    Gọvanọ Steeti California bụ Gavin Newsom kwuru na ọ ga-akpụpụ gọọmentị Trump n’ụlọikpe maka izipụ ndị ọrụ nchekwa n’obodo LA.

    N’ozi o wepụtara na soshal midia X, Newson kwuru na "e kwesighi iziga ndịagha ‘Marine’ n’obodo dị n amba Amerịka maka ibu agha megide ụmụafọ ibe has iji mezuo ọchịchị onyeisiala ji aka ike achị obodo. Nke a megidere ihe e ji maara Amerịka.”

    Otu nwaanyị so na-eme ngagharịiwe ka ọ kwụụ n'ihu ndị nchekwa National Guard n'obodo Los Angeles

    Ebe foto si, Reuters

    Ngagharịiwe ahụ malitere na ndịda obodo LA n’ụbọchị Fraịde mgbe ndị ọrụ na-ahụ maka ọpụpụ na mbata bụ Immigration Customs Enforcement (ICE) gara ọrụ iwuchi ndị mmadụ n’ebe dị iche iche nke obodo ahụ.

    Onye ntaakụkụko BBC bụ Carl Nasman kwuru na a dịla na mbụ kwuo na ngagharịiwe bụ ọgbakọ megidere iwu.

    Kamgbe ngagharịiwe a malitere, ndị nchekwa gụnyere ndị uweojii ejirila mgbọ egbe rọba, anwụrụọkụ anya miri nakwa ihe ndị ọzọ iji chụsasịa ndị a na-eme ngagharịiwe.

    A gbatara onye ntaakụkọ bụ nwafọ mba Australia mgbọ egbe rọba dịka ọ na-arụ ọrụ ịgbasa ozi banyere ngagharịiwe ahụ.

  20. Igbo ndị ji ji jide mma!

    Anyị ekeleela gị n'ụbọchị ọhụrụ ma na-asị ka ihu ọchị waara gị taa.

    Biko, jisie ike na-esonye BBC Igbo na Facebook, Instagram nakwa Websaịt maka akụkọ ndị gbapụtara ihe.

    Ndewo!