Amerịka ga-ewepụrịrị mwakpo tupu a malite mkparịtaụka ọhụrụ - Minista Ịran gwara BBC

Nchịkọta akụkọ ndị kachasị mkpa mere na mbaụwa n'ọnwa Juun 2025.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Uzoamaka Ewuzie, Ikechukwu Kalu, Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Michael Ilediagu, Adline Okere, Marvelous Obomanu

  1. California akpụpụla gọọmenti Donald Trump ụlọikpe maka izipụ ndịagha National Guard

    California akpụpụla gọọmenti Donald Trump ụlọikpe maka izipụ ndịagha National Guard

    Ọkaikpe Ukwu Kalifọnịa bụ Rob Bonta na gọvanọ steeti ahụ bụ Gavin Newsom akpụpụla ọchịchị onyeisiala Amerịka bụ Donald Trump ụlọikpe.

    Bonta na Newsom mere nke a n’ihi ndịagha National Guard Donald Trump zigara Lọs Anjelis na-ebughị ụzọ nata nkwado ha.

    N’ozi o wepụtara, Bonta kọwara nzipụ ndịagha ahụ dịka “itinye mmanụ n’ọkụ na-ere ere ma bụrụkwa nke a na-akwadoghị”.

    Bonta kwuru na “ikike gọọmenti etiti erughị” n’izipụ ndịagha National Guard na mpaghara ahụ ma kwuo na o megidere iwu nke e megharịrị ugboro iri.

  2. Nwunye Onyeisiala Naijiria bụ Oluremi Tinubu agaala Enugwu maka njem ụbọchị abụọ

    Nwunye Onyeisiala Naijiria bụ Oluremi Tinubu agaala Enugwu maka njem ụbọchị abụọ

    Ụlọọrụ nwunye Onyeisiala hibere iji nyere ndị o nweghị ka ọ dị ha aka nakwa iji ịkwalite ọnọdụ ụmụnwaanyi na ndị nwere nkwarụ a kpọrọ Renewed Hope Initiative (RHI) ebutela onyinye karịrị puku iri maka ụmụnwaanyị na-aghọ nwa n’Enugwu.

    E mere nke a n’ụbọchị Mọnde 9 Juun 2025 oge nwunye onyeisiala Naịjirịa bụ Oluremi Tinubu wuchiri n’Enugwu maka ịmalite njem ụbọchị abụọ ya nke gunyere inyepụ onyinye ndị ahụ nakwa ịgbape ọtụtụ akụrụngwa gọọmenti Enugwu rụrụ ọhụrụ.

    Nwunye Onyeisiala Naijiria bụ Oluremi Tinubu agaala Enugwu maka njem ụbọchị abụọ

    Ngwangwa ụgbọelu bụ nwunye onyeisiala, nwunye osote onyeisiala bụ Hajia Shettima na ndị otu ha dara n’ọdụ ụgbọelu Akanụ Ibiam dị n’Enugwu, Tinubu si ebe ahụ gaa nzukọ ya na ndị Igwe nwere n’Obi ha dị n’ụlọ omeiwu Enugwu steeti, ebe ha nọrọ kpaa maka ihe gbasara ụmụnwaanyị na ọrụ ndị Eze obodo.

    Nwunye Govano Enugwu bụ Nkechinyere Mbah bụ onye nabatara ma duru ha gaa n’ụlọ ezumeezu “International Conference Centre” ebe a nọọrọ nye ndị ọrụ ahụike karịrị puku iri akụrụngwa dị iche iche ha ji arụ ọrụ.

    Nwunye Onyeisiala Naijiria bụ Oluremi Tinubu agaala Enugwu maka njem ụbọchị abụọ

    Nke na-eso ya wee bụrụ ike nri nye ndị o nweghị ka ọ dị ha n’ogige Okpara Square nke nwunye osote onyeisiala bụ Hajiya Shetima hụrụ maka ya.

    N’abali Mọnde, ndị ọbịa ahụ ga-ezukọ na Old Government Lodge Enugwu ebe gọọmenti Enugwu na-ahazi mmemme ịkụ ngaji n’eze nakwa mmemme ndị ọzọ iji kelee nwunye onyeisiala ma gosi ya ihe e jiri mara Enugwu dịka nri, egwu na ejije.

    Nwunye Onyeisiala Naijiria bụ Oluremi Tinubu agaala Enugwu maka njem ụbọchị abụọ

    Njem ụbọchị abụọ ahụ Sinetọ Oluremi Tinubu gara n’Enugwu steeti ugbua ka ga-agakwa n’ihu echi.

  3. Etu otu kọmishọna n’Abia Steeti si gbanahụ ọnwụ n’aka ndị ojiegbe

    Chaka Chukwumerije bụ kọmishọna na-ahụ maka ala n'Abia Steeti

    Ebe foto si, Chaka Chukwumereije/Facebook

    Kọmishọna na-ahụ maka ala n’Abia steeti Chaka Chukwumerije agbanahụla ọnwụ site n’aka ndị ojiegbe n’ụbọchị Satọde abalị asaa nke ọnwa Juun, 2025.

    N’ozi e bipụtara na soshal midia, kọwaara na nke a mere mgbe o si n’obodo ya bụ Umunneochi na-alọta n’okporoụzọ awarawa si Okigwe gawa Umuahia.

    O kwuru na ụgbọala ha gafetụrụ Okigwe na-agbada n’ụzọ Umuahia ka otu ụgbọala bịara ha nso chọrọ ịgbachi ha ihu, nke mere ka ha kwụsịtụ jụọ ndị a ihe na-eme.

    Ọ sị na ndị nọ n’ụgbọala ahụ malitere ịgba ha egbe, ngwa ngwa ahụ ka ụgbọala nke ha ji ọsọ gbafere ha ma.

    N’ihe onyonyo o wepụtara, a hụrụ ka mgbọ egbe tupuchara ụgbọala ha mana o kwuru na o nweghi onye merụrụ ahụ n’ime mmadụ atọ ha dị.

    Dịka ọ dị ugbua, gọọmentị Abia ekwubeghi ihe ọbụla maọbụ ndị uweojii banyere mwakpo a tupu e bipụta akụkọ a.

  4. A kwụsịla ndị uweojii Kenya ọrụ ka otu nwoke nwụchara n’ụlọnga

    A kwụsịla ndị uweojii Kenya ọrụ ka otu nwoke nwụchara n’ụlọnga

    Ebe foto si, Getty Images/X

    Ndị uweojii mba Kenya nọ n’ọrụ n’ụbọchị otu nwoke nwụrụ n’ụlọnga abụrụla ndị a kwụsịtụrụ ọrụ.

    E kwuru na ọnọdụ a ga-adịgide ruo mgbe e mechara nnyocha gbasara ihe butere ọnwụ nwaokoroọbịa ahụ.

    Dịka onyeisi ndị uweojii Kenya bụ Douglas Kanja siri kwuo, a nwụchiri Albert Ojwang n’ụbọchị Fraịde oge osote onyeisi ndị uweojii mba ahụ bochara ya ebubo imebi aha ya.

    “Oge ọ nọ n’aka ndị uweojii, Ojwang nwetara mmerụahụ n’isi oge ọ kụrụ isi ya n’ahụ aja n’ụlọnga,” ka ndị uweojii kwuru n’otu ozi ha wepụtara.

    Ha gara n’ihu kwuo na “e bugara ya ụlọọgwụ, bụ ebe a nọọrọ kwuputa ya dịka onye nwụrụ anwụ”.

    Onyeisi otu Amnesty International na Kenya gwara BBC na ọnwụ Maazị Ojwang a kọwara dịka onye nkụzi na onye na-ebipụta akụkọ na soshal midịa bụ nke “a na-enyo enyo”.

  5. Ndị uweojii sị na ha na-enyocha ogbugbu e gburu Blessing Eze n'Ogun steeti

    Kọmishọna uweojii n'Ogun bụ Omolola Odutola na ndịagha Ifo gbakọtara n'ahịa

    Ebe foto si, Ogun State Police/Screenshot

    Ndị uweojii Ogun steeti ekwuola na ha amalitela inyocha ọnwu nwaada Blessing Eze onye na-ere ahịa e gburu n'ahịa dị n'obodo Ifo nke Ogun Steeti.

    Akụkọ kwuru na nke a mere n'ụbọchi Fraịde 6 Juun, 2025 mgbe a na-eme emume Eid Mubarak nke ndị okpukperechi Alakụba.

    N'ụbọchị ahụ ndị otu ọtawaike adịgboroja nọ na-anakọrọ ndị na-ere ahịa ego dị otu puku naịra na narị ise (N1500) n'ike.

    Dịka ha rutere n'ebe Blessing Eze na-ere ahia, ọ gwara ha na onweghi ego o nwere makana o rebeghi ahịa n'ụbọchị ahụ ma rịọ ka ha bịaghachị, otu n’ime ndi ahụ kụsasịrị ngwaahịa ya ma mgbe o jidere ya ka o dozie ngwaahịa ahụ, onye ahụ weere mma sụọ Blessing n'obi.

    Blessing dara n'ala ma nwụọ n'ebe ahụ, nke mere ka ọgbaghara dapụta n'ahịa n'ụbọchị ahụ.

    Ndị si mpaghara Ọwụwa Anyanwụ na-ere ihe ahịa ahụ agbachiela ọdọahịa ha ruo ụbọchị anọ iji gosi iwe ha banyere ogbugbu onye otu ha.

    Ha mekwara ngagharịiwe ma kwuo o teela anya ndị a malitere ịkpagbu n'ahịa na-arịọ ka gọọmentị Ogun Steeti gbatara ha ọsọ enyemaka.

    Mgbe BBC Igbo kpọtụụrụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Ogun steeti bụ Omolola Odutola, o kwuru na ihe dị etu a mere n'ezie ma gbakwụnye na ha amalitela inyocha ihe kpatara ọnwu Mrs Blessing Eze.

  6. Mba Amerịka na Chaịna amalitela mkparịtaụka ọzọ banyere azụmaahịa

    Ụgbọmmiri bu ngwaahịa n'ọnụ mmiri

    Ebe foto si, Getty Images

    Mkparịtaụka ọhụrụ iji idozie agha azụmaahịa dị n'etiti mba Amerịka na Chaịna ga-enwe isi n'obodo London n'ụbọchị Mọnde 9 Juun, 2025

    Ndị nnọchiteanya mba Amerịka na mkparịtaụka ahụ gụnyere odeakwụkwọ azụmaahịa bụ Howard Lutnick ga-ezute ndị nnọchiteanya mba Chaịna dị ka Osote Primia bụ He Lifeng iji dozie esemokwu dị n'etiti akụnaụba abụọ a kachasị ukwuu n'ụwa bụ nke na-eyi azụmaahịa mbaụwa egwu.

    N'otu ọnwa gara aga isiobodo mba Amerịka bụ Washington na nke Chaịna bụ Beijing nwere nkwekọrịta ikwụsịtụ ụtụisi ha tinyere na ngwaahịa ha mana obodo abụọ a ebola onwe ha ebubo imebi nkwekọrịta ahụ.

    Mkparịtaụka ọhụrụ a sochiri oku ekwentị dị n'etiti Onyeisiala Amerịka bụ Donald Trump na ogbo ya nke Chaịna bụ Xi Jinping n'izuụka gara aga nke Trump kọwara dị ka "okwu dị mma".

  7. A gbaala ọtụtụ ụgbọala ọkụ na ngagharịiwe na-eme na Los Angeles mba Amerịka

    Ndị uweojii na-agba ndị na-eme ngagharịiwe anwụrụọkụ anyammiri

    Ebe foto si, EPA

    Ngagharịiwe a na-eme megide ndị ọrụ gọọmentị na-amanye iwu mbịarambịa n’obodo Los Angeles abanyela ụbọchị atọ dịka ndị uweojii kwuru na ọgbakọ ọbụla a na-eme na ndịda obodo LA bụ nke iwu na-akwadoghi.

    A gbaala ọtụtụ ụgbọala ọkụ ma zuo ọtụtụ ngwo ngwo ndị mmadụ, ebe otu nwafọ mba Briten merụrụ mgbe a gbara ya mgbọ egbe rọba, ugbua a na-achọ ịwa ya ahụ.

    Nwafọ mba Australia merụkwara ahụ site na mgbọ egbe rọba a gbara ya n'oge ngagharịiwe ahụ.

    Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump kwuru na “ihe dị ezigbote njọ na LA”, ma sị ka eziga ndịagha ebe ahụ.

    Mgbe ndị uweojii gbochiri ụzọ ka ndị ngagharịiwe ghara ịgafe

    Ebe foto si, EPA

    Trump adịla mbụ ziga ndị nchekwa ‘National Guard’ – nke megidere ubomnobi gọvanọ Carlifornia bụ Gavin Newsom.

    Ebe ngagharịiwe ahụ na-eme bụ mpaghara ndịda Los Angeles dịka onye ntaakụkọ BBC bụ Peter Bowes si kwuo ma sị na obodo dịka ọ datụrụ jụụ n’abalị Sọnde.

    Cheta na ọgbaghara ahụ malitere n’ụbọchị Fraịde mgbe ndị ọrụ mbịarambịara gara ịmanye iwu n’ebe dị iche iche n’obodo Los Angeles.

  8. Igbo ndị ọma jọkwa nụ ooo!

    Ụkpa ekele ka anyị na-ebunye gị na mbido izuụka a.

    Anyị na-asị ka ahịa ọma ahụ ị kpọsara ree onwe ya nke ọma.

    Gbalịa na-esonye n'ọgbakọ BBC Igbo na Facebook, Instagram nakwa websaịt maka akụkọ ndị hiri odo n'ụwa gbaa gburu gburu.

    Daalụ!

  9. Nwaafọ Kenya e jichiri maka ozi o bipụtara na soshal midịa anwụọla

    Nwaafọ Kenya e jichiri maka ozi o bipụtara na soshal midịa anwụọla

    Ebe foto si, X

    Ụlọọrụ ndị uweojii kwụụrụ onwe ha na mba Kenya amalitela ime nnyocha gbasara ọnwụ otu nwoke e jichiri maka “ibipụta ozi ụgha”.

    Ọ bụ ndị uweojii kwupụtara nke a.

    A nwụchiri Albert Ojwang n’obodo Homa Bay dị na mpaghara ọdịda anyanwụ mba ahụ maka ozi o bipụtara n’ọbaozi X.

    Nna ya bụ Meshack Opiyo gwara ndị ntaakụkọ na a kpụụrụ nwa ya gawa isi obodo Kenya bụ Naịrobi.

    “Oge ọ nọ n’aka ndị uweojii, Ojwang nwetara mmerụahụ n’isi oge ọ kụrụ isi ya n’ahụ aja n'ụlọnga,” ka ndị uweojii kwuru n’otu ozi ha wepụtara.

    Ha gara n’ihu kwuo na “e bugara ya ụlọọgwụ, bụ ebe a nọọrọ kwuputa ya dịka onye nwụrụ anwụ”.

    Onyeisi otu Amnesty International na Kenya gwara BBC na ọnwụ Maazị Ojwang a kọwara dịka onye nkụzi na onye na-ebipụta akụkọ na soshal midịa bụ nke “a na-enyo enyo”.

  10. Izrel egbuola mmadụ anọ n’akụkụ ogige enyemaka dị na Gaza

    Izrel egbuola mmadụ anọ n’akụkụ ogige enyemaka dị na Gaza

    Ebe foto si, Reuters

    Ndị nchekwa Izrel egbuola ndị Palestine anọ na mpaghara ndịda Gaza a na-akpọ Rafah.

    Ndị ọrụ ahụike na mpaghara Gaza kwuru na ndị nchekwa Izrel gburu ndị Palestine anọ dịka ha na-aga ebe a na-eke ihe enyemaka na mpaghara Gaza.

    Ndịagha Izrel kwụrụ na ndị nchekwa ha gbara egbe n'ikuku iji dọọ ndị gbakọrọ ebe ahụ aka na ntị dịka ha weere ha dịka ndị na eyi egwu.

    Ndị ọrụ ahụike Palestine kwuru na ha bupụrụ mmadụ anọ e gburu egbu dịka ọtụtụ ndị mmadụ gbakọrọ n’olileanya na a ga-emepe ebe enyemaka ahụ ka ha nweta nri.

  11. E bola onyeagha Briten ebubo idina nwaanyị n'ike na mba Kenya

    Ndịagha abụọ nọ n'ihu ọgụ

    Ebe foto si, PA Media

    E bola otu onyeagha mba Briten ebubo idina otu nwaanyị n’ike n’akụkụ ogige ọzụzụ ndịagha mba Briten dị na Kenya, ebe a nọbu boo onyeagha ọzọ ebubo igbu mmadụ.

    Ndina n’ike ahụ mere n’ọnwa gara aga n’ebe dị nso n’ogige ọzụzụ a kpọrọ ‘British Army Training Unit Kenya (Batuk) dị nso n’obodo Nanyuki dị na mpaghara ugwu Nairobi.

    A nwuchiri nwoke ahụ ma gbaa ya ajụjụọnụ site n’ihe a mere mgbe ụfọdụ ndịagha a gara n’ụlọ oriri na ọṅụṅụ dị n’obodo ahụ.

    Nnyocha na-aga n’ihu ugbua site n’aka ngalaba uweojii ndịagha Briten na-ahụ maka mpụ ndịagha Briten mere na mba ha nakwa mba ndị ọzọ.

    Minista mba Briten na-ahụ maka nchekwa wepụtara ozi ma kwuo na e jidela “otu onyeagha” na mba Kenya.

    "Agwa ọjọọ dị etu a abụghị ihe anyị na-abata n’etiti ndịagha. Mkpesa ọbụla e nwetere banyere mpụ onyeagha mere, a na-enyocha ya n’ụzọ ziri ezi,” ka minista ahụ kwuru.

    Mpụ idina n’ike nke a sị na onyeagha mba Briten mere na-abịa dịka ebubo pụta buuru na onyeagha mba Briten nọ na Kenya gburu otu nwaanyị bụ onye obodo n’afọ 2012.

  12. Trump ezigala ndị 'National Guard' na Los Angeles ebe ọgbaghara dapụtara

    Ndị ọrụ nchekwa 'National Guard'

    Ebe foto si, Getty Images

    Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump ekeleela ndị ọrụ nchekwa obodo “National Guard maka “ọrụ ha rụrụ ọfụma” n’ime nkeji ole ma ole o kwuru na ọ ga-eziga ha n’obodo Los Angeles.

    Trump dị na mbụ kwuo na ọ ga-eziga ndị ọrụ ‘National Guard’ dị puku abụọ na Los Angeles site n’esemokwu dapụtara n’ebe ahụ.

    Nke a na-abịa dịka ndị ọrụ na-ahụ maka ndị mbịara mbịa na ndị si n’agbụrụ Latino bi na Los Angeles nwere esemokwu dịka ha na-amanye iwu gọọmentị tinyere a kpọrọ ‘immigration law’.

    Onyeisi obodo Los Angeles bụ Karen Bass kwuru na ezipụbeghi ndị ọrụ ‘National Guard’ n’ime obodo ha.

    Mgbe ndị mmadụ na-agba ọsọ maka ọgbaghara dapụtara na Los Angeles

    Ebe foto si, AFP VIA GETTY IMAGES

    Ọtụtụ ndị mmadụ akatọọla Trump maka atụmatụ ya iziga ndị ọrụ nchekwa ‘National Guard’ n’obodo Los Angeles.

    Ndị a gụnyere Gọvanọ California bụ Gavin Newsom bụ onye kwuru na mkpebi ahụ ga-ewetekwu ọgbaghara karịa igbo nsogbu ahụ. Ndị ọzọ katọrọ mkpebi ahụ bụ ọtụtụ ndị ọkwa ha gbagotere na pati Democrat.

    Esemokwu ahụ malitere n’ụbọchị Fraịde mgbe ndị ọrụ mbịarambịara gara ịmanye iwu n’ebe dị iche iche n’obodo Los Angeles.

    Ụlọọrụ ntaakụkọ CBS kwuru na ndị a gara ọrụ ahụ na mpaghara Westlake na South LA bụ ebe ha gara inwuchi ndị na-ejighi akwụkwọ zuru oke bata n’Amerịka.

    Kamgbe ọgbaghara ahụ dapụtara, a nwuchiela ihe ruru mmadụ otu narị na iri na asatọ.

  13. Igbo ndị ọma unu asaala chi?

    Anyị ji obiọma anabata gị n'izuụka ọhụrụ na-asị ka ụwa dịkwara gị na mma.

    Biko, bịa n'ọgbakọ anyị ka ị gụrụ akụkọ ndị anyị ji bịa.

    Ndewo!

  14. Zambia ga-amalite iru újú abalị asaa maka ọnwụ onye bụbu onyeisiala Edgar Lungu

    Edgar Lungu nwụrụ n’ụbọchị Tọzde 5 Juun 2025 na mba Saụt Afrịka

    Ebe foto si, Hindustan Times via Getty Images

    Nkọwa foto, Edgar Lungu nwụrụ n’ụbọchị Tọzde 5 Juun 2025 na mba Saụt Afrịka

    Mba Zambia ekwupụtala iru újú abalị asaa maka ọnwụ onye bụbu onyeisiala Edgar Lungu, bụ onye nwụrụ n’ụbọchị Tọzde 5 Juun 2025 na mba Saụt Afrịka.

    E kwuru na a ga-efe ọkọlọtọ mba Zambịa n’ọkara ma malite imechi ebe ntụrụndụ niile n’ụbọchị Sọnde 8 Juun 2025.

    Ha kwukwara na a na-atụanya ozu Maazị Lungu ịbata mba ahụ n’izu a.

    Gọọmentị Zambịa ekwuola na ọ bụ mba ahụ ga-eme olili ozu maka onye ahụ bụbu onyeisiala, bụ onye nwụrụ mgbe ọ dị afọ iri isii na asatọ (68).

    Maazị Lungu chịrị mba Zambịa dịka onyeisiala afọ isii nke malitere 2015.

  15. Cristiano Ronaldo ekwuola na ọ gaghị esonye n'asọmpi "Club World Cup"

    Ronaldo kwuru na e nwere otu ndị egwuregwu bọọlụ kpọrọ ya oku mana ọ bụghị bọọlụ niile ga ị ga-eche

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Ronaldo kwuru na e nwere otu ndị egwuregwu bọọlụ kpọrọ ya oku mana ọ bụghị bọọlụ niile ga ị ga-eche

    Onye egwuregwu bọọlụ a ma ama si mba Pọtụgal bụ Cristiano Ronaldo ekwuola na ya agaghị agba n'asọmpi iko ndị otu egwuregwu mba ụwa “Club World Cup” nke ọnwa a.

    Ronaldo bụ onye e kwuru na ọ jụrụ oku nke ndị otu bọọlụ ga-esonye n’asọmpi a kpọrọ ya.

    Onye egwuregwu bọọlụ ahụ dị afọ iri anọ akwụsịla ịgbara otu egwu bọọlụ Al-Nassr nke Saụdi Arabịa mgbe ọnwa Juun 2025 gachara.

    Cheta na onyeisi Fifa bụ otu na-ahụ maka egwu bọọlụ na mba ụwa Gianni Infantino kwalitere olileanya ndị mmadụ na Ronaldo nwereike sonyere otu egwu bọọlụ ọzọ dịka Al-Nassr esoghị ndị ga-esonye n’asọmpi ahụ.

    “Agaghị m esonye n’egwuregwu Club World Cup,” Ronaldo kwuru.

  16. Interpol amalitela ịchọ onye bụbu minista gbapụrụ na Gana

    E kwuru na Ofori-Atta gara mba ofesi maka nleta ahụike

    Ebe foto si, Bloomberg via Getty Images

    Nkọwa foto, E kwuru na Ofori-Atta gara mba ofesi maka nleta ahụike

    Òtù ndị uweojii na-ahụ maka mpụ na mba ụwa International Criminal Police Organization (Interpol) amalitela ịchọ onye bụbu minista nke gbapụrụ na Gana.

    Onye ahụ bụbu minista na-ahụ maka ego na Gana Ken Ofori-Atta ka ndị uweojii mba ụwa malitere ịchọ maka ebubo iji ụlọọrụ ọha mee maka ọdịmma onwe ya.

    Nke a na-abịa dịka ndị ọkaiwu Gana kwupụtara na ọ bụ onye a na-achọsi ike maka ebubo itinye aka n'ọtụtụ ihe nrụrụaka mgbe ọ nọ n'ọchịchị yana onye gbanarịrị ikpe ziri ezi dịka ọ gara mba ofesị.

    Ọkwa ndị uweojii mba ahụ abụghị akwụkwọ ikike ijide kama ọ bụ arịrịọ a na-arịọ ndị uweojii n'ụwa niile ka ha jide ya tupu amalite ịkpọlata ya n’ụlọ.

    Ofori-Atta bụ onye e kwuru na ọ gara mba ofesi maka nleta ahụike, o kwubeghị ihe ọbụla banyere ebubo ahụ, mana o kwuru na a na-emeso ya omume n'ụzọ iwu na-akwadoghị.

  17. Rọshịa ewerela droonu mee mwakpo kachasị njọ na mba Yukren

    Rọshịa ewerela droonu mee mwakpo kachasị njọ na mba Yukren

    Ebe foto si, Reuters

    Opekatampe mmadụ atọ anwụọla ebe mmadụ iri abụọ na otu ndị ọzọ merụrụ ahụ oge Rọshịa ji droonu mee mwakpo kachasị njọ n’obodo Kharkiv dị na Yukren.

    Ọ bụ Mayor nke obodo ahụ bụ Ihor Terekhov kwupụtara nke a.

    Terekhov kwuru na Rọshịa jiiri droonu iri anọ na asatọ, ogbuniigwe missile na ogbunigwe ndị na-efe efe wakpoo obodo ahụ n’abalị gara aga.

    O kwuru na mwakpo ahụ “ewetela ọtụtụ mbibi” dịka ọ metụtara ọtụtụ ụlọ obibi ndị mmadụ.

    E mere mwakpo ọjọọ na Yukren n’abalị ụnyahụ oge e gburu mmadụ isii ma merụọ mmadụ iri asatọ ahụ.

    Ọnọdụ ahụ sochiri mwakpo dara ụda Yukren mere n’ogige ndịagha elu Rọshịa n’ụbọchị Sọnde gara aga.

    Oge e mechara mwakpo ahụ, onyeisiala Amerịka bụ Donald Trump kwuru na onyeisiala Rọshịa bụ Vladmir Putin sịrị na ya ga-emegwara.

  18. Igbo nwe mmadụ, ụnụ asaala chi, Ngwụcha izuụka ọma nụ

    Obi ekele ka anyị ji anabata gị n'ọgbakọ BBC News Igbo n'ụbọchị taa bụ Satọde 7 Juun 2025.

    Chinonso Ugorji nọ ebe a n'ụtụtụ a ịkọọrọ gị ka o si akpọtụ n'ala Igbo, Naịjirịa, Afrịka na ụwa dum gbaa gburugburu mana Uzoamaka Ewuzie na Michael Ngene ga-emecha sonyere ya n'ehihie.

    Biko gaa n'ihu nọnyere anyị.

  19. Otu Wagner ga-ahapụ Mali dịka ọ rụchara 'ọrụ' mbuso ndị nnupụisi agha

    Otu Wagner ga-ahapụ Mali dịka ọ rụchara 'ọrụ' mbuso ndị nnupụisi agha

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Otu Wagner ga-ahapụ Mali dịka ọ rụchara 'ọrụ' mbuso ndị nnupụisi agha

    Otu Wagner ekwupụtala na ha ga-ahapụ mba Mali dịka ọ rụchara 'ọrụ' mbuso ndị nnupụisi agha na mba ahụ dị na mpaghara ọdịda anyanwụ Afrịka.

    Ndị otu ahụ si mba Rọshịa na-arụ ọrụ na mba Mali kemgbe afọ 2021, na-enyere ndịagha Mali aka n’ịma ndịagha nnupụisi na-akwado okpukperechi Islam na mba ahụ, aka.

    N’ozi ha wepụtara n’akara Telegram, Wagner kwuru na ụmụafọ Mali ejikọla aka ọnụ iji ebuso ndị na-eyi ọha egwu agha.

    Ha kwukwara na ha gburu ọtụtụ ndịagha nnupụisi na ndị isi ha bụ na-eyi ọha egwu.

    Nkwupụta a na-abịa n'otu ụbọchị ahụ ka akụkọ na-ekwu na ndịagha Mali apụọla n'otu isi ebe ọrụ ha dị n'etiti obodo ahụ, mgbe a wakporo nke abụọ n'ime ihe na-erughị otu izu.

  20. Onye bụbu onye ọkaikpe Naịjirịa Mohammed Uwais anwụọla n'afọ 89

    O jere ozi dịka onye ọkaikpe nke Naịjirịa malite n’afọ 1995 ruo 2006 tupu ọ laa ezumike nka.

    Ebe foto si, Nigeria Supreme Court

    Nkọwa foto, O jere ozi dịka onye ọkaikpe nke Naịjirịa malite n’afọ 1995 ruo 2006 tupu ọ laa ezumike nka.

    Onye bụbu onye ọkaikpe Naịjirịa Mohammed Uwais anwụọla.

    Ọ nwụrụ dịka ọ gbara afọ iri asatọ na itoolu (89), dịka ndị ezinaụlọ ya siri kwuo.

    Akwụkwọ ozi nke ọnụ n’ekwuchitere ụlọikpe kachasị elu na Naịjirịa Akande Festus wepụtara kwuru na onye ọkaikpe ahụ nwụrụ n’ụbọchị Fraịde 6 Juun 2025 n’isi obodo Abụja.

    Ọkaikpe Uwais bụ onye a mụrụ n’ọnwa Juun n’afọ 1936 n'obodo Zaria, Kaduna steeti.

    O jere ozi dịka onye ọkaikpe nke Naịjirịa malite n’afọ 1995 ruo 2006 tupu ọ laa ezumike nka.

    Cheta na onye bụbu onyeisiala Naịjirịa Umaru Musa Yar’Adua nwụrụ anwụ, họpụtara ya ka ọ bụrụ onyeisi na kọmitii na-eme mgbanwe ntuliaka, bụ ebe ọ rụrụ nnukwu ọrụ ma gbaa mbọ iji kwalite usoro ntuliaka na Naịjirịa.