Amerịka ga-ewepụrịrị mwakpo tupu a malite mkparịtaụka ọhụrụ - Minista Ịran gwara BBC

Nchịkọta akụkọ ndị kachasị mkpa mere na mbaụwa n'ọnwa Juun 2025.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Uzoamaka Ewuzie, Ikechukwu Kalu, Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Michael Ilediagu, Adline Okere, Marvelous Obomanu

  1. Ndị isi agha mba Nijie ekwuola na ha ga-eweghara ụlọọrụ uranium dị na mba ahụ

    Ndị isi agha mba Nijie ekwuola na ha ga-eweghara ụlọọrụ uranium

    Ebe foto si, Getty Images

    Ndịagha na-achị mba Nijie ekwuola na ha ga-eweghara ọtụtụ n’ime ụlọọrụ uranium mba Fransị nwe na mba ahụ.

    Ọnọdụ a na-abịa dịka mba abụọ ahụ gara n’ihu na-enwe esemokwu.

    Somaïr bụ nke ụlọọrụ mba Fransị bụ Orano na-elekọta mana Nijie eboola ha ebubo ịkpa ọtụtụ akparamaagwa na-ezighị ezi.

    Kemgbe ha kpachiri ọchịchị n’afọ 2023, ndị isi agha mba Nijie ekwuola na ọ ga-amasị ha ilekọta ọtụtụ akụrụngwa ndị si na chi juru eju na mba ahụ.

    Ha wezugakwara onwe ha n’ebe mba Fransị nọ ma na-achọ ịgakwuru Rọshịa maka mmekọrịta.

    Nijie bụ mba nke asaa kachasị emepụta akụrụngwa uranium n’ụwa dum ma nweekwa akụrụngwa e ji emepụta igwe ndị nke bụ ọkacha mma n’Afrịka.

  2. Ịran na Izrel awakpola onwe ha dịka Ịran kwuru na ha agaghị enwe mkparịtaụka udo

    Ogbunigwe na-efe n'elu

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Ogbunigwe na-efe n'elu

    Izrel na Ịran agaala n’ihu na-awakpo onwe dịka agha dị n’etiti mba abụọ banyere abalị itoolu ya.

    Ndịagha Izrel gbochiri ọtụtụ ogbunigwe Ịran tụrụ ha n’abalị Fraịde 20 Juun, 2025 ma kwuo na ọ bụ ogige mmepụta ngwagha nuklịa mba Ịran dị n’Isfahan ka ha na-elejereanya ịwakpo.

    Nke na-abịa dịka minista Ịran na-ahụ maka mmekọ mba ofesi bụ Abba Araghchi kwuru na Ịran dị njikere inwe mkparịtaụka udo ma ọ bụrụ na mwakpo ahụ kwụsị.

    Minista nchekwa mba Izrel bụ Katz kwuru na otu onyeisi ndịagha Izrel nwụrụ n’ụlọ ya dị na mpaghara Qom.

    N’aka nke ọzọ, obi ọchịchị mba Amerịka ekwuola na Onyeisiala Donald Trump ga-anọ n’izuụka a kpebie ihe mba Amerịka ga-eme banyere mwakpo ndị a.

    Ogbunigwe na-efe n'elu

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Ogbunigwe na-efe n'elu
  3. Ụtụtụ ọma dị be anyị

    Anyị na-anabata gị n'ọgbakọ BBC News Igbo.

    Ekpere anyị bụ ka ihe ọma ị tụrụ anya ya taa a bịa na mmezu.

    Biko na-anọnyere anyị n'ọgbakọ BBC Igbo maka akụkọ ndị gbapụtara ihe n'ụwa.

    Ndewo!

  4. UK ga-ewepụ ndị ọrụ ụlọọrụ nnọchiteanya ha na Tehran ka Ịran malitere mbuso agha ọhụrụ n'Izrel

    Izrel na Ịran na-aga n’ihu n’ịkwakọrịta onwe ha mgbọ

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Izrel na Ịran na-aga n’ihu n’ịkwakọrịta onwe ha mgbọ

    Mba UK ekwuola na ha ga-ewepụ ndị ọrụ ụlọọrụ nnọchiteanya ha dị na Tehran dịka Ịran malitere mbuso agha n’Izrel.

    Ụlọọrụ na-ahụ maka mba ofesị nke UK kwuru na ha ga-akpachara anya site n’ịwepụ ndị ọrụ n'ụlọọrụ nnọchiteanya ha dị n’Ịran.

    Nke a na-abịa dịka Izrel na Ịran na-aga n’ihu n’ịkwakọrịta onwe ha mgbọ, ebe Ịran tụrụ Izrel ogbunigwe ọhụrụ n’oge ehihie Fraịde 20 Juun 2025.

    Cheta na ndịagha Izrel kwuru na ha kụriri ọtụtụ ebe ha bunaobi nke gụnyere ụlọ ebe a na-emepụta ngwaagha dị na Tehran.

    Ọzọkwa, minista na-ahụ maka ihe na-eme na mba ofesị na UK, Fransị na Jamini na-enwe mkparịtaụka na-aga n’ihu na Geneva taa maka nkwụsị agha dị n’etiti Izrel na Ịran.

    Obi ọchịchị Amerịka “White House” kwuru na Onyeisiala Donald Trump ga-ekwu ihe dịka izuụka abụọ ma Amerịka ọ ga-akwado Izrel maọbụ ọ gaghị.

  5. Ndịagha Izrel egbuola ndị Palestine 23 n'akụkụ ebe enyemaka dị na Gaza - Ndị akaebe

    Ọtụtụ narị ndị Palestine anwụọla n'ịgba ogbunigwe na nso ebe enyemaka

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Ọtụtụ narị ndị Palestine anwụọla n'ịgba ogbunigwe na nso ebe enyemaka

    Ndịagha Izrel egbuola ndị Palestine mmadụ iri abụọ na atọ mgbe ha gbara egbe ebe ọtụtụ mmadụ gbakọrọ n’ebe a na-eke ihe enyemaka na Gaza, ndị akaebe na ndị dọkịnta kwuru.

    Tankị na dorunu na-agba ọtụtu puku mmadụ nọ nso n’ebe a na-eke ihe enyemaka mmadụ mapaghara etiti Gaza nke mba Amerịka na otu Izrel na-akwado, ndị akaebe na ndị dọkịnta kwuru.

    Ndị nchekwa Izrel kwuru na ndịagha ha kwuru na ha kwara mgbọ ịdọ aka na ntị n’ebe ndị mmadụ gbakọrọ.

    Otu ụgbọelu Izrel gbara "ọtụtụ ndị a na-enyo enyo" ndị IDF kwuru na ha na-agakwuru ndịagha mgbọ.

    Ndị GHF gọnarịrị ogbugbu mere n'akụkụ saịtị ya. Mịnịstrị ahụike Hamas na-achị kwuru na egbuola ihe karịrị ndị Palestine 400 n'ụdị ọnọdụ ahụ kemgbe ngwụcha ọnwa Mee.

  6. Senịgal akagbuola ọzụzụ otu egwu bọọlụ nkata n’Amerịka maka enwetaghị akwụkwọ visa

    Senịgal na-akwado maka asọmpi "AfroBasket" n'ọnwa Julaị

    Ebe foto si, Basket Sénégal

    Nkọwa foto, Senịgal na-akwado maka asọmpi "AfroBasket" n'ọnwa Julaị

    Mba Senịgal akagbuola ọzụzụ otu egwu bọọlụ nkata ụmụnwaanyị ha n’Amerịka dịka Praịm minista mba ahụ dị n’ọdịda ọwụwa anyanwụ kwuru na ya kagburu ọzụzụ ahụ maka enwetaghị akwụkwọ visa.

    Praịm minista Ousmane Sonko kwuru na otu egwu bọọlụ nkata ahụ ga-enwezi ọzụzụ ahụ n’isi obodo Senịgal bụ Dakaa “n'ọnọdụ dị mma”.

    Nke a na-eme dịka akụkọ kwuru na mba Amerịka na-atụle imachi mba iri abụọ na ise n’Afrịka nke gụnyere Senịgal ịbata Amerịka.

    Cheta na Amerịka machiri mba iri na abụọ gụnyere asaa nọ n’Afrịka ịbata Amerịka dịka ha tinyere ọnọdụ mgbochi na mba asaa ndị ọzọ nke atọ dị n’Afrịka.

  7. Idemmiri eburula nwata dị afọ 10 n’Abịa steeti

    Nwata dị afọ 10 adanyela n’ọwammiri ma nwụọ n’Abịa steeti

    Ihe ọdachi mere n'Aba dị Abia steeti n’ụbọchị Tọzde 19 Juun, 2025 mgbe otu nwata nwoke nwereike ịdị afọ iri dakpuru n'ime nnukwu ọwammiri ma rugbuo.

    Nwata nwoke ahụ, ka a kọrọ na ọ dakpuru n'ime ọwammiri oge ọ na-achọ ịwụnye ureghure n'ime nnukwu ọwammiri si Omuma Road Aba gawa Cemetery Road Aba.

    Dịka ndị hụrụ ihe merenụ siri kọọ, ọdachi ahụ mere n’agbata elekere abụọ ruo elekere anọ nke ehihie n'oge nnukwu mmiri na-ezo

    Otu onye hụrụ ihe merenụ aha ya bụ Maazị Peter Chukwuemeka Chisom kọọrọ onye ntaakụkọ BBC News Igbo na ọ ga-abụ na e dunyere nwata ahụ kpofuo ureghure n'ime ọwammiri, nke bụ otu akparamagwa jọgburu onwe ya ndị mmadụ na-akpa n'Aba.

    "Mana, dịka ọ na-achọ ịwụnye ureghure ahụ n'ime ọwammiri, ụkwụ ya gbụchapụrụ, ya adakpuo," ka Chisom kọrọ.

    Ndị mmadụ malitere iti mkpu, na-agba mbọ ịnapụta ya, mana mmiri dị n'ọwammiri ahụ na-asọsi ike, ma buru ya gawa.

    E mechara hụ ozu ya mgbe ọ kụrụ ihe dịka elekere isii nke ehihie n'ime ọwammiri dị na Cemetery Road, n’akụkụ okporoigwe, dịka nke ahụ butere nnukwu mwute n’obodo.

    Ndị mmadụ kpọrọ oku ka gọọmenti Abia steeti tinye iwu siri ike iji kụziere ndị mmadụ ọghọm dị n'ụdị akparamagwa ahụ ma wepụtakwa ntaramahụhụ maka ndị ga-ada iwu ahụ.

    N'oge a na-ede akụkọ a, ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Abịa steeti bụ Maureen Chinaka azaghachibeghị ozi e zigaara ya gbasara akụkọ a.

  8. Mba UK, otu EU na mba Ịran ga-enwe mkparịtaụka maka izuụka abụọ Trump nyere

    Mba UK, otu EU na mba Ịran ga-enwe mkparịtaụka maka izuụka abụọ Trump nyere

    Ndị minista na-ahụ maka ihe na-eme na mba ndị ọzọ na mba UK, Fransị na Jamini ga-ezute onye otu ha nke mba Ịran maka mkparịtaụka.

    Ya bụ mkparịtaụka ga-adị na Geneva n’ụbọchị Fraịde 20 Juun 2025, bụ akụkụ mbọ a na-agba iweta agha dị n’etiti Izrel na Ịran na njedebe.

    Nke a na-abịa dịka obi ọchịchị Amerịka kwuru na Trump ga-anọ n’ime izuụka abụọ na-abịa n’ihu kpebie ma Amerịka ọ ga-eso Izrel busoo Ịran agha.

    Dịka odeakwụkwọ mgbasaozi Trump siri kwuo, Onyeisiala Amerịka gburu oge inwe mkpebi dịka o chere na “ezigbo ohere ka dị” maka mkparịtaụka.

    Ndịagha Izrel kwuru na ha wakporo ọtụtụ ogige ndịagha Ịran n’abalị, ebe Ịran tụkwara Izrel ogbunigwe.

    Dịka ndị ọrụ gbatagbata siri kwuo, mmadụ ise merụrụ ahụ na Beersheba dị na mpaghara ndịda Izrel, dịka ọkụ gbara n’akụkụ ụlọọrụ Microsoft.

    Ka o sina dị, Ịran ekwupụtabeghị mmadụ ole ọnọdụ ahụ metụtara.

  9. Igbo mmamma nụ ooo, Ka ụbọchị taa maara onye niile mma

    Ekele ka anyị na-ebutere gị maka isonyere ọgbakọ BBC News Igbo n'ụbọchị taa bụ Fraịde 20 Juun 2025.

    Buru n'obi na anyị ga-ewetere gị akụkọ niile na-akpọtụ n'akụkụ ụwa niile taa na websaịt anyị nakwa n'ọbaozi Facebook na Instagram.

    Biko gaa n'ihu nọnyere anyị...

  10. Rwanda na DR Kongo ekwekọrịtala ibinye aka n'akwụkwọ nkwekọrịta udo iji kwụsị esemokwu

    A na-atụkwa anya na ha ga-ebinye aka n’akwụkwọ nkwekọrịta udo ahụ n’izu na-abịa

    Ebe foto si, AFP via Getty Images

    Nkọwa foto, A na-atụkwa anya na ha ga-ebinye aka n’akwụkwọ nkwekọrịta udo ahụ n’izu na-abịa

    Ndị ọrụ gọọmentị Rwanda na Democratic Republic of Kongo ekwekọrịtala ka ha kwụsị esemokwu nke ọtụtụ iri afọ dị n’etiti mba abụọ ahụ.

    Ọ bụ mba Amerịka na Kataa bụ ndị ogbugbo wetere udo ahụ nke wepụtara ohere ịnapụ ndịagha nnupụisi ngwaagha na njikọta ọnọdụ" nke otu ndịagha na-alụ ọgụ n'ọwụwa anyanwụ DR Kongo.

    Cheta na mba Rwanda gọnarịrị ebubo nkwado otu nnupụisi M23 nke weghaara ọtụtụ mpaghara ahụ n’afọ a.

    Nkwekọrịta ahụ gụnyere iwepụta usoro nchekwa iji gbochie ọkụ ịla elu n'ọdịnihu.

    A na-atụkwa anya na ha ga-ebinye aka n’akwụkwọ nkwekọrịta udo ahụ n’izu na-abịa.

  11. Ọ ga-abụ nnukwu ọdachi ma Amerịka sonye na mwakpo Izrel na-awakpo Ịran - Minista

    Ihe karịrị mmadụ narị abụọ na iri asaa emerụọla ahụ na Izrel dịka Ịran tụrụ ogbunigwe n’ụbọchị Tọzde 19 Juun 2025

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, Ihe karịrị mmadụ narị abụọ na iri asaa emerụọla ahụ na Izrel dịka Ịran tụrụ ogbunigwe n’ụbọchị Tọzde 19 Juun 2025

    Ọ bụru na mba Amerịka sonyere mba Izrel na mwakpo ha na-eme n’Ịran, ọ ga-abụ nnukwu ọdachi na mpaghara ahụ, minista na-ahụ maka ihe na-eme na mba ofensi n’Ịran gwara ụlọ mgbasa ozi BBC.

    “Nke a abụghị agha ndị Amerịka” Saeed Khatibzadeh gwara onye ntaakụkọ Lyse Doucet dịka Onyeisiala Donald Trump na-atụle ihe mba Amerịka ga-eme banyere esemokwu ahụ.

    Ihe karịrị mmadụ narị abụọ na iri asaa emerụọla ahụ na Izrel dịka Ịran tụrụ ogbunigwe n’ụbọchị Tọzde 19 Juun 2025, minista ahụike Izrel kwuru. Mana ndị ọchịchị Ịran ekwupụtabeghị ihe ọbụla banyere ndị merụrụ ahụ taa.

    Minista na-ahụ maka nchekwa n’Izrel kwuru na “agaghị ekwe ka onyeisi kachasị elu n’Ịran nọrọ ndụ” dịka Ịran kụriri ụlọọgwụ Soroka, akụkọ AFP na ụlọ mgbasa ozi obodo kọrọ.

    Ịran kwuru na ọ bụghị ụlọọgwụ ka ha chọrọ ịkụrị kama ọ bụ ogige ndịagha dị nso n’ụlọọgwụ ahụ.

    N’aka nke ọzọ, Izrel kwuru na ọ bụ ụlọ mmepụta ngwaagha nukilịa gụnyere “Arak heavy water reactor na Natanz” nke na-anaghị arụ ọrụ ka ha chọrọ ịkụrị.

  12. Mba Briten amachiela Julius Malema nke Saụt Afrika

    Julius Malema

    Ebe foto si, Getty Images

    A machiela onye ndọrọndọrọ ọchịchị mba Saụt Afrịka e ji iko okwu mara bụ Julius Malema ịbata mba Briten. N’okwu metụtara agbụrụ.

    Ngalaba na-ahụ makai he na-eme n’ụlo nke mba Briten kwuru na ọ bụ maka “ọdịmma ọha” nakwa na ọ bụ ‘ihe a na-bataghị inye ya ohere mbata.

    N’akwụkwọ ozi nke otu ụlọntaakụkọ News 24 bipụtara nke ha kwru si n’aka Gọọmentị mba Briten kwuru na ihe kpalitere nke a bụ na Malema na-enye out Hamas nkwado nakwa ihe o kwuru ka mwakpo mechara n’Izrel n’ọnwa Oktọba nsị na pati ya ga-enye ndị Hamas ngwaagha ma ọ bụrụ na ha bata n’ọkwa ọchịchị.

    Mba Briten kwukwara nwa amadi ahụ kpọkwara oku ka a malite “igbu ndị ọcha” nakwa “iji ngwaọgụ gaa ọgụ” maa a jụ.

  13. Iran atụọla ogbunigwe n'ụlọọgwụ na mba Izrel dịka ọtụtụ mmadụ merụrụ ahụ

    Iran atụọla ogbunigwe n'ụlọọgwụ na mba Izrel dịka ọtụtụ mmadụ merụrụ ahụ Iran atụọla

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, Ka ụlọọgwụ ebe ogbunigwe Iran tụrụla Izrel dara

    Iran atụọla ogbunigwe n'ụlọọgwụ Soroka nke dị na akụkụ Beersheba na mpaghara ndịda Izrel.

    Ụlọọrụ gbata gbata n'Izrel si na ihe ruru mmadụ 65 merụrụ ahụ n'ofe mba ahụ.

    Ogbunigwe a Iran tụrụ mere dịka onyeisi mba Amerịka Donald Trump nyere ikike ka a wakpo Iran mana o mebeghi mkpebi ikpeazu.

    Onye ndu kachasi elu nke Iran adọla Amerịka aka na ntị na Iran ga-ezute ha na ọnọdụ ọjọọ ma ha tinye aka n'agha a.

    Ndị ụlọọrụ ụlọọgwụ n'Izrel bu onye na-arịa ọrịa na-agba ọsọndụ

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, Ndị ụlọọrụ ụlọọgwụ n'Izrel bu onye na-arịa ọrịa na-agba ọsọndụ
  14. Ụtụtụ ọma ndị Igbo

    Ya gaziere anyị niile taata!

  15. Ịran na Izrel na-awakpo onwe ha ka Onyeisiala Trump na-atụle Amerịka itinye aka

    Onyeisiala Trump kwuru na ya nwereike itinye aka maọbụ enweghị,

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Onyeisiala Trump kwuru na ya nwereike itinye aka maọbụ enweghị ike

    Mba Ịran na Izrel na-aga n’ihu na-awakpo onwe ha n’abalị Wenezde 18 Juun 2025 dịka Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump na-atụle ma Amerịka aga-itinye aka.

    Cheta na Onyeisiala Trump kwuru na ya nwereike itinye aka maọbụ enweghị ike, mgbe a jụrụ ya ajụjụ ma mba Amerịka ọ ga-akwado Izrel na-ibuso Ịran agha.

    Onyeisiala Amerịka gbakwunyere: “O nweghị onye ma ihe m chọrọ ime. Mana a na m ekwu nke a: Ịran nwere nnukwu nsogbu ma chọọ ịkpakọrịtaụka”.

    Ndị Ịran zaghachiri site n'ikwu na ha agaghị "agba ọsọ gaa n'ọnụ ụzọ obi ọchịchị mba Amerịka bụ “White House".

    Onye ntaakụkọ BBC kwuru na Amerịka ka ọ dị ugbu a, a rịọbeghị UK ka o jiri ntọala ya na nke Saịprọs ma ọ bụ Diego Garcia were wakpoo Ịran.

  16. Ezinaụlọ Edgar Lungu akwụsitụla atụmatụ ibuleta ozu ya

    Foto Edgar Lungu

    Ebe foto si, AFP via Getty Images

    Nkọwa foto, Foto Edgar Lungu

    Ezinaụlọ Edgar Lungu bụbu onyeisiala mba Zambịa akwụsịtụla atụmatụ ibulata ozu ya na Saụt Afrịka ma bo gọọmenti Zambịa ebubo imetọ mkwekọrịta ha nwere banyere oliliozu nna ha.

    Akụkọ kwuru na ezinaụlọ Lungu gbochiri ụgbọelu kwesịrị ibulata ozu Edgar Lungu ụbọchị Wenezde 18 Juun, 2025 n’agbanyeghị na nkwado niile akụrụla ọnụ.

    Ezinaụlọ ahụ kwuru na ha enweghị ntụkwasiobi na gọọmenti Zambịa ga-eme ihe dị na nkwekọrịta ha nwere.

    Ọnụ na-ekwuru ezinaụlọ Lungu bụ Makebi Zulu kwuru na ozu Edgar Lungu agahị abata Zambịa ụbọchị Wenezde 18, Juun, 2025.

    Zulu kwuru na gọọmenti wepụtara akwụkwọ usoro oliliozu Lungu mana ha agwaghị ezinaụlọ ya.

  17. INEC ajụla na otu PDP agaghị enwe ọgbakọ NEC

    INEC ajụla na otu PDP agaghị enwe ọgbakọ NEC

    Ebe foto si, PDP

    Nkọwa foto, INEC ajụla na otu PDP agaghị enwe ọgbakọ NEC

    Ụlọọrụ na-ahazi ntuliaka na Naịjirịa bụ Independent National Electoral Commission (Inec) kwuru na pati Peoples Democratic Party (PDP) emezughị ihe kwesiri maka ịme nzukọ ọgbakọ ndị isi nke National Executive Committee (Nec).

    N'akwụkwọ ozi ezigara ndị PDP, ụlọọrụ ahụ kwuru na akwụkwọ ozi pati PDP degara ha emezughị usoro nke ụlọọrụ ha wepụtara.

    Cheta na otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị PDP degaara ụlọọrụ Inec akwụkwọ n’abalị iri atọ nke ọnwa Mee banyere nkwado otu ahụ na-eme maka nzukọ ndị isi otu ahụ n’Abụja.

    Inec kwuru na ọ bụ naanị onye na-achị otu ahụ bụ Umar Damagum binyere aka n’akwụkwọ ozi PDP zitere, mgbe o kwesiri ịbụ ya na odeakwụkwọ pati ahụ.

    Cheta na Samuel Anyanwu na Sunday Udeh-Okoye na-arụrịtaụka ugbua banyere onye kacha mma iwe ọkwa odeakwụkwọ nke otu PDP.

  18. Onyeisi kachasị elu n’Ịran adọọla Onyeisiala Trump aka na ntị banyere ikwado mwakpo Izrel

    Ayatollah Ali Khamenei kwuru nke a n’ozi o nyere na televishọn nke steeti n’Iran

    Ebe foto si, EPA

    Nkọwa foto, Ayatollah Ali Khamenei kwuru nke a n’ozi o nyere na televishọn nke steeti n’Iran

    Onyeisi kachasị elu n’Ịran adọọla Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump aka na ntị banyere “mmerụ ahụ na-enweghị atụ” ma ọ bụrụ na ndịagha Amerịka kwado mwakpo mba Izrel megide Iran.

    Ayatollah Ali Khamenei kwuru nke a n’ozi o nyere na televishọn nke steeti n’Iran, ebe o kwuru na mba Iran agaghị ekwe ịkwụsị dịka ha dọrọ onyeisiala mba Amerịka aka na ntị.

    Cheta na Onyeisiala Trump kwuru na mba Amerịka na-atụle ikwado mwakpo mba Izrel wakporo ụlọọrụ na-emepụta ngwaagha n’Iran dịka ụlọ mgbasa ozi CBS News siri kwuo.

    Ọzọ, Izrel kụriri ebe nrụpụta centrifuge abụọ nke Iran n'otu abalị, dịka ndị ụlọọrụ UN na-ahụ maka nuklia siri kwuo, ebe Iran kwuru na ọ jiri ngwaagha hypersonic wakpoo Izrel.

  19. Trump na-atụle isonye mba Izrel n'agha ogbunigwe ha na-ebuso mba Ịran

    Mgbe Onyeisiala Trump na-agwa ndị ntaakụkọ okwu ka ọ na-abanye n'ụgbọelu 'Airforce one'

    Ebe foto si, Reuters

    Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump na-atụgharị uche isonye mba Isreal n’agha ogbunigwe ha na-atụ na mba Iran. Ya na ndịisi ọrụ nchekwa mba ha nwere mkparịtaụka were oge ruru nkeji iri itoolu (90 minutes).

    Otu ebe Amerịka na-achọ ịtụ ogbunigwe na mba Iran bụ ogige ogbunigwe nuklịa ha a kpọrọ Fordo nke nọ n’ime ime ala naanị mba Amerịka nwere ụdịrị ogbunigwe (30,000lb) ga-agbawanwu ogige ahụ, dịka onye ntaakụkọ banyere nchekwa bụ Frank Gardner si kwuo.

    Ndị ndụmọdụ Trump na-enwe nghọtahie n’etiti ha banyere atụmatụ a, bụ nke ndị ọkachamara kwuru na “ọ ga-agbanwe ọtụtụ ihe” banyere agha a.

    Kamgbe ụbọchị atọ gara aga, e bugala ụgbọelu agha atọ nke Amerịka na-eji agbanye mmanụ n’ụgbọelu ha ndị ọzọ na Yurope.

    Trump dọrọ mba Iran aka na ntị ma kwuo “ndidi anyị na ha agbada ala”, ma dee ka mba Iran “Chịlie aka elu!”.

    Mana o kwuru na “anyị” agaghị egbu onyendu mba Iran bụ Ayatollah Ali Khamenei – “ọ bụghị ugbua”

    Ihu eluigwe na mba Izrel dịka ogbunigwe si na mba Ịran na-ada aghara aghara

    Ebe foto si, Reuters

    Mana n’igosi isi akwara ya, Khamenei kwuru na ọ gaghị awụsa ọwa n’ebe mba Izrel nọ, ma “anyị agaghị emere ndị Zionist obi ebere ọbụla”.

    Ka ọ dị ugbua ndị kwe na ndị ekweghi dị na mba Yurope, dịka mba Fransị na-adọ aka na ntị megide mgbanwe ọchịchị na mba Ịran ebe Jamini na-ekele mba Izrel maka ịrụ “ọrụ riri unyi” n’agha ha na-ebuso mba Iran.

    Kamgbe agha bidoro n’ụbọchị Fraịde, mba Iran agbaala ọtụtụ ogbunigwe na mba Izrel iji zaghachị mwakpo Izrel na-awakpo ogige ngwaagha nuklịa ha. N’ime abalị, ha tụrụ ogbunigwe dị egwu a kpọrọ Fattah-1 hypersonic n’isiobodo Izrel bụ Tel Aviv.

  20. Igbo ndị ihe na-agara nke ọma

    Anyị na-ekelekwa gị n'ụbọchị nke etiti izuụka a.

    Ekpere anyị bụ ka ihe ọma ị tụrụ anya ya n'izu a bịa na mmezu tupu ọ na-agwụ.

    Biko na-anyọ nyere anyị n'ọgbakọ BBC Igbo n'ebe niile maka akụkọ ndị gbapụtara ihe n'ụwa.

    Ndewo!