Onyeisiala Yuganda bụ Yoweri Museveni abịnyela aka n’iwu iji
nye ohere ka a na-ekpe ụmụ mmadụ ikpe n’ụlọikpe ndịagha dabere n’ọnọdụ ụfọdụ.
N’ọnwa Jenụwarị ka Ụlọikpe Kachasị kwupụtara ụdịrị iwu ahụ dịbu
na mba Yuganda dịka nke iwu akwadoghị.
Tupu oge ahụ, e nwereike kpụpụ ụmụ mmadụ n’ụlọikpe ndịagha ọ
bụrụ ma a chọta ngwaọrụ ndịagha n’aka ha, dịka egbe na uwe njirimara.
Ndị ọnụ na-eru n’okwu nyere mkpesa n'oge ahụ megide ya bụ iwu ma kwuo na
e ji ya emegide ndị na-akatọ gọọmenti.
N’ọnwa gara aga ka ndị omeiwu kwadoro mmegharị iwu ahụ iji
nye ohere ka ndịagha na-ekpe mmadụ nkịtị ikpe.
Aga m ewepụta ohere gaa nleta na Benue Steeti na Wenezde
Ebe foto si, Bola Ahmed Tinubu/X
Onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Tinubu ekwuola na ọ ga-ewepụta ohere gaa njem nleta na Benue Steeti n’ụbọchị Wenezde maka o gbugbu e gburu ndị mmadụ n’obodo Yelewata dị na steeti ahụ.
Tinubu kwesịrị ị ga Kaduna steeti n’ụbọchi Wednezde ị mepe ọrụ dị iche iche gọọmentị steeti ahụ na-aru, mana ọ tụgharịrị ya ruo Tọzdee iji dozie ụzọ maka nleta ọ ga-eme na Benue.
“Aga m ewepụta ohere gaa hụụ ndị Benue Steeti n’ụbọchị Wednezde,” ka Tinubu kwuru n’ụbọchị Mọnde ka ọ na-agbape ụlọọrụ na-enye mmiri n’Abuja.
Nkwupụta nke ọnụ na-ekwuru Onyeisiala bụ Bayo Onanuga, kọwara na Tinubu ga-eji ohere ahụ nwee nzụkọ ya na ndị niile ihe a metụtara nke gụnyere ndị eze ọdịnala, ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị, okpukperechi, ndịisi obodo, na otu ndị ntoroọbịa iji chọọ ihe ngwọta zuru oke maka nsogbu a.
Trump kwuru na ọ bụghị n'ihi agha Izrel na Iran mere o ji hapụ ọgbakọ G7
Ebe foto si, Getty Images
Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump, onye hapụrụ ọgbakọ
ndịisi mbaụwa G7 ọ gara na mba Kanada kwuru na ọ bụghị n’ihi agha dị n’etiti
Izrel na Iran mere o jiri hapụ ọgbakọ ahụ.
N’ozi o wepụtara n’akara soshal midia ya, Trump
kwuru na Onyeisiala mba Fransị bụ Emmanuel Macron “ekwuteghi” ya mgbe o kwuru
na Trump laghachịrị na Washington maka inwe mkparịtaụka udo n’etiti Izrel na
Iran.
“Ọ maghị ihe mere m jiri alaghachị na
Washington ugbua”, ka Trump kwuru. “Mana ọ bụghị ihe gbasara mkparịtaụka udo. Ọ
bụ ihe karịrị nke ahụ.”
Trump akọwaghị kpọmkwem ihe mere o jiri hapụ ọgbakọ
ahụ, mana ọ pịachiri okwu ya sị “na-aṅa nụ nt!”
Onyeisiala mba Fransị mgbe ọ
na-ekwu okwu n’ọgbakọ G7 n’ụbọchị Mọnde sị na Trump hapụrụ ọgbakọ ahụ makai he dị
mma, nke bụ ịhụ na e wetere mkparịtaụka udo n’etiti Iran na Izrel.
“E nwere ohere mkparịtaụka maka
etu a ga-esi kwụsị ịkwa mgbọ ma wete udo”, Macron gwara ndị ntaakụkọ.
Akụkọ kwuru na isiụlọọrụ mba Amerịka
bụ White House na-atụle inwe mkparịtaụka n’etiti mba Amerịka na ndị ọrụ mba
Iran banyere ngwaagha nuklịa n’izuụka a.
Cheta na kamgbe Fraịde ụbọchị iri
na atọ nke ọnwa Juun ka mba Izrel na Iran malitere ịkwakọrịta onwe ha mgbọ nke
buterela ọnwụ ọtụtụ mmadụ ma laa ngwo ngwo n’iyi.
Nke a malitere mgbe Izrel tụrụ
ogbunigwe n’ogige ebe a na-arụpụta ngwaagha nuklịa dị n amba Iran, nke mere
Iran jiri zaghachị ha site n’ịtụ ogbunigwe aghara aghara n’Izrel.
Checheche Igbo kwenu! Mụọ nụ! Zụọ nụ!
Anyị bu ụkpa ekele na-asị gị nnọọ n'ụbọchị taa ma sị ka ihe ọma niile ị na-eme gaara gị siriri werere.
Biko, gbalịa sonyere anyị n'ọgbakọ BBC Igbo na Facebook, Instagram na Websaịt.
Onyeisiala Amerịka bụ Donald Trump agwala ndị ntaakụkọ Praịm Mịnịsta Kanada bụ Mark
Carney okwu dịka ọgbakọ ndị otu G7 malitere na Kanada.
Trump kwuru na ọchụchụ a chụrụ Onyeisiala Rọshịa bụ Vladmir
Putin n’otu ahụ a mabuuru dịka G8 n’afọ 2014 bụ nke ha akpachapụghị anya mee.
O kwukwara na mba Amerịka na Kanada pụrụ inwetazu nkwekọrịta
azụmaahịa ha mana ya agaghị ada mba na nkwenye o nwere maka ụtụisi.
Oge ọ na-anabata ndị otu G7, Carney kwuru na ụwa niile lekwasara
ha anya maka ezi ndu ma kwuo na ha nọ “n’oge ịgbanwe akụkọ”.
Nke a bụ ọgbakọ mbụ maka ụfọdụ ndị ndu gbara ọkpụrụkpụ, ma bụrụkwa
nke mbụ Trump ga-esonye n’ọgbakọ ahụ kemgbe ọ lọghachiri n’ọchịchị nke ugboro
abụọ ya.
EFCC akpụpụla Emefiele ụlọikpe maka ebubo nrụrụakaego ọhụrụ dị ijeri N7.7
Ụlọorụ na-ebu agha megide mpụ na nrụrụakaego na Naịjirịa bụ
Economic and Financial Crimes Commission (EFCC) akpụpụla onye bụbu Onyeisi Ụlọakụ
Etiti Naịjirịa bụ Godwin Emefiele ụlọikpe.
EFCC kpụpụrụ Emefiele n’ihu Ọkaikpe Yususu Halilu nke Ụlọikpe
Ukwu dị n’Abụja n’ihi ebubo asatọ ndị gbakwasara ụkwụ na nrụrụakaego dị ijeri
naịra asaa na ụma asaa (N7.7bn).
E bokwara ya ebubo inwe ọgbara ụlọ obibi obosara ya dị square-meter
150 na mpaghara Lokogoma dị n’Abuja.
Ka ọ dị, Emefiela kwuru na aka ya dị ọcha n’ebubo ndị ahụ.
Ọkaiwu na-ama ya ikpe bụ Rotimi Oyedepo rịọrọ ụlọikpe ka ha
lebara okwu ahụ anya ngwangwa ma jichie Emefiele n’ụlọmkpọrọ.
Mana ka o sina dị, Ọkaiwu onye ahụ bụbu Onyeisi Ụlọakụ Etiti
Naịjirịa chetaara ụlọikpe na a gbaala akwụkwọ atọ na mbụ megide Emefiele
tinyere nke ugbua mere ya anọ.
Ọ gara n’ihu rụtụ aka na ụlọikpe ndị ọzọ nyere Emefiele ntọhapụ
beelụ na nso nso a ma tinye akwụkwọ ka ụlọikpe ahụ nye ya beelụ nke ha.
Ka e mesịrị, ya bụ ụlọikpe nabatara akwụkwọ ntọhapụ beelụ ahụ,
ma nye iwu ka nwaamadị ahụ na-azara ọnụ ya kpọta ndị akaebe abụọ nwere ngwongwo
ruru ijeri naịra abụọ (N2bn) n'ime elekere iri asaa na abụọ iji hụ na e jichighị
ya n’ụlọmkpọrọ.
Nwata dị afọ iri ejirila egbe gbagbuo nna ya n’Anambra steeti
Ebe foto si, Anambra state police command
Ụlọọrụ ndị uweojii Anambra steeti eweela iwe n’ihi ihe ọdachi
butere ọnwụ onye ọrụ ha bụ Okolie Amechi.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Anambra steeti bụ Tochukwu Ikenga kwupụtara
nke a n’ozi ọ wepụtara n’ụbọchị Mọnde 16 Juun 2025.
Ikenga kọwara na ihe ọdachi ahụ mere n’isi obodo Anambra
steeti bụ Ọka n’abalị Sọnde 15 Juun 2025 oge nwa onye uweojii ahụ dị afọ iri
gbapụrụ mgbọ na-amaghị ama.
Ozi ahụ kwuru na nwa onye uweojii ahụ gbapụrụ mgbọ egbe
AK-47 nna ya na-amaghị ama, dịka mgbọ tụtara nna ya n’azụ ma tụtakwa nwanne ya nke
abụọ n’aka.
Dịka ozi ahụ siri kwuo, ndị dọkịta kwupụtara Amaechi dịka
onye nwụrụ anwụ oge e bugara ya ụlọọgwụ, mana nwa ya nke mgbọ tụtara na-anara ọgwụgwọ
n’ụlọọgwụ ugbua.
Ka ọ dị ugbua, ndị uweojii eburula ya bụ egbe AK-47 ma dọnyekwa
ozu nwoke ahụ nwụrụ anwụ n’ọbaozu.
Ikenga mere ka anyị mata na ya ga-eme ka ozi ndị ọzọ gbasara
ihe ọdachi ahụ ruo anyị aka dịka oge na-aga.
A họpụtala Blaise Metreweli dịka nwaanyi mbụ ga-abụ onyeisi otu MI6
Ebe foto si, UK Foreign Office/AP
A họpụtala nwada Blaise Metreweli dịka nwaanyị mbụ ga-abụ onyeisi otu nchekwa nzuzo mba Briten a kpọrọ MI6 kamgbe afọ otu narị na iri na isii e hiwere otu a.
Nwada Blaise Metreweli onye banyere n'otu a n'afọ 1999 ga-abụ onyeisi ha nke iri na asatọ dịka ọ ga-anọchi anya Sir Richard Moore n'afọ a.
Ọ na-arụ ọrụ ugbua dịka onye na-ahụ maka nwulite tekịnụzụ n'ụlọọrụ nchekwa a ma kwuo na "obi juru ya ma bụrụ nkwanye ugwu" nye ya ịbụ onyendu.
Praịm minista mba Briten bụ Keir Starmer kwuru na nhọpụta nwada a bụ ihe "akụkọ dị ukwuu" ugbua ọrụ nchekwa ha dị ezigbote mkpa".
MI6 bụ otu ọrụ ha bụ ikpokọta ozi nzuzo ọbula site na mba ha nakwa na mba ofesi iji hụụ na e chekwara mba ahụ megide otu na-eyi ndụ egwu, mpụ dị iche iche.
Nwada a dị afọ iri anọ asaa bụbu onyeisi otu nchekwa MI5 nke yiri ogbo ha MI6 ma rụọ ọrụ na mpaghara etiti Ọwụwa Anyanwụ Yorupe.
Ihe Pope Leo, Onyeisiala Tinubu na ndị ọzọ kwuru maka ogbugbu ndị mmadụ na Benue Steeti
Ebe foto si, Getty Images/Bola Tinubu/Atta Edeh
Onyeisiala Naịjiria bụ Bola Tinubu enyela ndi nchekwa iwu ka a kwusi ogbugbu a na-egbu ndị mmadụ na Benue steeti.
Tinubu nyere ntụziaka a na Sọnde 15 Junn 2025, dịka ndi na-eyi ndụ egwu gburu ihe kariri mmadụ 100 na mpaghara Yelwata n’ime ọchịchị
obodo Guma dị na steeti ahụ.
N'otu ụbọchị ahụ, ndị ntoroọbịa gara n'okporoụzọ ime ngharịiwe
dịka ha na-ekwu na gọọmenti gbara nkiti na-ele anya ka ndị obodo ha si anwu.
Cheta n’ụbọchi Fraịde 12 Junn ndị a na-enyo enyo bụ ndị
na-achị ehi mere mkpa mkpa n'obodo oke n’etiti Benue na Nasarawa steeti ma
gbuo ọtụtu mmadụ dịka ndị uweojii si kọwaa.
Ebe foto si, Attah Edeh
Gọvano steeti ahụ bụ Hyacinth katọrọ ogbugbu a ma kwuo na gọọmentị ya na-eso ndị ụlọọrụ nchekwa gọọmentị etiti, ndị eze ọdịnala, ndịisi obodo, na ndị ọ dị mkpa na-akpa nkata iji mee ka nchekwa sie ike ma mee ka nchekwa na udo ga-adịgide ikwụsi ogbugbu ndị a.
Onye bụbu Osote Onyeisiala na Naịjiria na onye zọrọ ọkwa onyeisiala n'aha pati PDP n'afọ 2023 bụ Atiku Abubakar kwuru na ogbugbu a na-egosi na nsogbu nchekwa na-akawanye njọ nke cheere Naịjirịa n’ihu ma gwa gọọmenti etiti na ndị ọchịchị Benue steeti ka ha malite nnyocha ngwa ngwa banyere mwakpo ahụ ma chọpụta ndị na-akpa arụ a.
Onyeisi ụka Katọlik n'ụwa bụ Pope Leo tupu ọ malite ikpe ekpere Angelus n'ụbọchị Sọnde kpere ekpere maka "nchekwa, ikpe ziri ezi, na udo" maka ogbugbu mere na Benue steeti, ma kwuo na echiche maka "Obodo ndị Kraịst nọ n'ime obodo Benue steeti."
Ebe foto si, Attah Edeh
Ụlọọru gbata gbata na Naịjirịa bụ NEMA kwuru na ihe karịrị mmadụ puku atọ (3000) gụnyere ọtụtụ ụmụnwaanyị na ụmụaka agbapụla n’ụlọ ha ma nwee mkpa nri na ihe ndị ọzọ.
Ọnụọgụgụ ndị mwakpo a chụpụrụ n'ezinaụlọ ha dị 1069, gụnyere mmadụ 6527. N'ime ha bụ ụmụnwaanyị 1768, ụmụnwoke 759, ụmụaka 657 na-erubeghị afọ 18, ndị okenye 1870 ndị gafere afọ 18, ndị nne na-enye nwa ara 252, ụmụnwaanyị dị ime 82, na ndị agadi 91.
Bashir Ahmad, onye bụbu onye enyemaka Onyeisiala Muhammadu Buhari na ndị ọzọ tinyekwara ọnụ na mkpa mkpa a.
Ọtụtụ ndị mmadụ na-ekwu ka Onyeisiala Tinubu Kwupụta ọnọdụ mberede a kpọọ 'State of emergency' na Benue Steeti dịka o mere na Rịvas steeti.
Ebe foto si, Attah Edeh
Nkwakọrịta mgbọ dị n'etiti mba Izrel na Iran abanyela ụbọchị nke anọ
Ebe foto si, Reuters
Nkwakọrịta mgbọ n’etiti Izrel na mba Iran ka na-aga
n’ihu dịka ọ banyerela ụbọchị nke anọ.
E gburu mmadụ ise ọhụrụ ma merụọ ọtụtu ndị ọzọ
ahụ na mba Izrel site n’ogbunigwe mba Iran tụrụ n’abalị, dịka ụlọọrụ gbata
gbata na mba Izrel si kwuo.
N’otu aka ahụ, mba Izrel gburu
onyeisi ngalaba ndịagha mba Iran site n’ogbunigwe ha tụrụ n’Iran n’ụbọchị Sọnde.
Nke a na-abịa dịka mba Izrel tụrụ
ogbunigwe na mba Iran n’ụbọchị Fraịde 13 Juun ma mebie ogige ebe a na-arụpụta
ogbunigwe nuklịa, ogige ndịagha ha nakwa ebe ndị ọzọ. Iran zaghachịrị ha site n’ịtụ
ọtụtụ ogbunigwe na mba Izrel.
Ebe foto si, Reuters
Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump kwuru na mba abụọ ndị a gbalịa mee udo, ma kwuo na mkparịtaụka na-aga n’ihu dịka nkwakọrịta mgbọ na-aga n’ihu. Iran kwuru na ha agaghị anabata nkwụsị ịkwa mgbọ ebe a ka na-awakpo ha.
Praịm minista mba Izrel bụ Benjamin Netanyahu kwuru na “okwu a abụghị na ha na-achọ esemokwu”, mana ọ bụ ịkwụsị mba Iran ịrụpụta ogbunigwe nuklịa.
Ministrị ahụike mba Iran kwuru na ihe ruru mmadụ narị abụọ na iri abụọ na anọ (224) anwụọla site na mwakpo Izrel na-eme kamgbe Fraịde.
Igbo mụrụ nze mụọ ọzọ!
Obi sara mbara ka anyị ji anabata gị n'ọgbakọ BBC Igbo na mmalite ụbọchị ọrụ n'izuụka ọhụrụ a.
Anyị na-asị ka izu a dịrị gị na mma.
Biko, echefukwala ịnọsike ike n'ọgbakọ websaịt, Facebook na Instagram anyị maka akụkọ ndị ga-amasị gị.
Daalụ!
Mmadụ abụọ anwụọla dịka akwammiri dara n'Indịa
Ebe foto si, AFP/Getty Images
Mmadụ abụọ anwụọla ka akwa mmiri e ji igwe rụọ dara na
mpaghara ọdịda anyanwụ Indịa n'ụbọchị Sọnde 15 Juun, 2025.
Ndị ọrụ gọọmentị kwuru na mmadụ isii ndị ọzọ merụrụ ahụ nke
ukwuu.
Minista mba ahụ bụ Davendra Fadnavis sị na ezipụla ndị ọrụ
nnapụta ka ha gaa n'osimiri Indrayani River, ebe ọdachi ahụ mere iji zọpụta ndị
nọ na nsogbu.
Ndị hụrụ mgbe ihe ahụ mere kwuru na ọtụtụ ndị mmadụ nọ
na-agafe ya bụ akwammiri tupu ọ daa.
Mmadụ asaa anwụọla oge ụgbọelu helikọpta kpọkara n’Indịa
Ebe foto si, Reuters
Ụgbọelu helikọpta akpọkaala n’Uttarakhand steeti dị na mba
Indịa ma gbuo mmadụ asaa.
Ọ bụ ndị ọchịchị mba ahụ mere ka anyị mata nke a.
Ozi ụlọmgbasaozi dị na Indịa wepụtara kwuru na ụgbọelu ahụ
si Kedarnath wee na-efego ugwu Himalayan.
Dịka anyị siri ghọta, e zipụrụ ndị ọrụ gbatagbata ozugbo ọdachi
ahụ mere dịka ha na ndị uweojii sooro buputa ozu ndị nwụrụ anwụ.
Dịka ụlọọrụ na-ahụ maka njem ụgbọelu na mba Indịa siri kwuo,
ndị nwụrụ n’ihe mberede ahụ gụnyere onye ọkwọụgbọelu na obere nwata dị afọ abụọ.
Ụlọọrụ ahụ gbakwunyere na ngalaba na-eme nnyocha gbasara ihe
mberede ụgbọelu bụ Aircraft Accident Investigation Bureau (AAIB) ga-eme nnyocha
gbasara ihe ọdachi ahụ.
Ndị uweojii anwụchiela onye ohi a na-enyo enyo n'Ebonyi steeti
Ebe foto si, Ebonyi State Police Command
Ndị uweojii Ebonyi steeti anwụchiela onye ohi a na-enyo enyo
bụ Chibuzor Nworie.
A nwụchịrị onye oji egbe ezu ahụ mgbe ya na ndị otu ya gara
izu ohi n'Onuebonyi junction.
Mgbe ha malitere izu ohi, ndị uweojii nwetara ozi, chịkọta
onwe ha wee gaa ebe ahụ.
Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii n'Ebonyi state bụ Joshua
Ukandu kọwara na ngwa ngwa ndị uweojii bịarutere, ndị ọzọ gbara ọsọ ebe ha
jidere naanị Chibuzor Nworie.
Ukandu kwere nkwa na a ga-ejide ndị ọzọ gbara ọsọ ma kwuo na
ihe ndị a hụrụ Chibuzor n'aka mgbe e jidere ya gụnyere egbe ntụ na mgbọ egbe.
Ụmụafọ Katsina steeti na ndị ojiegbe a ma ama emeela udo
Ebe foto si, X
Ụfọdụ ụmụafọ Katsina steeti edoziela esemokwu dị n'etiti ha na ndị ojiegbe na-eyi ha egwu kemgbe ọtụtụ oge.
Ndị obodo Bicci dị n'okpuru ọchịchị Danmusa na steeti ahụ mere udo n'etiti ha na Ado Aleru na opekatampe ndị ndu otu ndị ojiegbe iri ndị ọzọ.
Ọ bụ kọmịshọna na-ahụ maka nchekwa na ihe ndị na-eme na Katsina steeti bụ Dr. Nasiru Mu'azu gwara BBC nke a.
O kwuru sị: "Anyị na Ado Aleru, Kamilu Buzaru, Dogo Nahali, Wada Jargaba, Dahiru Buzu na Nagoggo nọdụrụ ala nwee mkparịtaụka."
Ọ gbakwunyere na ndị nnọchiteanya obodo n'oge mkparịtaụka ahụ gụnyere ndị ụkọchukwu, ndị ndu okpukperechi na Onyeisioche okpuru ọchịchị Danmusa.
"Ndị ojiegbe ahụ na-achọ udo, ọ bụ ya mere anyị ji zukọọ ma nwee mkparịtaụka iji hụ na e wetara udo," ka kọmịshọna ahụ kwuru.
Ogbunigwe Iran tụrụ egbuola ndị Izrel ma merụọ ọtụtụ ahụ
Ebe foto si, EPA
Mmadụ iri
nwụrụ n’abalị site n’ogbunigwe mba Iran tụrụ n’Izrel dịka ndị ọrụ gọọmentị si
kwuo.
Ndị uweojii
kwuru na mmadụ isii nwụrụ n’obodo Bat Yam dị nso na Tel Aviv, nke gụnyere ụmụaka abụọ. Ebe a ka na-achọ mmadụ asaa achọ
dịka ndị ọrụ gbata gbata na-abọchasị ụvụrụ aja ụlọ dara ada.
Mmadụ anọ
ndị ọzọ nwụrụ na mpaghara ugwu obodo Tamra bụ ebe ndị okpukperechi Alakụba bi dịka
ndị ọrụ n’ụlọọgwụ si kwuo.
Onyeisiala
mba Izrel bụ Isaac Herzog n’ozi o depụtara na soshal midia X kwuru “Ọ bụ ihe mwute
ma sie ike n’ụtụtu a,” dịka ha tetara n’abalị ogbunigwe a na-ada aghara aghara
na mpaghara ugwu.
“Mwakpo ọjọọ
nke Iran” gburu ma merụọ ndị Juu na ndị Arab, ụmụafọ Izrel na ndị mbịarambịa, gụnyere
ụmụaka na ndị okenye, nwoke na nwaanyị,” ka Herzog kwuru.
Ọ gara n’ihu tie ezinaụlọ ndị nwụrụ anwụ aka n’obi ma kpee
ekpere ka ndị merụrụ ahụ gbakee ma ka a hụụ ndị na-efu efu.
Ebe foto si, EPA
Ndịagha Izrel adọọla ụmụafọ Iran aka na ntị ka ndị bi n’akụkụ ogige ndịagha mba Iran si ebe ahụ pụọ maka ọgụ na-aga n’ihu ugbua.
N’ozi ha wepụtara na soshal midi X, kwuru ka ndị niile bi nso n’akụkọ ebe a na-arụpụta ngwaagha ndị Iran si ebe ahụ pụọ ngwa ngwa ruo oge a na-amabeghi.
Nke a na-abịa dịka Izrel tụchara ogbunigwe n’ogige ebe mba Iran na-arụpụta ngwaagha Nuklịa nke mere Iran ji azaghachị ha aghara aghara kamgbe ụbọchị atọ gara aga.
Igbo ndị ọma e ji eme ọnụ!
Unu abọọla chi taa?
Anyị ji obiọcha anabata gị n'ụbọchị taa
Izrel na-awakpo Ịran ebe Tehran kwuru na ha ga-azaghachi mwakpo ọbụla
Ebe foto si, Getty Images
Nkọwa foto, Ogige mwakpo ahụ metụtara
Ndịagha
Izrel ekwuola na ndịagha ụgbọelu ha na-awakpo na mpaghara dị iche iche n’Ịran.
Praịm Minista
Izrel bụ Benjamin Netanyahu kwuru na Izrel ga-awakpo mpaghara ọbụla n’Ịran, nke
a na-abịa dịka mba Ịran tụrụ ọtụtụ ogbunigwe n’izrel ụbọchị Fraịde 13 Juun,
2025.
N’aka nke ọzọ,
onyeisiala Ịran bụ Masoud Pezeshkian emeela ka o doo anya na Ịran ga-azaghachi
mwakpo ọbụla Izrel wakporo ha.
Praịm
minista UK bụ Keir Starmer kwuru na UK na-eziga ndịagha ụgbọelu iji nye
mpaghara etiti ọwụwa anyanwụ n’agbanyeghị na Ịran kwuru na ha ga-awakpo
ogige ndịagha Amerịka, UK na Fransi ma ọ bụrụ na ha nye mba Izrel nkwado maọbụ
gbochie ogbunigwe ha tụrụ n’Izrel.
Ebe foto si, Getty Images
Nkọwa foto, Ụlọ na ụgbọala mwakpo ahụ mebiri
A wakpola ma gbuo onye omeiwu Democratic na di ya - Ndị ọrụ Minnesota
Ebe foto si, Reuters
Nkọwa foto, Ihe ọjọọ a mere na Champlin na Brooklyn Park, obodo abụọ gbara agbata obi dị nso na Minneapolis.
A gbagbuola
onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Democratic pati nke steeti Minnesota na di ya na mwakpo pụrụ iche ezubere, dịka
ndị ọrụ Minnesota kwuru.
Aka na-achị
steeti Minnesota bụ Gọvanọ Tim Walz kwuru na e gburu onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Melissa
Hortman na di ya na mwakpo dịka ihe ndọrọ ndọrọ ọchịchị kpalitere.
A gbakwara
onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Democratic John Hoffman na nwunye ya egbe mana Walz
kwuru na ya nwere nchekwube na ha ga-adị mma.
Onyeisiala
Donald Trump na-ekwu na ogbugbu ahụ yiri "mwakpo ezubere iche megide ndị
omeiwu steeti," na-agbakwunye na "agaghị anabata ime ihe ike jọgburu
onwe ya" n’Amerịka.
Ekwenyere
na onye a na-enyo enyo na ogbugbu Hortman mere onwe ya onye uweojii wee gbanarị
mgbe ya na ndị uweojii kwakọrịtara mgbọ, ndị uweojii kwuru.
Ihe ọjọọ a
mere na Champlin na Brooklyn Park, obodo abụọ gbara agbata obi dị nso na
Minneapolis.
Cheta na Melissa Hortman, onye omeiwu Minnesota onye e gburu n'isi taa, bụbu onye ama ama na Democratic Pati steeti.
Ebe foto si, Paul Battaglia/Minnesota House of Representatives
Nkọwa foto, Ndị ọchịchị kwuru na a gbagburu Melissa Hortman na di ya n'ụlọ ha
Ndịagha nnupụisi Kongo chọrọ usoro iweta udo maka nsogbu - UN
Ebe foto si, Monusco/X
Nkọwa foto, Ndịagha nnupụisi Kongo chọrọ usoro iweta udo maka nsogbu - UN
Onyeisi ụlọọrụ UN na-ahụ maka inweta udo na mba Democratic
Republic nke Kongo na ndịagha nnupụisi Rwanda na-akwado enweela mkparịtaụka
maka ichekwa ndị nkịtị na mpaghara ndị ha weghaara n’ọwụwa anyanwụ mba ahụ.
Odeakwụkwọ UN bụ onye nnọchi anya pụrụ iche Bintou Keita
kwuru na ndịagha nnupụisi kwuru na ha chọrọ usoro iweta udo maka nsogbu nke kawanyere
njọ n’ọnwa Jenụwarị dịka ha weghaara isi obodo Goma.
O kwuru na ya tinyere "mmụọ nke ige ntị na
mgbanwe" na mkparịtaụka ha nwere na Goma na Fraịde.
Cheta na Nke a abụghị mkparịtaụka mbụ UN na-ahụ maka ya
kemgbe e weghaara Goma, mana ọkwa nke a kachasị elu.
Ọzọ, kemgbe mmalite nke afọ a, M23 enweela ọganihu dị ukwuu
na mpaghara ọwụwa anyanwụ bara ụba nke ihe nweta, nke a gụnyere iwere Goma na
Jenụwarị.