Amerịka ga-ewepụrịrị mwakpo tupu a malite mkparịtaụka ọhụrụ - Minista Ịran gwara BBC

Nchịkọta akụkọ ndị kachasị mkpa mere na mbaụwa n'ọnwa Juun 2025.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Uzoamaka Ewuzie, Ikechukwu Kalu, Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Michael Ilediagu, Adline Okere, Marvelous Obomanu

  1. E mechiela ogige enyemaka dị na Gaza ruo otu ụbọchị

    Ndị mmadụ na-achọ ịnata enyemaka na Gaza

    Ebe foto si, Reuters

    Emechiela ogige ebe a na-enyere ndị mmadụ aka dị na Gaza n’ime otu ụbọchị dịka ndịagha mba Izrel dọrọ aka na ntị okporoụzọ e si aga ebe ahụ bụ “ebe a na-akwa mgbọ”.

    Ngalaba enyemaka a kpọrọ Gaza Humanitarian Foundation, nke Amerịka na Izrel na-akwado kwuru na a ga-emechi ebe ahụ iji maara ka ihe si aga ka ha nwee ike ịrụ ọrụ ọfụma.

    N’aka nke ọzọ, ndịagha Izrel kwuru na a ga-egbochi ndị mmadụ ịbanye n’ogige enyemaka ahụ maọbụ ime njem n’okporoụzọ e si aga ebe ahụ.

    Nke a na-abịa dịka e gbuchara mmadụ iri abụọ na asaa mgbe ndịagha Izrel gbara egbe n’akụkụ ogige enyemaka ahụ n’ụbọchị Tuzde dịka ndị out Hamas si kwuo. Mana Izrel kwuru na ndịagha ya gbara egbe mgbe ha hụrụ ndị ọjọọ a na-enyo enyo.

    Nke ahụ bụ mwakpo ugboro atọ kachasị daa ụda n’okporoụzọ ahụ e si aga n’ogige enyemaka ahụ.

    Otu United Nation adọọla aka na ntị na mmadụ karịrị nde abụọ nwereike ịnwụ site n’agụụ na Gaza dịka mba Izrel machiri nri na enyamaka ịbata ruo izuụka iri na otu.

  2. Unu asaala chi?

    Nke a bụ iji nabata gị n'ọgbakọ BBC Igbo n'ụbọchị Wenezde a.

    Gbaa jii ebe a maka akụkọ ndị gbapụtara ihe n'ụwa.

  3. Otu ha na Al-Qaeda nwere mmekọ ekwuola na ha wakporo ndịagha mba Mali

    Njirimara ndịagha ndị Mali

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Njirimara ndịagha ndị Mali

    Otu na-eyi ọha egwu ha na otu Al-Qaeda nwere mmekọ ekwuola na ọ bụ ha wakporo ogige ndịagha mba Mali n’obodo Boulikessi.

    Ihe karịrị ndịagha 30 nwụrụ na mwakpo ahụ mere ụbọchị Sọnde, 1 Juun, 2025 mana ndị ọchịchị ekwubeghị ka nke ọ bụ eziokwu.

    Ụbọchị Mọnde, 2 Juun, 2025, otu Jama’a Nusrat ul-Islam wa-Muslimin (JNIM) kwuru na ọ bụ ogige ndịagha Timbuktu ka ha chọrọ ịwakpo, dịka ndị obodo kwuru na ha nụrụ ụda egbe.

    Ozi ndịagha wepụtara ụbọchị Mọnde 2 Juun, 2025, kwuru na ha gbochiri mwakpo ndịagha nnupuisi mere na Timbuktu gbuo mmadụ 14 n’ime ha ma nwụchie mmadụ 31.

  4. Afrịka ga-eketa nnukwu oke site n’akụnaụba $200bn nke Bill Gate

    Afrịka ga-eketa nnukwu oke site n’akụnaụba $200bn nke Bill Gate

    Ebe foto si, Getty Images

    Onye hibere ụlọọrụ Microsoft bụ Bill Gates ekwuola na ya ga-eji mpaghara akụnaụba ya kachasị wee kwalite ọrụ ahụike na agụmaakwụkwọ na mba Afrịka n’ime afọ 20 nọ n’ihu.

    Nwoke ahụ dị afọ 69 kwuru na “site n’ịkwalite ikike nke mmadụ site n’ahụike na agụmaakwụkwọ, mba niile nọ n’Afrịka kwesịrị ịnọ n’ụzọ nke ọganihu”.

    Oge ọ na-ekwu okwu n’isi obodo Itiopịa bụ Addis Ababa, Gates gwara ndị ntoroọbịa na-ekepụta ihe ọhụrụ n’Afrịka ka ha chee maka ụzọ ha ga-esi mepụta amamịhe nwa Bekee bụ Artificial Intelligence (AI) iji kwalite nlekọta ahụike na mba Afrịka.

    N’ọnwa gara aga ka Gates kwupụtara na ya ga-ekesa 99% site n’akụnaụba ya, nke o chere ga-eru ijeri $200 n’afọ 2045, bụ mgbe ụlọọrụ ya na-eme atụmatụ ịkwụsị ọrụ.

  5. Ikpe Natasha na Gọọmentị Naịjirịa agaghị n'ihu maka abụbụọrụ ndị ụlọikpe gbara

    Akwọ a manyere n'ihu ụlọikpe ukwu dị n'Abuja banyere abụbụọrụ ahụ

    Otu jikọtara ndị na-arụ ọrụ n’ụlọikpe na Naịjirịaca kpọrọ 'Judiciary Staff Union of Nigeria (JUSUN)’ amalitela abụbụọrụ.

    Otu a bidoro abụbụọrụ a na Naịjirịa gbaa gburu gburu dịka ha na-achọ ka a kwụọ ha ego nrite ọnwa ise, ma sị ka gọọment malite ịkwụ ha ụgwọọnwa opekatampe puku naịra ise (N70,000).

    Ọnụụzọ ụlọikpe ukwu dị n'Abuja mechiri emechi

    Ndị a chọkwara ka gọọmentị were pasentị 25 maọbụ 35 bulie ego a na-akwụ ha n’ụgwọ ọnwa.

    Abụbụọrụ a metụtara ụlọikpe dị iche iche n’Abuja nke mere na e kpezighi ikpe dị n’etiti gọọmentị Naịjirịa na Sịnetọ Natasha Akpoti-Uduaghan kwesịrị ịmalite n’ụbọchị atọ nke ọnwa Juun.

  6. Mmadụ 27 anwụọla site n'egbe Izrel gbara n'ogige enyemaka dị na Gaza

    Ụmụnwaanyị na-ebe akwa maka ndị ezinaụlọ nwụrụ na mwakpo ahụ

    Ebe foto si, Reuters

    Ngalaba ahụike nke out Hamas ekwuola na opekatampe na mmadụ iri abụọ na asaa anwụọla ebe mmadụ iri itoolu merụrụ ahụ site egbe ndị Izrel gbara ọtụtụ ndị kwụụ n’ahịrị na-eche ka ha nata enyemaka n’obodo Rafah dị na Gaza.

    Ndịagha Izrel kwuru na ha gbara egbe n’akụkụ ogige enyemaka ahụ mgbe ha chọpụtara na “ọjọọ a na-enyo enyo”, ma kwuo na ha na-enyocha ndị merụrụ ahụ - ngalaba nnyoch BBC Verify kwuru na ha na-enyocha nke ahụ.

    Onye ọrụ ahụike nọ ebe ahụ gwara BBC maka “mkpa mkpa” mere ebe ahụ ma sị na aka ejula ha n’ịlekọta ọtụtụ ndị merụrụ ahụ.

    N’out aka ahụ, mba Izrel gọrọ na ọ bụghị ha gbara ndị Palestine egbe na nke mere n’ụbọchị Sọnde, ebe ngalaba ahụike Hamas kwuru na e gburu mmadụ iri atọ na otu.

    Izrel anaghị ekwe ka ndị ntaakụkọ si mba ọzọ gụnyere BBC bata n’obodo Gaza, nke mere ka ọ raa ahụ inyochapụta ihe na-eme n’ogbe ahụ.

  7. E gbuola ihe ruru mmadụ 23 na Benue Steeti site n'ọgụ ndị ochi ehi na ndị ọrụ ugbo

    Onye ọchị ehi ji osisi ya na ehi ndị ọ na-achị

    Ebe foto si, Getty Images

    Gọvano Hyacinth Alia agwaala ndị nchekwa ka ha kwụsị ogbugbu a na-egbu ndị mmadụ na Benue steeti site n'ọgụ ndị ọchị ehi na ndị ọrụ ugbo.

    Nka na-abịa dịka e gburu ihe rụrụ mmadu iri na otu n'ọchịchị ime obodo Apa na iri na abụọ na mpaghara ọdịda anyanwụ Gwer nke steeti ahụ nke wetara ọnụọgụgụ ndị e gbụrụla ka ọ bụrụ iri abụọ na atọ.

    Mgbe ọ na-agwa ndị nta akụkọ okwu na ọgbakọ ndị otu nchekwa nwere n'ụlọ gọọmentị na Mọnde 3 Juun, 2025, gọvanọ katọrọ mwakpo ahụ ma nye ndị ọrụ nchekwa iwu ka ha chụpụ ndị na-eme ihe a.

  8. Ụtụtụ ọma nụ ooo!

    Igbo mụrụ nze mụọ ọzọ, anyị na-ekele gị n'ụtụtụ a ma na-abata gị n'ọgbakọ BBC Igbo na Facebook, Instagram na websaịt.

    Ndewo!

  9. Ihe karịrị mmadụ 700 anwụọla n'idemmiri

    Onye na-egwu ala

    Ndị ọrụ gọọmentị ekwuola na ọnụọgụgụ ndị nwụrụ na idemmiri mere n'obodo Mokwa dị na Naija steeti arala karịa 200.

    Mmadụ 500 ọzọ bụ ndị a kana-achọ achọ n'obodo ahụ dịka otu onye ọrụ gọọmentị bụ Musa Kimboku si gwa BBC, ma kwukwa na a kwụsịla mbọ ịchọ nọ̄ị na-efu efu dịka e nweghị olileany na a ga-ahụ ha na ndụ.Idemmiri nke e kwuru na a hụbeghị udi ya kemgbe afọ 60 wakporo Tiffun Maza nakwa Anguwan Hausa dịka oke mmiri zochara.Ka ọ dị ugbua, ndị ọrụ gọọmentị ga-amalite igwupụta ozu ndị tọrọ n'okpuru ala iji gbochie ọrịa ikesa.

  10. Ndị Kenya eweela iwe dịka e jichiri nwaanyị ngwa teknụụzụ doro anya

    Ndị Kenya eweela iwe dịka e jichiri onye ngwa teknụụzụ doro anya

    Ebe foto si, Vocal Africa/X

    Ndị Kenya egosila iwe na ọnụma n’ihi njichi e jichiri nwaafọ ha ngwa teknụuzụ doro anya.

    Nwaanyị ahụ e jichiri mepụtara otu akụrụngwa ga-enyere ndị mmadụ aka ịgba ụkwụ megide atụmatụ iwu ‘finance bill’ n’ihi ụjọ na ọ ga-eme ka ọnọdụ obibi ndụ dikwuo njọ.

    Ndị ọnụ na-eru n’okwu sịrị na e jichiri Rose Njeri n’ụbọchị Fraịde dịka ndị uweojii wakporo ụlọ ya dị n’isi obodo Kenya bụ Naịrobi ma jichie ngwa elektrọnik niile o ji arụ ọrụ.

    Ka ọ dị ugbua ndị uweojii ekwubeghị okwu ọbụla gbasara njichi e jichiri nwaanyị ahụ mụrụ ụmụ abụọ.

    Ndị ntoroọbịa Kenya mere ngagharịiwe kpụ ọkụ n’ọnụ n’afọ gara aga oge gọọmenti mere atụmatụ ibuli ụtụisi, mana nke ahụ manyere Onyeisiala William Ruto iwezuga ya bụ atụmatụ iwu.

    Opekatampe mmadụ iri ise bụ ndị e gburu ebe ọtụtụ ndị ọzọ ka ndị nchekwa dọkpụụrụ n’ike oge ha wakporo ndị ahụ na-eme mkpesa n’afọ gara aga.

  11. Mmadụ asatọ emerụọla ahụ dịka otu nwoke mụnyere ha ọkụ na Colorado, mba Amerịka

    Ndị ọrụ nchekwa ewerela ọnọdụ n'ebe ihe a mere dịka ha ka na-eme nnyocha

    Ebe foto si, Reuters

    Mmadụ asatọ emerụọla ahụ dịka otu nwoke wakporo ndị mmadụ ma malite ịmụnye ha ọkụ n’ihe dịka otu elekere nke ehihie n’ọdọahịa Boulder dị na Colorado mba Amerịka.

    Ngalaba nchekwa FBI kwuru na mwakpo bụ nke “iyi ndụ egwu” mere ka ndị mmadụ gbakọtara na-eme emume maka ndị Izrel e ji eji bụ a na-eme kwa izuụka.

    Onye a na-arụ aka mere mwakpo ahụ bụ otu nwafọ mba Ijipt a kpọrọ Mohamed Sabry Soliman dị afọ iri anọ na ise bụ onye ikike akwụkwọ njem ya gwụrụla kamgbe afọ 2023.

    Ndị ọrụ nchekwa sị na nwamadị tiri mkpu sị “tọhapụ Palestine” dịka o ji mmanya ọkụ na osisi na-emepụta okụ na-amụnye ndị mmadụ ọkụ.

    Ọdọahịa Boulder dị na Colorado mba Amerịka ebe ihe a mere.

    Ebe foto si, Reuters

    Ha nwụchiela nwamadị a ugbua ma kwuo na o doro ha anya na ọ bụ naanị kpara nkata ma mee mwakpo ahụ.

    Ndị nwamadị a mụnyere ọkụ gụnyere ụmụnwaanyị anọ na ndị nwoke anị dị n’agbata afọ iri ise na abụọ ruo iri asatọ na asatọ (52-88yrs).

    E burula ndị a gawa n’ụlọọgwụ dị na dịka otu merụrụ nnukwute ahụ, a na-agwọ ha maka ọkụ ọgbụgba.

  12. Igbo mụrụ nze mụọ ọzọ

    Anyị na-anabata gị n'izuụka ọhụrụ a pụrụiche ma kwuo ka ọ gaara gị nke ọma n'ihe ọma ọbụla ị na-eme.

    Jisie ike na-anọnyere anyị n'ọgbakọ BBC Igbo na Facebook, Instagram nakwa websaịt.

    Daalụ!

  13. Ndị uweojii anwụchiela ndị gburu otu nwaanyị na-arụ n’ụlọakụ n’Ọnicha

    Ndị uweojii anwụchiela ndị gburu otu nwaanyị na-arụ n’ụlọakụ n’Ọnicha

    Ebe foto si, Anambra State Police Command

    Ndi uweojii Anambra Steeti anwụchiela mmadụ abụọ a na-enyo enyo maka ntọrị na ogbugbu otu nwannyị bụ onyeisi ụlọakụ aha ya bụ Ifeoma Esther Onyekwelu.

    Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii Anambra Steeti bụ Tochukwu mere ka anyị mata nke a n’ozi o wepụtara n’ụbọchị Sọnde 1 Juun 2025.

    Dịka Ikenga siri kọwaa, arụ a mere n’ụbọchị 13 Jenụwarị 2025 mgbe a hụrụ ozu nwaanyị ahụ n'akụkụ okporoụzọ na Nnobi dịka e ji akwa kechie ya anya ma gbuo ya n'agbanyeghị na a naara ezinụlọ ya ego mgbapụta ruru nde naịra 14.

    E jidere Monday Egbe dị afọ iri atọ na abụọ nakwa Kenneth Nnoga dị afọ iri abụọ na asatọ n'ebe nzuzo ha dị n’otu steeti gbara Anambra agbataobi.

    Ka o sina dị, a na-enyocha mmadụ ndị ahụ e ji eji ugbua iji matakwuo ka ndị otu ha si akpa arụ ma nweekwa ike nwụchie ndị nke fọrọ afọ.

  14. Ndị Kano 22 na-eme egwuruegwu anwụọla oge ha na-ala emume ‘Sports Festival’

    Ndị Kano 22 na-eme egwuruegwu anwụọla oge ha na-ala emume ‘Sports Festival’

    Ebe foto si, Screenshot

    Nnukwu ihe ọdachi mere n’ehihie Satọde 31 Mee 2025 oge mmadụ iri abụọ na abụọ nwụrụ n’ihe mberede mere n’okporoụzọ si Kano gawa Kadụna.

    Ụlọorụ na-ahụ maka njem okporoụzọ bụ Federal Road Safety Corps (FRSC) mere ka anyị mata nke a site n’ozi ha wepụtara.

    Ndị zutere ọdachi ahụ bụ otu ndị egwuruegwu Kano steeti bụ ndị nọ n’ụzọ na-ala ka ha gachara emume egwuruegwu National Sports Festival a haziri n’Ogun steeti.

    Otu n’ime ndị pụtara na ndụ, aha ya bụ Ado Salisu gwara ndị ntaakụkọ na ihe mberede ahụ mere dịka ọ fọdụrụ obere oge ka ha ruo Kano steeti.

    Ihe mberede ahụ mere na mpaghara Gadar Yankifi dị n’okpuru ọchịchị Malam mgbe o jiiri ihe dịka ọkara gaa elekere iri na abụọ nke ehihie metụtara ụgbọala bọọsụ Toyota Coaster akara ya bụ KN041 A17.

    Dịka ụlọọrụ FRSC dị na Kano siri kwuo, ọdachi ahụ metụtara ndị njem iri atọ na abụọ gụnyere ụmụnwoke iri atọ na otu na otu nwaanyị.

    Ka o sina dị, mmadụ iri abụọ na abụọ n’ime ha nwụrụ ozugbo ihe mberede ahụ mere ebe ndị nke ọzọ nwetara ogogo mmerụahụ dị iche iche.

    FRSC kwuru na nnyocha ndị ha merela enwebeghị ike chọpụta ihe butere ọdachi ahụ mana ha na-eche na o nwereike ịbụ ịgba ọnwụ ọnwụ na ike gwụrụ onye ọkwọụgbọala maọbụkwanụ nsogbu ụgbọala.

  15. "PSG ga-aga n'ihu igosi iko Champions League ka mmadụ 192 merụchara ahụ n'ọgbaghara"

    Ụgbọala a mụnyere ọkụ nke ndị uweojii nọ n'akụkụ ya na-echekwa onwe ha ka ọkụ ghara ịgba ha

    Ebe foto si, Reuters

    Mmadụ abụọ anwụọla ebe mmadụ 192 merụrụ ahụ na mpaghara dị iche iche na mba Fransị mgbe ndị mmadụ na-enwe aṅụrị maka mmeri otu egwuregwu Paris Saint-Germain (PSG) Inter Milan ma mabute iko Uefa Champions League.

    Minista na-ahụ maka ihe na-eme n’ime obodo nke mba Fransị kwupụtara nke a.

    Otu nwata dị afọ iri na asaa nwụrụ n’obodo Dax mgbe a sụrụ ya mma n’obi na mgbede ụbọchị Satọde dịka akụkọ si kwuo.

    Otu nwoke dị afọ iri abụọ na atọ nwụrụ n’isiobodo bụ Paris mgbe ọ na-akwọ ụgbọ a kpọrọ ‘scooter’ ka otu ụgbọala kuturu ya, ka ọkaiwu gọọmentị kwuru.

    Ọtụtụ ụgbọala ka ha na-ere ọkụ

    Ebe foto si, Getty Images

    N’ebe ndị ọzọ, a mụnyere ọkụ nakwa egbe aṅụrị a kpọrọ ‘fireworks’, kụkasịa ụgbọala dị iche iche dịka ndị a na-enwe aṅụrị na PSG mabutere iko kachasị na mba Yurope nke mbụ ya.

    Ndị uweojii iri abụọ na abụọ tinyere ndị ọrụ mgbanyụọkụ mmadụ asaa so na ndị merụrụ ahụ dịka ministri ime obodo si kwuo ma sị na a gbara ụgbọala narị abụọ iri isii na anọ (264) ọkụ.

    Ha gara n’ihu kwuo na a nwụchiela mmadụ narị ise, iri ise na itoolu (559) maka ọgbaghara ahụ.

    Na-agbanyeghi nke a, ndị ọrụ nchekwa ekwuola na PSG ga-aga n’ihu ime ngagharị iji gosi Iko Uefa Champions League ha mabutere.

    Nwamadị a bụ Nunez kwuru na ọ bụ ihe mwute na ụfọdụ ndị nkwado na-enye egwuregwu bọọlụ aha ọjọọ.

    Ọ gbakwunyere na ndị ọrụ nchekwa ga-eke nkwụcha ma mụrụ anya ka azụ iji hụụ na PSG mere ngosi iko ahụ n’udo.

    Ndị uweojii na-achụgharị ma na-anwụchi ndị na-ebute ọgbaghara

    Ebe foto si, Getty Images

  16. Ihe ruru mmadụ asaa anwụọla dịka akwammiri abụọ dara na Rọshịa

    Ndị ọtụ ụgbọoloko na mba Rọshịa kesara foto ebe akwammiri ahụ dara mana BBC achọpụtabeghi ma ọ bụ n'ezie

    Ebe foto si, Moscow Interregional Transport Prosecutor's Office

    Akwammiri abụọ e jirila abalị daa na mpaghara dị iche iche na mba Rọshịa ebe ha mba Yukren nwere okeala, nke gburu ihe ruru mmadụ asaa ma merụọ ọtụtụ ndị ọzọ ahụ.

    Akwammiri dị n’okporoụzọ obodo Bryansk dara wee dakwasị ụgbọoloko bi ndị mmadụ n’abalị Satọde dịka gọvanọ mpaghara ahụ si kwuo.

    Ndị ọrụ gbata gbata kwuru na opekatampe na mmadụ asaa nwụrụ. Ihe karịrị mmadụ iri anọ na asaa ka e bu gawa n’ụlọọgwụ, nke gụnyere otu nwata dịka Gọvanọ Alexander Bogomaz si kwuo.

    Ngalaba ụgbọoloko nke mba Rọshịa kwuru na akwammiri ahụ dara site “na nkata ndị mmadụ kpara”.

    Alexander Khinshtein na-arụ ọrụ dịka gọvanọ depụtara n’akara Telegram maka akwammiri ahụ dara ada.

    Ebe foto si, Telegram / Alexander Khinshtei

    Awa ole ma ole nke a mechara, akwammiri ọzọ adaa na mpaghara Zheleznogorsk, mee ka ụgbọoloko gbapụ n’okporo ya, dịka Alexander Khinshtein na-arụ ọrụ dịka gọvanọ si kwuo.

    Ụgbọoloko ahụ nwuuru ọkụ ma merụọ onye na-akwọ ya ahụ n’ụkwụ, ka Khinshtein kwuru.

    O depụtara n’akara Telegram na a ga-eme nnyocha banyere akwammiri ahụ dara ada.

    O dobeghi anya ma o nwere ihe jikọtara ọdịda akwammiri abụọ, mba Yukren ekwubeghi okwu banyere nke a.

  17. Mmadụ 26 anwụọla na Gaza dịka Izrel gbanyere egbe n'ogige enyemaka

    Ndị merụrụ ahụ e bu na-abanye n'ime ụlọọgwụ na Gaza

    Ebe foto si, Getty Images

    Opekatampe e gbuola mmadụ iri abụọ na isii dịka ụgbọala agha mba Izrel gbara egbe n’akụkụ ebe a na-enyere ndị mmadụ aka dị na Gaza dịka ndị ọrụ gbata gbata si kwuo.

    E merụrụ ndị Palestine mmadụ otu narị na iri ise ahụ dịka ndị ọrụ ahụike Red Cross dị n’obodo Rafah si kwuo.

    Ndị bi n’obodo gwara BBC na ndịagha Isreal malitere ịgba egbe n’ogige ebe a na-enyere ndị mmadụ aka

    Ndịagha Izrel ekwuola na ha amaghị maka ndị a sị nwụrụ maọbụ merụọ ahụ n'ogige ahụ.

    Ha gara n'ihu kwuo na ha na-eme nnyocha banyere nke a.

    Izrel gbochiri ihe ọbụla ịbanye na Gaza ma malite ịkwa mgbọ megide ndị otu Hamas n’ụbọchị 18 Maachị, mebisie nkwekọrịta nkwụsị ịkwa mgbọ nke mba Amerịka, Qatar na Ijipt nyere aka e mee.

    Izrel malitere ịkwa mgbọ n’obodo Gaza iji zaghachị mwakpo otu Hamas gafere okeala wakpoo ha n’ụbọchị 7 Ọktoba afọ 2023, nke e gburu mmadụ otu puku na narị abụọ ma tọọrọ mmadụ narị abụọ na iri ise na otu.

    Opekatampe e gbuola ihe ruru mmadụ 54,381 na Gaza kamgbe agha ahụ malitere dịka ngalaba ahụike nke otu Hamas nọ n’isi ya si kwuo.

  18. Igbo ọma ndị ọma e ji eme ọnụ

    Anyị ji obi sara mbara anabata gị n'ọnwa ọhụrụ a bụ ọnwa isii n'afọ 2025 ma na-asị dịka afọ a gbarala ọkara, na ihe ọma ọbụla ị chọrọ inwete n'afọ a n'ụzọ dị mma, ga-eru gị aka tupu ọnwa isii ọzọ.

    Jisie ike na-anọnyere anyị n'ọgbakọ BBC Igbo maka akụkọ ndị gbapụtara ihe n'ụwa gbaa gburu gburu.

    Daalụ!