Gọọmenti Naịjirịa agwala mba Amerịka na e nweghị ihe iyi egwu dị n’Abuja

Ebe foto si, Mohammed Idris/X, Getty Images
Gọọmenti Naịjirịa ekwuola na e nweghị ihe iyi egwu ọbụla dị gburugburu isi obodo mba ahụ bụ Abuja.
Gọọmenti Naịjirịa kwupụtara nke a n’ụbọchị Mọnde 23 Juun 2025 oge ha na-azaghachi ndụmọdụ Ụlọnnọchiteanya mba Amerịka dị na Naịjirịa nyere ụmụafọ ha ka ha zeghara akụrụngwa ndịagha na ụlọọrụ gọọmenti niile dị n’Abụja.
Na nzaghachi, Gọọmenti Naịjirịa gara n’ihu kwuo na Abuja nwere ezi nchekwa maka ụmụafọ Naịjirịa na ndị ọbịa niile.
Ozi Minista na-ahụ maka mgbasaozi bụ Mohammed Idris wepụtara kwuru na Gọọmenti Naịjirịa anụla maka ndụmọdụ Ụlọnnọchiteanya mba Amerịka nyere ndị ọrụ ha nakwa ezinaụlọ ha ka ha zeghara ogige ndịagha nakwa akụrụngwa gọọmenti niile dị n’Abuja.
O kwuru na dịka Gọọmenti Naịjirịa nabatara ikike Ụlọnnọchiteanya mba ndị ọzọ nwere inye ụmụafọ ha ndụmọdụ, na ọ dịkwa mkpa ime ka o doo anya na Abuja nwere ezi nchekwa maka ụmụafọ, ndị bi ebi nakwa ndị ọbịa.

















