Otu Take It Back Movement eyiela egwu ime ngaghrịiwe ma ọ bụrụ na ndị uweojii atọghapụghị Omoyele Sowore

Ndị otu Take It Back Movement ekwuola na ha ga-eme ngagharịiwe maka nwụchi ndị uweojii nwụchiri ma kpọchie onyeisi ha bụ Omoyele Sowore n’Abuja.
Ọ bụ n’ụbọchị Tuzde 5 Ọgọst, 2025 ka ọkaiwu Omoyele Sowore bụ Tope Temokun kwuru na ndị uweojii kpọrọ Sowere oku ma kwuo na ọ bụ oge Sowore bịara n’ụlọọrụ ha ka a ga-agwa ya ihe mere ha ji kpọọ ya oku.
Mana oge Sowore na ndị nkwado ya ụfọdụ gara ịza oku ahụ ndị uweojii kpọrọ ya n’isi ụlọọrụ ndị uweojii Force Headquaters dị n’Abuja n’ụbọchị Wenezde 7 Ọgọst 2025, ka ndị uweojii nwụchiri ma kpọchie ya.
Akụkọ kwuru na ndị uweojii na-enyocha Sowore maka ebubo ime ihe adịgboroja nakwa ịkpalite ọgbaaghara n’obodo.
N’aka nke ọzọ, otu Amnesty International nakwa ụfọdụ ndị ọkaiwu Naịjirịa akatọọla nwụchi nakwa mkpọchi Sowore nke ha kọwara dịka ihe megidere iwu Naịjirịa.
Ozi Amnesty International wepụtara n’ụbọchị Wenezde 7 Ọgọst 2025, kọwara nwụchi Omoyele Sowore dịka nke megidere iwu ma metọọ ikike ya dịka nwaafọ Naịjirịa.
Ka ọ dị ugbua, ndị ọkaiwu Sowore na-agba mbọ ịhụ na o nweere onwe n’aka ndị uweojii ahụ.
Omoyele Sowore zorọ ọkwa onyeisiala na ntuliaka 2023 na pati African Action Congress.



















