WAEC ewepụtala mpụtara ule nke afọ 2025

Ebe foto si, WAEC/X
Ụlọọrụ West African Examinations Council, WAEC, ewepụtala mpụtara ule nke afọ 2025.
WAEC mere ka amata nke a n’ozi ha wepụtara n’ụbọchị Monde, Ọgọst 4, 2025 n’akara X soshal midia ha.
N’okwu ha “anyị na-agwa ụmụakwụkwọ niile mere ule WASSCE n’afọ 2025 ka ha mara na mpụtara ule ha mere apụtara”.
WAEC jiri ohere ahụ kwuo na-enweghị mgbe ha kagburu mpụtara ule nke afọ 2025 niile dịka akụkọ si kwuo.
Ụmụakwụkwọ 1,969,313 bụ ihe mere ule ahụ e mere bido n’ọnwa Epril ruo Juun 2025 n’ụlọakwụkọ sekọndịrị ruru 23,554 na Naịjirịa.
E mekwara ule ahụ na mba Benin Republik, Côte d’Ivoire na Equatorial Guinea bụ mba ha n amba Naịjirịa nwere out usoro agụmaakwụkwọ.



















