Chaịna na Indịa ekwenyela inwe mmekọ

Nchịkọta akụkọ ndị kachasị mkpa mere na mbaụwa n'ọnwa Ọgọst 2025.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Uzoamaka Ewuzie, Ikechukwu Kalu, Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Michael Ilediagu, Adline Okere, Marvelous Obomanu

  1. Trump ezigala ndị ga-eme nyocha n'ogige enyemaka dị na Gaza

    Onye ozi  Steve Witkoff nke onyeisiala Trum zigara mpaghara Gaza ị ga-mara ọnọdụ gbata gbata na-enyemaka

    Ebe foto si, US Government

    Nkọwa foto, Onye ozi Steve Witkoff

    Onye ozi Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump zigara ịga mara ka ọnọdụ gbata gbata dị n'ogige ebe a na-ekesa ihe enyemaka Gaza eruola.

    Onye ozi ahụ Steve Witkoff kwuru na ihe ọ bịara ime n'ogige a kpọrọ 'Gaza Humanitarian Foundation' bụ inyocha ka ọnọdụ ihe dị ma zigara Onyeisiala Trump ozi etu a ga-esi weta atụmatụ dị mma iji kesaa nri enyemaka na akụrụngwa ahụike.

    Onye ọzọ soo Witkoff mee njem nleta ahụ bụ Mike Huckabee, na-anọchiteanya mba Amerịka na Izrel nakwa ndịagha mba Izrel.

    Cheta n'onwa gara aga ụfọdụ ndị ọrụ enyemaka na-arụ ọrụ na Gaza boro Izrel ebubo iji ụkọ nrị mere ihe ngwa ọgụ site n'igbochi ihe enyemaka ịbanye na Gaza.

    Otu United Nation katọrọ nke a nakwa etu ụfọdụ mbaụwa si gbaa nkịtị ebe agụụ na erighi ezi nri si na-egbusi ndị mmadụ na Gaza.

  2. Anyị agbaghị ụlọ ọbụla ọkụ maọbụ zuo ohi n’Ehime Mbano - Ndịagha Naịjirịa

    Njirimara ndịagha Naịjirịa nakwa ndịagha Naịjirịa nọ n'ụgbọala ha

    Ebe foto si, 82 Division Nigeria Army/DHQNigeria/X

    Otu ndịagha 82 Division dị n’Enugwu ewepụtala ozi banyere akụkọ ahụ kwuru ma bo ndịagha ebubo ịkpa arụ na mpaghara Ehime Mbanọ, Imo Steeti.

    Akụkọ kwuru na ndịagha gbara ọtụtụ ụlọ ndị mmadụ ọkụ ma buru ngwo ngwo ha ebe ụfọdụ merụrụ ahụ n’obodo Umualumaku Ehime Mbanọ, Imo steeti.

    Onyeisi mgbasaozi otu ndịagha 82 division bụ Lt. Col. Olabisi Olalekan Ayeni kwuru na ebubo ahụ abụghị eziokwu ma kọwaa na ọ bụ ndị obodo Umualumaku kpara nkata ahụ iji kwutọọ aha ndịagha.

    Ọ gwara ndị ọnụ na-eru n’okwu n’obodo ahụ ka ha nye ndịagha nakwa ndị nchekwa ndị ọzọ nkwado zuruoke iji hụ na ha nwereike ịrụ ọrụ ma nwụchịe ndị kpara mkpa mkpa ahụ.

    Lt. Col. Ayeni jikwa ohere ahụ gwa ndị ntakụkọ, ndị otu NGO nakwa CSO ka ha wepụ aka ma kwụsị ịgbasa ozi na’abụghị eziokwu.

  3. Donald Trump amanyela tarifu pasenti 35 na mbubata si Kanada dịka Amerịka manyere ụgwọ ọhụrụ na mba ndị ọzọ

    Onyeisiala Trump na-achị Amerịka

    Ebe foto si, Getty Images

    Mba Amerịka ekwupụtala tarifu ọhụrụ na mba n’ihe karịrị mba 90 dịka ụbọchị ikpeazụ Onyeisiala Trump kwuru nyere ha maka nkwekọrịta azụmahịa gara.

    Tarifu a manyere na Kanada buzi pasenti 35 mana Praịm Mịnịsta Kanada bụ Mark Carney katọrọ nke a. Cheta na tarifu Amerịka manyere na mbubata si Kanada na mbụ dị pasentị 25.

    Amerịka kwụsịtụrụ tarifu ha manyere na mbubata niile si mba Mexico ruo abalị 90 ebe a manyere tarifu pasentị 50 na mbubata si mba Brazil.

    Onyeisiala Trump kwuru maka tarifu ndị a n’ọnwa Eprel nke butere ahụ ọmajijiji n’akụnaụba ụwa niile.

    Gịnị bụ Tarifu?

    Tarịfu bụ ụtụisi e tinyere n'elu ngwaahịa maọbụ akaọrụ.

    N'ichafụ Tarifu bụ ego a manyere n'elu ngwahịa si otu mba, ga na mba ọzọ. A na-amanye tarifu ndị a na ngwaahịa na-aba mba ebe ndị isiala ha na-achọ ịkwalite ụlọọrụ na-arụpụta ngwaahịa mba ha, ma kwụsị ngwaahịa a na-awụbata.

    A na-akwụ ụgọ ha. Onye na-akwụ ụgwọ ya bụ ndị na-ebubata ngwa ahịa ahụ bụ onye na-ere ahịa n'ụzọ nke ukwuu ya.

  4. Ụtụtụ ọma ndị ọma be anyị

    Nnọọ n'ọgbakọ BBC News Igbo n'ọnwa ọhụrụ a bụ Ọgọst. Anyị abịala iwetara gị akụkọ niile si Naịjirịa, Afrịka nakwa mbaụwa taa.

    Ọfọ anyị bụ ka ọnwa Ọgọst mịtara gị na ezinaụlọ gị naanị oziọma.

    Ndewo!!