Chaịna na Indịa ekwenyela inwe mmekọ

Nchịkọta akụkọ ndị kachasị mkpa mere na mbaụwa n'ọnwa Ọgọst 2025.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Uzoamaka Ewuzie, Ikechukwu Kalu, Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Michael Ilediagu, Adline Okere, Marvelous Obomanu

  1. Ọtụtụ ọma Igbo ndị ọma

    Anyị ji obi sara mbara anabta gị n'ọgbakọ BBC Igbo taa bụ Sọnde 10 Ọgọst, 2025.

    Ọ bụ naanị akaụkọ gbara ọkpụrụkpụ si mbaụwa ka anyị bịara iwetara gị ta.

    Gaa n'ihu sonyere anyị n'akara soshal midia anyị dị iche nakwa Whatsapp Chanelụ.

    Ndewo.

  2. Audu Ogbeh bụbu mịnịsta, onyeisi oche otu PDP anwụọla n'afọ 78

    Audu Ogbeh bụbụ Onyeisi oche otu ndọrọndọrọ ọchịchị Peoples Democratic Party (PDP) ma bụrụkwa mịnịsta na-ahụ maka ọrụ ugbo n’oge garaaga.

    Ebe foto si, Pius Utomi Ekpei/AFP via Getty Images

    Nkọwa foto, Audu Ogbeh

    Audu Ogbeh bụbụ Onyeisi oche otu ndọrọndọrọ ọchịchị Peoples Democratic Party (PDP) ma bụrụkwa mịnịsta na-ahụ maka ọrụ ugbo n’oge garaaga anwụọla.

    Ogbeh nwụrụ n’afọ iri asaa na itoolu (78) n’ụbọchị Satọde, Ọgọst 8, 2025 dịka ụlọọrụ mgbasa ozi Nigeria Television Authority (NTA) si kwuo.

    NTA kwuru na "Onye bụbu Mịnịsta ngaraba ọrụ ugbo bụ Audu Ogbeh anwụọla n’afọ 78".

    Audu Ogbe bụ mịnịsta n’ọchịchị Muhammadu Buhari bụbu Onyeisiala Naịjirịa nwụrụ anwụ.

    Ọ bụ mgbe Audu Ogbe bụ mịnịsta n’afọ 2018 ka gọọmenti machiri ndị na-ebubata osikapa na Naịjirịa maka ịkwado ndị ọrụ ugbo na-akọpụta ya n’ime obodo.

  3. A gwala m Starmer udiri atụmatụ udo ga-amịta ezi mkpụrụ n’etiti Rọshịa na Yukren

    Onyeisiala mba Yukren bụ Volodymyr Zelensky na Praịm mịnịsta mba Briten bụ Keir Starmer

    Ebe foto si, PA Media

    Nkọwa foto, Volodymyr Zelensky na Keir Starmer

    Onyeisiala mba Yukren bụ Volodymyr Zelensky ekwuola na ya agwala Praịm mịnịsta mba Briten bụ Keir Starmer udiri atụmatụ udo ga-amịta ezi mkpụrụ n'etiti mba Yukren na Rọshịa.

    Ọ sị na Keir Starmer kwenyere n’atụmatụ ga-eme ka udo tọrọatọ ga-adịgịde adịgịde dị n’etiti Rọshịa na Yukren.

    Zelensky kwuru sị, ebe nsogbu dị bụ na mba Rọshịa nwereike mee ka nkata niile a ga-akpa maka atụmatụ udo bụrụ nke enweghị onye ga-ekwete na ya.

    Ọ gara n’ihu kelee mba Briten, Amerịka na ndị niile na-akwado udo n’etiti mba Rọshịa na Yukren.

  4. Mmadụ 25 anwụọla n’ihe mberede ụgbọala na Kenya

    Ihe mberede okporoụzọ na-emekarị na mba ahụ dị na mpaghara ọwụwa anyanwụ Afrịka

    Ebe foto si, Ministry of Health Kenya

    Nkọwa foto, Ihe mberede okporoụzọ na-emekarị na mba ahụ dị na mpaghara ọwụwa anyanwụ Afrịka

    Ụgbọala bọs bu ndị si olili ozu na-alọta na mpaghara ọdịda ọwụwa anyanwụ mba Kenya nwere ihe mberede okporoụzọ ma gbuo mmadụ iri abụọ na ise, ndị ọchịchị obodo kwuru.

    Akụkọ ndị uweojii nke BBC hụrụ kwuru na ụgbọala ahụ ekwezighị onye ọkwọ ụgbọala njikwa, nke mere ka ọ pụọ n'okporoụzọ wee dakpunye n'ime olulu dị n'akụkụ okporoụzọ Kisumu-Kakamega n'ehihie Fraịde.

    Ndị uweojii kwuru na ụmụnwaanyị iri, ụmụnwoke iri na otu nwa agbọghọ nwụrụ ebe ndị njem mmadụ iri abụọ merụrụ ahụ nke mmadụ ise n’ime merụrụ nnukwu ahụ.

    Ndị ọchịchị obodo kwuru na mmadụ anọ mechara nwụọ n’ụlọọgwụ.

    E kwuru na ndị njem a si n'ebe olili ozu na-alọta dịka e kwenyere na ha niile si n'otu ezinụlọ.

  5. Ndị uweojii ekwuola na ha ataghị Sowore ahụhụ oge ha nwuchiri ya

    onye na-akwado ikike mmadụ bụ Omoyele Sowore na ndị uweojji Naịjiria

    Ebe foto si, Getty

    Nkọwa foto, onye na-akwado ikike mmadụ bụ Omoyele Sowore na ndị uweojji Naịjiria

    Ndị uweojii Naịjirịa akatọọla foto na-efesasị ebe niile, bụ nke gosiri ebe onye na-akwado ikike mmadụ bụ Omoyele Sowore yi bandeeji n'ụlọọrụ ha n’Abuja.

    Cheta na ndị uweojii nwụchiri Sowore n'ụbọchị Tọzde 7 Ọgọst, 2025 mgbe ọ gara ịza oku ha kpọrọ ya na n'isi ụlọọrụ ndị uweojii dị n'Abuja n'ihi ebubo e boro ya gunyere; nkwutọ, mpụ na ime akwụkwọ adịgboroja ndị uweojii.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Naịjirịa bụ Olumuyiwa Adejobi kwuru na e nyere Sowore mgbapụta abalị abụọ mgbe e jidere ya dịka iwu Naịjirịa si dị ma kwuo na ha na-atụ anya na ọ ga-abịa zara ọnụ ya n'ụlọikpe ụbọchị na-abịa.

    Ọ kọwara na foto Sowore yi bandeeji n'ụlọọrụ ha igosi na ndị uweojii tara ya ahụhụ maọbụ merụrụ ya ahụ bụ asị.

    "Ya bụrụ na ọ bụ eziokwu, gịnị mere o kweghị ka ndị ahụike nke ndị uweojii bịara inyocha ya mee nke ahụ iji chọpụta ma ọ bụ eziokwu na ọ merụrụ ahụ?” Ka Adejobi jụrụ.

  6. Yukren agaghị enyefe Rọshịa ala ha - Ka Zelensky kwuru

    Onyeisiala Mba Yukren Zelensky

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, Onyeisiala Mba Yukren Zelensky

    Dịka onyeisiala Amerịka bụ Donald Trump na-akwado izute onye otu ya na Rọshịa bụ Vladimir Putin iji nweta nghọta zuruoke nakwa ịkwụsị agha dị n’etiti Rọshịa na Yukren, onyeisiala Yukren bụ Volodymyr Zelensky ekwuola na ọ gaghị enyefe Rọshịa ala ha.

    Nke a na-abịa dịka Trump rụtụrụ aka na inyefe okeala bụ ihe nwereike ịkwụsị agha dị n'etiti mba abụọ ahụ.

    Trump na Putin ga-enwe nzukọ n'ụbọchị Fraịde 15 Ọgọst 2025, mana Zelensky kwuru na ogbugbo ọbụla na-etinyeghị Yukren n’usoro e si nweta ya ga-abụ nke megidere udo.

    Njem Putin gara ịhụ Trump n'Amerịka ga-abụ nke mbụ ya kemgbe afọ 2019.

  7. Igbo ndị ọma, ụtụtụ ọma

    Nnọọ n’ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Satọde 9 Ọgọst 2025.

    Anyị ga na-ewetere unu akụkọ ihe na-eme na Naịjirịa nakwa ụwa niile.

    Biko sonyekwara anyị na Facebook, Instagram na WhatsApp Channelụ anyị.

    Ndewo!

  8. Otiegwu Wasiu Ayinde arịọla mgbahara maka esemokwu ya ndị ọrụ ụgbọelu ValueJet

    Otiegwu Wasiu Ayinde Marshal a maama dịka KWAM1

    Ebe foto si, KWAM1/Instagram

    Otiegwu Wasiu Ayinde Marshal a ma ama dịka KWAM1 arịọla mgbahara maka esemokwu dapụtara n’etiti ya na ndị ụlọọrụ ụgbọelụ 'ValueJet' n'ọdọụgbọelu Nnamdi Azikiwe dị n'Abuja n’ụbọchị Tuezde 5 Ọgọst, 2025.

    N’ihe onyonyo o wepụtara nye ndị mgbasaozi n’ụbọchị Fraịde 8 Ọgọst, 2025, KWAM1 kọwara na omume ya bụ ihe ihere na ụta dịịrị ya, dịka ọ rịọrọ Onyeisiala Tinubu, Mịnịsta na-ahụ maka ụgbọelu, ụlọọrụ ValueJet, onye na-akwọ ụgbọelu ahụ, ndị na-eso ya, ezinaụlọ ya nakwa ndị Naịjirịa niile mgbahara.

    Ụgbọelu ValueJet

    Ebe foto si, ValueJet/X

    O kwuru n’ihe bidoro okwu ụbọchị ahụ bụ maka ihe o ji na-aka nke ụfọdụ ndị si na ọ bụ mmanya ọkụ mana ihe o ji bụ mmiri make ahụike ya nke dọkinta gwara ya ka ọ na-aṅụ mmiri mgbe ọbụla.

    Cheta na a machiri nwamadị a ime njem ụgbọelu ruo ọnwa isii ma kwụsịtụ onye ọkwọụgbọelu ahụ ọrụ n'ihi esemokwu ahụ.

    Nwamadị a kwụchiri n'ihu ụgbọelu ahụ ma jụụ na ọ gaghị efepu maka na ha gwara ya wepụ iko o ji n'aka nke ha kwuru na ọ bụ mmanya ọkụ tupu ọ banye n'ime ụgbọelu ahụ.

    Ọ jụrụ nke mere ha ụlọọrụ ValueJet jiri mechie ụzọ ụgboelu ahụ ma sị na ọ gaghị eso ha aga Legọs n'ihi nnupuisi ya.

    Nke a butere ọtụtụ okwu na nkatọ na Naịjirịa kamgbe ihe ahụ mere.

  9. Mba Germany akwụsịla iresi Izrel ngwaagha maka ihe ha na-eme na Gaza

    Ụlọ ndị mmadụ na Gaza mebiri emebi dka Izrel tụrụ ogbunigwe

    Ebe foto si, Getty

    Atụmatụ Izrel Iweghara obodo Gaza enwetala nkatọ dị iche iche dịka mba Germany kwuru na ha ga-akwụsịtụ inye Izrel ngwaagha, n'ihi atụmatụ Praịm Mịnịnsta ha bụ Benjamin Netanyahu iweghara obodo Gaza.

    Germany so na mba ha na Izrel na-enwe ezigbo mmekọrita nakwa otu n'ime ndị kachasi enye Izrel ngwaagha esorola ndịisi mbaụwa katọọ mkpebi Izrel iweghara obodo Gaza.

    Ndị agha Izrel

    Ebe foto si, Getty Images

    Ụfọdụ ụmụafọ Gaza gwara ndị ntaakụkọ na ha na-atụ egwu ihe atụmatụ iweghara obodo ha ga-ebute mana ndị ọzọ kwuru na o nweghị ihe ga-eme ka ha hapụ obodo ha.

    Izrel kwuru na iji ndịagha ma nrụgide ga-eme ka ikike Hamas daa mba mana akụkọ ihe mere eme na-egosi anyị na iji naanị aka ike adịghị arụ ọrụ, dika Jeremy Bowen si kwuo.

    N’aka nke ọzọ akụkọ kwuru na gọọment Izrel anaghị ekwe ka ndị ntaakụkọ mbaụwa banye na Gaza ma kọọ akụkọ etu ha kwesịrị.

  10. Ndị nọ n'ụlọmkpọrọ na Naịjirịa ga-ebido ịtụ vootu n'oge ntuliaka - INEC

    Sylvester Nwakuche na Mahmood Yakubu

    Ebe foto si, Inec/Prisons/Facebook

    Ụlọọrụ na-ahụ maka ntuliaka na Naịjirịa bụ Independent National Electoral Commission (Inec) ekwuola na ndị nọ n’ụlọmkpọrọ ga-amalite ịtụ vootu n’oge ntuliaka.

    Onyeisi ụlọọrụ a bụ Mahmood Yakubu kwuru nke a mgbe ọ nabatara onyeisi ụlọọrụ na-elekọta ndị a tụrụ mkpọrọ na Naịjirịa bụ Sylvester Nwakuche n’isiụlọọrụ ha dị n’Abuja n’ụbọchị Fraịde 8 Ọgọst, 2025.

    Yakubu kwuru na ụlọikpe mkpegharị nyere iwu sị na ọ bụ ikike dịịrị ndị a tụrụ mkpọrọ ka e nye ha ohere idebanye aha ma tụọ vootu.

    O kwuru na ha maara na nke a bụ ikike dịịrị ndị a, inye ha ohere ịtụ vootu dịka e si eme ya na mba ndị ọzọ dịka gụnyere Gana, Kenya na Saụt Afrịka.

    Yakubu kwuru na ya ndị nlekọta ụlọmkpọrọ ga-arụkọ ọrụ iji hụụ na nke a bịara na mmezu, ma kwuo na ụlọomeiwu kwesịrị ịgbapụ ya ọsọ n’ime ka ọ bụrụ iwu.

    Nke a na-abịa dịka Nwakuche bụ onyeisi ndị nlekọta ụlọmkpọrọ kpọrọ oku ka e mee ka ndị nọ na mkpọrọ na-atụ vootu.

  11. Ụlọikpe ekwuola na a ga-eli Edgar Lungu na Zambia na-agbanyeghị isiakwara ezinaụlọ ya na-agba

    Edgar Lungu chịrị mba Zambia afọ isii malite na 2015 ruo 2021.

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, Edgar Lungu chịrị mba Zambia afọ isii malite na 2015 ruo 2021.

    Otu ụlọikpe ekwuola na gọọmenti mba Zambia nwereike ibulata ozu Edgar Lungu na mba ha iji lie ya dịka o kwesịrị, na-agbanyeghi na ezinaụlọ ya achọghị etu ahụ.

    Ezinaụlọ Lungu chọburu ka ha jiri nwaayọ lie ozu Lungu na mba Saụt Afrịka bụ ebe ọ nwụrụ n’ọnwa Juun. Obi adịghị ha mma maka mkpebi a ụlọikpe ukwu dị na Pretoria mere.

    Gọọmenti mba Zambia nabatara mkpebi ahụ ma kwuo na ọ bụ eziokwu na ha so ezinaụlọ onyendu ha eru uju kama na “ozu ya bụ gọọmenti nwee ya”.

    Nghọtahie a na-eso esemokwu dị n’etiti Lungu na onye nọchiri anya ya bụ Onyeisiala Hakainde Hichilema, nke ezinaụlọ ya kwuru na Lungu kwuru na ọ chọghị ka Hichilema bịa olili ozu ya.

    Ọkaikpe Aubrey Ledwaba kwuru na gọọmenti Zambia nwere ikike ibulata ozu onye bụbu onyeisiala nwụrụ anwụ ma nye ezinaụlọ ya iwu ka ha hapụ ozu nwamadị ahụ.

    Edgar Lungu nwụrụ dịka ọ gbara afọ iri isii na asatọ ka ọ rịachara ọrịa mana ezinaụlọ ya ekwughi kpọmkwem ụdịri ọrịa gburu ya.

  12. Kabịneti nchekwa mba Izrel akwadola ka ha nweghara Gaza niile

    Ụfọdụ ndị bi na Gaza gwara BBC na egwu na-atụ ha ebe ndị ọzọ kwuru na obi kara ha ma kwuo na ha agaghị ahapụ ụlọ ha.

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, Otu nwaanyị nọ n'ogige ụlọ ogbunigwe kụkpọrọ

    Kabineti na-ahụ maka nchekwa akwadola atụmatụ Praịm Mịnịsta Benjamin Netanyahu wepụtara inweghara obodo Gaza niile.

    Cheta na Netanyahu kwuru na ya nwere ebumnobi iwerecha mpaghara Gaza niile, mana ọ chọghị “ijide ya”.

    Netanyahu kwupụtara nke a oge ọ na-ezute ndị isi nchekwa mba Izrel iji kpaa gbasara etu ndịagha ga-esi were ọnọdụ.

    Ka ọ dị ugbua ọtụtụ ndị isi mbaụwa dị iche iche gụnyere Praịm Mịnịsta UK bụ Keir Starmer akatọọla atụmatụ a. Starmer kwuru na atụmatụ a bụ nke nwereike ibute ịkwafu ọbara na mpaghara ahụ.

    Ụfọdụ ndị bi na Gaza gwara BBC na egwu na-atụ ha ebe ndị ọzọ kwuru na obi kara ha ma kwuo na ha agaghị ahapụ ụlọ ha.

  13. Ụtụtụ ọma ndị ọma

    Nnọọ n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Fraịde 8 Ọgọst 2025.

    Anyị ga na-ewetere gị akụkọ ihe na-eme na Naịjirịa nakwa ụwa niile.

    Gaa n'ihu sonyere anyị n'akara Soshal midia Facebook, Instagram nakwa WhatsApp Channelụ anyị.

    Ka ihe ọma meere Okeke na Okafor taa.

    Ndewo!

  14. Mmadụ isii anwụọla na mba Kenya ka ụgbọelu ndị ahụike kpọkasịrị

    Mpaghara ebe ụgbọelu kpọkashịrị na isi obodo mba Kenya

    Ebe foto si, Reuters

    Mmadụ isii anwụọla mgbe obere ụgbọelụ ndị ọrụ ahụike kpọkasịrị n'isiobodo mba Kenya bụ Nairobi, dịka otu onye ọrụ gọọmenti na mpaghara ahụ si kwuo.

    Kọmishona na mpaghara bụ Kiambu kwuru na ndị nwụrụ gụnyere ndị dọkinta, nọọsụ, onye na-akwọ ụgbọelu ahụ, mmadụ abụọ guzo n'ebe ihe ahụ mere, ebe mmadụ abụọ merụrụ nnukwu ahụ.

    Akụkọ kwuru na ụgbọelụ ha malitere njem n'ọdụgbọelu Wilson n’ụbọchị Tọsde 7 Ọgọst, 2025 na-aga Hargeisa na mpaghara Somalia mgbe ihe mberede a mere dịka ọkpọkasịrị n’elu ụlọ ndị mmadụ bi na mpaghara Githurai nke Nairobi.

    Ezigala ndị nnyocha ka ha gaa n'ebe ahụ ihe mberede a mere iji nwee ike ime nyocha ma chọpụta ihe kpatara ya.

  15. Netanyahu ekwuola na Izrel nwere ebumnobi iweghara Gaza niile

    Netanyahu ekwuola na Izrel nwere ebumnobi iweghara Gaza niile

    Ebe foto si, Reuters

    Praịm Minista Izrel bụ Benjamin Netanyahu ekwuola na ya nwere ebumnobi iwerecha mpaghara Gaza niile, mana ọ chọghị “ijide ya”.

    Netanyahu kwupụtara nke a oge ọ na-ezute ndị isi nchekwa mba Izrel iji kpaa gbasara etu ndịagha ga-esi were ọnọdụ.

    Otu Mbaụwa bụ United Nations (UN) adọọla aka na ntị na atụmatụ ahụ ga-enwe “nnukwu ihe ọghọm,” ebe ezinaụlọ ndị e ji eji na-atụ ụjọ na ọnọdụ ahụ nwereike itinye ndụ ndị nke ha na nsogbu.

    Mana ụlọmgbasaozi Izrel kwuru na Netanyahu kwenyere na nke ahụ bụ naanị ụzọ a pụrụ isi bibie Hamas ma napụta ndị e ji eji, dịka mkparịtaụka maka nkwụsị ọgụ kụrụ afọ n’ala.

    Nzukọ ahụ na-abịa dịka mbaụwa na ndị ha na Izrel na-emekọrịta ihe kwanyere ha ọkụ n’ahụ ka ha kwụsị agha dị na Gaza ma nye ohere ka e bubatakwuo ngwa enyemaka na mpaghara ahụ.

    Izrel malitere ibuso Gaza agha n’isochi mwakpo Hamas mere n’ụbọchị 7 Ọktoba 2023, bụ mgbe ha gburu ihe ruru mmadụ 1,200 ma kpụrụ mmadụ 251 laa Gaza dịka ndị a dọtara n’agha.

  16. Iwe ji ndị mmadụ na Saụt Afrịka ka a tọhapụrụ onye e boro ebubo igbu mmadụ

    Otu nwoke e boro ebubo na o gburu ụmụnwaanyị abụọ ma nye ezi ozu ha

    Ebe foto si, Nomsa Maseko / BBC

    Onye ọkaiwu steeti na mba Saụt Afrịka ewepụla ikpe megide otu onye n’ime ndị a na-arụ aka na o gburu ụmụnwaanyị isi ojii abụọ ma were ozu ha ji nye ezi nri.

    Adrian de Wet so n’ime ụmụnwoke atọ ndị a na-ekpe ikpe maka ogbugbu e gburu Maria Makgato gbara afọ iri anọ na ise, na Lucia Ndlovu di afọ iri ato na anọ dịka akụkọ kwuru na ha na-achọ nrị n’ugbo a na-azụ ezi n'akụkụ Polokwane na mpaghara Limpopo n'ugwu Saụt Afrịka n’afọ 2024.

    Dịka ikpe ya malitere n’ụbọchị Mọnde 5 Ọgọst, 2025, ọ gbara ama na ọ bụ onye nwe ugbo ahụ bụ Zachariah Johannes Olivier gbagburu ụmụnwaanyị abụọ ndị ahụ ma manye ya n‘ike ka ọ tụba ozu ha n’ime ugbo ezi.

    Na-agbanyeghị na ama Adrian de Wet gbara megide Zachariah Johannes Olivier onye nwe ugbo ahụ, Oliver na onye ọzọ na-arụkwa ọrụ n’ugbo ahụ e boro ebubo ka nọ n’ụlọmkpọrọ.

    Walter Makgato, nwanne nwoke otụ n’ime ụmụnwaanyị abụọ ahụ e gburu nọ na-ebe akwa n'ụbọchị Wenezde 7 Ọgọst, 2025 dịka ụlọikpe yigharịrị ikpe ma nye iwu ka a tọhapụ otu n’ime ndị gburu nwanne ya nwaanyị, nke gosipụtara na ọ gaghị enweta ikpe ziri ezi.

  17. E nyela iwu ka a machie otiegwu Wasiu Ayinde ịbanye ụgbọelu na Naịjirịa

    Mịnịsta na-ahụ maka ọdọ ụgbọelu bụ Festus Keyamo na otiegwu Wasiu Ayinde Marshal a maama dịka KWAM1

    Ebe foto si, KWAM1/Instagram/FAAN

    Nkọwa foto, Festus Keyamo, otiegwu Wasiu Ayinde Marshal na ndị ọzọ

    Mịnịsta na-ahụ maka ọdọ ụgbọelu bụ Festus Keyamo enyela iwu ka ụlọọrụ “Federal Airports Authority of Nigeria, (FAAN)” kwụsị otiegwu Wasiu Ayinde Marshal a maama dịka KWAM1 ịbanye ụgbọelu na Naịjirịa.

    Festus Keyamo mere ka a mata nke a n’akara X sochia mịdịa ya bụ ebe ọ nọ kwupụta ntaramaahụhụ e nyere onye ọkwọ ụgbọelu ahụ ma ịnapụ ya akwụkwọ ịkike ịkwọ ụgbọelu ruo na e mechaa nyocha.

    Keyamo bụ onye kwuru na mmachị a machịrị Kwam1 ịbanye ụgbọelu ga-adị ire ruo na ha emechaa nyocha katọrọ ihe mere n'ọdọ ụgbọelu Nnamdi Azikiwe n'Abuja.

    N’okwu ya “ihe ndị ọrụ ụgbọelu ValueJet na Kwam1 mere n’Ọgọst 5 2025 n’ọdọ ụgbọelu Nnamdi Azikiwe bụ ihe nwereike ibute ọnwụ mmadụ”.

    “E kirri m onyonyo ihe mere ma hụ na ọkwọ ụgbọelu ma Kwam1 dara iwu”.

    “Ọ bụ Kwam1 na-anọchị ụgbọelu ịpụ mana ọ bụ ihe adịghị mma mgbe ọkwọ ụgbọelu nyara ụgbọelu n’agbanyeghị na mmadụ nọchịrị ya ụzọ”.

    “Ọ bụ nke a mere anyị ji napụ ọkwọ ụgbọelu akwụkwọ ikike ya ma machie Kwam1 ịbanye ụgbọelu ruo na anyị emechaa nyocha”.

  18. Erimeri GMO enweghị ihe ha mere - NAFDAC

    Erimeri GMO enweghị ihe ha mere - NAFDAC

    Ebe foto si, Getty Images

    Ụlọọrụ na-ahụ maka ụzọ e si eji ihe oriri na ọgwụ eme ihe na Naịjirịa bụ National Agency for Food and Drug Administration and Control (NAFDAC) n’asụsụ Bekee etinyela ọnụ na mkparịtaụka ọhanaeze na-enwe gbasara ihe oriri ndị a gbanwetụrụ ọdịdị ha bụ Genetically Modified Organisms (GMO).

    NAFDAC kwuru na erimeri ndị bụ GMO enweghị ihe ha mere, kama e kwesịrị ịkọwapụta ha nke ọma.

    Ọ bụ nnukwu onyeisi ụlọọrụ NAFDAC bụ Mojisola Adeyeye kwupụtara nke a n’otu ihe omume a haziri n’ụlọmgbasaozi Channels TV n’ụbọchị Tọzde 7 Ọgọst, 2025.

    O kwuru na ọ bụ ụlọọrụ National Biosafety Management Agency (NBMA) bụ ndị e nyere ikike ịhụ na nri ndị bụ GMO dị mma maka oriri, mana ha na ụlọọrụ NAFDAC na-agbakọta aka n’ọrụ.

    Adeyeye kwupụtara nke a dịka ọtụtụ ndị Naịjirịa malitere inwe mmetụta gbasara erimeri GMO ndị juputara na mba ahụ ugbua nakwa ogogo ihe oriri ndị a na-ere gburugburu Naịjirịa.

    Ọ sịrị na ọ bụ eziokwu na ụlọọrụ NAFDAC nwere ọrụ dịịrị ha ilekọta ihe oriri gburugburu Naịjirịa mana ụlọọrụ ndị ọzọ nwekwara ọrụ nke ha n’ogogo steeti.

  19. WAEC ga-enyocha mpụtara ule afọ 2025 n’ihi ọdachi teknụzụ

    WAEC ga-enyocha mpụtara ule afọ 2025 n’ihi ọdachi teknụzụ

    Ebe foto si, WAEC/X

    Ụlọọrụ West African Examinations Council (WAEC) ekwuola na ha na-enyocha nsogbu teknụụzụ dapụtara na mpụtara ule afọ 2025 ha wepụtara na nsonso a.

    Nke a mere ha jiri kwụsịtụ inye ndị mmadụ ohere ịbanye n’ọbaozi ha maka ịchọpụta mpụtara ule afọ 2025.

    WAEC kwupụtara nke a n’ozi ha bipụtara n’akara ọbaozi X ha, oge ha mere nnyocha imeụlọ.

    Ọnọdụ a bịara n’oge ọbaozi e ji achọpụta mpụtara ule WAEC nyụrụ ka ọkụ, dịka ụmụakwụkwọ na-enweghịkwa ohere ịhụ mpụtara ule ha.

    WAEC kwuru na debere na nnyocha a ha na-eme, ha ekpebiela ịgbapụ ọsọ nyochaa ma dozie ọdachi teknụzụ butere nsogbu ahụ.

    Ha gwara ndị gara lee mpụtara ule ha n’oge gara aga ka ha laghachi azụ n’ime elekere iri abụọ na anọ iji legharịa ya ọzọ.

  20. Ndị Tanzanịa na-eru uju Onyeisioche Ụlọ Omeiwu ha gbara arụkwaghịm

    Ndị Tanzanịa na-eru uju Onyeisioche Ụlọ Omeiwu ha gbara arụkwaghịm

    Ebe foto si, Tanzania Presidency/X

    Ụmụafọ mba Tanzanịa na-eru uju onye ndọrọndọrọ ọchịchị a ma ama bụ Job Ndugai, onye bụbu Onyeisioche Ụlọ Omeiwu mba ahụ.

    Ndugai bụ onye ndọrọndọrọ ọchịchị mbụ gbara arụkwaghịm oge ya na onyeisiala nwechara esemokwu.

    Nwoke ahụ garala ozi dịka Onye Omeiwu n’ime afọ iri abụọ na ise gara aga nwụrụ n’isi obodo Tanzanịa bụ Dodoma n’ụbọchị Wenezde ka ọ gbachara afọ iri isii na abụọ.

    Ọ bụ Onyeisioche Ụlọ Omeiwu mba Tanzanịa bụ Tulai Ackson kwupụtara nke a.

    E kwupụtabeghị ihe butere ọnwụ Ndugai, kama ụlọmgbasaozi ndị e nwere na mba ahụ sịrị na ọ nọ kemgbe na-anara ọgwụgwọ n’otu ụlọọgwụ dị na mba ahụ.

    N’ozi o wepụtara, Onyeisiala mba Tanzanịa bụ Samia Suluhu Hassan kwuru na “ya ji obi mwute” nata ozi gbasara ọnwụ Ndugai, dịkwa ka o zigaara ezinaụlọ nwoke ahụ na ndị enyi ya ozi nkasiobi.