Nchịkọta akụkọ ndị kachasị mkpa mere na mbaụwa n'ọnwa Ọgọst 2025.
Mkpuchi Na Eme Ozugbo
Uzoamaka Ewuzie, Ikechukwu Kalu, Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Michael Ilediagu, Adline Okere, Marvelous Obomanu
Ndịagha nnupụisi DR Kongo egbuola ndị nkịtị 140 n'agbanyeghị usoro udo - Otu ikike mmadụ
Ebe foto si, AFP
Nkọwa foto, Ọwụwa anyanwụ DR Kongo nke nwere nnukwu mmanụ si na Chi dị n'ala ka ọgụ na-aga na ya kemgbe
Ndịagha nnupụisi M23 egbuola opekatampe mmadụ otu narị na
iri anọ na mpaghara ọwụwa anyanwụ Democratic Republic nke Kongo n’ọnwa gara aga
n’otu n'ime arụrụ arụ kacha njọ nke ndị otu jiegbe mere kemgbe ọ malitere na
ngwụcha afọ 2021, otu na-ahụ maka ikike mmadụ kwuru.
Nke a na-eme n’agbanyeghị usoro udo nke mba Amerịka na Kataa
wetara iji wete ọgbaghara dị na mpaghara ahụ na njidebe.
Ha kwuru na ndị akaebe gwara otu ahụ na ndịagha nnupụisi nke
Rụwanda na-akwado "gburu" ndị bi n'ime obodo, gụnyere ụmụnwaanyị na ụmụaka,
ọkachasị ndị agbụrụ Hutu na mpaghara Rutshuru, n’akụkụ ogige Virunga National
Park.
Cheta na ndịagha nnupụisi ahụ gọnarịrị n’aka ha adịghị n’ogbugbu
ndị a, ma kpọọ ebubo ndị a "nkọwa abụghị eziokwu".
Trump ekwuola na Rọshịa nwereike ịjụ inwe nkwekọrịta maka ịkwụsị agha na Yukren
Ebe foto si, Getty Images
Kremlin akọwaala nzukọ dịịrị n’etiti
onyeisiala Rọshịa bụ Vladmir Putin na onye otu ya nke mba Yukren bụ Volodymyr
Zelensky dịka ihe na-abaghị uru.
Ọnọdụ a na-abịa dịka onyeisiala Amerịka bụ Donald Trump kpọghachiri
oku ka ndị ndu mba abụọ ahụ zute iji kpaa maka ịkwụsị agha dị na mba Yukren.
Oku a na-akpọ ka mba abụọ ahụ nwee nzukọ na-abịa sịka Trump
zutere Putin n’Alaska n’izuụka gara aga ma nabatakwa Zelensky na ndị ndu Yurop
asaa n’obi ọchịchị White House n’ụbọchị Mọnde.
Trump kwetara na agha ahụ bụ nke “siri ike” ịkwụsị ma nabata
na o kwere omume na onyeisiala Rọshịa enweghị mmasị ịkwụsị ọgbaaghara ahụ.
“O kwere omume na ọ chọghị inwe nkwekọrịta,” ka ọ
gbakwunyere.
Starmer etoola ọganihu e nwetara na mkparịtaụka Yukren
Ebe foto si, EPA
Praịm Minista mba UK bụ Keir Starmer akọwaala mkpebi onyeisiala
Amerịka bụ Donald Trump ịrọpụtara Yukren nchekwa dịka atụmatụ dabara adaba.
O tokwara mbọ niile a na-agba iji hụ na Volodymyr Zelensky na
Vladimir Putin nwere nzukọ.
Praịm Minista ahụ gara nzukọ ndị ndu n’obi ọchịchị White
House n’ụbọchị Mọnde, dịka ọ hapụrụ ezumike ya na ezinaụlọ ya gara na Scotland.
Ọ nọọrọ n’isi nzukọ otu European Union nakwa nke
Commonwealth n’ụbọchị Tuzde, ka ya na ndị ndu kpaa maka ihe ndị ọzọ ha ga-eme.
Ndị ndu ahụ kpakwara ụzọ ndị ọzọ ha pụrụ isi kwanyekwuo
Putin ọkụ n’ahụ, nke gụnyere inye ya ntaramaahụhụ.
N’aka nke ya, Trump gwara ụlọmgbasaozi Fox News na Yukren “agaghị
esonye n’otu nchekwa NATO”, ma rụtụ aka na ndịagha Yurop ga-aga Yukren iji
gbochie mwakpo Rọshịa n’ọdịnihu.
Zelensky sị na ọ di njikere izute Putin n'ihu n'ihu ka ya na Trump nwechara mkparịtaụka
Ebe foto si, Getty Images
Onyeisiala mba Yukren na ọtụtụ ndị ndu mba Yurope rutere n’obi
ọchịchị mba Amerịka bụ White House izute Onyeisiala Donald Trump maka mkparịtaụka
ọhụrụ iji gbochie agha dị na mba Yukren.
Ụfọdụ ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ na mkparịtaụka ahụ
gụnyere;
Putin na Zelensky nwereike izute
onwe ha. Trump kwuru na ọ kpọrọ Putin iji hazie mkparịtaụka ya na Zelensky, n’ihi
nke a, a ga-enwe mkparịtaụka n’etiti Trump, Putin na Zelensky.
Trump na ndị ndu mba Yurope
enweghi nkwekọrịta banyere nkwụsị ịkwa mgbọ - Trump dịka ọ nabataghị atụmatụ ka
a kwụsị ịkwa mgbọ tupu a na-enwe mkparịtaụka ọzọ ịkwụsị agha ahụ. Nke a mere ka
ndị ndu mba Yurope gbarụọ ihu. “Echeghi m na ọ ga-adị mma ka e nwee mkparịtaụka
ọzọ ma a kwụsịtụghị ịkwa mgbọ,” ka Onye Chanselọ mba Germany bụ Friedrich Merz
kwuru. “Ya mere ka anyị gbaa mbọ hụụ na nke a mere ma kwanye Rọshịa ọkụ n’ike”.
Trump kwuru na mba Amerịka ka
enye aka chekwaa mba Yukren. Nke a bụ mkpebi gbara ọkpụrụkpụ o merela banyere
nchekwa, nke bụ ihe kachasị emetụta mba Yukren. Mana o dochaghị anya etu mba
Amerịka ga-esi mee nke a.
Zelensky gbapụrụ iche na nzukọ
nke a karịa ka ọ dị na nke ha nwere n’ọnwa Febụwarị 2025. O yi uwe ‘suit’ ma
jiri akwụkọozi si n’aka nwunye ya, nakwa ụkpa ekele o nyere na mmalite okwu ya.
Zelensky kwuru na mkparịtaụka ya
na Trump bụ nke kachasị mma ọ na-enwe kamgbe, ebe Trump kwuru na mkparịtaụka bụ
nke dị “mma”.
Zelensky gara n’ihu kwuo na ọ dị
njikere izute Putin n’ihu n’ihu maka ịkpa nkata etu a ga-esi kwụsị agha dị n’etiti
mba Rọshịa na Yukren.
Unu asaala chi?
Obi sara mbara ka anyị anabata gị n'ọgbakọ BBC Igbo taa.
Trump na Zelensky ezutela, kpebie etu ha ga-esi kwụsị agha dị n'etiti Rọshịa na Yukren
Ebe foto si, Getty Images
Nkọwa foto, Trump na Zelensky ka ha nwere nzukọ na 'White House'
Onyeisiala mba Yukren bụ Volodymyr Zelensky na onyeisiala Amerịka bụ Donald Trump na-enwe nzukọ ugbua iji weta udo ma kwụsị agha dị n'etiti Yukren na Rọshịa.
Nke a na-abịa dịka Trump zutechara onyeisiala Rọshịa bụ Vladmir Putin n'ụbọchị Satọde.
Dịka nzukọ ha na-aga n'ihu, Trump kwere nkwa ezi nchekwa nye Yukren na nkwekọrịta udo ọbụla, dịka o kwuru na ịkwusị ịkwa mgbọ abụghị ihe ga-eme ka agha dị n'etiti Roshịa na Yukren kwụsị.
Zelensky kwupụtara nkwado ya inwe nzukọ n'etiti Amerịka na ndị ndu mba Rọshịa, dịka ọ gwara Trump na ọ ga-akwado atụmatụ ya ịkwụsị agha n'etiti Rọshịa na Yukren
Trump kwuru na onyeisiala Rọshịa bụ Putin na-atụ anya oku ya n'ekwentị ka mkparịtaụka ha gachara.
Ebe foto si, Getty Images
Nkọwa foto, Trump na Zelensky enwela nzukọ ma kpebie etu ha ga esi akwụsị agha dị n'etiti Yukren na Rọshịa
Ndị isi mba Yurope erutela ‘White House’ maka mkparịtaụka n’etiti Trump na Zelensky
Ebe foto si, AFP Via Getty Images
Nkọwa foto, Praịm Mịnịsta Mba UK na-apụta n'ụgbọala ya dịka ọrutere 'White House'
Ndị ndụ mba
Yurope erutela n'obi ọchịchị Amerịka dịka Trump na Zelensky na-akwado inwe mkparịtaụka.
Zelensky ekwubuola
na Yukren dị njikere maka nkwekọrita ịkwụsị agha dị n’etiti ha na Rọshịa, dịka ha boro Putin
ebubo ịkuda obi ndị n’agbalị ihu na ọgụ ha kwụsịrị.
Cheta na onye ozi Trump kwuru n'ụbọchị Sọnde na Putin kwenyere ihu na Yukren nwere ezi
nchekwa dịka ha na-enwe mkparịtaụka na mba Amerịka.
Ebe foto si, Getty Images
Nkọwa foto, Onyeisiala mba France na-apụta n'ụgbọala ya dịka ọrutere 'White House'
Ezinaụlọ nde 2.2 dara ogbenye ga-eketa ego enyemaka Gọọmenti Etiti – Minista
Ebe foto si, Getty Images
Obere Minista
na-ahụ maka ọrụ obi ebere na mbelata ụbịam na Naịjirịa bụ Tanko Sununu ekwuola
na Gọọmenti Etiti nwere ọnụnụọkụnobi ibelata ụbịam na mba ahụ.
Ọ sịrị na
edekọọla ihe karịrị ezinaụlọ nde abụọ dara ogbenye maka iketa oke n’ihe omume
nkesa ego gọọmenti n’oge na-adịghị anya.
O kwuru na ha
ga-akpọtụrụ ezinaụlọ nde abụọ na ụma abụọ ndị ga-eketa oke n’ihe omume ahụ tupu
ngwụcha ọnwa Ọgọst.
Ya bụ
Minista kọwara na ọchịchị dị ugbua agbatala ọsọ enyemaka dị iche iche maka ndị dara
ogbenye nakwa ndị ụwa na-atụ n’ọnụ na Naịjirịa.
Sununu kọwara
na a hụtala ọganihu gbapụtara ihe site n’ihe omume Conditional Cash Transfer
(CCT), dịka e jiiri ya kesaa ọtụtụ ijeri naịra.
Nkọwa foto, Isiobodo Sudan dịka ọzu nke onwe ya mgbe ndiagha weghara ya na Maachị
Otu ndị na-ahụ maka ikike mmadụ a ma-ama na
mba Sudan eboola ndịagha mba ahụ nakwa ndị ọrụ nchekwa ebubo ịta ndị mmadụ ahụhụ rụọ n’ọnụ
ọnwụ.
Otu a nke a kpọrọ ‘Emergency Lawyers’ kwuru
na ha edekọtala ọtụtụ nnwuchi ndịagha mere
n'isiobodo Sudan bụ Khartoum.
Ha kwuru na o nwere mgbe a na-ahụ ozu ụfọdụ ndị
ha nwuchiri, dịka a na-ahụkwa ihe akaebe gosiri na a tara ha ahụhụ.
Cheta na ndịagha Sudan
weghaara isiobodo ha n’aka ndịagha nnupụisi a kpọrọ Rapid Support Forces n'ọnwa Maachị.
Ka o sina dị, ndịagha azaghị oku
BBC kpọrọ ha n'ụbọchị Sọnde maka ebubo a.
A kagbuola mmemme ‘graduation’ maka ụmụakwụkwọ ọtaakara n’Imo steeti
Ebe foto si, Getty Images, Screenshot
Gọọmenti
Imo steeti enyela iwu ka a kwụsị mmemme ndị gụchara akwụkwọ maka ụmụakwụkwọ ọtaakara
na ndị gụchara ogogo sekọndịrị nta.
Nke a dị n’ozi Kọmịshọna na-ahụ maka agụmaakwụkwọ na
steeti ahụ bụ Bernard Ikegwuoha wepụtara n’ubọchị 8 Ọgọst, 2025.
O kwuru na mịnịstrị ya wepụtara atụmatụ ahụ n’ihi ọnụnụọkụnobi
ha nwere ịrọpụta agụmaakwụkwọ bụ ịgba maka ụmụakwụkwọ niile na steeti ahụ.
N’ịgbakwasa ụkwụ n’ọdịdị agụmaakwụkwọ 6-3-3-4 dị na Naịjirịa,
Kọmịshọna ahụ kwuru na ndị e nyere ikike ka a haziere mmemme ndị gụchara akwụkwọ
bụ naanị ụmụakwụkwọ gụchara praịmari (Primary 6) na ndị nke gụchara sekọndịrị
(SSS 3).
Ebe foto si, Imo State Government
“Malite ugbua gawa n’ihu, a kagbuola mmemme ndị gụchara akwụkwọ maka ụmụakwụkwọ ọtaakara na ndị nke gụchara ogogo sekọndịrị nta (JSS 3)”.
“Nke a bụ iji mee ka ụmụakwụkwọ, ndị nne na nna, ndị nlekọta ụmụaka, ndị nwere aka oke na ụlọakwụkwọ dị iche iche tinye uche na mmụta ụmụakwụkwọ na ngwụcha agụmaakwụkwọ praịmarị na sekọndịrị ha,” ka ozi ahụ kwuru.
Ikegwuoha gwakwara ndị isi ụlọakwụkwọ niile, ọkachasị nke ndị nkịtị nwe, ka ha hụ na ọ bụ naanị akwụkwọ ọgụgụ gọọmenti kwadoro ka ha ji akụziri ụmụakwụkwọ ihe.
Ụlọọrụ NEMA na-agba mbọ ịzọpụta ndị nwere ihe mbere ụgbọmmiri na Sokoto Steeti
Ebe foto si, NEMA/X
Nkọwa foto, Njirimara ụlọọrụ NEMA na ndị ọrụ ha nọ n'akụkụ mmiri ebe ụgbọmmiri ahụ kpuru
Ulọọrụ National
Emergency Management Agency (NEMA), ngalaba Sokoto Steeti, ezigala ndị ọrụ
gbatagbata ha ka ha nyere aka na mbọ a na-agba ịzọpụta ndị nwere ihe mberede ụgbọmmiri
na Sokoto Steeti.
Onyeisi ụlọọrụ NEMA bụ Zubaida Umar kwuru na o zigara ndị ọrụ
gbatagbata ahụ ngwangwa o nwetara ozi na ụgbọmmiri bu mmadụ 50 na-aga ahịa
Goronyo kpuru n'ụtụtụ Mọnde 18 Ọgọst, 2025.
Akụkọ ruru anyị aka ugbua kwuru na a zọpụtala mmadụ iri ebe
a ka na-achọ mmadụ iri anọ ndị ọzọ achọ.
NEMA kwuru na ha na ndị obodo nakwa ndị enyemaka ndị ọzọ
na-agba mbọ ịchọta ndị ahụ ma kwe nkwa na ha ga-ewepụta ozi banyere mbọ ha ịzọpụta
mmadụ iri anọ ahụ tinyere inye ezinaụlọ ndị ahụ njinji ahụ metụtara nkwado n’oge.
Ebe foto si, NEMA/X
Ebe foto si, NEMA/X
Naịjirịa achụpụla ndị si mba ofesi ụlọikpe mara ikpe maka ebubo mpụ cyber
Ebe foto si, EFCC
Nkọwa foto, Ụfọdụ ndị si mba ọzọ ahụ Naịjirịa chụlara
Ụlọọrụ
Nigerian Immigration Service (NIS) na ụlọọrụ Economic and Financial Crimes
Commission (EFCC) amalitela ịchụla ndị si mba ọzọ nọ na Naịjirịa ụlọikpe mara
ikpe maka ebubo dị iche iche gụnyere mpụ cyber.
A chụlara mmadụ
42 n’ime mmadụ 192 ahụ si mba Chaịna na Filipins Ụlọikpe Ukwu gọọmenti etiti dị
na Legọs mara ikpe na mba ha dị iche iche.
Ndị a a chụpụrụ
na Naịjirịa so na mmadụ 759 ụlọọrụ EFCC nwuchiri n’ọnwa Disemba 10, 2024 na
Oyin Jolayemi Street dị na mpaghara Victoria Island, Legọs Steeti.
Ụlọọrụ EFCC
kwuru na ha ga-achụlakwa ọtụtụ ndị ọzọ ụlọikpe mara ikpe na mba ha dị iche iche
n’ụbọchị Mọnde 18 na Tuzde 19 Ọgọst, 2025. EFCC kwuru na ha enyefeela ndị mba
ofesi ahụ a mara ikpe n’aka ụlọọrụ Nigerian Immigration Service (NIS).
Trump ekwuola na Zelensky nwereike ịkwụsị agha Yukren na Rọshịa ozugbo
Ebe foto si, Reuters
Onyeisiala mba Amerịka
bụ Donald Trump ekwuola na ogbo nke mba Yukren nwereike ịkwụsị ọgụ ha na mba Rọshịa
“ozugbo” mana ọ gụpụrụ atụmatụ Yukren isonye n’ọgbakọ Nato maọbụ inweghachite
okeala Crimean Peninsula, bụ nke Rọshịa kpachiri n’afọ 2014 dịka okwu ndị
ga-eso na mkparịtaụka udo ha ga-eme n’ụbọchị Mọnde 18 Ọgọst, 2025.
Nke a na-abịa dịka
Zelensky ga-awuchi na mba Amerịka n’ụbọchị n’isiụlọọrụ gọọmenti Amerịka bụ
White House maka mkparịtaụka ahụ, ebe ndị ndu mba nọ na Yurope ga-esonye na ya.
"Onyeisiala Zelensky nwereike ịkwụsị agha ha na Rọshịa ngwa ngwa
na-egbughi oge, ma ọ bụrụ na ọ chọrọ, maọbụ ya gaa n’ihu,” Trump kwuru.
"Cheta etu o sim alite. Ọ gaghị enwete okeala Crimea nke
Obama nyere (n’afọ 12 gara aga na-agbaghị egbe ọbụla!), YUKREN AGAGHỊ ESONYE N’OTU NATO.
Ụfọdụ ihe agaghị agbanwe!!!” ka ọ gbakwụnyere.
Onyeozi pụrụiche nke
Onyeisiala Trump kwuru na Vladimir Putin ekwela inye mba Yukren nchekwa – gụnyere
udịrị atụmatụ nchekwa nke otu Nato.
Zelensky dị na mbụ kpọọ oku maka nkwa nchekwa ahụ, dịka ọ
nabatara mkpebi mba Amerịka banyere usoro inwe mkparịtaụka udo ha na Rọshịa.
Igbo ndị ọma mma mma nụ ooo!
Anyị bụ ụkpa ekele na-anabata gị n'izuụka ọhụrụ a.
Putin ekwela nkwa nchekwa nye Yukren dịka ha na-akwado ime udo
Ebe foto si, Reuters
Onyeozi Onyeisiala Donald Trump bụ Steve Witkoff ekwuola na Onyeisala mba Rọshịa bụ Vladimir Putin ekwenyela na mba Yukren ga-enwe nchekwa dịka ihe ga-eso na nkwekọrịta udo ha na-akwado inwe.
Onyeisiala Yukren bụ Volodymyr Zelensky ga-eso Praịm Mịnịsta
mba Briten na ndi ndu mba Yurope gaa n'Amerịka maka nzuko ha na Trump ga-enwe.
Ebe foto si, EPA
Nke a na-abịa dịka Zelensky gwara ndị ntaakụkọ “na-ekwesịrị ka nchekwa rụọ ọrụ” dịka ha na-achọ ịnwe nkwekọrita ụdọ iji kwụsị ọgụ ha na Rọshịa.
A na-atu anya na nzukọ a ga-enwe n'isiụlọọrụ gọọmenti mba Amerịka bụ “White House” ga-amita mkpụrụ ọma.
Ndị Palestine agbala ọsọndụ ka ndịagha mba Izrel tụrụ ogbunigwe na Gaza
Ebe foto si, Reuters
Ọtụtụ ndị mmadụ bi na mpaghara Ndịda
Zeitoun na Gaza agbapụla site n'ebe obibi ha dịka ndịagha mba Izrel tụrụ ogbunigwe ebe
ahụ n’ụbọchị Satọde16 ọgọst, 2025.
Ụlọọrụ nchekwa obodo na Gaza kwuru na e gburu
mmadụ ruru iri anọ na mwakpọ ahụ Izrel mere.
N’aka nke ọzọ a na-enwe ngagharịiwe na mba
Izrel maka atụmatụ gọọmenti Izrel nke bụ ịkpachi obodo Gaza.
Ebe foto si, Reuters
Nkọwa foto, Ndi na-eme ngagharịiwe na mba Izrel mechiri okporo ụzọ
Ihe karịrị mmadụ 200 na-efu efu dịka oke idemmiri mere Pakistan
Ebe foto si, AFP via Getty Images
Ihe karịrị mmadụ narị abuo na-efu na
mpaghara ugwu-ọdịda anyanwụ mba Pakistan n’ihi oke idemmiri mere n'ebe ahụ.
Ndị ọrụ gọọmenti kwuru na idemmiri a egbuola
ihe karịrị mmadụ narị na Pakistan, ụfọdụ ndị nwụrụ si na mpaghara Khyber
Pakhtunkhwa.
Ọnụọgụgụ ndị na-efu efu nwereike ịrị elu
dịka ndị ọrụ gbata gbata eliela ozu mmadụ asatọ a na-amaghị ndị nwe ya, dịka otu
onye ọrụ gọọmenti b u Jehanfir Khan si kwuo.
A nwuchiela ndị ndu abụọ nke otu na-eyi ndụ egwu a kpọrọ Ansaru
Ebe foto si, ONSA
Onye ndụmọdụ banyere nchekwa
na Naịjirịa bụ Nuhu Ribadu ekwupụtala nwuchi mmadụ abụọ bụ ndị ndu otu na-eyi
ndụ egwu a kpọrọ ‘Ansaru terrorist group’.
Ribadu kwupụtara nke a na
mgbasaozi o nyere banyere ọnọdụ nchekwa n’isiụlọọrụ ya ma kwuo na ndị a
nwuchiri bụ Abu Baraa, onyeisi na Mahmuda bụ osote ya.
E kwuru na aka ndị a dị n’ọtụtụ
mwakpo iyi ndụ egwu na-eme na Naịjirịa, tinyere ntọrị ndị mmadụ gbagotere elu.
Ndịisi ndị ọrụ nchekwa dị iche
iche nọ mgbe a na-ekwupụta nwuchi ndị a.
Ribadu kọwara na “Mahmud Muhammad
Usman e ji Abu Bara’a maara bụ kpọrọ onwe ya ‘Emir nke Ansaru bụ onye na-ahazi out
iyi ndụ egwu ndị ọzọ jupụtara na Naịjirịa, ma bụrụkwa onye na-akpa nkata maka
ntọrị ndị mmadụ, izu ohi bụ nke ha ji akwado iyi ndụ egwu kamgbe ọtụtụ afọ.
“Onye nke abụọ bụ Mahmud al-Nigeria
e ji Mallam Mamuda maara, onye kpọrọ onwe ya onyeisi ọrụ nke Abu Bara’a. Ọ bụ
onye ndu otu “Mahmudawa” na-ezo na mpaghara Kainji mana na-akpa ike na Niger,
Kwara Steeti nakwa Benin Republic.
“A zụrụ Mamuda na Libya n’afọ
2013 ruo 2015 n’aha otu na-eyi ndụ egwu Jihad na Ijipt, Tunisia na Ọjerịa. Ọzụzụ
ya gbakwasịrị ụkwụ n’etu e si ebu ngwa ọgụ na ịrụ ogbunigwe.”
Ribadu kwuru na mmadụ abụọ ka a
na-achọ achọ kamgbe ọtụtụ afọ dịka ha mere ọtụtụ mwakpo gburu ma ndị nkịtị na ndịagha.
O kwuru na ụfọdụ mwakpo ha mere gụnyere
ịwakpo ụlọmkpọrọ Kuje n’afọ 2022, mwakpo ọdọ a na-emepụta uranium (akụrụngwa e
ji arụ ogbunigwe), ntọrọ ndị injinịa mba Fransị Francis Collomp na Katsina
Steeti, na ntọrọ Alhaji Musa Umar Uba n’ọnwa Mee afọ 2019.
“Aka ha dịkwa na ntọrọ Emir nke Wawa,
ha ndị ọzọ na-eyi ndụ egwu na Mali, Niger, Burkina Faso na-arụkọ ọrụ.
Ribadu kwuru na nwuchi mmadụ abụọ
a bụ ihe kachasị gbapụta ihe ndị ọrụ nchekwa na-eme iji chekwaa Naịjirịa.
O kwuru na nwuchi ndịisi otu Ansaru
a ga-ekposa ndị otu ka ha gharazie ịkpa ike na Naịjirịa.
Otu Ansaru a sepụtara isi mbụ n’ọnwa
Jenụwarị afọ 2012, site na nkwupụta ha mere na Kano Steeti, dịka otu alaka si n’otu
Boko Haram.
Ndị isi mba Yurop ekwuola na ha ga-esonye Zelensky na nzukọ ya na Onyeisiala Trump ga-enwe
Ebe foto si, Getty Images
Onyeisi otu
European Commission bụ Ursula von der Leyen ekwuola na ya na ndị isi mba Yurop
ndị ọzọ ga-esonye Onyeisiala Yukren bụ Volodymyr Zelensky na mkparịtaụka ya na
Onyeisiala Donald Trump na-achị Amerịka ga-enwe n’ụbọchị Mọnde 18 Ọgọst 2025 n’obi
obi ọchịchị White House dị na Washington.
Onyeisiala Volodymyr
Zelensky ga-eme njem n’Amerịka ebe ya na Onyeisiala Trump ga-anọ nwee mkparịtaụka
banyere agha dị n’etiti Rọshịa na Yukren.
Nke a na-abịa
dịka Volodymyr Zelensky kwuru na Rọshịa na-etinye ọgbaghara na mbọ niile a
na-agba ịkwụsị agha Yukren.
Zelensky
mere ka o doo anya na Rọshịa ekweghị n’oku niile a kpọrọ ka ha kwụsị ọrụ ndịagha
ha nakwa nkwekọrịta ịkwụsị mgbọ.
Onyeisiala
Donald Trump kwuru na ọ chọrọ ịkwụsị agha Yukren ma weta udo zuruoke n’etiti Rọshịa
na Yukren.
N’aka nke ọzọ
ndị isi mba Frans, Jamini na UK na mba ndị ọzọ ha na ha na-enwe mmekọ ga-enwe
mkparịtaụka banyere agha Yukren n’ụbọchị Sọnde 17 Ọgọst, 2025
Lee ihe megoro kamgbe Trump, Putin enweghị nwekọrịta n’Alaska
Ebe foto si, Pool via REUTERS
Nkọwa foto, Donald Trump na Vladimir Putin
Onyeisiala mba Rọshịa bụ Vladimir Putin esila Alaska laa na-enweghị nkwekọrịta banyere
ịkwụsị agha na Yukren maọbụ kweta atụmatụ
nkwụsịtụ ịkwa mgbọ.
Mana lee ihe ndị ọnụ na-eru n’okwu kwuru maka ihe mere
nakwa ihe a na-atụ anya ugbua.
Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump na ndị ndu NATO nakwa Onyeisiala mba Yukren bụ Volodymyr
Zelensky kpara nkata ka Trump na Putin kpachara n’Alaska.
Ebe foto si, Reuters
Nkọwa foto, Keir Starmer.
Trump jiri akara ya na soshal mịdịa Truth kwuo na ụzọ kacha mma ịkwụsị agha Rọshịa na Yukren bụ mba abụọ ahụ “inwe nkwekọrịta udo karịa atụmatụ ịkwụsịtụ ịkwa mgbọ”.
Trump sị na Onyeisiala Zelensky ga-abịa Washington DC n’ụbọchị Monde ma kwuo na ọ bụrụ na ihe gaa etu o kwesiri na ya ga-etinye ọgbakọ nke Putin ga-abịa”.
Ebe foto si, SAUL LOEB/AFP via Getty Images
Nkọwa foto, Donald Trump na Volodymyr Zelensky
Volodymyr Zelensky:
Mana Onyeisiala mba Yukren bụ Volodymyr Zelensky na-ekwu na ya gwara Trump na “ọ ka mma na e nyere mba Rọshịa nnukwu ntaramaahụhụ ma ọ bụrụ na Rọshịa achọghị ịbịa ọgbakọ udo nke mba Rọshịa, Yukren na Amerịka nakwa ndị ọzọ ga-anọ”.
Ebe foto si, Getty Images
Nkọwa foto, Donald Trump , Vladimir Putin na ndị ọzọ
Vladimir Putin:
Ka Vladimir Putin si Alaska laa, o wepụtara ozi sị na ọ ga-amasị ya ma agha Rọshịa na Yukren kwụsị.
Ọ kọwara ihe mere n’Alaska dịka “mmalite nkwụsị agha” ma dọọ aka na ntị ka Yukren na Yurope hara ikposa ihe ha kwetere.
Ebe foto si, Getty Images
Nkọwa foto, Donald Trump , Vladimir Putin na ndị ọzọ
Ndị ndu Yurope:
Ndị ndu mba dị na Yurop kwuru na ha dị njikere ịkwado usoro nkwekọrịta mba Rọshịa, Yukren nakwa Amerịka na Yurop ga-eso guzobe.
Ha kwuru na ihe ọzọ a ga-eme bụ ka Trump na Zelensky nwee mkparịta ụka nke ha.