Ụgbọala gwongworo na ụgbọala ndị njem bu mmadụ iri na asatọ kụkọtara onwe ha ma gbuo mmadu abụọ.
Ihe mberede ahụ mere n'ihu Mahadum Ebonyi steeti n'ụbọchị Satọde Ọgọst 23, 2023.
Ọnụ na-ekwuru ndị Uweojii na steetị ahụ bụ Joshua Ukandu kwuru na ọ bụ eziokwu na mmadụ abụọ nwụrụ n'ihe mberede okporoụzọ ahụ.
Ukandu tinyere na ọ bụ ndị ọkwọ ụgbọala abụọ kpatara ajọ ihe mere.
Mana ndị hụrụ ihe mere kwuru na ndị ọrụ nchekwa ụzọ a na-akpọ Federal Road Safety abịaghị ọsọ ọsọ mgbe mkpamkpa ahụ kpara.
Nnamdi Kanu akpọọla oku ka NBA nnyocha ọkaikpe Binta Nyako, Tsammani, Lawal
Nkọwa foto, Nnamdi Kanu nọ n'etiti
Nnamdi Kanu bụ onye ndu otu Indigenous People of Biafra (IPOB) nakwa onye wepụtara otu nchekwa Eastern Security Network (ESN) akpọọla ọkụ ka e mee nyocha n'isi ndị ọkaikpe Naijiria ọnụ ọgụgụ ha rụrụ atọ.
Nnamdi Kanu bụ onye gọọmenti Naịjirịa kpọpụrụ ụlọikpe ma ji chie ya n'ụlọ ọrụ ndị uweojii nzuzo bụ Department of Security Services (DSS) n'Abuja kpọrọ oku ahụ n'akwụkwọ ọ degara ndị otu jikọtara ndị ọkaiwu bụ Naijiria Bar Association (NBA) n'ọnwa Ọgọọst 2025.
N'akwụkwọ ahụ nke NBA natara, Nnamdi Kanu gụpụtara ndị ọkaikpe ọ chọrọ ka e mee nyocha dịka Binta Nyako, Haruna Tsammani na Garba Lawal.
Kanu boro ndị ọkaikpe ahụ ebubo ime ihe na-enweghị nkwado n'iwu nakwa usoro ọrụ ha dịka ọkaikpe.
Ọ gwara NBA ka ha nwee mkpebi ime ka ndị ọkaikpe dara iwu nwee ntaramahụhụ, ma ka ha tinye ọnụ n'ikpe ya na gọọmenti Naịjirịa.
Dịka Kanu si kwuo "ugbua abụghị mgbe NBA ga-agba nkịtị maka na onye gbara nkịtị ekwetela".
Rọshịa na-agbatị agha site na ịkwụsị mkparịtaụka udo - Onyeisiala Zelensky
Ebe foto si, EPA/Shutterstock
Nkọwa foto, Onye ndu mba Yukren kwuru na ọ naghị atụ egwu nzukọ ọ bụla, na ya adịghị ka Rọshịa
Onyeisiala mba Yukren bụ Volodymr Zelensky na-ebo mba Rọshịa ebubo ịgbatịkwu agha dị n'etiti mba abụọ ahụ site na ‘ime ihe
nille ha nwereike’ iji gbochie nzukọ ya na Onyeisiala Vladimir Putin maka ịkwụsị
agha.
Cheta na Onyeisiala
mba Amerịka bụ Donald Trump na-achọ ka ndị ndu mba abụọ nwee nzuko maka mkparịtaụka udo mana o kwuru n’ụbọchị
Fraịde 22 Ọgọst ha abụọ dịka “mmanụ na mmanya – ha adịghị na mma”.
N'aka nke minista na-ahụ maka ihe na-eme na mba ofesi na Rọshịa Sergei Lavrov kwuru na Onyeisiala Putin dị njikere izute Onyeisiala Zelenksy “mgbe ihe ha ga-ekwu na nzukọ ahụ dị njikere”.
Ọ gara n'ihu na-ebọ Onyeisiala Zelensky ebubo ịjụ ihe niile mba Rọshịa chọrọ.
Mba UK ekweela ịkwụ ụmụafọ Kenya ọkụ gbara ala ha ego iti aka n'obi
Ebe foto si, British Army Training Unit Kenya (Batuk)
Nkọwa foto, Ebe ndiagha UK na-enwe ọzụzụ na mpaghara Kenya gbara ọkụ
Gọọment mba UK ekwuola
na ha ga-akwụ ụmụafọ Kenya ọkụ gbara ihe onwunwe
ha oge ndịagha Britain na-eme ọzụzụ afọ anọ gara aga, ụgwọ iti aka n’obi.
N’agbayeghị na gọọment
UK ekwubeghị ego ole ha ga-akwụ, onye okaiwu na-annọchiteanya ndị ihe metụtara
gwara BBC na ọ bụ nde abụọ na itoolu na ọnụ egọ Yuro (£2.9 million).
Akụkọ kwuru na ọ bụ mmadụ puku asaa na nari asaa na iri abụọ na atọ ka ihe onwunwe ha mebiri
emebi nakwa ahụike ha nwere nsogbu n’ihi
ọkụ gbara na mpaghara Loodaiga Conservancy na ndagwurugwu Rift dị na Kenya.
Cheta na gọọment UK kwuru na ọku ahụ gbara n'afọ 2022 mebiri ọtụtụ ihe dịka o sitere na stovu dara ada n'amaghị ama oge ndịagha ha na-enwe ọzụzụ ebe ahụ.
Ndị uweojii anwụchiela otu nwoke a na-enyo enyo na ọ na-ere mgbọ egbe n’Anambra Steeti
Ebe foto si, Anambra State Police Command
Nkọwa foto, Ndị uweojii amalitela ime nnyocha iji nwuchie ndị ha na Akpan Godwin na-arụkọ ọrụ
Ndị uweojii anwụchiela otu nwoke dị afọ iri isii na ise bụ
onye a na-enyo enyo na ọ na-ere mgbọ egbe n’Anambra steeti.
Ozi ọnụ na-ekwuru ndị uweoji Anambra Steeti bụ Tochukwu
Ikenga wepụtara, kọwaara na e jidere nwoke ahụ aha ya bụ Akpan Godwin dịka o ji
mgbọ egbe ruru otu puku na otu nari na Nkpọr dị n’Ọnicha.
Ikenga gara n’ihu kwuo na nwoke ahụ a na-enyo-enyo gwara dị
uweojii mgbe a na-agba ya ajụjụ ọnụ, na ọ na-ere ngwaagha ma kpọ aha ndị ozo
na-eso ya ere ahia ahụ iwu na-akwadoghị.
O kwuru na ndị uweojii amalitela ime nnyocha iji nwuchie ndị
ha na Akpan Godwin na-arụkọ ọrụ.
Saụt Korea agbaala ndịagha Nọt Korea mgbọ ịdọ aka na ntị maka ịgafe okeala ha
Ebe foto si, Reuters
Nkọwa foto, Otu onye agha Nọt Korea guzo na-eche nche n'akụkụ okeala dị n'etiti Nọt na Saụt Korea
Saụt Korea ekwuola na ha gbara ndịagha Nọt Korea na-agafe
okeala ewusiri ike dị n’etiti mba abụọ ahụ mgbọ ịdọ aka.
N’aka nke ọzọ, ndị mgbasa ozi steeti nke Nọt Korea kwuru na
ogbunigwe ahụ bụ "nkpasu iwe nke a kpachapụrụ anya" gbaa dịka obi ọchịchị
mba Nọt Korea na-ebo goomenti Saụt Korea ebubo ịmalite ọgbaghara na-enweghị njikwa.
Nke a pụtara ihe dịka Onyeisiala ọhụrụ nke mba Saụt Korea bụ
Lee Jae Myung hapụrụ isi obodo Seoul n’ụbọchị Satọde 23 Ọgọst 2025 ịmalite njem
nleta na Tokyo nakwa isi obodo mba Amerịka bụ Washington.
Cheta na e kewara mba Korea abụọ kemgbe agha Korea bịara na
njedebe n’afọ 1953.
Igbo ndị ọma, ụtụtụ ọma
Nnọọ n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Satọde 23 Ọgọst, 2025.
Biko gaa n'ihu nọnyere anyị dịka anyị na-ewetere gị akụkọ ihe na-eme na Naịjirịa nakwa ụwa niile.
Sorokwa anyị na Websaịt, Facebook, Instagram na WhatsApp Chanelụ.
Udo dịrị gị!
Ụnwụ adaala nke mbụ ya n’obodo dị na Gaza - Otu Mbaụwa
Ebe foto si, Reuters
Nkọwa foto, A na-atụ anya na "ọdachi" ahụ ga-agbasa ruo Deir al-Balah na Khan Younis n'ọnwa na-abịa
Otu na-ahụ
maka nri nke ụlọọrụ UN na-akwado ekwuola na ụnwụ adaala nke mbụ ya n’obodo dị
na Gaza.
IPC kwuru na
ihe karịrị mmadụ narị ise (500,000) nọ n’okeala Gaza na-agabiga oke "agụụ,
ịda ogbenye na ọnwụ", dịka a na-atụ anya na "ọdachi" ahụ ga-agbasa
ruo Deir al-Balah na Khan Younis n'ọnwa na-abịa.
Mịnịstrị na-ahụ
maka ihe na-eme na mba ofesi nke Izrel jụrụ akụkọ ahụ, ma kwuo na "ụnwụ adịghị
na Gaza".
N’aka nke ọzọ,
onyeisi ụlọọrụ UN bụ António Guterres kwuru na nsogbu a bụ "ọdachi mmadụ
mere" dịka ọ kpọrọ oku maka inye enyemaka mmadụ ohere na-enweghị njedebe
na Gaza.
Ọ na-abịa dịka
Praịm Minista Izrel Benjamin Netanyahu kwuru na ndị otu ya akwadola atụmatụ
maka mbuso agha ọhụrụ n’obodo Gaza.
Ndị IDF
na-ekwu na ọ gwala ndị dọkịta na ndị ọrụ enyemaka ka ha malite ikwapụ ndị mmadụ
tupu Izrel amalite ịtụ ogbunigwe ya.
Izrel ekwuola na ha ga-amalite mkparịtaụka iji tọhapụ ndị niile e ji eji
Ebe foto si, Reuters
Praịm Minista Izrel bụ Benjamin Netanyahu ekwuola na ya
enyela ntuziaka maka mkparịtaụka, iji malite ntọhapụ ndị e ji eji fọrọ afọ ma
kwụsịkwa agha dị na Gaza.
O kwuru na a ga-eme nke a n’usoro “Izrel ga-anabata”.
N’abalị Tọzde ka Netanyahu gwara ndịagha Izrel, na ndị ha na
ya so achị akwadola atụmatụ ime mwakpo kpụ ọkụ n’ọnụ na mpaghara ugwu Gaza.
Ndị ọchịchị Izrel kwadoro mwakpo ahụ n’agbanyeghị na mbaụwa na
ụfọdụ ndị mba ahụ gbara ụkwụ megide ya.
N’ụbọchị Mọnde ka Hamas nabatara atụmatụ ndị omeeudo si mba
Qatar na Ijipt wepụtara ka a kwụsị ịkwa mgbọ ụbọchị iri isii.
Dịka Qatar siri kwuo, atụmatụ ahụ ga-eme ka a tọhapụ ọkara
ndị e ji eji fọdụrụ na Gaza.
Mana na nzaghachi nke mbụ ya, Netanyahu anabatabeghị atụmatụ
ahụ e chere n’ihu ya.
Ụlọmgbasaozi Izrel kwuru na onyeagha Izrel sịrị na ha
ga-ezipụ ndị na-ekwuchitere ha maka inweghachi mkparịtaụka, ọ bụrụ ma a chọta ebe
a ga-anọ hazie ya.
Igbo Chukwu gọziri, ya gazie ooo, Ọfọ anyị taa bụ ndụ mmiri, ndụ azụ. Mmiri atala ma azụ anwụla.
Anyị ji ekele na ihu sara mbara anabata gị n'ọgbakọ BBC Igbo taa bụ Fraịde Orie 22 Ọgọst, 2025.
Ndị ọchịchị obodo ahụ kwuru na ihe a bụ agba nke mbụ n'usoro ndịagha Izrel siri hazie mwakpo ahụ.
Ndịagha Izrel enwetela ebe mgbakwasịụkwụ n'ime obodo Gaza, nke bụ ebe obibi ihe karịrị ndị Palestine otu nde.
Izrel kpachiri obodo ahụ dịka ha kwachara mgbọ dị egwu ma tụọkwa ogbunigwe aghara aghara kemgbe ụbọchị atọ gara aga.
Ọnọdụ a emeela ka odeakwụkwọ Otu Mbaụwa bụ António Guterres kpọghachi oku ka a kwụsị ịkwa mgbọ na-egbughị oge, "iji gbanarị ọnwụ na mbibi" nke mwakpo "na-aghaghị ibute".
Izrel chọrọ igosi na ha ka na-aga n'ihu n'atụmatụ ịkpachi mpaghara Gaza niile, n'agbanyeghị nkatọ mbaụwa.
Ọnụ na-ekwuchitere ndịagha sị na ndịagha amalitela ọrụ na mpaghara Zeitoun nakwa Jabalia iji tụọ ntọala maka mwakpo ahụ.
Ọ sịrị na Minista nchekwa Izrel bụ Isreal Katz kwadoro nke ahụ n'ụbọchị Tuzde, dika a ga-eme ka otu na-ahụ maka nchekwa mara maka ya n'ime izuụka a.
EFCC, NIS achụpụla ndị mba ofesi mmadụ 51 ụlọikpe tụrụ nga maka igwu chamdum ịntanet
Ebe foto si, EFCC / X
Nkọwa foto, Lee EFCC na NIS na-achụla ndị ahụ
Ụlọọrụ Economic
and Financial Crimes Commission (EFCC) nakwa ndị ọrụ Nigerian Immigration
Service (NIS) achụnaala ndị mba ofesi mmadụ iri ise na out bụ ndị mba ofesi ụlọikpe
tụrụ nga maka igwu chamdum n’ịntanet nakwa iyi ọha egwu ịntanet.
N’ime mmadụ
iri ise na otu ahụ gunyere ndị mba Chaịna mmadụ iri ise na otu onye mba Tunịsịa.
Ebe foto si, EFCC / X
Nkọwa foto, Lee EFCC na NIS na-achụla ndị ahụ
Nke a na-eme ya ndị mba ofesi mmadụ otu narị na abụọ bụ ndị a chụpụrụ na Naịjirịa kemgbe Frịde, Ọgọst 15, 2025.
Ndị a so na mmadụ 192 bụ ndị mba ofesi e jidere na Legos maka mpụ na igwu chamdum n'íntanet.
ASUU ekwupụtala na ha ga-agba abụbọ ọrụ
Ebe foto si, ASUU/KANO STATE GOCT/FACEBOOK
Nkọwa foto, Onyeisiala Bola Tinubu
Otu jịkọrọ ndị nkuzi mahadum bụ Academic Staff Union of Universities (ASUU) adọọla aka
na ntị kwuo na ha ga-agba abụbọ ọrụ maka na gọọmenti etiti na-ada mba na nkwekọrịta dị icheiche ha nwere, ọkọchasị nke afọ 2009.
ASUU boro gọọmenti
etiti ebubo ịda mba na nkwekọrịta ha nwere maka ịkwado ma ịtinye ego na mahadum.
Onyeisi ASUU
na Naịjirịa bụ Christopher Piwuna kwuru na ASUU na-edi ọnọdụ ahụ kamgbe afọ abụọ.
Christopher
Piwuna kwuru nke a mgbe ọ na-eme ihe nkuzi na Mahadum Jọs dị na Plateau steeti.
Piwuna gụpụtara
ọtụtụ nkwa gọọmenti etiti kwere ASUU nakwa nkwekọrịta niile ha nwere mana enweghị
nke e mezuru.
Ọ sị na “ASUU
edeela akwụkwọ degara gọọmenti etiti ugboro ole ma ole mana gọọmenti adịghị aza
ha nke mere na ASUU enwghị ihe ọzọ ha ga-eme na-abụghị ịgba abụbọ ọrụ”.
Ndịagha Sudan gọnarịrị ịtụ ogbunigwe n'ụgbọala bu ihe enyemaka
Ebe foto si, AFP via Getty Images
Nkọwa foto, Ụgbọala bu enyemaka nke ndi World Food Programme (WFP) nwe
Ndịagha Sudan agọnarịla ịtụ ogbunigwe n'ụgbọala bu ihe enyemaka nke ndị World Food Programme (WFP), bụ nke na-aga mpaghara Darfur ụkọ nri na-enye nsogbu.
Ndịagha nnupụisi Rapid Support Forces (RSF) tara ndịagha Sudan ụta maka aghae buru n’ụbọchị Wenezde 20 Ọgọst, 2025 n'obodo Mellit nke ndị RSF na-achịkọta.
WFP enyeghi oke nkọwa gbasra agha ahụ mana ha kwuru na ụgbọala atọ n’ime ụgbọala iri na isii so onwe ha kpọkara ma gbaa ọkụ.
Ka o sina dị nweghị ihe mere ndị ọrụ so na-eme njem ahụ.
Poopu Leo XIV ga-eme njem mba ofesi mbụ ya na Lebanọn
Ebe foto si, Getty Images
Nkọwa foto, Robert Prevost, onye a maara dịka Popu Leo XIV – bụ Popu nke mbụ ụka Katọlik si mba Amerịka
Poopu Leo
XIV na-akwado ime njem na mba Lebanọn n’afọ a, nke nwereike ịbụ njem mba ofesi
mbụ kemgbe a họpụtara ya dịka onyeisi ụka Katọlik n’ọnwa Mee, 2025.
Osote
onyeisi ụka Katọlik na mba Lebanọn bụ Achibishọpụ Paul Sayah kwuru na Vatikan
ka na-atule njem atụmatụ njem ahụ ma kwuo na ekwubeghị oge njem a ga-abụ.
Njem a bụ
nke e kwuru na ọ dị mkpa nye Poopu Leo XIV onye kpọrọ oku ọtụtụ ugboro maka udo
na mpaghara middle east nakwa ịdị n’otu nye n’agbanyeghị nkwenye maọbụ
okpukperechi onye na-ekpe.
Ọtụtụ kwuru
na njem mbụ onyeisi ụka katọlik ọbụla ga-eme, bụ nke na-atụ ntọala banyere ihe ọchịchị
ya ga-agbado ụkwụ.
Lebanọn bụ
mba nwere ndị ụka katọlik ruru nde abụọ ma bụrụkwa mba a maara dịka nke nwere ọtụtụ
ndị okpukperechi dị iche iche.
Ebe foto si, Getty Images
Rọshịa ejirila droonu 574, ogbunigwe 40 wakpoo mba Yukren
Ebe foto si, EPA
Nkọwa foto, Ụlọ ebe obibi ndị mmadụ na Lviv
Rọshịa atụọla mba Yukren droonu ọnụ ọgụgụ ya ruru
574 nakwa ogbunigwe 40.
Dịka ndị ọchịchị na mba Yukren si kwuo, nke a bụ
mwakpo kacha Rọshịa mere Yukren kamgbe izu ụka ole ma ole gara aga.
Droonu na ogbunigwe ahụ gburu otu onye na mpaghara Lviv, mana akụkọ sị na mmadụ iri na ise meruru ahụ
na mpaghara Transcarpathia.
Mwakpo ahụ
na-eme dịka Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump na-agba mbọ ịkwụsị agha n’etiti
mba Yukren na Rọshịa.
Mịnịsta mba Yukren
na-ahụ maka mba ofesi bụ Andrii Sybiha kwuru na “mwakpo Rọshịa ahụ bụ ihe gosiri o ji dị mkpa na agha kwụsịrị”.
Unu abọọla chi?, Ka ụbọchị taa maara onye niile mma
Nnukwu ọṅụ na obiụtọ ka anyị ji anabata gị n'ọgbakọ BBC Igbo taa.
Cheta na n’ụbọchị
Mọnde 11 Ọgọst, 2025, ụlọọrụ EFCC gbara akwụkwọ ma kwuo na aka Mele Kyari dị n’akara
ọbaego ndị ahụ ha chọpụtara na ego dị n’ime ha bụ nke e nwetara site na nrụrụaka
na mpụ.
EFCC gwara ụlọikpe
ka ha nye iwu maka mmachi akara ọbaego 0017922724 – Mele Kyari, akara ọbaego 0018575055
– Guwori Community Development Foundation na akara ọbaego 0018575141 – Guwori
Community Development Foundation (Flood Relief). Akara ọbaego ndị a niile dị n’ụlọakụ
Jaiz Bank.
EFCC kwuru na nnyocha mbụ ha mere chọpụtara na ego ruru narị
nde naịra isii (600m) dị n’ọbaego ndị ahụ bụ nke e nwetara site na nrụrụaka
nakwa ihe ndị ọzọ megidere iwu.
EFCC kọwara na ha chọpụtara na Mele Kyari ji akara ọbaego ndị
ahụ anara ego si n’ụlọọrụ NNPCL nakwa ọtụtụ ụlọorụ mmanụ agbidi ndị ọzọ.
N’aka nke ọzọ, Mele Kyari kwuru n’oge gara aga na aka ya adịghị
na nrụrụaka ọbụla oge ọ nọ n’ọkwa dịka onyeisi ụlọọrụ NNPCL.
Ọ gọnarịrị na ụlọọrụ EFCC nwuchiri ya maka nrụrụaka ijeri dọla
abụọ na ụma atọ ($2.6billion) e wepụtara maka ịrụzi ụlọọrụ mmanụ agbidi Naịjirịa.
N’out ozi o wepụtara n’akara X ya n’ọnwa Mee, Mele Kyari
gbara afọ 60 kọwara ebubo ndị ahụ dịka aka ọrụ ndị na-agba ya mgba okpuru chọrọ
imetọ aha ya. O kwuru na ya kwụrụ chịm ịzara ọnụ ya n’ebubo ndị ahụ.
A na-achọ mmadụ 20 dịka NEMA mechiri ọrụ ịchọ ndị na-efu efu ebe ahụ ihe mberede ụgbọmmiri mere na Sokoto Steeti
Ụlọọrụ National Emergency Management Agency (NEMA) nọrọ n’ụbọchị
Wenezde 20 Ọgọst, 2025 kwuona ha achọtala ozu mmadụ atọ n’ihe mberede ụgbọmmiri
ahụ mere na Sokoto Steeti.
N’ime mmadụ 50 ahụ nọ n’ụgbọmmiri ahụ, NEMA kwuru na ha chọtara
mmadụ 25 n’ime ha ma mee ka o doo any ana ha akwụsịla ọrụ ịchọ ndị mmadụ n’ebe
ahụ.
Onyeisi ụlọorụ NEMA na Sokoto Steeti bụ Aliyu Kafindangi
kwuru na ha na-agba mbọ iji chọta ndị ahụ nọ n’ụgbọmmiri ahụ bu ndị ọrụ ugbo na
ndị ahịa kpuru kemgbe abalị atọ gara aga.
Kafindangi kwuru na kwụsịrị ọrụ ịchọ ndị ọzọ maka na kemgbe
o megoro awa iri abụọ na anọ ihe mbered ahụ mere, ha jighị aka na e nwere onye ọbụla
ọzọ dị ndụ ha ga-achọta na ndụ.
O mere ka o doo any ana ihe mere ụgbọmmiri ahụ ji kpuo bụ
maka na o bu ibu karịrị ya.
Ebe foto si, NEMA/X
Mba Amerịka na Honduras na Uganda enweela nkwekọrịta maka mbula ndị mbịarambịara
Ebe foto si, Getty Images
Nkọwa foto, Ndị mba Amerịka chụpụrụ bịarutere Honduras na Jenụwarị
Mba Amerịka na Honduras na Uganda enweela nkwekọrịta mbula
mba ọzọ dịka ha na-emegide mbata na ọpụpụ n’usoro iwu na-akwadoghị, dịka akwụkwọ
ụlọọrụ CBS ha na BBC na-arụkọ ọrụ n’Amerịka nwetara kwuru.
Uganda kwenyere ịnabata ọnụọgụgụ edoghị anya nke ndị
kwabatara Afrịka na Eshia bụ ndị gbagara n’okeala Amerịka na Meziko, ebe
Honduras ga-anabata ọtụtụ narị ndị a chụpụrụ na mba ndị na-asụ Spanish, ka CBS kọrọ.
Nke a so n’atụmatụ ọchịchị onyeisiala Donald Trump iji nwete
ọtụtụ mba ka ha nabata ndị a chụpụrụ n’Amerịka abụghị ụmụafọ mba a na-ebuga ha.
Ndị na-akwado ikike mmadụ katọrọ atụmatụ a, na-ekwu na ọ
ga-etinye ndị na-akwaga mba ọzọ n’ọnọdụ ihe ize ndụ ma ziga ha na mba ndị nwereike
imerụ ha ahụ.