Gọọmenti mba Ghana emechitụla ụlọmgbasaozi redio itoolu

Ebe foto si, NCA/X, Getty Images
Ụlọọrụ na-elekọta nziritaozi na mba Gana bụ National Communication Authority (NCA) ekwupụtala na ha emechiela ụlọmgbasaozi redio itoolu na mba ahụ.
Ha bụ ụlọmgbasaozi ọnọdụ ahụ metụtara gụnyere ndị nke na-ewu ewu e kwenyere na ndị nwe ha bụ ndị na-agba gọọmenti ụkwụ.
E mechiri ha maka ebubo inupuisi n’iwu na-achịkọta mgbasaozi na mba Gana.
Dịka ụlọọrụ NCA siri kwuo, ndị nwe ụlọmgbasaozi redio ndị ahụ jụrụ ịnabata mgbazi e nyere ha n’ime mkpụrụ ụbọchị iri atọ.
NCA kwuru na isii n’ime ụlọmgbasaozi itoolu ndị ahụ “jụrụ maọbụ leghara ụbọchi ikpeazụ e nyere ha anya site n’ọjụjụ ha jụrụ ime ihe ndị a gwara ha.”
Ozi ahụ gbakwunyere na NCA mechiri ụlọmgbasaozi redio atọ nke onyendu otu New Patriotic Party na mpaghara Ashanti nwe maka erubeghị isi n’ụfọdụ iwu, nke gụnyere ịnọ n’ebe a na-enyeghị nkwado agbasa ozi.
Ọnọdụ a na-abịa dịka NCA kwupụtara n’ọnwa Juun na ha emechila ụlọmgbasaozi iri isii na abụọ maka mmehie dị iche iche, site n’iwu Minista na-ahụ maka nziritaozi na mba ahụ bụ Sam George nyere.


















