Chaịna na Indịa ekwenyela inwe mmekọ

Nchịkọta akụkọ ndị kachasị mkpa mere na mbaụwa n'ọnwa Ọgọst 2025.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Uzoamaka Ewuzie, Ikechukwu Kalu, Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Michael Ilediagu, Adline Okere, Marvelous Obomanu

  1. ASUU ebidola ngagharịiwe mbụ n’ọchịchị Onyeisiala Bola Tinubu

    Ndị ASUU
    Nkọwa foto, Ndị ASUU

    Otu jikọrọ ndị nkuzi mahadum na Naịjirịa bụ Academic Staff Union of Universities (Asuu) ebidola ime ngagharịiwe na Naịjirịa niile maka maka ọnọdụ ha.

    ASUU na-eme ngagharịiwe otu ụbọchị ugbua na mahadum nke gọọmenti etiti nakwa na mahadum niile ndị otu ha na-arụ ọrụ.

    Nke a na-eme dịka ha na-ekwu na ha ga-agba abụbọ ọrụ ma ọ bụrụ na gọọmenti etiti hara imezu nkwa e kwere ha.

    Ndị ASUU
    Nkọwa foto, Ndị ASUU

    Ndị nkuzi ahụ na-ekwu na nke a bụ maka ọnọdụ ha nakwa gọọmenti enweghị ike ịkwụ ha ego niile e kwesiri ịkwụ ha.

    Ngagharịiwe nke a bụ nke mbụ ASUU na-eme n’ọchịchị Onyeisiala Bola Tinubu.

  2. A hụla ozu mmadụ 13 n'ọhịa Shakahola dị na mba Kenya

    Ndị ọchịchị kwuru na ha na-eme nnyocha iji mara ka e nwere ili ndị ọzọ ozu dị n'ime ya

    Ebe foto si, YASUYOSHI CHINA/GETTY IMAGES

    Ndị na-eme nnyocha egwuputala ozu mmadụ 13 na akụkụ anụ ahụ 18 dị iche iche n’ime ili dị na n’obodo Kwa Binzaro.

    Nke a na-abịa dịka a malitere ịchọ ọtụtụ ụmụaka n’obodo ahụ.

    Ndị ọrụ nchekwa kwuru na ha nwuchiri mmadụ 11 a na-eyo eyo na aka dị n’ụmụaka ahụ a na-achọ achọ.

    Akụkọ kwuru na a na-eme nnyocha iji chọpụta ka ozu ndị ahụ a chọpụtara ọ bụ ndị Paul Mackenzie gburu site.

    Cheta na a na-enyocha Paul Mackenzie maka ebubo na o gburu ndị ụka site n’ịgwa ha ka ha buo ọnụ ka nwee nwụọ ma zute Jisọs Kraịst ngwa ngwa.

    N’afọ 2023, a chọpụtara ozu mmadụ 400 gụnyere ụmụaka n’ime ọhịa Shakahola dị na mpaghara obodo Malindi.

  3. Ezinaụlọ ndị Izrel e ji eji agbachiela ụzọ dịka ha na-eme ngagharịiwe

    Ndị na-eme ngagharịiwe nọchiri ụzọ

    Ebe foto si, Getty Images

    A na-eme ngaghrịiwe ugbua na mpaghara dị iche iche n’Izrel dịka ezinaụlọ ndị e ji eji na-akpọ oku ka a tọhapụ ndị ezinaụlọ ha e ji kemgbe.

    Ihe onyonyo na foto anyị hụrụ gosiri na ndị ngagharịiwe ahụ machiri okporoụzọ dị iche iche.

    Ihe ruru mmadụ 1,200 anwụọla ebe mmadụ 251 ka e ji eji na Gaza na mwakpo Hamas mere n’Ọktoba 7, 2023. E kwuru na mmadụ 20 Hamas ji eji ka dị ndụ.

    Izrel zaghachiri mwakpo ahụ site na mwakpo ha mere nke gburu ndị Palestian ruru 62,744.

    Ngagharịiwe a na-abịa dịka mmadụ 20 gụnyere ndị ntaakụkọ nwụrụ site na mwakpo abụọ Izrel mere n’ụlọọgwụ dị na Gaza n’ụbọchị Mọnde, 25 Ọgọst, 2025.

  4. Ụtụtụ ọma Igbo bụ Igbo

    Daalụ dịka ị na-esonyere anyị n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Tuzde 26 Ọgọst, 2025.

    Anyị na-asị ka ihe ọma meere gị n'ọpụpụ gị na mbata gị.

    Anyị kwụrụ chịm iwetara gị akụkọ ihe na-eme na Naịjirịa, Afrịka nakwa mbaụwa niile.

    Gaa n'ihu sonyere akara soshal midia anyị niile maka akụkọ foto na vidio ndị ọzọ anyị ji bịa taa.

    Ndewo.

  5. Ọ bụ onye ndịda ka anyị ga-enye ọkọlọtọ anyị n'afọ 2027 - PDP

    Pati PDP ekwuola na onye ga-azọ okwa onyeisiala na afọ 2027 ga-esi mpaghara ndịda

    Ebe foto si, People's Democratic Party/X

    Nkọwa foto, Pati PDP ekwuola na onye ga-azọ okwa onyeisiala na afọ 2027 ga-esi mpaghara ndịda

    Otu Peoples Democratic Party (PDP) ekwuola na onye ga-eji ọkọlọtọ ha zọọ ọkwa onyeisiala na ntuliaka afọ 2027 ga-esi mpaghara ndịda.

    Nke a pụtara ihe dịka ndị ndu pati PDP nwere nzukọ nke ugboro otu narị na abụọ n'isi ụlọọrụ ha dị n'Abuja.

    Ha họpụtakwara Iliya Umar Damagum dịka Onyeisioche ha bido n'ụbọchị Mọnde 25 Ọgọst.

    Damagum ga-ejide okwa ahụ ruo mgbe pati ha ga-enwe nnukwu ọgbakọ ha n'Ibadan malite na Nọvemba 15 ruo 16, 2025.

    PDP ahọpụtala Iliya Umar Damagum dịka onyeisiocha ha

    Ebe foto si, People's Democratic Party/X

    Nkọwa foto, PDP ahọpụtala Iliya Umar Damagum dịka onyeisiocha ha
  6. Julius Malema akpọọla oku maka otu onyeisiala na mba Afrịka

    Onyendu ndị na-agba gọọmenti ụkwụ

    Ebe foto si, Leon Sadiki/Bloomberg via Getty Images

    Nkọwa foto, Onyendu ndị na-agba gọọmenti ụkwụ

    Onyendu ndị na-agba gọọmenti ụkwụ na mba Saụt Afrịka bụ Julius Malema akpọọla oku ka enwee otu Afrịka e jikọtara ọnụ ma nwee otu onyeisiala, otu akwụkwọ ego, otu ụlọomeiwu nakwa otu ndịagha.

    Ọ kpọrọ oku a mgbe otu jikọtara ndị Ọkaiwu na Naịjirịa bụ Nigeria Bar Association (NBA) na-enwe nzukọ omenafọ afọ ha.

    Malema, onye kwuru okwu na nzukọ ahụ a na-ahazi na'Enugwu steeti sị na oge eruola mgbe ndị amaala Afrịka kwesịrị ịkwụrụ onwe ha, na-abụghị ịchọ enyemaka mba ofesi.

    Onyendu ndị na-agba gọọmenti ụkwụ na Saụt Afrịka kọwara na ego mbite ndị Afrịka na-anata bụ nke nwereike itinye ọdịnihu mpaghara ahụ na nsogbu.

  7. Ndị isi nchekwa n'Afrịka na-ezụkọ na Naịjiria iji chọta ogbugbo maka nchekwa

    Onyeisi ndị ọrụ nchekwa Naịjirịa bụ Christopher Musa

    Ebe foto si, DEFENCE HEADQUARTERS NIGERIA/FACEBOOK

    Nkọwa foto, Onyeisi ndị ọrụ nchekwa Naịjirịa bụ Christopher Musa

    Onyeisi ndị ọrụ nchekwa Naịjirịa bụ Christopher Musa akpọọla oku ka ahazigharịa ndịagha Afrịka ka nwereike merie ndị na-eyi ọha egwu na mpaghara di iche iche na mba Afrịka.

    Ọ kpọrọ oku a dịka ndị isi nchekwa mba Afrịka iri ise na anọ bịara nzukọ ha na isiobodo Naịjirịa n’ụbọchị Mọnde 25 Ọgọst, 2025 nke ga-akwụsị na 27 Ọgọst, 2025.

    Ọ gara n’ihu kwuo na ihe gbasara nchekwa n'Afrịka na-abawanye nke kwesịrị ka ndị ọrụ nchekwa niile nọ na mba Afrịka na-arụkọta ọrụ ọnụ maka na ndị na-eyi ọha egwu achọghị ịma mba bụ mba.

    Nzukọ a ha na-enwe ga-adị n'ime ụbọchị atọ, a na-atụ anya na mkparịtaụka ha ga-eweta ogbugbo iji kwụsị ihe gbasara enweghị nchekwa n'Afrịka.

  8. Oke ifufe mmiri 'typhoon' amalitela inye nsogbu na mba Vietnam

    Oke ifufe mmiri na-enye mpaghara Vietnam nsogbu

    Ebe foto si, AFP via Getty Images

    Nkọwa foto, Oke ifufe mmiri na-enye mpaghara Vietnam nsogbu

    Oke ifufe mmiri na-enye mpaghara Vietnam nwere oke osimiri nsogbu nke mere ka e nye iwu ka ndị bị n’akụkụ ebe ahụ pụọ.

    Ihe ruru mmadụ narị puku ise na iri asatọ na isii (586,000) bụ ndị e nyere iwu ka ha hapụ ụlọ ha pụọ, mana ndịagha nọ ebe ahụ i nyere ndị mmadụ aka.

    Ụlọọrụ na ahụ maka ihu eluigwe na mba Vietnam bụ National Center for Hydro-Meteorological Forecasting kwuru na Typhoon Kajiki ahụ nwereike ibute idemmiri.

  9. A nwuchiela nwaanyị dị afọ 50 maka ebubo ịtụ mgbere ọgwụike

    A nwuchiela nwaanyị dị afọ 50 maka ebubo ịtụ mgbere ọgwụike

    Ebe foto si, Getty Images

    Ụlọorụ na-ebu agha megide ịṅụ na ịtụ mgbere ọgwụike na Naịjirịa bụ National Drug Law Enforcement Agency, NDLEA, anwụchiela otu nwaanyị dị afọ iri ise maka ebubo ịtụ mgbere ọgwụike.

    Ndị ọrụ NDLEA kwuru na nwaanyị ahụ a na-ebo ebubo gbara mbọ izupụ ọgwụike heroin arụ ya dị kilogram 1.3 site n’ime dịka a ga-asị na ọ dị ime.

    A nwụchiri nwaanyị ahụ a na-enyo enyo aha ya bụ Ifeoma Ezewuike n’ọdọ ụgbọala dị na Jibowu, mpaghara Yaba nke Legọs steeti oge ọ na-akwado ibuga ọgwụike ahụ Abuja.

    A ga-akpụpụ ya n’ụlọikpe n’ọdịnihu ngwangwa ụlọọrụ NDLEA mechara nnyocha miri emi.

  10. Ụmụnne atọ anwụọla n’ime ụgbọmmiri ndị mbịarambịa na Mediterranean

    Ụmụnne atọ anwụọla n’ime ụgbọmmiri ndị mbịarambịa na Mediterranean

    Ebe foto si, RESQSHIP

    Ụlọọrụ nnapụta mba Jamini ekwuola na ụmụnne ndị nwaanyị atọ erugbuola n’ụgbọmmiri rọba bu ndị mbịarambịa.

    Dịka ụlọọrụ ahụ a kpọrọ RESQSHIP siri kwuo, nke a mere oge ifufe mmiri ruru 1.5m (4.9ft) buuru ụgbọmmiri ahụ.

    A napụtara mmadụ ruru iri isii na ise gụnyere nne ụmụnne atọ ahụ na nwanne ha nwoke, tinyekwara ụmụnwaanyị atọ dị ime na obere nwa dị ọnwa asaa.

    Ụgbọmmiri ahụ nke ọtụtụ mmadụ jupụtara n’ime ya hapụrụ obodo Zuwara dị na mba Libịa ma malite ịmịkọrọ nnukwu mmiri ka ụfọdụ elekere gasịrị, ka ụlọọrụ ahụ kwuru.

    Mba Libịa abụrụla ebe mmalite njem maka ndị mbịarambịa nwere olileanya iji ụzọ aghụghọ gafee osimiri Mediterranean ma banye n’obodo Lampedusa nke mba Ịtali.

  11. Ndị uweojii amalitela inyocha nwoke kpọchiri nwa kemgbe afọ ise n'Anambra Steeti

    Kọmishọna ndị uweojii Anambra Steeti bụ Ikioye Orutugu

    Ebe foto si, Nigeria PoLICE Command

    Ndị uweojii Anambra Steeti amalitela ime nnyocha banyere nwoke e kwuru na ọ kpọchiri nwa ya kemgbe afọ isi gara aga n’obodo Igboukwu dị n'Anambra Steeti.

    Akụkọ kwuru na nna nwaamdị ahụ aha ya bụ Chogbo onye e ji Agudo mara, kechiri ya kemgbe afọ ise ma gwa ya na ọ gara njem mba ofesi.

    Kọmishọna ndị uweojii steeti ahụ Ikioye Orutugu enyela ndị ọrụ ya iwu ka ha malite nnyocha iji chọpụta ma nwuchie ndị niile aka ha dị n’ajọ omume ahụ ma hụ na ha nwetara ntaramahụhụ dịka iwu siri kwu.

    Orutugu kelekwara ndị ntorobịa obodo ahụ maka mbọ ha gbara iji gbaa ajọ omume a n’anwụ ma kwuo na nke a gosiri mkpa ọ bị ka ọhanaeze nyere ndị uweojii aka iji hụ na e nwere ezi ncheka n’obodo.

    Ka ọ dị ugbua, nwaamadị na-enweta nleta.

  12. Ndị ntaakụkọ anọ so na mmadụ 20 nwụrụ oge Izrel wakporo ụlọọgwụ dị na Gaza

    Aha ndị ntaakụkọ nwụrụ bụ Husaam al-Masri si ụlọọrụ Reuters, Marian Dagga bụ onye ntaakụkọ Associated Press (AP), Mohammed Salameh na Muath Abu Taha bụ ndị ntaakụkọ ụlọ mgbasaozi Al Jazeera.

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Aha ndị ntaakụkọ nwụrụ bụ Husaam al-Masri si ụlọọrụ Reuters, Marian Dagga bụ onye ntaakụkọ Associated Press (AP), Mohammed Salameh na Muath Abu Taha bụ ndị ntaakụkọ ụlọ mgbasaozi Al Jazeera.

    Ndị ọchịchị na Gaza ekwuola na mmadụ 20 gụnyere ndị ntaakụkọ anọ anwụọla site na mwakpo abụọ ndịagha Izrel mere n’ụlọọgwụ Gaza.

    Onye ntaakụkọ na-esere foto ụlọ mgbasaozi Reuters na onye ntaakụkọ ụlọọrụ AP so na ndị ahụ nwụrụ oge a wakporo ụlọọgwụ Nasser.

    Akụkọ kwuru na ndị ọzọ nwụrụ na mwakpo nke mbụ ebe mwakpo nke abụọ gburu ọtụtụ ndị ọzọ dịka ha na-enyere ndị mwakpo ahụ metụtara enyemaka.

    Ndịagha mba Izrel kwuru na ọ bụ mere mwakpo ahụ ma rịọ mgbaghara banyere ndị nkịti na ndị ntaakụkọ ahụ nwụrụ.

    Nke a na-abịa dịka ndị ntaakụkọ isii nwụrụ na mwakpo Izrel mere n’akụkụ ụlọọgwụ al-Shifa Hospital dị na Gaza n’izuụka abụọ gara aga.

    Aha ndị ntaakụkọ ahụ nwụrụ bụ Husaam al-Masri si ụlọọrụ Reuters, Marian Dagga bụ onye ntaakụkọ Associated Press (AP), Mohammed Salameh na Muath Abu Taha bụ ndị ntaakụkọ ụlọ mgbasaozi Al Jazeera.

    Ụlọọgwụ ahụ ndịagha ahụ wakporo

    Ebe foto si, Getty Images

  13. Onyeisiala Trump ekwuola na ọ ga-eziga ndịagha na Baltimore iji buo agha megide mpụ

    Onyeisiala Trump ekwuola na ọ ga-eziga ndịagha na Baltimore iji buo agha megide mpụ

    Ebe foto si, Getty Images

    Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump eyiela egwu na ọ ga-eziga ndịagha na Baltimore ka ha buo agha megide mpụ dị iche iche na steeti ahụ.

    Nke a na-abịa dịka Gọvanọ Maryland bụ Wes Moore kpọrọ ya oku maka ije “safety walk” e mere na mpaghara ahụ.

    Onyeisiala Trump kwuru na ọ ga-enye Gọvanọ Wes Moore enyemaka ma ọ bụrụ na ọchọrọ ya. Cheta na Onyeisiala Trump zigara ndịagha na Los Angeles nakwa Washington DC.

    Mana ọtụtụ ndị otu pati Democrats akatọọla atụmatụ iji ndịagha nweta ncheka obodo. Ha na-ekwu na ọ bụ ndị uweojii na ndị nchekwa ndị ọzọ ka ọ bụ ọrụ ha ime nke a.

  14. Ndị be anyị, unu asaala chi

    Anyị ji obi ụtọ anabata gị n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Mọnde 25 Ọgọst, 2025 ma bụrụkwa ahịa Eke.

    Gaa n'ihu sonyere anyị dịka anyị ga-ewetara gị akụkọ niile gbara ọkpụrụkpụ si Naịjirịa, Afrịka nakwa ụwa niile.

    Sonyere akara soshal midia anyị niile maka akụkọ foto na vidio ndị anyị ji bịa taa.

    Ndewo.

  15. Pope Leo XIV ekwuola na obi dị ya ụtọ na nkwekọrịta mba UK na Mauritius nwere

    Onye ndụ Katọlik Pope Leo XIV ha na ndị nnọchianya ndị gbara ọsọ ndụ mmadụ iri na ise

    Ebe foto si, EPA

    Pope Leo XIV ekwuola na obi dị ya ụtọ etu mba Briten na Mauritius si kpebie idozi ogologo esemokwu ha banyere Agwaetiti Chagos nọ na Mauritius.

    Mgbe ọ na-agwa ndị nnọchianya ndị gbara ọsọndụ dị mmadụ iri na ise, Pope Leo XIV kọwara na nkwekọrịta mba abụọ a nwere n'ọnwa Mee bụ mmeri nye usoro ikpe kwụụ ọtọ.

    O kwuru na Mauritius ga-ewere ọchịchị ala ahụ mmiri gbara gburu gburu site n'aka mba Briten mana ha ga-ahapụ ka mba Amerịka na Briten jiri mpaghara ebe ahụ mere ogige ndịagha rụọ afọ iri itoọlu na itoolu mana ha ga na-akwụ ha ugwọ dị otu nde narị yuro na otu (£101m) kwa afọ.

  16. Ndịagha Naịjirịa ejirila ogbunigwe tụgbuo ndị oyi ndụ egwu karịrị mmadụ iri atọ

    Ndịagha Naịjiria kana agba mbọ ịkwụsị ogụ na mpaghara ọdịda anyanwụ Afrịka

    Ebe foto si, AFP via Getty Images

    Ndịagha Naịjirịa egbuola ihe karịrị mmadụ iri atọ ndị na-eyi ndụ egwu na mwakpo ha mere n'okeala Ugwu-Anyanwu Naịjiria nke dị nso na mba Kamerun.

    Ndiagha kwuru na ha mere mwakpo ahụ ebe anọ iji gbochie mbuso agha nke ndị na-eyi ndụ egwu chọrọ ime ndịagha nọ n'ebe ahụ.

    Naijirịa na-alụso otu ndị na-eyi ndụ egwu agha kamgbe ihe karịrị afọ iri, ya na ndị omekome na-eme ihe ike, nakwa otu ndị na-atọrọ mmadụ iji nara ego.

    Cheta na otu na-ahụ maka ikike dịịrị onye bụ 'Amnesty International' wepụtara nyocha ha mere ebe ha kwuru na ihe ruru mmadụ puku iri, nari abụọ na iri na asaa anwụọla kamgbe Onyeisiala Tinubu banyere n'ọchịchị n'afọ abụọ gara aga.

  17. Zelensky aṅụọla iyi ịga n'ihu n'ịlụ ọgụ dịka Yukren mere emume ncheta ụbọchị mnwereonwe ha

    Volodymyr Zelen ekwuola na Yukren ga-aga n’ihu ịbuso Rọshịa agha, ihe a bụ ozi ya n'ụbọchị  ncheta nwere onwe ha

    Ebe foto si, Public Broadcasting company of Ukraine

    Onyeisiala mba Yukren bụ Volodymyr Zelensky ekwuola na Yukren ga-aga n’ihu ibuso Rọshịa agha.

    Zelensky kwuru nke a mgbe ọ na-eme nkwupụta ya nye ụmụafọ Yukren dịka ha na-eme emume ncheta ụbọchị mnwereonwe ha.

    Dịka o si kwuo, Yukren chọrọ udo, dịka udo nke ụmụafọ anyị ga-eji aka ha kpebie ọdịnihu ha.

    Ndị mmadụ nọ na-agafe ọgbọ nwere onwe Yukren ebe eliri ndịagha Yukren nwụrụ na-agha

    Ebe foto si, Reuters

  18. Ọtụtụ ndị mba Izrel emeela ngagharịiwe maka agha Gaza

    Ndị na-eme ngagharịiwe n'Izrel

    Ebe foto si, Reuters

    Ọtụtụ puku mmadụ emeela ngagharịiwe na mpaghara dị iche iche na Izrel ma kpọọ oku maka nkwekọrịta ịkwụsị ịkwa mgbọ n’agha Gaza.

    Ndị ngagharịiwe ahụ kwuru na atụmatụ ndịagha Izrel inwere ọnọdụ na Gaza ga-etinye ndụ ndị otu Hamas ji eji na nsogbu.

    Onye bụbu mịnịsta Izrel na-ahụ maka nchekwa bụ Benny Gantz akpọọla oku ka ndị Izrel niile kwado atụmatụ gọọmenti iji nyere hụ na atọhapụrụ ndị ahụ Hamas ji.

    Praịm Mịnịsta Benjamin Netanyahu na-atụkwasịobi na nkwado pati ndị na-anaghị nkwado ka ha na Hamsa nwee nkwekọrịta iji kwụsị agha a na-aga n’ihu.

    Mịnịstrị na-ahụ maka ahụike na Gaza kwuru na mmadụ 60 anwụọla na mwakpo Izrel nakwa oke agụụ naanị n’ụbọchị Satọde 23 Ọgọst, 2025.

    Ndị na-eme ngagharịiwe n'Izrel

    Ebe foto si, Getty Images

  19. Atụmatụ Trump iziga ndịagha na Chicago bụ mmetọ ikike – Gọvanọ Illinois

    Onyeisiala Trump na-ekwu okwu dịka ndịagha National Guard na-ege ya ntị

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Onyeisiala Trump na-ekwu okwu dịka ndịagha National Guard na-ege ya ntị

    Gọvanọ JB Pritzker na-achị steeti Illinois mba Amerịka, ekwuola na atụmatụ Onyeisiala Donald Trump iziga ndịagh na Chikago bụ mmeto ikike.

    Gọvanọ Pritzker kwuru na enweghị ọnọdụ gbatagbata ọbụla na Chikago nke ga-eme ka e ziga ndịagha National Guard. O kwuru na Onyeisiala Trump chọrọ iji aka ya tinye ọgbaaghara na steeti ya.

    Akụkọ kwuru na Onyeisiala Trump ezigala ndịagha ruru puku abụọ na Washington DC ebe ọ bụ pati Democrats na-achị, nke a bụ atụmatụ ya ibelata mpụ na mpaghara Amerịka dị iche iche.

    N’ụbọchị Fraịde 22 Ọgọst, 2025, Onyeisiala Trump kwuru na ọ ga-eziga ndịagha na Chikago na New York steeti abụọ pati Democrats na-achị.

    N’aka nke ọzọ Mayọ Chikago bụ Brandon Johnson kwuru na ya enwetaghị ozi ọbụla banyere izita ndịagha National Guard na Chikago ma katọọ atụmatụ ahụ Onyeisiala Trump chọrọ imezu.

  20. Ụtụtụ ọma Igbo ndị ọma

    Anyị ji obi ụtọ anabata gị n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Sọnde 24 Ọgọst, 2025 ma bụrụkwa ahịa Nkwo.

    Izuụka ọhụrụ a ga-amịtara gị na ezinaụlọ gị ezi mkpụrụ.

    Gaa n'ihu sonyere anyị dịka anyị ga-ewetara gị akụkọ niile gbara ọkpụrụkpụ si Naịjirịa, Afrịka nakwa ụwa niile.

    Sonyekwara aka soshal midia a niile maka akụkọ foto na vidio ndị anyị ji bịa taa.

    Ndewo.