Chaịna na Indịa ekwenyela inwe mmekọ

Nchịkọta akụkọ ndị kachasị mkpa mere na mbaụwa n'ọnwa Ọgọst 2025.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Uzoamaka Ewuzie, Ikechukwu Kalu, Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Michael Ilediagu, Adline Okere, Marvelous Obomanu

  1. Ọhanaeze, ụnụ abọọla chi?, Ka Eke taa ketara anyị ihe ọma!

    Ọṅụ na obiọma ka anyị ji anabata gị n'ọgbakọ BBC Igbo taa bụ Fraịde Eke 29 Ọgọst, 2025.

    Soro anyị na Websaịt, Facebook, Instagram na WhatsApp Chanelụ maka akụkọ niile na-akpọtụ n'ụwa.

    Ọ bụ Chinonso Ugorji na Marvelous Obomanu ga-anọ n'isi ụgbọ n'ụtụtụ a, dịka Uzoamaka Ewuzie na Michael Ilediagu ga-esonyere ha na mgbede.

    Biko gaa n'ihu nọnyere anyị taa...

  2. Gọọmenti Ebonyi steeti ebuliela ụgwọọnwa ndị ọrụ

    Gọvano Ebonyi steeti bụ Francis Nwifuru tụkwasịrị puku iri abụọ n’elụ puku iri asaa gọọment etiti n’akwụ ndị ọrụ obodo (Civil servants) i ji beleta ọnọdụ ndị ọrụ obodo na steeti ahụ.

    Ebe foto si, Francis Nwifuru/Facebook

    Nkọwa foto, Gọvano Ebonyi steeti bụ Francis Nwifuru tụkwasịrị puku iri abụọ n’elụ puku iri asaa gọọment etiti n’akwụ ndị ọrụ obodo (Civil servants) i ji beleta ọnọdụ ndị ọrụ obodo na steeti ahụ.

    Ozi si n’aka kọmishọna na-ahụ maka mgbasaozi n'Ebonyi steeti bụ Ikeuwa Omebe kwuru na e buliela ụgwọọnwa opekatampe ndị ọrụ obodo ka ọ bụrụzie puku naịra iri itoolu (#90,000).

    Ozi ahụ kwuru na gọvanọ Ebonyi bụ Francis Nwifuru tụkwasịrị puku naịra iri abụọ n’elụ puku iri asaa gọọment na-akwụ ndị ọrụ obodo iji beleta ọnọdụ ọjọọ nke ndị ọrụ obodo na steeti ahụ.

    O kwuru na a kwụọla ndị lara ezumike nka na steeti ahụ kemgbe afọ 1996 rute ugbua ụgwọ ndị e ji ha.

    N’aka nke ọzọ, Gọvano Nwifuru nyere ụmụakwụkwọ ruru otu narị na iri anọ ohere agụmaakwụkwọ n’efu na mahadum a rụrụ ọhụrụ na steeti ahụ bụ ICT University, Oferekpe na Agbaja dị n’okpuru ọchịchị ime obodo Izzi.

    Ọ gara n’ihu kwuo na gọvano nyere ikike ka e tinye ịntanetị na mpaghara dị iche iche na steeti ahụ iji weta nchekwa ma kwalite azụmahịa.

  3. Ụlọọrụ Immigration ebuliela ụgwọ a na-akwụ maka akwụkwọ ‘passport’

    Ụlọọrụ Immigration ebuliela ụgwọ a na-akwụ maka akwụkwọ ‘passport’

    Ebe foto si, Getty Images

    Ụlọọrụ na-ahụ maka usoro ime njem na Naịjirịa bụ Nigeria Immigration Service (NIS) ebuliela ụgwọ a na-akwụ iji nweta akwụkwọ nkọwa onwe bụ passport.

    Dịka ụlọọrụ ahụ siri kwupụta, akwụkwọ nkọwa onwe nke na-anọ afọ ise ma nwee ihu akwụkwọ iri atọ na abụọ ga-abụzi otu narị puku naịra.

    N’otu aka ahụ, akwụkwọ nkọwa onwe nke na-anọ afọ iri ma nwee ihu akwụkwọ iri isii na anọ ga-abụzi narị puku naịra abụọ.

    Ha kwuru na a ga-amalite itinye ọnụego ọhụrụ a n’ọrụ n’ụbọchị mbụ nke ọnwa Septemba, 2025.

    Cheta na ụlọọrụ NIS buliri ụgwọ a na-akwụ iji nweta akwụkwọ nkọwa onwe n’ọnwa Septemba, afọ 2024.

    Oge ahụ, ha buliri ọnụego akwụkwọ nkọwa onwe nke nwere ihu akwụkwọ iri atọ na abụọ site na puku naịra iri atọ na ise ruo puku naịra iri ise ma bulie nke nwere ihu akwụkwọ iri isii na anọ site na puku naịra iri asaa ruo otu narị puku naịra.

  4. Mmadụ abụo anwuọla dịka ụgbọala osote Onyeisi ụlọomeiwu Abịa steeti nwere ihe mberede

    Mmadụ abụo anwuọla dịka ndị ọzọ merụrụ ahụ n'ihe mberede ụgbọala metụtara ụgbọala osote onye isi ụlọ omebeiwu Abia steeti

    Ebe foto si, Gov. Otti's Chief Press Secretary

    Nkọwa foto, Mmadụ abụo anwuọla dịka ndị ọzọ merụrụ ahụ n'ihe mberede ụgbọala metụtara ụgbọala osote onye isi ụlọ omebeiwu Abia steeti

    Mmadụ abụo anwuọla dịka ndị ọzọ merụrụ ahụ n'ihe mberede ụgbọala metụtara ụgbọala osote onyeisi ụlọomebeiwu Abịa steeti bụ Austin Okezie Meregini.

    Ihe mberede a mere na mpaghara Obehie dị n'okporoụzọ Enugu-Umuahia-Aba-Port Harcourt.

    Ndị merụrụ ahụ nọ n’ụlọọgwụ Federal Medical Centre, Umuahia ugbua mana akụkọ kwuru na mmadụ abụọ nwụrụ.

    Mmadụ abụọ ahụ nwụrụ anwụ bụ ụmụnne ndị aha ha bụ Ifeanyi Maduako dị afo iri anọ na ise nakwa Onyedi Obasi gbara afọ iri atọ na ise.

    Ha bụ ndị si n'okpuru ọchịchị ime obodo Ehime Mbano dị n'Imo steeti.

    Enwebeghị onye ma ihe kpatara ihe mberede a mana akụkọ kwuru na ụgbọala osote onyeisi ụlọomeiwu Abia steeti nọ na-agba nnukwu ọsọ oge ọdachi ahụ mere.

    N'ịzaghachi ihe mere, osote onyeisi ụlọomeiwu Abia steeti, onye kwupụtara na ọ nọghị n'ụgbọala ahụ, sịrị na ụgbọala ahụ nọ na-alọta njem ha mere na Port Harcourt, Riva steeti.

  5. Zelensky kwuru na e gbuola mmadụ asatọ na mwakpo ọjọọ e mere na Kyiv

    Zelensky kwuru na e gbuola mmadụ asatọ na mwakpo ọjọọ e mere na Kyiv

    Ebe foto si, Reuters

    Onyeisiala Yukren bụ Volodymyr Zelensky kwuru na e gbuola mmadụ asatọ gụnyere otu nwatakịrị na Kyiv.

    Zelensky, onye kwupụtara nke a n’ụbọchị Tọzde, sịrị na nke ahụ mere oge Rọshịa jiri abalị kwaa ha mgbọ dị egbu.

    Minista na-ahụ maka ihe na-eme na mba ahụ bụ Ihor Klymenko kwupụtara n’ọbaozi Telegram, na ndị nwụrụ anwụ gụnyere obere ụmụaka abụọ.

    Onyeisi Kyiv bụ Vitali Klitschko kwuru na opekatampe mmadụ iri atọ na asatọ merụrụ ahụ na mwakpo ọjọọ ahụ e ji droonu na ogbunigwe mee.

    N’ozi o bipụtara n’ọbaozi X, Zelensky kwuru na Kremlin ahọrọla “ogbunigwe karịa mkparịtaụka”, ma kwughachi mkpa ọ dị inye Rọshịa “ntaramaahụhụ ọhụrụ siri ike.”

    Mwakpo ọjọọ ahụ bịara ka e tinyechara ụlọ ndị Yukren karịrị otu narị puku n’ọchịchịrị n’ihi mwakpo Rọshịa jiri droonu mee n’akụrụngwa ọkụ latrik ha n’ụbọchị Wenezde.

    N’ozi o bipụtara n’ọbaozi Telegram, Onyeisi ndịagha Kyiv bụ Tymur Tkachenko kwuru na otu n’ime ụmụaka ndị e gburu egbu dị afọ iri na anọ, ma kwuo na opekatampe ụmụaka ise merụrụ ahụ na mwakpo ahụ.

    Ọ rụtụrụ aka kwuo na a wakporo obodo karịrị iri abụọ, dịka ọtụtụ ụlọ gbara ọkụ, tinyere ụlọakwụkwọ ọtaakara.

  6. Ọhanaeze, ụnụ abọọla chi?, Ka Nkwọ taa kwọtara anyị ihe ọma!

    Ọṅụ na obiọma ka anyị ji anabata gị n'ọgbakọ BBC Igbo taa bụ Tọzde Nkwọ 28 Ọgọst, 2025.

    Soro anyị na Websaịt, Facebook, Instagram na WhatsApp Chanelụ maka akụkọ niile na-akpọtụ n'ụwa.

    Ọ bụ Chinonso Ugorji na Marvelous Obomanu ga-anọ n'isi ụgbọ n'ụtụtụ a, dịka Uzoamaka Ewuzie, Michael Ngene na Michael Ilediagu ga-esonyere ha na mgbede.

    Biko gaa n'ihu nọnyere anyị taa...

  7. Mmadụ abụọ anwụọla oge ụgbọala osote onyeisi ụlọomeiwu Abia Steeti nwere ihe mberede okporoụzọ

    Ụgbọala ihe mberede okoporoụzọ ahụ metụtara

    Mmadụ abụọ anwụọla n’ihe mberede okporoụzọ metụtara ụgbọala osote onyeisi ụlọomeiwu Abia Steeti bụ Austin Okezie Meregini.

    Akụkọ kwuru na ihe mberede ahụ mere n’okporoụzọ si Enugu gawa Umuahia-Aba nakwa Pọt Hakọt dị na mpaghara Obehie, merụrụ ọtụtụ ndị ọzọ ahụ ebe ọkwọụgbọala osote onyeisi ụlọomeiwu ahụ ka e kwuru o nwereike ịkwụsị ịga ije ma ọ bụrụ na a waghị ya ahụ n’ọkpụkpụ spine ya ngwa ngwa.

    Ndị ahụ merụrụ ahụ anyị nụrụ na ha bụ ndị ọrụ nchekwa osote onyeisi ụlọomeiwu ahụ, nọ n’ụlọọgwụ Federal Medical Centre (FMC) dị n’Umuahia enweta nleta.

    Akụkọ kwuru na mmadụ abụọ ahụ nwụrụ aha ha bụ Ifeanyi Maduako 45 na Onyedi Obasi gbara afọ 35, bụ ụmụnwanne si okpuru ọchịch Ehime Mbano, Imo steeti.

    E kwuru na ha abụọ si be ha abata dịka ha gasịrị emume olili ozu nne ha oge njinji ahụ jiri.

    E kwukwara na ha si mba ofesi bata maka emume olili ozu ahụ.

  8. Nchụpụ obodo Gaza bụ ihe ga-emeriri eme - Ndịagha Izrel

    Ndịagha Izrel chọrọ ka ndị mmadụ pụọ n'obodo Gaza tupu ha abata

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Ndịagha Izrel chọrọ ka ndị mmadụ pụọ n'obodo Gaza tupu ha abata

    Ndịagha Izrel agwaala ndị Palestine na nchụpụ ndị mmadụ n’obodo Gaza ga-emeriri eme dịka ndịagha ya jikere iweghara ya.

    N’ozi ha wepụtara n’akara X n’ụbọchị Wednezde 27 Ọgọst 2025, ọnụ na-ekwuru ndịagha nke Arab bụ Avichay Adraee kwuru na ezinụlọ na-akwaga na ndịda “ga-enweta enyemaka mmadụ kacha emesapụ aka”.

    Ka ọ dị ugbua, tankị ndịagha Izrel kwabara n'ime mpaghara ọhụrụ nke obodo Gaza n'otu abalị, na-amanye ọtụtụ ndị bi ebe ahụ ka ha gbapụ, ndị akaebe kwuru.

    Ọtụtụ puku mmadụ akwagharịla n'ihi na Izrel na-aga n’ihu na-abata mba ahụ - ọ kacha ukwuu n'akụkụ ndị ọzọ nke obodo ahụ, ebe ihe dịka otu nde ndị Palestine ka bi.

    Cheta na a na-atụ anya na Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump ga a bụ onyeisioche na nzukọ maka atụmatụ obi ọchịchị Amerịka bụ White House were maka ịhazị Gaza ma akwụsị agha.

  9. Mmadụ abụọ anwụọla ebe ọtụtụ ndị ọzọ merụrụ ahụ oge otu onye gbara egbe n’ụlọakwụkwọ ụka Katọlik dị na Minneapolis

    Gọvanọ Minnesota bụ Tim Walz kọwara njinji a jiri n’ụlọakwụkwọ Annunciation Catholic School dịka ajọ ọdachi.

    Ebe foto si, Reuters

    Ndị uweojii kwuru na mmadụ abụọ anwụọla ebe mmadụ 20 ndị ọzọ merụrụ ahụ oge otu nwaamadị a na-ekwughị aha ya malitere ịgba egbe n’ụlọakwụkwọ dị na Minneapolis, mba Amerịka.

    Gọvanọ Minnesota bụ Tim Walz kọwara njinji a jiri n’ụlọakwụkwọ Annunciation Catholic School dịka ajọ ọdachi.

    E kwuru na ọnọdụ mmadụ iri merụrụ ahụ dị oke njọ ebe nwaamdị gbara egbe so na ndị nwụrụ.

    Akụkọ kwuru na nwaamadị ahụ gbara egbe ahụ dịka ụmụakwụkwọ na-aka ụka mass.

  10. Onyeisiala Bola Tinubu, Peter Obi etinyela ọnụ n’ihe mberede ụgbọoloko Abuja – Kaduna

    Onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Tinubu na Peter Obi bụbu Gọvanọ Anambra steeti.

    Ebe foto si, Bola Tinubu/Peter Obi / X

    Nkọwa foto, Onyeisiala Bola Tinubu na Peter Obi

    Onyeisila Bola Tinubu na Peter Obi bụbu Gọvanọ Anambra ezigala ndị niile ihe mberede ụgbọoloko Abuja-Kaduna metụtara ozi iti aka n’obi.

    Tinubu bụ onye ji akara X soshal mịdịa ya zipu ozi nke ya kwuru na ya na-eche ka e zitere ya nkọwa banyere ihe mere nakwa ihe nwereike ịkpata ya.

    Ọ sị na “a na-agwa m etu ọnọdụ si dị ugbua mana m na-eche ka e nye m nkọwa ihe niile mere. Ụlọọrụ NRC na-eme ihe ha nwereike ime ka udiri ihe ahụ hara ime ọzọ”.

    Mana Peter Obi bụ onye kwuru na ya na-ekpere ndị meruru ahụ ekpere gwara gọọmenti Naịjirịa ka ha kpọọ ọnọdụ ndị ahụ mkpa ma mee ka ndị mmadụ nwee ntụkwasị obi n’usoro njem ụgbọoloko.

    Cheta na ọ bụ ụgbọoloko si Abuja na-aga Kadụna steeti fepụrụ n’okporo ya ma nwee ihe mberede nke meruru igwe mmadụ ahụ n’ụbọchị Tuzde n’ihe dịka elekere iri na otu nke ụtụtụ.

  11. Naịjirịa amachibidola mbupụ mkpụrụ osisi shea eji emepụta ude ịchọ mma

    Naịjirịa bụ mba kacha emepụta mkpụrụ osisi shea n'ụwa, dịka ọ na-ewe ihe dịka tọn 350,000 kwa afọ.

    Ebe foto si, AFP/Getty Images

    Nkọwa foto, Naịjirịa bụ mba kacha emepụta mkpụrụ osisi shea n'ụwa, dịka ọ na-ewe ihe dịka tọn 350,000 kwa afọ.

    Naịjirịa amachiela mbupụ mpkụrụ osisi shea eji emepụta ude eji achọ mma ruo ọnwa isii.

    Nke a bụ iji mee ka mba Naịjirịa na-erite uru n’ahịa shea dịka ọtụtụ ihe na-efunahụ ya site na imepụtaghị nnukwu shea bọta na mpaghara.

    E kwuru na Naịjirịa bụ mba na-emepụta ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ pasent 40 nke ihe ọkụkụ n'ụwa kwa afọ, mana ọ bụ naanị otu pasent ka ọ na-enweta n’ahịa $ 6.5bn (£ 4.8bn) zuru ụwa ọnụ - ọnọdụ osote onyeisiala Kashim Shettima kọwara dịka ihe agaghị " anabata".

  12. Trump amanyela Ịndia ụtụisi 50% maka ịzụrụ mmanụ mba Rọshịa

    Trump amanyela Ịndịa ụtụisi 50% maka ịzụrụ mmanụ mba Rọshịa

    Ebe foto si, Getty Images

    Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump amanyela ụtụisi 50% n’elu ngwaaghịa niile e si Ịndịa atụbata na mba ahụ.

    Nke a bụ ntaramaahụhụ o nyere Ịndia maka ịga n’ihu na-azụrụ mmanụ agbịdị n’aka mba Rọshịa.

    Ụtụisi ọhụrụ a nwereike inwe mmetụta gbapụtara ihe n’azụmaahịa nakwa akụnaụba mba Ịndia.

    Gọọmenti Delhi ekwuola na e mesoro ha omume na-adịghị mma n’ihi na mmanụ ha zụtara n’aka mba Rọshịa metụtara mkpa na-akpa mba ahụ.

    E kwenyere na atụmatụ a nwereike nye Ịndia ohere ka ha na gọọmenti Mosko na Beijing malite imekọrịta ihe.

    Praịm Minista Ịndia bụ Narendra Modi ga-aga Chaịna n’ime izuụka ndị na-abịa abịa, nke bụ njem mbụ ọ na-eme n’ime afọ asaa, iji gaa ọgbakọ.

  13. Maka ihe mberede ụgbọoloko: E mechiela okporo si Abuja gawa Kaduna - NRC

    Maka ihe mberede ụgbọoloko: E mechiela okporo si Abuja gawa Kaduna - NRC

    Ebe foto si, Nigeria Railway Corporation

    Ụlọọrụ na-ahụ maka njem ụgbọoloko na Naịjirịa bụ Nigerian Railway Corporation (NRC) akwụsịtụla njem ụgbọoloko n’okporo si Abuja gawa Kaduna.

    Nnukwu Onyeisi ụlọọrụ NRC bụ Kayode Opeifa kwupụtara nke a n’ozi o wepụtara n’abalị Tuzde 26 Ọgọst, 2025 n’Abuja.

    Ọ kọwara na ọ bụ mmadụ narị isii na iri na asatọ nọ n’ime ụgbọoloko ahụ nwere ihe ọdachi, nke gụnyere ndị njem narị ise na iri asatọ na atọ, ndị ọrụ iri na ise, otu onye ọrụ ahụike, mmadụ asatọ na-edobe ogige ọcha na mmadụ iri na otu na-ahụ maka ihe oriri.

    Ya bụ ozi kwuru na n’ime mmadụ niile ahụ, asaa nwetara mmerụahụ dị iche iche, mana e bugara ha ụlọọgwụ ozugbo.

    Opeifa gara n’ihu kwuo, na a kpọghachiri ndị njem fọrọ afọ n’ọdọụgbọoloko dị n’Idu na Kubwa, bụ ebe ha siri garuo ebe ha na-aga n’udo.

    Maka ihe mberede ụgbọoloko: E mechiela okporo si Abuja gawa Kaduna - NRC

    Ebe foto si, Nigeria Railway Corporation

    Ọ sịrị na ụlọọrụ NRC nyekwara iwu ka a kwụghachi ndị njem niile ụgwọ njem ha na-egbughị oge, ma kwuo na amalitela ime nnyocha iji chọpụta ihe butere ọnọdụ ahụ.

  14. Rọshịa abanyela na mpaghara Dnipropetrovsk – Ka Yukren kwupụtara

    Rọshịa abanyela na mpaghara Dnipropetrovsk – Ka Yukren kwupụtara

    Ebe foto si, Russian ministry of defence

    Ndịagha Yukren ekwetela na ndịagha Rọshịa abanyela na mpaghara azụmaahịa dị n’Ọwụwa Anyanwụ Dnipropetrovsk, dịka ha na-agba mbọ ịgbanye mgbọrọgwụ ebe ahụ.

    “Nke a bụ ajọ mwakpo mbụ dị etu ahụ a na-eme na mpaghara Dnipropetrovsk,” ka Viktor Trehubov nke otu Dnipro Operational-Strategic Group of Troops gwara BBC.

    Ọ bụ eziokwu na o mere ka o doo anya na a kwụsịla ha imere mwakpo ahụ gawa n’ihu.

    Rọshịa kwuru kemgbe oge ọkọchị na ha abanyela na mpaghara ahụ, dịka ndịagha ha na-agba mbọ ịbanyekwu n’okeala Yukren site na mpaghara Donetsk.

    Na mmalite ọnwa Juun, ndị ọchịchị Rọshịa kwuru na ha amalitela ibu agha na Dnipropetrovsk, n’agbanyeghị na ozi ọhụrụ a Yukren wepụtara na-ekwu na o techabeghị aka Rọshịa ruru n’okeala ahụ.

  15. Igbo mụrụ nze mụọ ọzọ, ụnụ asaala chi, Ọfọ anyị taa bụ onye biri ma ibe ya biri

    Anyị ji ekele na ihu sara mbara anabata gị n'ọgbakọ BBC Igbo taa bụ Wenezde Afọ 27 Ọgọst, 2025.

    Soro anyị na Websaịt, Facebook, Instagram na WhatsApp Chanelụ maka akụkọ niile na-akpọtụ n'ụwa.

    Ọ bụ Ikechukwu Kalu na Chinonso Ugorji ga-anọ n'isi ụgbọ n'ụtụtụ a, dịka Uzoamaka Ewuzie, Michael Ngene na Michael Ilediagu ga-esonyere ha na mgbede.

    Biko gaa n'ihu nọnyere anyị taa...

  16. A nwuchiela ndị uweojii a hụrụ ebe ha na-agụkọ ego na Delta steeti

    A nwụchiela ndị uweojii a hụrụ ebe ha na-agụkọ ego

    Ebe foto si, Bright Edafe/X

    A nwuchiela ndị uweojii anọ n’isi obodo Delta steeti bụ Asaba maka ebubo akparamaagwa na-ezighị ezi.

    Nke a dị n’ozi ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Delta steeti bụ Bright Edafe bipụtara n’akara ọbaozi X ya n’ụbọchị Tuzde 26 Ọgọst, 2026.

    O kwuru na a kpụpụrụ ha bụ ndị uweojii anọ n’ihu Kọmịshọna ndị uweojii Delta steeti n’ụbọchị Tuzde 26 Ọgọst.

    “A gbaala abụọ n’ime ha nwere ọkwa dị elu ajụjụ ma jichie abụọ ndị nke ọzọ nwere ọkwa ‘inspector’ n’ụlọnga,” ka ozi ahụ kọwara.

    Ọ gbakwunyere na a ga-enyocha ndị uweojii ahụ nke ọma, ma kọwaa omume ha dịka nke na-emechu ụlọọrụ ndị uweojii ihu.

    Cheta na a hụrụ ụfọdụ ndị uweojii n’otu ihe onyonyoo fesara ebe niile, ka ha nọ n’ime ụgbọala ha na-apịakọ ọtụtụ ukwu ego, n’ebe e chere bụ isi obodo Delta steeti bụ Asaba.

  17. Gọọmenti ekwuola okwu banyere ihe mgberede ụgbọoloko mere n’ụzọ Abuja-Kaduna

    Ụgbọoloko dara  n’ụzọ Abuja -Kaduna.

    Ebe foto si, Screenshot/NTA/X

    Nkọwa foto, Ụgbọoloko dara n’ụzọ Abuja -Kaduna.

    Ụlọọrụ gọọmenti na-ahụ maka ụgbọoloko bụ Nigeria Railway Corporation ekwuola na ọ bụ eziokwu na ụgbọoloko nwere ihe mgberede n’ụzọ Abuja -Kaduna.

    Ha sị na ọ bụ ụgbọoloko si Abuja na-aga Kaduna fepụrụ n’ụzọ.

    Ha kọwara na ihe mgberede ahụ mere n’ebe dị nso n’ọdọ ụgbọoloko Asham, mana ndị ọrụ gbatagbata nakwa ndị ọrụ ahụike agaala n’ebe ahụ.

    N’ozi ụlọọrụ ahụ wepụtara ka ha kwuru na nsogbu adịghị maka na ndị ọrụ nchekwa agaala n'ebe ihe mgberede ahụ mere ma kwuo na ha na-agba mbọ ka ha kpoghachie ndị niile so ụgbọoloko ahụ eme njem Abụja.

    N’aka nke ọzọ ụlọọrụ na-eme nnyocha maka ọnọdụ nchekwa mmadụ a na-akpọ Nigeria Safety Investigation Bureau (NSIB) ekwuola na ha ga-eme nnyocha ịchọpụta ihe butere ihe mgbederede ahụ.

  18. Ụlọikpe Saụt Afrịka ekwubiela okwu maka akwamozu onyeisiala mba Zambia

    Ụlọikpe Saụt Afrịka ekwubiela okwu maka akwamozu onyeisiala mba Zambia

    Ebe foto si, Getty Images

    Ụlọikpe Ukwu mba Saụt Afrịka ekpebiela na a ga-elirịrị onye bụbu onyeisiala mba Zambịa bụ Edgar Lungu n’obodo ya.

    Lungu nwụrụ n’ọnwa Juun dịka ọ gbachara afọ iri isii na asatọ.

    Nwoke ahụ bụbu onyeisiala mba Zambịa nwụrụ n’otu ụlọọgwụ dị na Pretoria, bụ ebe ọ na-anara ọgwụgwọ.

    Ka o sina dị, mkpebi a nwereike ịdọghachi akwamozu ya azụ, dịka Ọkaiwu ezinaụlọ ya nwereike laghachi n’ụlọikpe maka mkpegharị ikpe.

    Na mmalite ọnwa a ka otu ụlọikpe dị na Pretoria kpebiri na Gọọmenti Zambịa nwere ikike ịhazi akwamozu nwoke ahụ bụbu onyeisiala.

    Mana ezinaụlọ ya chọrọ ka e lie ya na mba Saụt Afrịka, bụ nke mere ha na Gọọmenti Zambịa ji nwee nghọtahie gbasara okwu ahụ.

  19. Mba Fransị ebughachila okpokoro isi Eze ndị Madagascar e gburu egbu

    Mba Fransị eweghachila okpokoro isi Eze ndị Madagascar e gburu egbu

    Ebe foto si, Reuters

    E bughachila okpokoro isi Eze ndị Madagaska ndịagha mba Fransị gburu oge ha kụchiri mba ahụ.

    Emume nnyefe okpokoro isi King Toera na mmadụ abụọ ndị ọzọ ha na ya so achị bụ nke a haziri na mịnịstrị na-ahụ maka omenala na Paris.

    E buuru okpokoro isi ndị ahụ gaa mba Fransị na ngwụcha senchuri nke iri na itoolu ma chekwaa ha n’ọkpụụlọ Museum of Natural History dị n’isi obodo Fransị.

    Ihe a bụ nke mbụ e tinyere n’ọrụ, bụ iwu na-ahụ maka iweghachi ihe ndị fọdụrụ n’ahụ mmadụ dị na mba Fransị.

  20. E mechiela ụlọọgwụ adịgboroja isii na Rivas steeti

    E mechiela ụlọọgwụ adịgboroja isii na Rivas steeti

    Ebe foto si, Getty Images

    Otu kọmitii a kpọrọ Rivers State Interprofessional Anti-Quackery Committee emechiela ụlọọgwụ isii na-erughị ogogo a chọrọ gburugburu steeti ahụ, ma nwuchie mmadụ abụọ a na-enyo enyo na ha etozughị oke ịbụ ndị ọrụ ahụike.

    N’ozi Hope Avundaa wepụtara n’aha kọmitii ahụ, o kwuru na agha ahụ ha buru n’ụbọchị Fraịde 22 Ọgọst, 2025 bụ nke lekwasara anya n’obere ụlọahụike, ebe ndị a na-ere ọgwụ nakwa ụlọọgwụ ndị a na-enyeghị nkwado.

    Kọmitii ahụ kwuru na otu n’ime ụlọọgwụ ndị ahụ bụ ụlọ nwere ọnụụlọ atọ a tụgharịrị ka ọ bụrụ ụlọọgwụ, nke otu onye kpọrọ onwe ya dọkịta ji mere ebe a na-amụ nwa nakwa ebe a na-awa ahụ.

    E kwuru na a napụrụ ụlọọgwụ ahụ ikike kemgbe ihe karịrị afọ iri gara aga.

    Kọmitii ahụ mechikwara ụlọọgwụ ọzọ nọ n’ime ụlọ nwere ọnụụlọ atọ a tụgharịrị ka ọ bụrụ ụlọọgwụ.

    E kwuru na onye nwe ya nọ ebe ahụ awa ndị mmadụ ahụ ma na-azụkwa ndị ‘nọọsụ eliza’ site n’enyemaka otu dọkịta na-amụ ọrụ.

    Ha gakwara mechie ebe otu ‘nọọsụ eliza’ na-ere ọgwụ na mpaghara Omagwa ma nyefee ya n’aka Onyeisi na-ahụ maka ndị na-ere ọgwụ.

    Ụlọọgwụ ọzọ ndị kọmitii ahụ mechiri bụ ụlọelu obibi e ji mere ụlọọgwụ, ụlọọrụ na-abụghị nke gọọmenti nakwa ebe a na-azụ ndị nọọsụ dị n’Okporo.