Inec gbalịrị ruo 80% na ntuliaka onyeisiala - Yakubu Maikyau, onyeisi NBA
Yakubu Maikyau, bụ onyeisioche otu jikọrọ ndị ọkaiwu na Naịjirịa a kpọrọ 'Nigeria Bar Association' ekwuola na ụlọọrụ nhazi ntuliaka bụ Inec gbalịrị nke ọma na ntuliaka ọkwa onyeisiala nke e mere n'ụbọchị 25 nke ọnwa Febrụwarị 2023.
Maikyau kwuru nke a na mkparịtaụka ya ndị ntaakụkọ Channels, ma kọwaa na ọ bụrụ na ntuliaka ahụ bụ ule, "Inec nwetara ebe 78% maọbụ 80% nke bụ A".
"Ọ bụ eziokwu na e nwere ụfọdụ mperi ndị ọrụ Inec riri n'ụbọchị ntuliaka ahụ, ọ bụkwa eziokwu na enwere ọdachi dị icheiche, mana ị tulee ya nke ọma, ị ga-ahụ na ya bụ ntuliaka gara nke ọma," Maikyau kwuru.
"Nke a mere anyị ji enye Inec ndụmọdụ ka ha lebaa anya na ntuliaka nke gara aga, chọpụta ọdachi niile ha nwere nakwa ebe ha emetechaghị nke ọma, ma gbaa mbọ iji hụ na ihe ndị ahụ na-agazighị nke ọma agaghị emekwa ọzọ na ntuliaka nke ọkwa gọvanọ na ndị omeiwu steeti bụ nke a ga-enwe na Maachị 11."