Otu nwaamadị bi na Kano steeti akọwala etu nyighari ntuliaka
ọkwa Gọvanọ Inec mere siri metụta ya na ezinaụlọ ya.
Inec buuru ntuliaka e kwesịrị ime taa bụ Satọdee ụbọchị 11
nke ọnwa Maachi gaa ụbọchị 18 nke ọnwa Maachi n’ihi ọrụ nhazi ngwa ọrụ Bvas ha nakwa
ọrụ nkwadobe ndị ọzọ maka ya bụ ntuliaka.
Maazị Alhaji Shuaibu Idi Amin bi na Kano steeti kwuru:
‘Anyị ekeesala akwụkọ agbamakwụkwọ anyị nke ehibere ụbọchị
18 Maachị, obi adịghị m mma mana dịka ndị ‘Obident’ na-erubere gọọmentị isi,
anyị ga-eme ihe kwesịịrị ime.’
Dịka ọtụtụ ma, oge ntuliaka na Naịjirịa na-eme amachie ngagharị
ndị mmadụ na Naịjirịa gburu gburu dịka a na-emechi ọdụ ụgbọelu niile nakwa ole
ala Naịjirịa niile, nke na-eme ndị mmadụ anaghị ehibe emume ọbụla dị mkpa n’ụbọchị
ahụ.
Alhaji Shuaibu gwara BBC na ezinaụlọ ya bi na Bauchi steeti akwaodolari
kemgbe ịbịa emume a ‘mana ugbua, amalitela m ịkpọ ha gwaa ha na ya bụ emume
agaghị agazị n’ihu n’ihi Inec ehibela ntuliaka ụbọchị ahụ’.
Ọtụtụ ekwuola
na nyịgharị a Inec mere n’ụbọchị Tọọzde metụtara ha dịka ha hibere emume, njem
nakwa ihe ndị ọzọ dị ha mkpa ụbọchị ahụ.
Ya bụ ihe emetụtakwala ụmụakwụkwọ mahadum na Naịjirịa bụ ndị e meechiri ụlọakwụkwọ ha maka atụmatụ ntuliaka kemgbe ọnwa Febụwarị.
Ka ọ dị ugbua, mahadum abụọ na Legọs eyigahrịala mmepe ụlọakwụkwọ ha ozọ bụ nke ha zubere imepee me emechapụ ntuliaka e kwesịrị ime taa bụ Satọdee.
Mahadum Legọs nke Unilag na Lasu so na ndị ya bụ ihe metụtara.
Ihe mere Inec jiri yigharịa ntuliaka ọkwa Gọvanọ na ndị ụlọomeiwu steeti
Ụlọọrụ nhazi ntuliaka Naịjirịa bụ Inec n’ịchafụ kwuru na ha mere mkpebi a dịka ụlọikpe nyere iwu banyere ngwa ọrụ Tenkụzụ Bvas ha ji mee ntuliaka ọkwa onyeisiala n’ụbọchị 25 nke ọnwa Maachị.
Inec kwuru na ha chọrọ ime nke a ka ha nwee ike kwado ma jirikwa ya bụ ngwa Bvas mee ntuliaka ọkwa gọvanọ mana ụfọdụ ndị bu okwu na ha enwenyeghi mpụtara ntuliaka ahụ achọghị ka Inec mee nke a, ụlọikpe kụchapụrụ mkpesa ndị a ma nye iwu ka Inec hazịgharị ma hịchapụ ozi ndị nọ n’ime ngwa Bvas ha mana nyekwa iwu na ha ga-ezobe ozi ndị gụnyere vootu ndị mmadụ tụrụ n’ọdụ ntuliaka dị iche iche n’ime ọba ozi pụrụiche na ịntanetị a na-akpọ ‘Server’ na Bekee.
Ndị buu okwu a gaa ụlọikpe gụnyere Peter Obi nke Labour Party (LP), Atiku Abubakar nke People’s Democractic Party (PDP) na ndị ọzọ sokwa zọọ ya bụ ọkwa onyeisiala bụ nke e mechara a họpụtara Bola Tinubu nke All Progressives Congress (APC) dịka onye mmeri.
Mkpesa ndị a na-eme gụnyere ebubo na usoro ntuliaka ahụ agaghị n’ụzọ ziri ezi ọkachasị dịka Inec esoghị usoro ha kwupụtara iso na ya bụ ntuliaka nke gụnyere iji ngwa Bvas zipụ nchịkọta vootu ndị a tụrụ na ọdọ ntuliaka dị iche iche n’akụkụ Naịjirịa niile nakwa ịgba n’anwụ etu vootu ndị ahụ niiile si abata, ebe ha si, ọnụ ọgụgụ na ihe ndị ọzọ n’akụkụ ọba ozi ha a kpọrọ ‘Irev’.
Inec kwuru n’oge ahụ na ha kwetere na ihe agaghị etu ha siri chebuo dịka ụfọdụ nsogbu teknụzụ metụtara ha mana ndị mmadụ ọkachasị ndị nso nso ndị a na-emerịghi, na-arụ Inec aka ebe ya bụ okwu nọ n’ụlọikpe ugbua.
Inec kwuru na ha ga-eji ohere nyịgharị oge ntuliaka a hazịgharị ngwa Bvas ha ma kwadobe nke ọma ịhụ na ihe ndị cheere ha aka mgba na ntuliaka ọkwa onyeisiala anọchịghị ha ụzọ ọzọ.