Ndịagha Naịjirịa ruru 26 ebutela ọrịa coronavirus

Ndịagha Naịjirịa ekwupụtala na mmadụ iri abụọ na isii ebutela nje covid-19 n’ime mmadụ narị anọ na iri na asaa ha mere nnyocha.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Coronavirus: Ụmụaka ọhụrụ asaa anwụọla maka abụbọọrụ ndị ọrụ ahụike

    Ụmụaka asaa a mụru ọhụru nwụru n’ụlọọgwụ maka na ha enweteghị ọgwụgwụ n’oge na mba Zimbabwe.

    Nke a na-eme dịka ndị ọrụ ahụike na-agba abụbọ ọrụ maka enweghị akụrụngwa nchekwa coronavirus.

    Naanị ndi dọkịta abụọ nọ n’ọrụ ma ha sịkwa na ihe a mere n’ụbọchị Monde bụ nke obere ma ọ bụrụ na gọọmentị arụghị ọrụ ha.

    Ndị nọọsụ si na ha chọrọ uwe nchekwa ahụ nke Bekee kpọrọ 'PPE' nakwa mbulite ụgwọnwa ha

    Ebe foto si, EPA

    Nkọwa foto, Ndị nọọsụ si na ha chọrọ uwe nchekwa ahụ nke Bekee kpọrọ 'PPE' nakwa mbulite ụgwọnwa ha
  2. Hydroxychloroquine ka bụ ọgwụ na-ebuso coronavirus agha - Trump

    Onyeisiala Donald Trump

    Ebe foto si, AFP

    Onyeisiala mba Amerịka ekwusiela ike na ọgwụ hydroxychloroquine na-enye aka ibuso ọrịa coronavirus agha.

    Trump sị na ihe mere ndị ọrụ ahụike ya ji jụ ịnabata ọgwụ a e ji agwọ ọrịa ịba bụ maka na ọ bụ ya wepụtara atụmatụ a.

    Okwu ya na-abịa dịka ụlọọrụ Twitter machiri ọkpara Trump ka ọ ghara izipu ihe onyonyo na-akwado ọgwụ hydroxychloroquine.

    Onweghi ihe akaebe na-egosi na ọgwụ a nwereike ibuso ọrịa a agha, ndị nyocha sị na nke a nwereike ibute ọrịa obi.

    N'ọnwa gara aga ụlọọrụ na-ahụ maka nri na ọgwụ n'Amerịka sị dọrọ aka na ntị ka akwụsị ịṅụ ọgwụ a n'ihi igbochi coronavirus maka akụkọ sị na ọ na-ebute ọrịa obi.

    Ụlọọrụ ahụike mbaụwa bụ WHO sị na enweghi ihe akaebe sị na ọgwụ a na-agwọ coronavirus.

  3. Ụlọọrụ na-ahụ maka mgbochi ọrịa na Naịjirịa bụ NCDC n’ịchafụ sị na a chọpụtara ọrịa coronavirus n’ahụ mmadụ narị isii, iri abụọ na anọ n’ụbọchị Tuzde.

    N’ime ndị a, mmadụ iri abụọ na asatọ si n’EnugwuSteetị, ebe mmadụ iri na asaa si n’Ebonyi Steetị.

    Mmadụ

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  4. Igbo ndị ọma unu asaala chi?

    Anyị ji obi ọma anabata unu n'ụbọchị nke taa.

    Sonyere anyị n'akụkọ maka coronavirus na Naịjirịa.

  5. Mmadụ 829 nwere onwe ha n'aka coronavirus nanị n'ụbọchị Mọnde

    Ngalaba NCDC ekwuola na mmadụ 829 enwerela onwe ha site n'aka ọrịa coronavirus nanị n'ụbọchi Monde.

    Dịka ọ dị ugbu a, mmadụ 18,203 e sila n'ute ọrịa covid-19 pụta.

    NCDC na-arịọkwa ndị Naịjirịa ka ha jisie ike mee ihe nchekwa niile gọọmentị kwuru.

    Ndị nyocha ahụike

    Ebe foto si, AFP

  6. Gee akụkọ ga-amasị gị n'otu nkeji

  7. Ụnụ asaala chi Igbo ndị ọma

    Ndewo, soro anyị taa maka akụkọ niile ga-amasị gị.

  8. Ka ọ dị echi

    Ị mere nke ọma wee nọnyere anyị taa.

    Echi ga-abụ echi ọma.

    Ka chi foo!

  9. Kenya agbachiela ebe a na-ere nkwụ dịka ha gbatikwuru ọnọdụ onye apụla ezi n'abalị

    Ụlọ nkwụ

    Ebe foto si, AFP

    Onyeisiala mba Kenya bụ Uhuru Kenyata agbatikwuola ọnọdụ onye apụla ezi n'abalị, dịka ọ machikwara ọdụ nkwụ niile, n'ihi etu ọnụọgụgụ ndị bu coronavirus ka na-arị ibe ya elu na mba ahụ.

    Ọ kwuru nke a na ọgbakọ ya na ndị gọvanọ nwere na Mọnde gbasara ọnụdụ coronavirus na be ha.

    Onyeisiala sị na ọ bụ maka oringo ndị ntorobịa na-agba mere ya ji tie ya bụ iwu ka ha ghara itinye ndị mmadụ ọnọdụ ọjọọ.

    o ruola mmadụ 17,000 bu ya bụ nje dịka ọ tagoro isi mmadụ narị abụọ na iri asatọ.

  10. Na Akpọtụ Ugbu A, Gọọmentị etiti adọtikwuola mmepe obodo

    Boss Mustapha

    Ebe foto si, Twitter/NCDC

    Gọọmentị etiti etinyekwuola otu izu n'atụmatụ iji nwayọ nwayọ na-emepe obodo.

    Boss Mustapha bụ odeakwụkwọ gọomentị etiti nakwa onyeisioche otu gọọmentị etiti họpụtara maka ịlụso Covid-19 agha na Naịjirịa, kwuputara nke a ka ha na-agwa ndị ntaakụkọ okwu n'Abuja taa.

    Akụkọ ka na-abịa...

  11. Ụlọakwụkwọ ndị sekondịrị na-apụ apụ ga-amalite n'ụbọchị anọ nke ọnwa Ọgọst

    Ụmụakwụkwọ

    Gọomentị etiti ewepụtala ụbọchị nke anọ ọnwa Ọgọst dịka ụbọchị ndị na-akwado ụwe ọpụpụ ga-amalite akwụkwọ.

    Nke a bụ nkwekọrịta ndị Mịnịstrị na kọmishọna agụmakwụkwọ na Naịjirịa taa bụ Mọnde.

    Ha kwekọrịtara na ndị na-akwodo ụle Waec ga-amalite ule ahụ ụbọchị iri na asaa nke ọnwa Ọgụst.

    Ndị so na nkwekọrịta a bụ ndị Ministri agụmakwụkwọ nke gọọmentị etiti, ndị Kọmishọna agụmakwụkwọ si steeti iri atọ na isii (36) dị na Naijirịa, ndị otu Naịjirịa Union of Teachers, ndị isi ọrụ uleakwụkwọ nakwa ndị isi ụlọakwụkwọ abụghị nke gọọmenti.

    Ndị ụmụakwụkwọ na-apụ apụ nwere izuụka abụọ iji kwado ule Waec na Neco tupu o ruo n'ụbọchị iri na asaa nke ọnwa Ọgọst (17-8-2020).

    Ha kwekọrịtara na ha ga-arịọ gọọmenti ka enyere ha aka ịme ka ya bụ oge a kara aka nwee isi.

    Ha ga-ezukọkwa echị, ha na ndị ụlọọrụ na-ekpokoba ụleakwụkwọ dịka Neco, Nabteb, na Nbais ịlebe anya ka ha ga-esi kpokoba ụle ha ka ha nwee ike ịme ya otu mgbe.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  12. Ihe ala ili na-egosi maka coronavirus na Somalia

  13. Ndewonụ ndị ọma

    Covid 19 agaghị ezute gị na ndị be gị mana gbaa mbọ na-akwọcha aka gị ọfụma.

  14. Ihe karịrị mmadụ 40,000 ebutela coronavirus na Naịjirịa

    Ngalaba Nigeria Centre for Disease Control (NCDC) ekwuputala na mmadụ narị ise na iri ise na ise ọzọ ebutela ọrịa coronavirus na Naịjirịa.

    Ụgbụa, mmadụ puku iri anọ na narị ise, iri atọ na abụọ ebutela ọrịa a kamgbe o bidoro na Naijirịa ebe mmadụ puku iri na asaa, narị atọ na iri asaa na anọ esile na ya gbakee.

    Ọnụ ọgụgụ ndị bu Coronavirus

    Ebe foto si, NCDC

  15. Ụtụtụ ọma nwa Igbo

    Ụbọchị taa ga-amụtara gị mkpụrụ...Soro anyị maka akụkọ niile ga-amasị gị taa niile.

    Nkwụ

    Ebe foto si, Science Photo Library

  16. Ka chi foo!

    I mere ọfụma wee nọnyere anyị taa.

    Ka Chukwu mee gị mma.

    Ndeewo

  17. Lee etu ọrịa coronavirus kwụ na Naịjirịa ugbua

    Dịka a na-achụpụbeghi ọrịa coronavirus kpamkpam na Naịjirịa, lee etu ihe kwụ na mba a.

    Ngalaba Nigeria Centre for Disease Control (NCDC) na-ahụ maka mgbochi ọrịa na-efe efe wepụtara ọnụọgụgụ ndị ha merela nnyocha.

    Ha kwuru na ha emeela nnyocha ruru 262,579, ebe mmadụ 39,977 buterela ya bụ ọrịa.

    Mmadụ 856 alaala mmụọ n'ihi ọrịa a, ebe mmadụ 16,948 chịrịla ute ọrịa ha laa.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  18. Ụmụ Naịjirịa nọ na Yurop na-abata n'obodo taa maka ọsọ coronavirus

    Ndị Naịjirịa bi n'ofesi

    Ebe foto si, NiDCOM

    Ụmụafọ Naịjirịa ọzọ tọrọ na Fransị nakwa mba Yurop ndị ọzọ hapụrụ ọdọụgbọelu dị na Fransị mgbe o ji ọkara gafee elekere iri nke ụtụtụ a lọtawa Naịjirịa.

    Onyeisi ụlọọrụ na-ahụ maka ndị Naịjirịa bi n’ofesi bụ Abike Dabiri-Erewa kwuputara nke a.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  19. Ihe karịrị mmadụ 2000 ọzọ ebutela coronavirus n'otu ụbọchị n'Iran

    Mba Ịran

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, Mba Ịran mepegharịrị ahịa dịka nke a dị n'obodo Tehran, n'ọnwa Epreelụ

    Mba Iran ekwuola na mmadụ 2,333 ọhụrụ butere ọrịa coronavirus na mba ahụ n'ime otu ụbọchị, dịka ọrịa ahụ ka na-akpa ike na mba ahụ kemgbe ọnwa Mee.

    Mịnịstrị ahụike nke mba ahụ kwuru na mmadụ 216 nwụrụ n'ime otu ụbọchị (ụnyaahụ), nke mezuru ya mmadụ 15,700 ọrịa a tarala isi ha na mba ahụ.

    Ịran malitere imepegharị obodo n'ọnwa Epreelụ, mgbe ọnụọgụgụ ndị butere ọrịa a dara. Ha mepegharịrị ụlọekperealakụba, ụlọahịa nakwa ebe ndị mmadụ na-anọ elegharị anya, ma hapụ ka ndị mmadụ nwee ike na-eme njem isi na steeti fere na steeti.

    Mgbe ọrịa a selitere isi na mba ahụ, ọ bụ n'isi obodo Tehran nakwa Qom ka ọ kpara ezigbo mkpamkpa, mana ebe ọ kacha enye nsogbu ugbua bụ n'obodo Khuzestan dị na mpaghara Saụt-Westị.

    Hassan Rouhani bụ onyeisiala mba ahụ ekwuola hoo haa, na onye ọbụla ga-eyiriri mkpuchi imi ma ha nọrọ n'ụgbọ e ji eme njem nakwa ebe ndị mmadụ juru.

  20. Obiano akagbuola ntuliaka ngalaba Football Association steeti ahụ

    Willie Obiano

    Ebe foto si, Anambra state media

    Gọọmentị Anambra steeti akagbuola ngalaba na-ahụ maka egwuregwu bụ Anambra State Football Association (AnSFA) Board and Local Football Councils ya na ntuliaka ndị ọchịchị ha tinyeburu ụbọchị Mọnde.

    Kọmishọna mgbasa ozi steeti ahụ bụ Don Adinuba kwuru na nke a bụ maka irubere agha coronavirus isi na steeti ahụ.