Ndịagha Naịjirịa ekwupụtala na mmadụ iri abụọ na isii ebutela nje covid-19 n’ime mmadụ narị anọ na iri na asaa ha mere nnyocha.
Mkpuchi Na Eme Ozugbo
Coronavirus: Ụmụaka ọhụrụ asaa anwụọla maka abụbọọrụ ndị ọrụ ahụike
Ụmụaka asaa a mụru ọhụru nwụru n’ụlọọgwụ maka na ha enweteghị ọgwụgwụ n’oge na mba Zimbabwe.
Nke a na-eme dịka ndị ọrụ ahụike na-agba abụbọ ọrụ maka enweghị akụrụngwa nchekwa coronavirus.
Naanị ndi dọkịta abụọ nọ n’ọrụ ma ha sịkwa na ihe a mere n’ụbọchị Monde bụ nke obere ma ọ bụrụ na gọọmentị arụghị ọrụ ha.
Ebe foto si, EPA
Nkọwa foto, Ndị nọọsụ si na ha chọrọ uwe nchekwa ahụ nke Bekee kpọrọ 'PPE' nakwa mbulite ụgwọnwa ha
Hydroxychloroquine ka bụ ọgwụ na-ebuso coronavirus agha - Trump
Ebe foto si, AFP
Onyeisiala mba Amerịka ekwusiela ike na ọgwụ
hydroxychloroquine na-enye aka ibuso ọrịa coronavirus agha.
Trump sị na ihe mere ndị ọrụ ahụike ya ji jụ ịnabata
ọgwụ a e ji agwọ ọrịa ịba bụ maka na ọ bụ ya wepụtara atụmatụ a.
Okwu ya na-abịa dịka ụlọọrụ Twitter machiri ọkpara Trump ka ọ ghara izipu ihe onyonyo na-akwado ọgwụ hydroxychloroquine.
Onweghi ihe akaebe na-egosi na ọgwụ a nwereike ibuso ọrịa a agha, ndị nyocha sị na nke a nwereike ibute ọrịa obi.
N'ọnwa gara aga ụlọọrụ na-ahụ maka nri na ọgwụ n'Amerịka sị dọrọ aka na ntị ka akwụsị ịṅụ ọgwụ a n'ihi igbochi coronavirus maka akụkọ sị na ọ na-ebute ọrịa obi.
Ụlọọrụ ahụike mbaụwa bụ WHO sị na enweghi ihe akaebe sị na ọgwụ a na-agwọ coronavirus.
Ụlọọrụ na-ahụ maka mgbochi ọrịa na Naịjirịa bụ NCDC n’ịchafụ
sị na a chọpụtara ọrịa coronavirus n’ahụ mmadụ narị isii, iri abụọ na anọ n’ụbọchị
Tuzde.
N’ime ndị a, mmadụ iri abụọ na asatọ si n’EnugwuSteetị, ebe mmadụ iri na asaa si n’Ebonyi
Steetị.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
End of X post
Igbo ndị ọma unu asaala chi?
Anyị ji obi ọma anabata unu n'ụbọchị nke taa.
Sonyere anyị n'akụkọ maka coronavirus na Naịjirịa.
Mmadụ 829 nwere onwe ha n'aka coronavirus nanị n'ụbọchị Mọnde
Ngalaba NCDC ekwuola na mmadụ 829 enwerela onwe ha site n'aka ọrịa coronavirus nanị n'ụbọchi Monde.
Dịka ọ dị ugbu a, mmadụ 18,203 e sila n'ute ọrịa covid-19 pụta.
NCDC na-arịọkwa ndị Naịjirịa ka ha jisie ike mee ihe nchekwa niile gọọmentị kwuru.
Ebe foto si, AFP
Gee akụkọ ga-amasị gị n'otu nkeji
Ụnụ asaala chi Igbo ndị ọma
Ndewo, soro anyị taa maka akụkọ niile ga-amasị gị.
Ka ọ dị echi
Ị mere nke ọma wee nọnyere anyị taa.
Echi ga-abụ echi ọma.
Ka chi foo!
Kenya agbachiela ebe a na-ere nkwụ dịka ha gbatikwuru ọnọdụ onye apụla ezi n'abalị
Ebe foto si, AFP
Onyeisiala mba Kenya bụ Uhuru Kenyata agbatikwuola ọnọdụ onye apụla ezi n'abalị, dịka ọ machikwara ọdụ nkwụ niile, n'ihi etu ọnụọgụgụ ndị bu coronavirus ka na-arị ibe ya elu na mba ahụ.
Ọ kwuru nke a na ọgbakọ ya na ndị gọvanọ nwere na Mọnde gbasara ọnụdụ coronavirus na be ha.
Onyeisiala sị na ọ bụ maka oringo ndị ntorobịa na-agba mere ya ji tie ya bụ iwu ka ha ghara itinye ndị mmadụ ọnọdụ ọjọọ.
o ruola mmadụ 17,000 bu ya bụ nje dịka ọ tagoro isi mmadụ narị abụọ na iri asatọ.
Na Akpọtụ Ugbu A, Gọọmentị etiti adọtikwuola mmepe obodo
Boss Mustapha bụ odeakwụkwọ gọomentị etiti nakwa onyeisioche otu gọọmentị etiti họpụtara maka ịlụso Covid-19 agha na Naịjirịa, kwuputara nke a ka ha na-agwa ndị ntaakụkọ okwu n'Abuja taa.
Nke a bụ nkwekọrịta ndị Mịnịstrị na kọmishọna agụmakwụkwọ na Naịjirịa taa bụ Mọnde.
Ha kwekọrịtara na ndị na-akwodo ụle Waec ga-amalite ule ahụ ụbọchị iri na asaa nke ọnwa Ọgụst.
Ndị so na nkwekọrịta a bụ ndị Ministri agụmakwụkwọ nke gọọmentị etiti, ndị Kọmishọna agụmakwụkwọ si steeti iri atọ na isii (36) dị na Naijirịa, ndị otu Naịjirịa Union of Teachers, ndị isi ọrụ uleakwụkwọ nakwa ndị isi ụlọakwụkwọ abụghị nke gọọmenti.
Ndị ụmụakwụkwọ na-apụ apụ nwere izuụka abụọ iji kwado ule Waec na Neco tupu o ruo n'ụbọchị iri na asaa nke ọnwa Ọgọst (17-8-2020).
Ha kwekọrịtara na ha ga-arịọ gọọmenti ka enyere ha aka ịme ka ya bụ oge a kara aka nwee isi.
Ha ga-ezukọkwa echị, ha na ndị ụlọọrụ na-ekpokoba ụleakwụkwọ dịka Neco, Nabteb, na Nbais ịlebe anya ka ha ga-esi kpokoba ụle ha ka ha nwee ike ịme ya otu mgbe.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
End of X post
Ihe ala ili na-egosi maka coronavirus na Somalia
Ndewonụ ndị ọma
Covid 19 agaghị ezute gị na ndị be gị mana gbaa mbọ na-akwọcha aka gị ọfụma.
Ihe karịrị mmadụ 40,000 ebutela coronavirus na Naịjirịa
Ngalaba Nigeria Centre for Disease Control (NCDC) ekwuputala na mmadụ narị ise na iri ise na ise ọzọ ebutela ọrịa coronavirus na Naịjirịa.
Ụgbụa, mmadụ puku iri anọ na narị ise, iri atọ na abụọ ebutela ọrịa a kamgbe o bidoro na Naijirịa ebe mmadụ puku iri na asaa, narị atọ na iri asaa na anọ esile na ya gbakee.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
End of X post
Ụmụ Naịjirịa nọ na Yurop na-abata n'obodo taa maka ọsọ coronavirus
Ebe foto si, NiDCOM
Ụmụafọ Naịjirịa ọzọ tọrọ na Fransị nakwa mba Yurop ndị ọzọ hapụrụ ọdọụgbọelu
dị na Fransị mgbe o ji ọkara gafee elekere iri nke ụtụtụ a lọtawa Naịjirịa.
Onyeisi ụlọọrụ na-ahụ maka ndị Naịjirịa bi n’ofesi bụ Abike Dabiri-Erewa
kwuputara nke a.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
End of X post
Ihe karịrị mmadụ 2000 ọzọ ebutela coronavirus n'otu ụbọchị n'Iran
Ebe foto si, Reuters
Nkọwa foto, Mba Ịran mepegharịrị ahịa dịka nke a dị n'obodo Tehran, n'ọnwa Epreelụ
Mba Iran ekwuola na mmadụ 2,333 ọhụrụ butere ọrịa coronavirus na mba ahụ n'ime otu ụbọchị, dịka ọrịa ahụ ka na-akpa ike na mba ahụ kemgbe ọnwa Mee.
Mịnịstrị ahụike nke mba ahụ kwuru na mmadụ 216 nwụrụ n'ime otu ụbọchị (ụnyaahụ), nke mezuru ya mmadụ 15,700 ọrịa a tarala isi ha na mba ahụ.
Ịran malitere imepegharị obodo n'ọnwa Epreelụ, mgbe ọnụọgụgụ ndị butere ọrịa a dara. Ha mepegharịrị ụlọekperealakụba, ụlọahịa nakwa ebe ndị mmadụ na-anọ elegharị anya, ma hapụ ka ndị mmadụ nwee ike na-eme njem isi na steeti fere na steeti.
Mgbe ọrịa a selitere isi na mba ahụ, ọ bụ n'isi obodo Tehran nakwa Qom ka ọ kpara ezigbo mkpamkpa, mana ebe ọ kacha enye nsogbu ugbua bụ n'obodo Khuzestan dị na mpaghara Saụt-Westị.
Hassan Rouhani bụ onyeisiala mba ahụ ekwuola hoo haa, na onye ọbụla ga-eyiriri mkpuchi imi ma ha nọrọ n'ụgbọ e ji eme njem nakwa ebe ndị mmadụ juru.
Obiano akagbuola ntuliaka ngalaba Football Association steeti ahụ
Ebe foto si, Anambra state media
Gọọmentị Anambra steeti akagbuola ngalaba na-ahụ maka egwuregwu bụ Anambra State Football Association (AnSFA) Board and Local Football Councils ya na ntuliaka ndị ọchịchị ha tinyeburu ụbọchị Mọnde.
Kọmishọna mgbasa ozi steeti ahụ bụ Don Adinuba kwuru na nke a bụ maka irubere agha coronavirus isi na steeti ahụ.