Ụnụ apụtala ụtụtụ?
Ndewo ndị Igbo!
N'ihe niile ị na-eme, kwụba aka gị ọtọ.
Ndịagha Naịjirịa ekwupụtala na mmadụ iri abụọ na isii ebutela nje covid-19 n’ime mmadụ narị anọ na iri na asaa ha mere nnyocha.
Ndewo ndị Igbo!
N'ihe niile ị na-eme, kwụba aka gị ọtọ.

Ebe foto si, Abia state media
Ozi na-eru anyị ntị taa bụ na Gọvanọ Okezie Ikpeazu nke Abia steeti ebudaala ọnụego ụtụisi dị iche iche iji nyere ndị mmadụ aka n'azụmahịa maka ịbelata iheisiike ya na agha coronavirus so.
Ọnụ na-ekwuru gọvanọ steeti ahụ bụ Onyebuchi Ememanka sị na "nke a bụ iji nyere ndị ahịa aka iwulita ahịa ha bụ nke agha coronavirus metutara.
Ya bụ mwetu ọnụego ụtụisi si pasent ise ruo pasent iri abụọ na ise.
Ndị ga-erita uru ya bụ mwetu ego ụtụisi bụ ndị ahịa mgbere, ndị ọrụ ngo, nadị ọrụaka, ndị na-azụ ala nakwa ndị chọrọ ịgbata akwụkwọ ala ha zụrụ.
Ụfọdụ ndị dị otu a ga-erite uru dị otu a ga-akwụ ụgwọ ha ji gọọmenti tupu ọnwa August agachaa.

Ebe foto si, Anambra Broadcasting Service/Facebook
Ndị ahịa mgbere n'Awaka, Anambra steeti, etiela oke mkpu maka njọ ahịa ji ha kemgbe amalitere ịkpọchị ụzọ maka igbochi nfesa nje coronavirus.
Dịka ndị ntaakụkọ ABS chọpụtara, ọtụtụ ndị ahịa nọcha nkịtị n'ọdụ ahịa ha sị na ụsụahịa emeela ha ihe kemgbe akpọchiri ụzọ maka igbochi nfesa nje coronavirus.
Ndị ndị ntaakụkọ ABS gbara ajujụọnụ n'Awka bụ ndị ha sị tukwucha nkịtị n'ọdụ ahịa ha sị na ọ na-ahịazị ahụ tupu ha eree otu ihe n'ụbọchị ugbua.
Ha sị na mmechị ụlọakwụkwọ mere ka ya bụ njọ ahịa kawanye njọ, ma na-arịọ gọomenti ka ha jisiike meghe ụlọakwụkwọ.

Ebe foto si, Zainab Ahmed/Twitter
Gọọmenti etiti etiela mkpu, ụbọchị ụka gara aga, sị na ọnọdụ nnọpụ iche Naịjrịa hiwere maka igbochi nfesa nje coronavirus fọrọ ntakiri ka ọ kwatuo akụ na ụba obodo a.
Mịnịsta na-ahụ maka akụ na ụba na mkpata na mmefu akụ bụ Zainab Ahmed bụ onye kwuru nke a n'ọzụzụ ndị ọrụ enyemaka ha mere sị na ihe ga-akawanye njọ n'ọnwa na-abịanụ.
Ọ sị na ya bụ ọnọdụ nnọpụ iche buru Naịjirịa aka n'ọnwa anọ nke mbụ (1st quarter) nke 2020 maka ọdịda ahịa mmanụ agbidi bụ nke butere ụkọ ego dọla na-abata na Naịjirịa.
Dịka Zainab kwuru, " a tụrụ anya na ihe ga-esiwanye ike ruo ọnwa anọ nke atọ (3rd quarter) n'afọ 2020".
Ọ kwuru na ya bụ ọnọdụ nnọpụ iche buru obodo a aka site n'ọtụtụ mmadụ achụrụ n'ọrụ, ntufu akụ na ụba nakwa mgbada ego na-abatara ezinaụlọ.
Ọ sị na ọ bụ ya mere National Bureau of Statistics ji chọpụta na ego na-abatara ezinaụlọ ndị mmadụ dara ada.
Ọ sị na ha chọpụtara na ego na-abatara ezinaụlụ ndị mmadụ na Naịjirịa erughị otu narị Naria, iri atọ na asaa (N137,000), nke pụtara Narịa iri na otu (N11,000) kwa ọnwa, bụ nke ezinaụlọ karịri pasent iri anọ na-enweta.

Ebe foto si, PA Media
Gọọmentị mba Briten ebinyela aka n’akwụkwọ maka ibute ọgwụ nde iri itoolu a na-enyocha maka ịgwọ ọrịa coronavirus.
Ụlọọrụ BioNtech na Pfizer na Valneva ka anya ha dị na nnyocha ọgwụ a.
Nkwekọrịta a Briten na ụlo ọrụ ndị a nwere bụ gụnyere nke ga-ezuru mmadụ nde 100 ụlọọrụ AstraZeneca na-arụ na mahadum Oxford.
Agbanyeghi nkwekọrịta ndị a, amabeghi ma ọgwụ ndị a a ga-arụ ọrụ.
Mana, ọ bụ ọgwụ mgbochi ka a na-eche ga-enye ụwa aka laghachi etu ọ nọ bụ mbụ.
A na-eme nyocha aghara aghara.
Ọ bụ na mbido afọ a ka ụwa matara maka coronavirus mana nyocha ọgwụ mgbochi ruru 20 na-aga n'ihu ugbua.
O nwere ndị ahụrụ na ha na-enye ahụ aka mepụte ihe o ji ebuso ọrịa agha Bekee na-akpọ "immune respone" mana onwebeghi nke na-egbochi ibute ọrịa a.

Ebe foto si, EPA
Ndị isi ala mba EU enwebwghi mkpebi ọbụla gbasara ego ole a ga-ewepụta gbasara enyemaka coronavirus na mpaghara ahụ.
Ha anọọla nzụkọ a pụrụiche ihe ruru abalị ano mana rue ugbua, mba dị icheiche ekwetabeghi n'ego ole a ga-ekewapụta maka nke a.
Nchọpụta na-ekwu na ụfọdụ mba chọrọ ka enye ndị mmadụ na ndị ụlọahịa ego a na-efu ebe ndị ozọ na-achọ ka enye ya ndi mmadụ dịka ego mbite a ga-akwụghachi n'ọdịnịhụ.
Akụkọ pụtara na-ekwu na onyeisiala mba Fransị bụ Emmanuel Macron tiri aka n'elu tebulu ma kwuo na ọ ga-agbahapụ nzụkọ ahụ dịka iwe malitere ịgba ọtụtụ mmadụ na mkparịtaụka ahụ.
Ọnụogụgụ ngalaba NCDC wepụtara na-egosi na ihe karịrị mmadụ puku iri na ise enwerela onwe ha n'aka covid-19.
O gosikwara na Edo steeti agafeela Legọs steeti dịka steeti kachasị nwe ọnụọgụgụ ndị butere ọrịa a n'ime otu ụbọchị.
N'aka nke ọzọ, mmadụ narị asaa ba iri asatọ na itoolu anwụọla maka ọrịa a.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Unu asaala chi?
Sonye anyị maka akụkọ ndị dị mkpa na-apụta maka coronavirus taa niile.
Ụmụ Igbo, ka anyị wụsa ọwa ebe a taa.
Rahụnụ ọfụma.

Ebe foto si, Twitter/Geoffery Onyeama
Mịnịsta na-ahụ maka mmekọrịta Naịjirịa na mba ndị ọzọ bụ Geoffrey Onyeama ebutela ọrịa Coronavirus.
Onyeama kwupụtara nke a n'akara Twitter ya n'ehihie Sọnde.
O kwuru na nke a bụ nke ugboro anọ ọ na-eme nnyocha maka ọrịa Covid-19, mana nchọpụta nke ikpeazụ a gosiri na o butela ya bụ ọrịa.
Onyeama kwuru na ya ga-ewepu onwe ya iche dịka iwu si kwuo ruo mgbe ọ gbakere
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post

Ebe foto si, Reuters
Boris Johnson bụ praịm mịnịsta mba Briten sị na ọ chọghị ịgbachi mba Briten ọzọ n'ihi mbawanye ọrịa coronavirus.
Mgbe ọ na-agwa ndị ntaakụkọ The Sunday Telegraph okwu, Johnson sị na ọnọ ịgbachi obodo dịka ebe a gbara ogbunigwe nuklịa, na ọ chọghị ka ha laghachị n'ọnọdụ ọzọ.
Mana onyeisi ndụmọdụ maka sayensị na UK sị na ọnọdụ ịgbachi obodo nwereike ịdị mkpa dịka ha na-achọ ịba n'oge oyi.
Nke a na-abịa dịka e nyela ndị ọchịchị ọdịnala obere ikike ịgbachi obodo, ha nwereike ịgbachi ụlọ azụmaahịa, emume, nakwa ebe oriri na nkwari.

Ebe foto si, Getty Images
Otu World Health Organisation sị na mmadụ ọhụrụ butere coronavirus n'ụwa ji ihe ruru puku narị abụọ na iri isii rigoro elu n'ime otu ụbọchị.
Nke a bụ ọnụọgụgụ kachasị adị elu n'ime otu ụbọchị n'ụwa niile kamgbe ọrịa a malitere n'ụwa.
WHO sị na mba ndị ọkachasị adị elu gụnyere Amerịka, Brazil, India na Saụt Afrịka.
Ndị nwụrụla n'ọrịa coronavirus n'ụwa ji ọnụọgụgụ puku asaa, narị atọ na iri isii gbagoo elu n'otu ụbọchị bụ kwa nke kachasị kamgbe Mee 10.
Ọnụọgụgụ ndị buterela ọrịa a n'ụwa n'ụbọchị Satọde akarịala nde iri na anọ, ebe ihe karịrị puku narị isii anwụọla.

Ụlọọrụ na-ebuagha megide mfesasị ọrịa na Naịjirịa bụ NCDC n'ịchafụ sị ha chọpụtara ọrịa coronavirus n'ahụ mmadụ narị isii, iri ise na atọ na Naịjirịa n'ụbọchị Satọde.
Mmadụ iri asatọ si n'Enugwu Steetị, iri na itoolu si n'Abia, iri na isii si n'Imo ebe itoolu si n'Ebonyi Steetị.
Ọnụọgụgụ ndị buterela ya ugbua dị puku iri atọ na isii, otu narị na asaa, ndị gbakerela dị puku iri na anọ, narị itoolu na iri atọ na asatọ ebe ndị nwụrụla dị narị asaa na iri asaa na asatọ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Anyị ji obi ọma anabata unu n'isi ụtụtụ taa.
Biko soro anyị dịka anyị na-ewetere unu akụkọ gbasara ọrịa coronavirus.
Aka na-achị Kaduna steeti bụ Nasir el-Rufai ekwuola na ndi ọrụ gọọmentị na steeti ahụ ga-alaghachi ọrụ ụbọchị Monde bụ nke 20 n'ọnwa Jụlai.
El-Rufai si na ndị ọrụ ga-esoro usoro gọọmentị hibere maka igbochi mfesa coronavirus.
Ọ sị na ndị ogogo ha ruru 14 gbagoo ga-arụ ọrụ Monde, Wenesde na Fraịde, ebe ndị nọ n'ogogo asaa ruo 13 ga-arụ ọrụ Tuzde na Tụzde site elekere itoolu nke ụtụtụ ruo elekere atọ nke ehihe.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post

Ebe foto si, EPA
Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump aṅụọla iyi na ọ ga-agaghị amagide ndị mba ya n’ike ka kpuchiwe ihu maka mfesasị ọrịa coronavirus.
Okwu ya na-abịa dịka onye ọkachamara na nyocha ọrịa na-efe efe n’Amerịka bụ dọkịta Anthony Fauci sị na ikpuchi ihu dị oke mgbe, ka onye ọbụla malite ikpuchi ihu.
Ugbua ikpuchi n'Amerịka abụrụla ihe e ji eme ndọrọ ndọrọ ọchịchị.
Ọtụtụ ndị gọvanọ steetị dị iche iche emeela ka ọ bụrụ iwu na onye ọbụla na-ekpuchi ihu ya ma ha pụta n'ezi. Ha gụnyere gọvanọ Kay Ivey nke Alabama.
Mana Onyeisiala Trump mgbe ọ na-agwa ndị ntaakụkọ Fox okwu sị na o kwenyeghi ime ka ikpuchi ihu bụrụ iwu n'Amerịka, sị ndị mmadụ kwesịrị inwere onwe n'ụfọdụ ihe.
Na mbido izuụka a, ụlọọrụ na-ahụ maka mgbochi ọrịa n'Amerịka bụ Centers for Disease Control and Prevention wepụtara ozi sị ka ndị mmadụ bido ikpuchi ihu.
Ha sị na mkpuchi ihu nke e ji akwa mee bụ nke kachasị akpa ike n'igbochi mfesa coronavirus.
Ngalaba na-ahụ maka mgbochi ọrịa bụ NCDC ekwuola na nyocha gosiri na-enwere mmadụ 600 ọhụrụ bu ọrịa coronavirus na mba ahụ.
Ha sị na ọnụ ọgụgụ ọhụrụ a mere ya mmadụ 35454 ọrịa ahu fesarala na Naịjirịa.
N'ime ndị a, mmadụ 14633 agbakeela ebe mmadụ 772 nwụrụ site n'ọrịa ahụ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Ngwa, sonyere anyị na njem nke taa.

Ebe foto si, Getty Images
Ndị uweojii Anambra steeti ekwuola na otu nwoke amabeghị aha ya nwụrụ n’ụzọ awara awara, na Mega filling station dị n’ime Ọnịcha, Anambra steeti.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Steeti ahụ bụ Haruna Mohammed kwuru na onye ọkwọụgbọla awara awara kuturu ya bụ nwoke gbapụọsọ n’abalịụnyaahụ.
Ndị uweojii Ọka Division sị na ha bugere ya bụ nwaamadịụlọọgwụ Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu Teaching hospital dị n’Amaku Awka ebe ndị dọkịnta sị na ọ lawala mmụọ.
Ha dowere ozu ya n’ụlọọgwụ ebe ahụ.
Ha sị na ha enwebeghị ike ịchọpụta ndị wee ya bụ ozu ruo ugbua ma na-akpokukwa ndị onye nke ha na-efufu efu, yiri onye a akọwara ka ha bịa n’ụlọọrụ ndị uweojii nke Division B nke Awka maka iburu ya.
Ya bụ nwaamadị yi uwe aka ogologo na ebe ogologo ọkpa jins gbe ya bụ ihe mere.