Gov Dave Umahi agbakeela ka ọ rịachara coronavirus

Ebe foto si, Gọọmentị Ebonyi
Aka na-achị Ebonyi bụ Dave Umahi esorola na ndị meriri ọrịa coronavirus dika o mere nnyocha chọpụta na nje ọrịa ahụ adịghịzị ha n'ahụ.
Gọvanọ Umahi rịara coronavirus ruo otu ọnwa.
N'akwụkwọ Uchenna Orji bụ mgbasaozi kọmịshọna na-ahụ maka mgbasaozi na steeti ahụ nyere ndị ntaakụkọ, ọ sị "Govanọ Dave Umahi emeela nyocha chọpụta na onweghịzị coronavirus."
Gọvanọ Umahi kwukwara na ada ya nwaanyi nakwa ndị ọru ya atọ sokwa gbakee."
Akwụkwọ ahụ sị, "Govanọ Umahi na-ekele Chukwu nke ukwu maka ọgwụgwọ ma na-ekelekwa ndị Ebonyi na Naịjirịa maka ekpere na nkwado ha."









