Ndịagha Naịjirịa ruru 26 ebutela ọrịa coronavirus

Ndịagha Naịjirịa ekwupụtala na mmadụ iri abụọ na isii ebutela nje covid-19 n’ime mmadụ narị anọ na iri na asaa ha mere nnyocha.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Airpeace achụọla ndị ofeụgbọelu mmadụ 70 n'ọrụ

    Ụgbọelu Airpeace

    Ebe foto si, Ụgbọelu Airpeace

    Ụgbọelu 'Airpeace' achụọla o pekata mpe ndị ofeụgbọelu mmadụ iri asaa dịka ụlọọrụ ahụ na-ahazigharị onwe ha n'ihi njọọ ụbọchị nke ọrịa coronavirus butere.

    Ụlọọrụ kwuru na ihe chere ha n'ihu bụ ọchụchụ maọbụ igbubi ụgwọọnwa maọbụ akwụghị ụgwọọnwa na igbo mkpa ego dịrị ha mana ha hara ịchụ ụfọdụ n'ọrụ.

    Ozi si n'aka ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ ụgbọleu ahụ bụ Stanley Olisa, kwuru na ha hazighariburu ụgwọọnwa ndị ụlọọrụ aụ site n'iji ihe bido na pasent 0-40 were gbubie ihe onye na-anata dịka ụgwọọnwa onye habu.

    Cheta na izuụka ole na ole gara aga, onye nwe ụlọọrụ ahụ bụ Allen Onyema bekuru gọọmenti ka ọ gbatara ndị ụlọrụ ụgbọelu ọsọ enyemaka iji nyere ha aka zụọ ha ndụ dịka ha esoghị nweta elele n' akatamkpo ego dị ijeri dọla isii ($6bn) ego gọọmenti mapụtara maka ọrịa COVID-19.

  2. Mba Philipine emechiela ngagharị ọzọ maka Covid-19

    Ndị mmadụ agaghị apụta ezi maọbụ naanị ịzụta nri na ihe ndị ọzọ dị mkpa

    Ebe foto si, EUROPEAN PHOTOPRESS AGENCY

    Mba Phillipine etinyela mmachị obodo metụtara mmadụ nde kwuru nde n’isi obodo ha bụ Manila maka covid-19.

    Nke a na-abịa dịka ndị dọkịta obodo ahụ na-adọ aka na ntị na ọrịa coronavirus a fesaa ụgboro abụọ, na ọ ga-etipia ngalaba ahụike niile dị n’ala ahụ.

    Mmachi a pụtara na onye ọbụla ga-alọghachị n'ịnọ n'ụlọ ewepu ndị chọrọ ịzụ nri ndị dị mkpa, ụgbọala ọha agaghị na-agbazi, ebe njem ụgbọelu akwụsịla.

    Ndị ọrụ ahụike kwenyere na mmachi nke abụọ a ga-enyere ha aka igbo nsogbu mbuli n'ọnụọgụgụ a.

  3. Ọnụọgụgụ ndị butere coronavirus na Naịjirịa kwa ụbọchị na-adazi ala

    Ozi si n'aka ụlọọrụ na-ahụ maka mgbochi ọrịa bụ NCDC n'ịchafu na-egosi na mmadụ narị abụọ, iri asatọ na asatọ ọhụrụ butere coronavirus na Naịjirịa n'ụbọchị Mọnde.

    Nke a mere ọnụọgụgụ ndị buterela ọrịa a ji dị puku iri anọ na anọ, otu narị na iri abụọ na itoolu, nke mmadụ iri abụọ na ise si Enugwu Steetị ebe mmadụ iri abụọ si Abia Steetị.

    Mmadụ puku iri abụọ, narị isii na iri isii na atọ agbakeela ebe mmadụ narị asatọ iri itoolu na isii anwụọla n'ọrịa coronavirus.

    N'ime ụbọchị ole na ole ugbua, ọnụọgụgụ ndị butere ọrịa a na Naịjirịa kwa ụbọchị na ha agbatu ala mana amabeghi ma ọ pụtara na Naịjirịa na-emeri ya bụ ọrịa maọbụ na ngwa e ji eme nyocha ọ kọrọ akọ.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  4. Úbọchị ọma ndị Igbo e ji eme ọnụ

    A sị na mgbe onye tetere bụ ụtụtụ ya, ya mere anyị ji anabata unu n'ụtụtụ taa.

    Nọnyere anyị maka akụkọ ndị gbapụtara ihe maka coronavirus.

  5. Ka chi bọọ!

    I mere nke ọma wee nọnyere anyị taa.

    Echi ga-ewetere anyị ihu ọma na ihe ọma.

    Udo!

  6. Inye nwa ọhụrụ ara ka mma nye nne na nwa ahụ n'oge Covid-19 a - Unicef

    Onye na-enye nwa ara

    Ebe foto si, Science Photo Library

    Ngalaba mbaụwa na-ahụ maka ọdịmma ụmụaka bụ United Nations International Children's Emergency Fund (UNICEF), ekwuola na ọ ka mma inye nwa a mụrụ ọhụrụ ara ọkachasị n'oge a ọrịa Covid-19 na-akpa mkpamkpa.

    UNICEF kwuru nke a were sị na ọ dị mkpa ka Naijirịa soro mba ụwa niile kwado inye ụmụ amụru ọhụrụ ara dịka uwa niile na-eme emume ịkwado inye ụmụ ọhụrụ ara.

    Mmiri ara na-enyere ụmụ amụrụ ọhụru aka dịka ọ nwere ihe ndị na-eme ka ahụ sie ụmụaka ike ma gbochie ha ibute ọrịa.

    Dịka a ka na-eme nyocha ma ọrịa coronavirus ọ na-esi na mmiri ara efe, ihe ahụtarala bụ na enweghị ihe na-egosi na o nwereike isite n'ara fee nwa ọhụrụ.

    Dịka onyeisi UNICEF Naijirịa bụ Peter Hawkins siri kwụo "Dịka a na-aluso ọrịa coronavirus ọgụ, mmiri ara ka bụkwa nri kachasị mma maka ụmụ amụru ọhụrụ".

  7. Onyeisiala Buhari enyela Sao Tome and Principe enyemaka Covid-19 ruru nde N67

    Muhammadu Buahri

    Ebe foto si, NGR Presidency

    Onyeisiala Naijirịa bụ Muhammadu Buahri enyela mba Sao Tome and Principe akụrụngwa na uwe nchekwa covid-19 nke ruru nde naịra iri isii na asaa.

    Ọ bụ onyeisi ngalaba ehiwere maka ọrịa coronavirus bụ Boss Mustapha kwuputara nke a na nzụko ya na ndị ntaakụkọ nwere n'Abuja.

    O kwuru sị "obi m juputara n'ọṅụ dịka otu mba nọ na ngalaba ECOWAS na-agba mbọ imeri coronavirus, onyeisiala Naijirịa bụ Muhammadu Buhari nyere mba Sao Tome and Principe akụrụngwa na ọgwụ ruru nde Naira iri isii na asaa iji nyere aka maka Coronavirus.

    Nke a na-eme dịka ndị mba ahụ rịọrọ maka ọsọ enyemaka iji luso coronavirus ọgụ.

    Akụrụngwa ndị a gụnyere ihe eji eme nyocha, ihe eji ele ekpemọkụ ahụ, uwe nchekwa na akụrịụngwa ndị ọzọ.

  8. Ụlọakwụkwọ gọọmentị etiti 104 adịla njikere imepe echi - Minista agụmakwụkwọ

    Chukwuemeka Nwajiuba

    Ebe foto si, NCDC

    Maazị Chukwuemeka Nwajiuba bụ minista agụmakwụkwọ nke steeti, ekwuola na ụlọakwụkwọ gọọmentị etiti 104 dị na Naịjirịa adịla njikere imepe bido echi bụ ụbọchị anọ nke ọnwa Ọgọst.

    Nwajiuba kwuputere nke a dịka o kwukwara ọzọ na ọ bụ naanị ndị nọ na klaasị ọpụpụ bụ Jss3 na SS3, ga-ebido ya bụ akwụkwọ.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  9. Ọtụtụ ndị so ụgbọ mmiri ebutela Covid-19 na mba Norway

    Ụgbọ mmiri njem nlegharị anya

    Ebe foto si, EPA

    Ihe dịka mmadụ iri anọ ebutela ọrịa coronavirus dịka ha soro ụgbọ mmiri eji eme njem nke si mba Nọrway.

    Igwe mmadụ ndị ọzọ so ya bụ ụgbọ mmiri aha ya bụ MS Roald Amundsen nọ na ndopụ maka ọrịa coronavirus.

    Ndị ụlọọrụ nwe ya bụ ụgbo mmiri aha ha bụ Hurtigruten ekwuola na ihe kacha ha mkpa ugbu a bụ ka ha lekọta ndị ọrụ ha na ndị ha bu n'ụgbọ mmiri ha.

    Ọnụ ọgụgu gosiri na mmadụ 32 n'ime ndị ọrụ 158 so ya bụ ụgbọ mmiri ebutela coronavirus.

    kama ha na-achọ mmadụ 180 ọzọ sị ya bụ ụgbo mmiri were pụọ.

  10. Mmadu 20,000 anwụọla maka Coronovavirus n'Afịrịka

    Coronavirus

    Ebe foto si, getty

    Ngalaba African Union’s Centre for Disease Control and Prevention (Africa CDC) ekwuputela na mmadụ ruru puku iri na itoolu anwụọla maka Covid-19 n'Afịrịka niile ebe mmadụ nọ otu nde nso ebutela ya bụ ọrịa.

    Naanị mmadụ puku narị isii gbakerela n'ọrịa a, dịka ha si depụta.

  11. Minista atọ na mba Gambia ebutela ọrịa Covid-19

    Gọọmenti mba Gambia ekjwuola na minista atọ na mba ahụ ebutela ọrịa coronavirus dịka abalị ole na ole gachara kemgbe osote onyeisiala ha bụ Isatou Toura butere ya bụ ọrịa.

    Minista ndị ahụ gụnyere:

    Mmabureh Njie na-ahụ maka ego

    Fafa Sanyang na-ahụ maka Ọkụ na mmanụ agbịdị

    Amie Fabureh na-ahụ maka ọrụ ugbo.

    Dịka ọ dị ugbua mmadụ narị anọ na iri itoolu na asatọ ebutela ọrịa ahụ na mba Gambia.

  12. Mmadụ iri atọ na otu ọhụrụ butere coronavirus n'Abia Steetị

    Ụlọọrụ na-ahụ maka mgbochi ọrịa bụ Nigerian Centre for Disease Control (NCDC) sị na ha chọpụtara mmadụ narị atọ na anọ ọhụrụ bu coronavirus na Naịjirịa n'ụbọchị Sọnde.

    Abia Steetị ketere mmadụ iri atọ na otu nke mere ọnụọgụgụ ndị buterela ọrịa a na steetị ahụ ji dịrị narị ise, iri asatọ na abụọ.

    Ebonyi Steetị nwetere mmadụ iri na abụọ nke mere ọnụọgụgụ ha ji dịrị narị asatọ na asatọ.

    Nke a mere ọnụọgụgụ ndị bu ọrịa a ji dị puku iri anọ na atọ, narị asatọ na iri anọ na otu.

    N'ime ndị a mmadụ iri abụọ, narị atọ na asatọ agbakeela ebe mmadụ narị asatọ na iri asatọ na asatọ anwụọla site n'ọrịa a.

    Nke a na-abịa dịka ụlọakwụkwọ ga-emepu n'izuụka a maka ndị nọ na klaasị ule dịka Praịmarị 6, JSS 3 na SS 3.

    Ebe gọọmentị Legọs enyela iwu ka ụlọ okpukperechi mepee n'ụbọchị asaa nke ọnwa Ọgọstụ.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  13. Igbo ndị ọma ndewo nu oooo

    Ọ bụ obi ọma ka anyị ji asị unu nọọ n'ụbọchị taa.

    Biko gbalịa sonyere anyị maka akụkọ ndị hiri odo gbasara coronavirus.

  14. Iwu 8 ndị ụlọụka na ụlọ oriri ga-edoweriri ma ha mepee

    BABAJIDE SANWO-OLU

    Ebe foto si, TWITTER/BABAJIDE SANWO-OLU

    Gọvanọ Legọs steeti bụ Babajide Sanwo-Olu adọọla aka na nti nye ndị isi ụlọekpere nakwa ụlọ oriri dị iche iche gbasara iwu ndị ha ga-edoweriri tụmadị ugbua e kwuru na ha ga-emepenwu.

    Sanwo-Olu kwuru na ebe ọgbakọ ndị a ga-anatarịrị Lagos State Sport Commission (LSSC) akwụkwọ ikike tupu ha e mepee ụzọ n'ụbọchị asaa nke ọnwa Ọgọstụ.

    Ngalaba na-ahụ maka mgbochi ọrịa na Naịjirịa bụ Nigeria Centre For Disease Control (NCDC), wepụtaburu usoro a ga-eji na-aka ụka n'oge covid a:

    • Ndị na-abịa n'ụlọekpere nakwa onyeisi ụlọekpere ga-eyiriri mkpuchi imi
    • Ndị ahụ adịghị agaghị aganwu ụlọekpere ugbua, a ga-eji igwe nnyocha ka ahụ mmadụ si dị ọkụ nyochaa ya tupu ọ banye ụlọụka
    • A ga-enweriri ihe e ji akwọ aka nakwa 'sanitiser' n'ụzọ ebe e si aba n'ụlọụka maọbụ ụlọoriri.
    • Ndị nọ n'ụlọụka kwa oge agaghị akarị iri ise
    • A ga-enwe eserese gosiri nnọpụ mmadụ na ibe ya ruo mita abụọ
    • Agaghị enwe mmekọrịta ahụ ọbụla n'etiti ndị biara ịka ụka maọbụnagodi nkwekọrịta aka.
    • Agaghị eme Ihe ọbụla ga-eme ka ndị mmadụ metụta otu ihe aka
    • A ga-eji kemịkalụ na-egbu nje hichaa ụlọụka tupu nakwa mgbe a kachara ụka

    Sanwo-Olu kwuru na ndị ụlọ oriri ga-edowe iwu ndị a:

    • A ga-edowe ohere ọfụma ma a na-ekenye ndị mmadụ nri nakwa ka a ghara inwe ọtụtụ mmadụ gbakọrọ otu ebe
    • A ga-enwe ebe ndị mmadụ ga-akwọ aka ha tupu ha abata igoro nri
    • Ndị mmadị ga-eji tishu kpuchie imi na ọnụ ha ma ha na-akwa ụkwara
    • A gaghị akarị mmadụ iri ise (50) n'ụlọ oriri ọbụla kwa oge.
  15. Ihe karịrị mmadụ 500,000 ebutela coronavirus na Saụt Afrịka

    Ndị mba Saụt Afrịka

    Ebe foto si, EPA

    Nkọwa foto, Mba Saụt Afrịka ka ọrịa coronavirus kacha enye nsogbu na mpaghara Afrịka

    Ọnụọgụgụ ndị buterela ọrịa coronavirus na mba Saụt Afrịka agafeela puku narị ise dịka minista ahụike mba ahụ bụ Zwelini Mkhize si kwuo.

    Mkhize kwuru sị na ha chọtara ọrịa a n'ahụ mmadụ 10,107 naanị n'ụbọchị Satọde, nke mere ka ọ bụrụ mmadụ 503,290 buterela ya na mba ahụ.

    Ka ọ dị ugbua, ọrịa a egbuola ihe karịrị mmadụ puku asatọ (8,153) na mba ahụ (n'agbanyeghi na ndị nnyocha na-ekwu na ọ dị ka ọrịa a egbuola ihe karịrị etu a).

    Naanị mba Amerịka, Brazil, Rọshịa na India gafere ha n'ọnụọgụgụ ndị kacha buru ọrịa a na mbaụwa.

    Ndị ọrụ ahụike na mba Saụt Afrịka na-ekwu na ọria a ka na-efesa n'ike n'ike, ọkachasị n'isiobodo Pretoria.

    Obodo Gauteng bụ ebe ọrịa a kacha akpa mkpamkpa na mba ahụ, dịka a na-atụ anya na ọ ga-ewekwa ihe dịka otu ọnwa ọzọ tupu ọrịa a eruo ebe ọ ga-ejizi nwayọ na-adajụ.

    Nke a emeela mba Saụt Afrịka nọrọ n'ọnọdụ gbatagbata ruo ụbọchị 15 nke ọnwa Ọgọstụ.

    Ngalaba World Health Organization (WHO) adọọla aka na ntị na ihe na-eme mba Saụt Afịrịka ugbua nwereike imekwa na mba ndị ọzọ dị na mpaghara Afrịka.

  16. Ụlọụka ga-emepe n'Ọgọstụ 7- Gọọmenti Legọs

    Babajide Sanwo-olu

    Ebe foto si, Lagos State Governor

    Gọvanọ Legọs Babajide Sanwoolu ekwetela ka ụlọụka nke ndị okpukperechi nke Kraist nakwa alakụba mepegharịa site n'ụbọchị asaa nke Ọgọstụ mana naanị pasentị iri ise ga na-anọ ya n’otu oge.

    O kwuputere nke a n'ọgbakọ ebe ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu na Marina dị na Legọs.

    Cheta na gọọmenti mechiri ụlọ okpukperechi dị iche iche kamgbe Maachị maka igbochi mfesa ọrịa coronavirus.

    Ọgbakọ gọọmenti etiti hibere maka ibuso covid 19 agha kweteburu ka ụlọụka malite mana gọọmenti Legọs jụwara isi.

    Mana ugbua ụlọụka alakụba ga-emepe n'ụbọchị asaa nke Ọgọstụ ebe nke ndị otu Kraist ga-emepe n'ụbọchị itoolu nke Ọgọstụ.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  17. Igbo ndị ọma!, Ụnụ arahụkwara ọfụma?

    Lekwa ihe ndị na-akpọtụ maka coronavirus ugbua. Sonyere anyị ka ị mata nke ekwe na-akụ.

  18. Ka chi foonụ

  19. Ihe ị kwesiri ịma maka etu ọgwụ hydroxycholoquine si metụta covid-19 - Dkt Ije Akunyili

  20. Gọvanọ Kayode Fayemi sị na ya emeriela coronavirus dịka nnyocha gosiri na ọ dịghịzi ya n'ahụ

    Kayode Fayemi

    Ebe foto si, Kayode Fayemi/Facebook

    Aka na-achị Ekiti steeti bụ Kayode Fayemi ekwuola na nje ọrịa coornavirus adịghịzi ya n'ahụ.

    Nke a mere ka Fayemi nọchara abalị 11 n'ọnọdụ Bekee kpọrọ "isolation".

    Maazị Fayemi sị na ya dị njikere ịlaghachị ọrụ ya dịka gọvanọ Ekiti.

    Cheta na Fayemi kwuburu na ya butere coronavirus ma banye ịnọrọ onwe ya ruo oge nyocha gosiri na obughizi nje ahụ.

    O nyere osote ya bụ Otunba Bisi Egbeyemi ikike ịchị Ekiti ka ọ na-anata ọgwụgwọ.

    Fayemi sị na ya "na-ekele Chukwu maka ọgwụgwọ."