Ndịagha Naịjirịa ekwupụtala na mmadụ iri abụọ na isii ebutela nje covid-19 n’ime mmadụ narị anọ na iri na asaa ha mere nnyocha.
Mkpuchi Na Eme Ozugbo
Nke a bụ mbụ Onyeisiala Buhari na-eyi mkpuchi imi
Ebe foto si, Femi Adesina
Onyeisiala Muhammadu Buhari yi mkpuchi imi pụọ ezi n'ihe bụ mbụ a na-ahụ ya ka ọ na-ekpuchi imi ya kemgbe ọrịa coronavirus tiwapụtara na Naịjirịa.
Buhari kpuchiri imi ya dịka o si Naịjirịa fega mba Mali, maka nzukọ ya na ndị isi mba ndị nọ n'okpuru Economic Community of West African States (Ecowas) nwere maka ikpe udo n'ụbọchị 23 nke ọnwa Julaị.
NCDC agbapeela ụlọ nyocha ọhụrụ ise
Ngalaba nwe ọrụ ịgbochi ọrịa na-efe efe bụ NCDC n’ịchafụ
ekwuola na ha agbapeela ụlọ nyocha ise maka nyocha coronavirus.
Nke a ga-eme ya ụlọ nyocha iri ise na asatọ ehibere iji
nyocha ọrịa a na Naịjirịa niile.
Ebe e
hibere ụlọ nyocha ndị a bụ:
•Edo
Specialist Hospital dị na Benin
•ATBU
teaching hospital dị na Bauchi
•Rivers
Indorama Company Molecular Lab
•State
specialist Hospital, Amachara, Abia steet
•University
of Abuja, Gwagwalada GX Lab
Ha kọwara na ha hibere nke a iji mezu nkwa ha kwere ị nyocha
mmadụ nde abụọ n’ime ọnwa atọ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
End of X post
Coronavirus egbuola mmadụ 572 n'otu ụbọchị na Saụt Afrịka
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
End of X post
Unu asaala chi?
Ebe a ka anyị ga-esi wetere unu akụkọ niile maka coronavirus taa.
Ndị ọrụ ahụike nọ n' isiobodo mba Madagascar adọọla aka na ntị na ụlọọgwụ akarịala ohere ha nwere dỊka ọnụọgụgụ ndỊ butere ỌrỊa ahụ na-arị elu na mba ahụ.
Otu onyeisi n'ụlọọgwỤ gọọmenti dị n' Antananarivo, kwuru na ha nwere mmadụ iri anọ na isiii bu ọrịa coronavirus, ebe naanị ọnọdụ anọ fọrọ n'ụlọọgwụ ahụ.
N'ụlọọgwụ ọzọ, onyeiei ha kwuru na ndỊ ha na-eleta akarịala.
Mịnịsta na-ahụ maka ahụike na mba ahụ edepụtala akwụkwọ ozi n'ọha na-arịọ ndị otu ọrụ ebere enyemaka akọrọngwa e ji alụ ọgụ coronavirus dịka igbe e ji eme nnyocha, akwa iyichi ahụ na injini e ji eku ume.
Ka ọ dị ugbua, Madagascar enweela mmadụ puku asaa na nari ise (7,500) butere ọrịa coronavirus nke ihe ruru pasent 80 bụ ndị a hụrụ nje n'ahụ ha n'ọnwa gara aga.
Mana onyeisiala mba ahụ bụ Andry Rajoelina ka na-esi ọnwụ na ala ha na-emeri n'ọgụ coronavirus dịka dịka ọ gara n'ihu na-agbasa ozi maka ọgwụ mgbọrọgwụ o kwuru e ji egbochi ọrịa coronavirus.
Gọvanọ Kayode Fayemi nke Ekiti ebutela coronavirus
Akụkọ na-apụta ugbua na-ekwu na onye na-achị Ekiti steeti ebutela ọrịa coronavirus.
O kwuputara nke a n'akara Twitter ma kwuo na ọ bụ nyocha ọrịa a nke atọ ya ka nke a bụ.
O nyefere ọchịchi n'aka osote ya ma kwuo na ọ ga-esi n'ụlọ na-arụ ọrụ ndị ọzọ dị mkpa
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
End of X post
Covid akarịala Madagascar kwuru na ha mepụtara ọgwụ ya?
Ebe foto si, AFP
Mba Madagascar ezipụla ozi gbata gbata nye ndị ngalaba ahụike di iche iche ka ha gbatara ha ọsọ enye maka makana ndị bu ọrịa covid na-abawanye ebe ahụ.
E nwetala akụkọ na ụlọọgwụ ndị dị na mba ahụ ejula na-anabata naanị ndị ọria a jisike na njọ.
Ka ọ dị ugbua mmadụ puku asaa ka achọpụtarala covid 19 n’ahụ ha na mba ahụ.
Cheta na onyeisiala Andry Rajoelina wepụtara ọgwụ igbo nwereike ịgwọ coronavirus, ma resi ya mba dị n’Afịrịka dị iche iche.
Mana ndị ọrụ ahụike nọ na mba dịka Naịjirịa na DR Congo kwuru na ọgwụ ahụ adịghị ire ka ha mechara nyocha ya.
Trump ekwetala na coronavirus na-akawanye njọ n'Amerịka
Ebe foto si, Getty Images
Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump agwaala ndị mba ya ha kpuchie ihu ha iji gosi na ha kwụsị ike na nkwado mba ahụ n'oge coronavirus a.
Ọ nabatakwara na ọrịa ahụ abụghị akụko ifo dịka ọnụọgụgụ ndị butere ya nakwa ndị nwụrụla site na ya na-arị elu dị egwu.
Trump eyighị nkpuchi imi mgbe ọ na-ekwu nke a n'ọgbakọ ebe o na-ekwupute maka ọrịa a kwa ụbọchị.
Okezie Ikpeazu ekeelela ndị kwadoro ya na ndị gwọrọ ya
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
End of X post
Aka na-achị Abia steeti bụ Okezie Ikpeazu ekeleela ndị niile kwadoro mgbe ọ na-agabịga ije ya n'aka ọrịa coronavirus.
O kwuru na obi dị ya mma maka etu ndị mmadụ si gbaa ya okirikiri n'ọnwụnwa a.
Ihe ndị a niile dị n'ihe onyonyo o wepụtara n'akara Twitter ya.
O jikwa ohere ahụ kelee ndị ọrụ ahụike ndị o kwuru 'na-echekwa anyị n'aka orịa a' ma gwakwa ndị mmadụ ha chekwaa onwe ha.
N'ime ọnụọgụgụ ndị a, mmadu iri abụọ na asatọ butere ya n'Enugwu, mmadụ iri abụọ na Ebonyi, mmadụ itoolu na Delta steeti nakwa mmadụ abụọ n'Imo steeti.
Cheta na ọ bụ n'ụbọchị iTuzde ka aka na-achị Abia steeti bụ Okezie Ikpeazu si n'ọrịa ahụ gbakee ma tụọ mmamma kelee Chineke maka nke a.
Dave Umahi nke Ebonyi steeti bụ Gọvanọ ọzọ butere ọrịa a n'ọwụwa anyanwụ ka na-anata ọgwụgwọ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
End of X post
Nnọọnụ na peeji anyị
Pasanụ apasa ebe a maka akụkọ dị ọkụ gbasara coronavirus.
Ndewo.
Ka chi foo nụ
Gọvanọ Okezie Ikpeazu nke Abia steeti agbakeela malite ọrụ
Ebe foto si, Onyebuchi Ememanka
Gọvanọ Okezie Ikpeazụ nke Abia Steetị amalitela ọrụ dịka ọ rịachara ma gbakee site n’ọrịa coronavirus
n’ihe karịrị otu ọnwa.
Ọ tukwara mmamma n'ụka taa ikele Chineke maka mgbake ọ gbakere.
N’ọnwa gara aga ka gọvanọ kwupụtara na o butere ọrịa coronavirus ma dopu onwe ya
iche maka ịnata ọgwụgwọ.
Tupu Ikpeazu a hapụ ụlọọrụ ya, o nyefere ọchịchị Abia Steetị n’aka osote ya bụ
Ude Oko Chukwu.
Ihe onyonyo mechara pụta na-efegharị na soshal midia ebe gọvanọ Ikpeazu na onye
dọkịta ya na-akụ tennis, iji gosi na ọ gbakeela.
Kọmishọna mgbasa ozi bụ John Okiyi sị na ọ gbakeela ma
dịkwa njikere ịrụ ọrụ iji gboo mkpa dị na Steetị.
Okiyi kwupụtakwara obi aṅụrị o nwere maka mgbake na
mmalite n’ọrụ gọvanọ Ikpeazu.
Gọọmentị etiti ewetakwuola mbata na ọpụpụ ụgbọelu njem ofesi aka ruo ọktoba abalị 5
Ebe foto si, NCAA
Ụlọọrụ Nigeria Civil Aviation Authority bụ NCAA n'aha ịchafụ ekwuola na ụgbụelụ njem mba ofesi agaghị abata maọbụ fepụ na Naịjirịa ruo abalị iri na ise nke ọnwa ọktoba afọ 2020.
N'akwụkwọ ha degaara ndị ọrụ ụgbọelu kpọrọ onwe ha NOTAM n'ịchafụ ha sị ụgbụelụ mba ofesi agaghịzị amalite n'ụbọchị iri na itoolu nke ọnwa ọgụst dịka e kwuru na mbụ.
Nke a pụtara na ọ bụ naanị ụgbọelu dị oke mkpa nakwa ndị nke bu ndị isiọrụ mba ọzọ ka ga na-abata ruo mgbe ahụ.
Dkt.
Jonathan Osuji bụ Kọmishọna ahụike na steeti ahụ gwara BBC Igbo na bido n’ụbọchị
20 nke ọnwa Julaị, ka ha malitere ịga n’ụlọ n’ụlọ maka ime nnyocha a.
Osuji
kwuru na ha bidoro n’Ụmụahịa Nọt, Ụmụahịa Saụt nakwa Isiala Ngwa Nọt, ma na-atụ
anya ịgazu steeti ahụ gburugburu n’ime otu ọnwa maọbụ gafee.
O kwuru
na ha na-atụ anya iji ụbọchị atọ eme nnyocha n’ime okpuruọchịchị atọ kwa mgbe,
tupu ha agafee okpuruọchịchị atọ ọzọ, ruo mgbe ha ga-agazu okpuruọchịchị 17 dị
na steeti ahụ.
Ebe foto si, Onyebuchi Ememanka
Ọ gwakwara BBC Igbo na ọtụtụ ndị mmadụ (gụnyere ndị ọrụ gbatagbata, na ndị ọrụ ahụike nke ime obodo) bịara sonye ha n’efu, iji nyere ha aka hụ na e mere nnyocha a ọfụma.
Maka ime ka nnyocha a rute mmadụ niile aka, Osuji kwuru sị “Ọ ga-agazu ndị o kwesịrị ịgazu, anyị na-atụ anya inyocha mmadụ 10,000 n’ime otu ọnwa. Anyị ka malitere amalite.”
“Ọ bụghị onye ọbụla ị hụrụ ị kpọrọ ya gaa nyochaa ya, n’ihi na ụfọdụ ihe ndị e ji eme nnyocha a dị oke ọnụ, ọ bụghịdị oge niile ka ngalaba NCDC na-enwe kemịkal ahụ e ji eme nnyocha a.
“Enweghikwanu mgbe ọ ga-abụ mmadụ niile ka aka anyị ga-eru.”
Maka ebe ha nwereike itinye ndị ha nwereike ịchọta ọrịa a n’ahụ ha, Osuji kwuru sị na ha nwere ebe ga-aba ndị mmadụ, ọkachasị ndị ọrịa coronavirus a jisi ike.
Mana o kwukwara na ha ga-ahụ na ụfọdụ ndị ọzọ e nwereike ịchọta ya n’ahụ ha ga-anọsapụ n’ụlọ ha.
Ebe foto si, Onyebuchi Ememanka
Coronavirus curfew: A daala senetọ nha maka ịgagharị n'oge mmachi abali
Ebe foto si, AFP
A daala Senetọ mba Kenya bụ Johnson
Sakaja nha ego ruru dọla $150 maọbụ mkpọrọ ọnwa atọ maka ịnọ n'iro oge mmachi ngagharị n'abali e tinyere iji belata nkesa coronavirus na mba ahụ.
A nwụchiri Sakaja n'ime abali Satọde ebe ọ nọ n'aṅụ mmanya n'ọdọmmanya ka ọ gafechara elekere Itoolu nke abalị bụ oge
mmachi ngagharị abalị ka dị ire.
Senetọ arịọla ndị Kenya mgbaghara ma tinye akwụkwọ arụkwaghịm
dịka otu onye n'ime otu mba ahụ hiwere maka agha megide nkesa coronavirus.
Ọnụọgụgụ ndị nwụrụ na coronavirus na Brazil akarịala 80,000
Ebe foto si, Getty Images
Ka ọdị n'abali iri abụọ na otu nke ọnwa Julai, afọ 2020, mba
Brazil enweela mmadụ puku iri asatọ, otu narị na abụọ(80,120) nwụrụ n'ọrịa
coronavirus, dịka mịnịstrị na-ahụ maka ahụike na mba si were kwuo.
Ọnụọgụgụ ndị nwụrụ na coronavirus na Brazil akarịala 80,000
Ndị ọrụ gọọmentị na-ekwu na oke ọnwụ
mmadụ nwere ike ibute ụkọ igbe ozu dịka ụbịam na emeghị nnyocha dịka o kwesiri
mere ọtụtụ ji anwụ n'ọrịa ọjọọ ahụ.
Brazil bụ mba nke abụọ ọrịa coronavirus kachasị gbuo mmadụ
nyụghụnyụ na mba ụwa, ebe mba America bụ ebe coronavirus kachasị gbuo mmadụ
nwere mmadụ 143,864 nwụrụla site n'ọrịa.
Ebe foto si, Getty Images
Mmadụ 2,121645 ebutela ọrịa coronavirus na mba Brazil,ebe mmadụ 1409,202
Na nsonso, Brazil nwere mmadụ otu puku nwụrụ n'otu ụbọchi site n'ọrịa coronavirus.
Onyeisiala Brazil bụ Jair Bolsonaro, onye buterela ọria coronavirus na-ekpu afọ ime aka dịka ọ na-agwa ndị gọvanọ ka emepe obodo, na-agbanyeghị aka na ntị nke ndị ọkachamara ahụike na-adọ.
E bugala minista mba Saụt Afrịka ụlọọgwụ maka coronavirus.
Ebe foto si, AFP
E bugala Gwede Mantashe bụ minista na-ahụ maka ihe akụ ọnatarachi na mba Saụt Afrịka ụlọọgwụ dịka a chọtachara ọrịa coronavirus n’ahụ ya.
Gọọmentị mba ahụ kwuputara nke a, dịka ha kwukwara na nwunye ya nọ na nnọsapụ n’ụlọ.
Ha kwukwara na “dọkịta ha dụrụ ọdụ sị ka e buga Mantashe ụlọogwụ ebe a ga-enwe ike ilekọta ya anya ọfụma.”
Mara na a chọtara ọrịa coronavirus n’ahụ ha n’ụbọchị Tuzde nke izuụka gara aga.
Marakwa naọ bụ Saụt Afrịka ka ndị mmadụ kacha nwee ọrịa coronavirus na mpaghara Afrịka, ma bụrụkwa ndị nke ise kacha n’ụwa.
Ihe ruru mmadụ 360,000 ebutela ya ebe ọ tarala isi ihe ruru mmadụ 5,000
Mmadụ 562 ọzọ ebutela ọrịa covid-19
Mmadụ iri anọ na asaa si Abịa steeti so n’ime mmadụ narị ise na iri isii na abụọ ọhụrụ ngalaba NCDC kwuru na ha chọtara ọrịa coronavirus n’ahụ ha.
Ha kwukwara na mmadụ narị abụọ na iri abụọ na asatọ ọzọ agbakekwuola ma laa be ha.
Dịka ọ dị ugbua ọnụọgụgụ ndị butere ọrịa a na Naịjirịa kemgbe amalitere ịme ngụkọ agafeela puku iri atọ na asaa.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.