Ndịagha Naịjirịa ruru 26 ebutela ọrịa coronavirus

Ndịagha Naịjirịa ekwupụtala na mmadụ iri abụọ na isii ebutela nje covid-19 n’ime mmadụ narị anọ na iri na asaa ha mere nnyocha.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Gọọmenti etiti enyela ntụzịaka ka ndị ọrụ oyibo welitere isi bido ọrụ taa

    Onyeisi ọrụ nke gọọmenti etiti bụ Folasade Yemi-Esan enyela ntụzịaka ka ndị ọrụ oyibo nọ n'ọkwa 'Grade level 14 gbagowe nakwa ndị ọrụ dị mkpa malite ọrụ taa bụ Tuzde, abali abụọ nke ọnwa Juun.

    O kwuru na ha ga na-arụ ọrụ site Monde rue Fraide bido na Elekere itoolu rue elekere abụọ.

    O dụrụ ọdụ ka ha gbaa mbọ gbasoo usoro nchekwa onwe dịka nnọpụ iche,(physical distancing), ịkwọ aka na iyi mgbuchi ihu.

    Cheta na o kwuburu na ụlọọrụ ga-emepe ụbọchị Monde, Wenezde na Fraide site n'elekere itoolu rue elekere gara n'ihu kwuo na ụlọọrụ.

    Folasade Yemi-Esan

    Ebe foto si, Bashir Ahmad/Twitter

  2. Gee akụkọ mgbede taa n'otu nkeji

  3. Ụgbọelu nwereike amalite ife n'ime Naịjirịa site 21 Juun

    Ụgbọelụ

    N'ozi nke ya, onye nchịkọta ọrụ ọtawaike COVID-19 na Naịjirịa bụ Sani Aliyu sị na ụgbọelu nwereike ibido ọrụ n'ime Naịjriịa malite n'ụbọchị iri abụọ na otu nke ọnwa Juun.

    Ọ gwara ndị ụlọọrụ ụgbọelu ha malite kwadowe usoro ha ga-eji malite ọrụ n'ụdị ga-enye aka ịgbochi mfesa nje coronavirus.

    Aliyu mekwere ka o doo anya na ya asịkwaghị na ndị ọrụ ga-amalite na Juun 21, kama na ya nwere olile anya na malite mgbe ahụ, na ọrụ ha nwereike ibido ma ọ bụrụ na ha kwadote.

    Ọ sị na nke a bụ ohere e nyere ha iji kwadoo ịme njem.

    Aliyu sị na ọ bụ mmalite ọrụ ụgbọelu ga-enye aka ịmepe ụzọ maka ịmekọrịta njem site na steeti ga na steeti ọzọ.

  4. Gọọmenti Naịjirịa enwetuwela aka na mmachi amachiri maka agha Coronavirus, Ụka na amalite

    Boss Mustapha

    Ebe foto si, Twitter/OfficialOSGFNG

    Gọmenti Naịjirịa ewepụla mmachị amachiri ọgbakọ ụka maka agha coronavirus.

    N'akwụkwọ ọ gụpụtara ndị ntaakụkọ ụbọchị Mọnde, Boss Mustapha bụ onyeisi ndị ọrụ ọtawaike covid-19 sị na ndị ụka na ndị Alakụba ga na esokwa usoro mgbochi onwe dịka gọmenti wepụtara.

    Mustapha kwuru na mkpebia sitere na nkwado onyeisiala Muhammadu Buhari site na ọgbakọ ha nwere ụbọchị ụka.

    O kwukwara na ntuziaka aga eji eme ụka ga-apụta mgbe ndị kọmitii a na ndị gọọmenti steeti ga-ezukọ.

    Mana ọ sị na onyeisiala kwukwere na gọọmenti ka tinyekwara mmachi n'ọgbakọ ọbụla karịrị mmadụ iri abụọ na abụghị n'ọrụ.

    Onyeisi ọrụ ọtawike a kwuru na ntuziaka a nille ha weputara bụ nke ga-edu Naịjirịa ruo izuụka anọ, malite na ụbọchị abụọ ruo n'ụbọchị iri abụọ na itoolu nke Juun 2020.

    Ya bụ kọmitii kwekọrịtara na ha gana eji sayensi na ọnụọgụ were na-achọpụta ka ya bụ nje si agbasa.

  5. Ndị butere coronavirus na Naijirịa na June 1 ruru 416

    Coronavirus

    Ebe foto si, Getty Images

    Ụlọ ọrụ Nigeria Centre For Disease Control depụtara n'akara twitter ha na ndị butere coronavirus n'ụbọchị mbụ nke June ruru narị anọ, iri na isii.

    Nke a mere ka ọnụ ọgụ ndị buterela ọrịa a kwụrụ na Puku iri, nareị ise, iri asaa na asatọ(10,578).

    Ndị gbakerelanụ agafeela puku atọ ebe ndị nwụrụlanụ ruru narị abụọ, iri itoolu na itoolu.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  6. Igbo ndịọma! Ụtụtụọma!

    Taa mara ụnụ ezigbo mma ooo!

    Akụkọ coronavirus na-emiwanye emi mana ọ bụrụ na i soro anyị ebe a, ị ga-amata nke ekwe na-akụ.

  7. ỤmụIgbo ka chi foo nụ

    Ka anyị wụsa ọwa ebe a taa. kama chebiri anyị n'ụtụtụ echi ka anyị malite njem akụkọ dịka o si amasi gị. ndewo.

  8. Ewepụla mmachị nnọkọ n'ụlọ ofufe

    Gọọmentị Naijirịa ekwuola na aga-ewepụ mmachi amachiri nnọkọ n'ụlọ ofufe bido n'ụbọchị abụo nke ọnwa Juun.

    Ọ bụ onyeisi ngalaba na-ahụ maka ọrịa coronavirus bụ Boss Mustapha kwuputara nke a.

    O kwuru na a ga-eme nke a site n'usoro ya bụ ngalaba ga-ewepụta.

    Kama ụlọ akwụkwọ, ebe oriri, ebe a na-emegharị ahụ na ebe a na-elepụ anya ka nọkwa na mmachị.

    Dịka ọ dị ugbua, ụlo ndịna ga-emepe kama ha ka eji usoro gọọmentị wepụtara.

    Nwanyị na-ekpe ekpere

    Ebe foto si, Getty Images

  9. Gee akụkọ mgbede taa n'otu nkeji

  10. Covid-19: Njem ụgbọelu n'ime Naịjirịa nwereike bido na Juun 21

    Ọnụ na-ekwuru onyeisiala Muhammadu Buhari na soshal midia bụ Bashir Ahmad ekwuola na nagalba na-ahụ maka ibuso coronavirus agha bụ nke akpọrọ Presidential Task Force si ka ngalaba na-ahu maka njem ụgbọelu na Naịjirịa malite ihazi etu njem ụgbọelu ga-amalite na mba ahụ n'ụbọchị iri abụọ na otu nke ọnwa Juun.

    Ọ sịkwa na ha ewetuola oge ha tinyere maka mmachị ngagharị n'abali.

    Maazị Ahmad sị na site eche bụ ụbọchị nke abuọ n'ọnwa Juun mmachị ngagharị n'abalị ga-esizi elekere iri na otu nke abalị ruo elekere anọ nke ụtụtụ.

    Mmachị a sibu elekere asatọ nke abalị ruo elekere isii nke ụtụtụ.

    Skip X post, 1
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 1

    Ihe ọzọ Maazị Ahmad kwuru bụ na ụlọ akwụkwọ ka ga-emechi mana njem ụgbọelu n'ime Naịjirịa nwereike malite n'ụbọchị 21 nke ọnwa Juun.

    Ọzọkwa bụ na mmachị njem site steeti gawa steeti ka ga-adị ruo oge gọọmentị sị ka ngagharị malite.

    Sọsọ ụgbọala bu nri na ihe ndị ọzọ dị oke mkpa nwereike mee njem site seeti gawa steeti ọzọ.

    Skip X post, 2
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 2

  11. Ihe mere gọvanọ Ikpeazu na ndị ọrụ ya ji dopu onwe ha iche

    Gọvanọ Okezie Ikpeazu na ndị ọrụ ya

    Ebe foto si, Facebook/Ememanka

    Nkọwa foto, Gọvanọ Okezie Ikpeazu na ndị ọrụ ya

    Akụkọ pụtara na-ekwu na gọvanọ Abia Steetị bụ gọvanọ Okezie Ikpeazụ na ndịisi ọchịchị ya ewezugala onwe ha iche maka coronavirus.

    Ọ bụ mgbe a chọpụtara na ezinaụlọ Solomon Ogunji bụbu kọmishịọna gburugburu ebe obibi nwụrụ anwụ butere ọrịa a.

    Nke a mere gọvanọ Ikpeazu site n'ọnụ kọmishọna mgbasaozi bụ John Okiyi ji sị ndị ọrụ ya ha na Ogunji nwere mmekọ gaa nyocha onwe ma wepụ onwe ha site n'ọha.

    Mana ozi gọọmentị wepụtara sị na Ogunji nwụrụ site n'ọbara mgbalielu n'ụbọchị 24 ọnwa Mee n'ụlọọgwụ Mahadum Abia Steetị dị n'Aba.

    Ndịisi ọchịchị Abia Steeti ole ka a sị nọpụiche?

    A mabeghi mmadụ ole n'ime ndịisi ọchịchị Abia steetị gọvanọ Ikpeazu gwara wezuga onwe ha.

    Mana Okiyi bụ kọmishọna mgbasaozi wepụtara sị na o nyela onwe ya maka nyocha ma wezugakwa onwe n'ọha.

    BBC Igbo gbara mbọ ị nụta n'ọnụ ya, etu ihe si kwụrụ, mana Okiyi azaghị ekwentị maọbụ ozi e zigaara ya.

    Kedụ etu ihe si kwụrụ n'Abia ugbua?

    Odeakwụkwọ mgbasaozi bụ Onyebuchi Ememanka sị na onweghi nsogbu ọbụla dị n'Abia Steetị.

    Ọ sị na ọrụ ga na-aga etu o si na aga na mbụ na-agbanyeghi na ozi si n'aka Okiyi pụta na ụfọdụ ndịisi ọrụ n'Abia wezugara onwe ha iche.

    Ọ gara n'ihu rụtụaka na mgbe gọvanọ Kaduna Steeti bụ Nasir El-Rufai na nke Oyo Steetị bụ Seyi Makinde mere nke ha, na o gbochighị ọchịchị ị ga n'ihu.

    Ememanka sị na ọ bụrụgodi na gọvanọ wezugara onwe ya iche, na ọ gaghị egbochi ya inye ntuziaka ọbụla.

    O kwuru na ụlọọrụ gọọmentị niile n'Abia Steeti mepechara emepe na ọrụ n'aga nke ọma.

    Ọ sị na nchịkọta ihe niile komishọna kwuru bụ ka onye ọbụla kee nkwụcha maka ọrịa coronavirus.

  12. Yahaya Bello akpọchiela obodo maka egwu coronavirus

    Yahaya Bello

    Ebe foto si, @GOVBELLO/TWITTER

    Gọvanọr Kogi steeti bụ Yahaya Bello akpọchiela ọkpuruọchịchị Kabba/Bunu kpamkpam maka na ahụrụ mmadụ abụọ bụ nje coronavirus ebe ahụ.

    Bello jidere obodo niile dị na ya bụ okpuruọchịchị ahụ kpochie makana, Wenezde izu ka NCDC kwuru na Imam ndị Kabba na nwa ya bu ya bụ nje bụ nke butere nghọtahie n'etiti steeti ahụ na ndị ụlọọrụ ahụ.

    Mana taa bụ Mọnde ka Gọvanọ ahụ sị na ihe mere ya jiri kpọ ya bụ okwu mkpa bụ na ọ banyela na ndọrọ ndọrọ.

    Ọ sị na malite n'ime abalị Tuzde, echi, na obodo niile dị na ya bụ okpuruochichi dị ahụ bi na ya ga-aba ụlọ ruo izuụka abụọ.Ọ sịkwa na ndị ọrụ ahụike ha ndị ahụ jekọtara ga-esokwa baa ụlọ.

    Yahaya Bello ka na-eso ọnwụ na ọnweghị onye bu nje coronavirus na steeti ahụ ruo mgbe NCDC huru mmadụ abụọ ahụ.Nke a bụ mbụ a na-ahụ ndị bu ya bụ nje na steeti ahụ.

  13. Ihe ndị mmadụ na-atụ anya onyeisiala Muhammadu Buharị nwereike ikwu taa

    Boss Mustapha

    Ebe foto si, Twitter/OfficialOSGFNG

    Otu kọmiti ọtawaike COVID-19 na onyeisiala Muhammed Buhari tinyere ọnụ n'usoro mnwetulata aka n'agha coronavirus na Naịjirịa n'ọgbakọ ha ụnyaahụ bụ ụka.

    Ndị kọmiti ahụ na-eche na oruola mgbe gọọmenti ga-aba n'agba nke abụọ na ya bụ agha.

    Onyeisi ya bụ kọmiti ọtawaike bụ Boos Mustapha sị na ya ebunyela onyeisiala Muhammadu Buhari uche maka otu ọnọdụ kwesiri idi gawazia n'ihu gbasara ya bụ agha.

    N'ọnụ ya, okwu gbasara agha a ga-adịwazị n'aka ndị steeti ugbua ebe ichikọta ihe dum ga-adịwazị n'aka gọọmenti etiti.

    Mustapha tụnyekwara azụ na ha kpakwara maka ịmepe ụlọụka na nke ndị Alakụba n'ọgbakọ ha.

    Ọ sị "ihe ndị a niile bụ ihe anyị na onyeisiala kpara, ọ bụ ya ka ọ dịzịara ịma nke a ga-eme".

    Ọ sị na ha kpakwara maka mmepe ụlọakwụkwọ, ụlọọrụ, ụlọahịa na ihe ndị ọzọ bụ nke Mustapha sị ha bunyechara ya uche ka ọ ga-esi dị na ihe ndị a.

  14. Ndị Gana ewetuwala aka na mmachi agha coronavirus

    Nana Dankwa Akufor-Addo nke Gana

    Ebe foto si, Getty Images

    N'Afrịka, Onyeisiala mba Ghana bụ Nana Akufor-Addo agụpụta usoro ha ga-esi welata aka na mmachi agha coronavirus ha malitere kemgbe ọnwa abụọ gara aga.

    Ọ sị na malite ụbọchị Fraịde, na ndị ụka na ndị Alakụba nweziri ike ịmalite ofufe, mana ọ gaghị akarị otu narị mmadụ otu mgbe n'ụka ha.Mmadụ puku asatọ bu ya b nje na Ghana ebe mmadụ iri atọ na isii nwugoro na ya.

  15. Ndị buterela coronavirus na Naijiria agafela 10,000

    NCDC

    Ebe foto si, NCDC Twitter

    Ọnụọgụ ndị nwere nje coronavirus na Naịjirịa agafeelanụ puku iri o.

    N'ọnụọgụ NCDC wepụtara n'abalị, mmadụ narị atọ na asaa ọhụrụ bụ ya bụ nje ebe Imo steeti nwere mmadụ atọ ọzọ n'ime ha.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  16. Ụtụtụ ọma Igbo ndị ọma!

    Ụbọchị taa mara onye ukwu nakwa onye nta mma.

    Daalụnụ, ngwa sonyere anyị ka anyị na-ewetara gị akụkọ dị ọkụ gbasara ọrịa coronavirus.

    Chetakwa na-akwọchasị aka gị ọfụma. Coronavirus ka nọkwa n'obodo.

  17. Ka chi foonụ. Ka ọ dị echi

  18. Okezie Ikpeazu agwala ndị ọrụ ya gaa nnyocha Coronavirus

    Okezie Ikpeazu

    Ebe foto si, Abia state Press

    Site na nnyocha emere ezinaụlọ kọmishọna na-ahụ maka ugburu nke Abia steeti bụ Solomon Ogunji, onye nwụrụ n'izu gara aga, Gọvanọ steeti ahụ agwala ndị ọrụ ya niile ha na ya jekọrịtara ha gakwa nnyocha coronavirus nke ha o ma nọpụ anọpụ. Okezie Ikpeazu sị na ya na onwe ya ga-emekwu nnyocha ma zokwa onwe ya ruo izuụka abụọ ka amara nke a na-arịa arịa.

  19. Coronavirus egbuola onye mbụ ya na mba Rwanda

    Minista na-ahụ maka ahụike na mba Rwanda ekwuola maka ọnwụ mbụ ha dekọrọ na mba ahụ site n'ọrịa Coronavirus.

    O kwuru na nwoke ahụ dị afọ 65 bụ ọkwọ ụgbọala si mba ọzọ bata.

    Nwoke ahụ nwụrụ dịka o bidoro ị ta-ahụhụ nkurume n'ụlọọgwụ pụrụiche ebe a na-agwọ ya.

    Mmadụ 359 bụ ọnọgụgụ ndị niile bu ọrịa covid-19 na mba ahụ.