Ndịagha Naịjirịa ruru 26 ebutela ọrịa coronavirus

Ndịagha Naịjirịa ekwupụtala na mmadụ iri abụọ na isii ebutela nje covid-19 n’ime mmadụ narị anọ na iri na asaa ha mere nnyocha.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Ụlọikpe dị n'Abuja adaala Naira Marley nha N200,000

    Naira Marley

    Ebe foto si, Naira Marley Instagram

    Dịka a kpọpụrụ otiegwu a ma dịka Naira Marley ụlọikpe maka ida iwu covid-19, a daala ya nha ruru puku narị naịra abụọ (N200,000).

    Ụlọikpe ahụ dị n'Abuja kpebiri na Marley onye ezigbo aha ya bụ Afeez Fashola, dara iwu oge o si Legọs fee n'ụgbọelu gaa Jabi Lake Mall dị n'Abuja ime emume n'ụbọchị 13 nke ọnwa Juun, n'agbanyeghi na gọọmentị tinyere iwu mmachi ime njem.

    Ụlọikpe kwukwara na ọ ga-edepụta ozi ịrịọ mgbaghara n'elu otu akwụkwọ ozi ndị ntaakụkọ ama ama.

    Nke a na-abịa dịka ụlọikpe dị na Legos dakwara ya na onye nhazi ya nha ịkwụ otu puku narị naịra (N100,000) maka ịda otu iwu a.

    Cheta na Naira Marley ji ụgbọelu e mechara chọpụta na ọ bụ otu ọkaikpe ka a haziri ya, mee ya bụ njem.

  2. Ekpere Alakụba na-amalite taa n'uju ya n'ụlọekpere ha na Legọs

    Ụlọekpere Alakụba

    Ebe foto si, Reuters

    Taa bụ Fraịde ka ụlọekpere ndị Alakụba na Legọs na-amalịta n'uju ya kemgbe ọnwa Maachị emechichere ya.

    Ndị ụka Kristi ga-emeghe ụbọchị ụka na-abịanụ.

    Mana gọọmenti na-adọ aka na ntị ka ụlọekpere niile ghara ijufe ọkara.

    Ọ bụ nje coronavirus mere gọọmenti jiri mechie ụlọekpere niile na Maachị.

    Gọvanọ Legọs steeti bụ Babajide Sanwo-Olu sị na mmepe ụlọekpere gosiri na gọọmentị na-anwa oke ha n'agha coronavirus.

  3. Mmadụ karịrị otu nde ebutela coronavirus n'Afrịka

    Coronavirus n'Afrịka

    Ebe foto si, Reuters

    N'Afrịka, nke anyị na-anụ n'ụtụtụ a bụ na ọnụọgụ ndị bu nje coronavirus n'Afrịka akarịala otu nde ebe ọkara n'ime ha si na mba Saụt Afrịka dịka mahadum Johns Hopkins (JHU) sịrị dee.

    Mana n'ezie, JHU kwukwara na ọbụghị Afrịka ka ya bụ ọrịa ka njọ, agbanyeghị na nlele maka nje a na-alaazụ n'Afrịka.

    Onye nchịkọta ụlọọrụ na-ahụ maka mfesa nje a n'Afrịka bụ John Nkengasong gwara BBC na ihe karịri pasentị iri asaa agbakeelarị.

    Ha chọpụtara na ọtụtụ n'ime ndị bu nje a nọ n'obodo mepere emepe.

    Mana ọ sịkwa na obi ekwesighị ịmapụ ndị mmadụ, kama ha kwesiri itinye uche n'ihe ha kwesiri ịme, ma hapụkwa sayensi ka ọ gbaziere ha ụzọ maka ya bụ nje.

  4. Njem ụgbọelụ ga-amalite n'izu ole na ole, ọ bụghị n'ọnwa a

    Ụgbọelụ

    Ebe foto si, AFP

    Njem ụgbọelu ịpụ maọbụ ịbata n'ofesi ga-amalite n'izu ole maọbụ ole na-abịa.

    Nke a bụ ọnụokwu Hadi Sirika bụ Mịnịsta njem ụgbọelu mgbe ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwụ n'ọgbakọ gọọmentị etiti na-eme ka ịkọwara ndị Naịjirịa ka ọnọdụ COVID-19 siri kwuru kwa ụịbọchị n'Abuja.

    Sirika rịọrọ ọhaneze mgbaghara maka otu gọomentị si kpọchie ụzọ ime njem ofesi kemgbe, bụ nke ọ sị na ọ bụ maka ọdịmma ndị mmadụ.

    O kwụkwara na ịmeghe ụzọ njem mba ofesị "abụghị naanị n'aka ndị ọrụ ha ka ọ dị".

    O kwuru na ndị ọrụ njem ụgbọelu achọọlarị imalite ọrụ maka ahụhụ sitere n'imechi ụzọ a gọọmentị mechiri, mana ọ dịghị nfe.

    Sirika kwukwara na mgbe a ga-amalite njem, na ndị na-eme njem kwesiri ịnọ n'ọdọụgbọelụ awa atọ tupu oge njem ha maka nnyocha.

  5. NCDC ahụla coronavirus n'ahụ mmadụ 354 ọhụrụ ụnyaahụ na Naịjirịa

    Ụlọọrụ na ahụ maka ịgbochi mfesa nje na Naịjirịa bụ NCDC kwuru na mmadụ narị atọ iri ise na anọ (354) ka ahụrụ nje coronavirus n'ahụ ha ụnyaahụ bụ Tọzde.

    N'ime ndị a Ebonyi chịtara iri na itoolu (19) ebe Delta ji iri na isii (16).

    Nke a wetere ọnụọgụ dị niile bụ ya bụ nje na Naịjirịa na puku iri anọ na ise, narị abụọ, iri anọ na anọ (45,244).

    N'ime ndị a mmadị puku iri atọ na abụọ, narị anọ na iri atọ (32,430) agbakeelarị laa be ha, ebe ya bụ ọrịa tagoro isi mmadụ narị itoolu, na iri atọ (930).

    NCDC

    Ebe foto si, NCDC

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  6. Unu asaala chi e! Taa dịkwara Igbo niile mma, ebe ọbụla unu nọ.

  7. Akpọpụla Naira Marley ụlọikpe maka ịda iwu mmachi coronavirus

    Azeez Adeshina Fashola

    Ebe foto si, Nairamarley/Instagram

    Ndị uweojii nke Legọs steeti akpọpụla oti egwu bụ Azeez Adeshina Fashola ụlọikpe maka ịda iwu ehiwere maka mmachị ngagharị maka ọrịa coronavirus.

    Ọ bụ n'ụlọikpe pụrụ iche nke dị n'Oshodi ka akpụpụrụ ya.

    Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii nke Legọs steeti bụ Bala Elkana kwuru na ọ bụ n'ụbọchị 13/06/2020 n'elekere abụọ nke ehihe ka Fashola banyere ụgbọelu were si legọs gawa Abuja maka ihe mmemme.

    Fashola na onye na-achịkọta ya bụ Seyi Awouga kwere na ikpe mara ha nke mere ka ọkaikpe rie ha nha otu puku nari naịra n'isi n'isi.

  8. Gịnị mere ụmụ Naijiria na-agbagha ọnụọgụgụ coronavirus NCDC na-ewepụta?

  9. Buhari agbatiela mmachi coronavirus

    Muhammadu Buhari

    Ebe foto si, @BashirAhmad

    Onyeisiala Muhammadu Buhari e jirila izuụka anọ gbatịa mgbachi ngharị maka coronavirus.

    Ọ bụ onyeisi otu na-ahụ aha Naijiria na-ebu megide ọrịa coronavirus bụ Boss Mustapha kwụpụtara nke a oge ọ na-agwa ndị ntakụkọ okwu maka ọnọdụ ọrịa ahụ na Naijiria taa bụ Tọzde.

    Skip X post, 1
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 1

    Mustapha gara n'ihu kwụọ na otu ahụ onyeisiala hiwere maka ọgụ megide coronavirus akwadoghị ụmụakwụkwọ ime nnyocha ahụ tupu ha amalịte akwụkwọ.

    Nke a na-abịa dịka akụkọ na-efe3gharị na ụfọdụ steeti nyere ndị nne na nna iwu ịkwụ N2500 maka nnyocha ahụ ụmụ ha tupu ha enwe ohere ịmalite akwụkwọ.

    Skip X post, 2
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 2

  10. 'Ọnụ ọgụgụ Coronavirus na mba Lebanon nwereike iri elu maka ogbunigwe gbara' - Mịnịsta Ahụike

    Beirut

    Ebe foto si, Reuters

    Mịnịsta na-ahụ maka ahụike na mba Lebanon bụ Hamad Hassan ekwuola na ọnụ ọgụgụ ndị butere ọrịa coronavirus na mba ahụ nwereike ịla elu n'ime ụbọchị iri maka ihe gbara ka ogbunigwe n'obodo Beirut.

    Ụlọ ntaakụko NNA kwuru na Hassan gwara ndị redio nke Sawt Loubnan na ihe ga-ebute nke a bụ mmekọ n'etiti ndị merụrụ ahụ na ndị ọrụ ahụike na-eyighị ezigbo uwe nchekwa.

  11. "A na m eche ka Chukwu si m bido ịka ụka" - TB Joshua

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

    Onye ụkọchukwu ama ama na Naịjirịa bụ TB Joshua ekwuola na ọ na-eche ka Chineke gwa ya ka o bido ofufe tupu ha ebido.

    Nke a na-eme dịka gọọmentị Legọs steeti wepụrụ mmachị amachịrị ofufe niile na steeti ahụ ma nye ha ikike ibido ofufe ọzo site n'ụbọchị Sụnde bụ ụbọchị itolu nke ọnwa Ọgụst 2020.

    Cheta na TB Joshua buburu amụma na ọrịa Covid-19 ga-ala n'ọnwa Machị afọ 2020 kama omezughị.

  12. Mmadụ 457 ọhụrụ butere coronavirus na Naịjirịa na Wenesde

    Ụlọọrụ na-ahụ maka mgbochi ọrịa na Naịjirịa bụ NCDC n'ịchafụ sị ha chọpụtara ọrịa coronavirus n'ahụ mmadụ narị anọ, iri ise na asaa n'ụbọchị Wenesde.

    Nke a mere ọnụọgụgụ ndị buterela ya ji dị puku iri anọ na anọ, narị asatọ na iri itoolu.

    N'ime ndị ọhụrụ a butere ya, iri atọ na anọ si Enugwu, iri abụọ na atọ si Abia, iri na otu si Ebonyi, asaa si Anambra ebe mmadụ atọ si n'Imo.

    Ndị gbakerela n'ọrịa dị puku iri atọ na abụọ, otu narị na iri isii na ise ebe ndị nwụrụla dị narị itoolu, iri abụọ na asaa.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  13. Igbo mma mma nụ oooo

    Anyị ji obi ọma anabata unu n'ọgbakọ anyị nke taa.

    Buru oche gị bịa gụrụ akụkọ gbasara coronavirus n'uju.

  14. Mba Sawụt Afrịka enwetala enyemaka n'aka WHO

    Ngalaba ahụike mbaụwa niile bụ WHO ezipụla ndị enyemaka pụrụiche ruru 43 na mba Sawụt Afrịka ịnyere ha aka kwụsịlata mkpamkpa ọrịa covid-19 na-akpa na mba ahụ.

    Ha kwuputara nke a n'akwụkwọ ozi ha depụtara n'ụbọchị Wenzde.

    Ka akụkọ a na-apụta, mmadụ 17 n'ime ọnụọgụgụ 43 ahụ ga-atụ ụkwa na mba Sawụt Afrịka na Wenzde ahụ kwa.

    Ndị a a na-ezipu bụcha ndị ọkaibe n'ihe gbasara ahụike, nyocha, ịlụso ọrịa na-efe efe agha, ịzụta akụrụngwa ọrụ, ịkuziri ndị mmadụ maka ihe niile gbasara ahụike nakwa ịhọpụta ndị aka siri ike n'ọrụ ahụike.

    Ọ bụ Dọkịta Matshidiso Moeti bụ onyeisi WHO n'Afrịka nakwa Michael Ryan na-ahụ maka ọrụ gbatagbata nke WHO na-arụ bụ ndị ndu otu pụrụiche a.

  15. Osote onyeisiala mba Zimbabwe abụrụla mịnịsta ahụike

    Constantino Chiwenga

    Ebe foto si, AFP

    Osote onyeisiala mba Zimbabwe bụ Constantino Chiwenga abụrụla mịnịsta ahụike ha n'ime otu ọnwa ọgbaghara banyere mpụ na nrụrụaka metụtara nyocha coronavirus.

    Chiwenga bụbu onyeisi ndị agha nke duru ndị agha na-apụ Robert Mugabe bụbu onyeisiala ọkwa.

    Onye ọ nọchiri anya dịka mịnịsta bụ Obadiah Moyo pụtara n'ụlọikpe n'ọnwa Juun maka ebubo nrụrụaka ego dị nde dọla iri abụọ $20m. mana e mechara gbapụta ya.

    Onyeisiala Mnangagwa sị na ọ dị mkpa ka enwe udo na mịnịstrị ahụike ọkachasị ugbua coronavirus na-arị ibe ya elu.

    Zimbabwe nwere mmadụ 4,200 buterela coronavirus, mmadụ 81 anwụọla mana a na-eche na ọnụọgụgụ ndị bu ya kwesịrị ịkarị.

  16. Mmadụ karịrị puku 11 gbakere site n'ọrịa coronavirus na Naịjirịa n'otu ụbọchị

    Ọ bụ ihe tụrụ ọtụtụ ndị Naịjirịa n'anya na mmadụ dị puku iri na otu, otu narị na iri asatọ na asatọ gbakere site n'ọrịa coronavirus ụnyaahụ dịka ụlọọrụ na-ahụ maka mgbochi ọrịa bụ NCDC si kwuo.

    Ozi NCDC wepụtara na-akọwa na mmadụ narị atọ na anọ butere ọrịa a na Naịjirịa n'ụbọchị Tuzde nke mere ọnụọgụgụ ndị buterela ọrịa a ji dị puku iri anọ na anọ, narị anọ iri atọ na atọ.

    N'ime ndị a mmadụ puku iri atọ na otu, narị asatọ na iri ise na otu agbakeela ebe narị itoolu na otu anwụọla.

    Nke a pụtara na ndị a ka bu ọrịa a ugbua na Naịjirịa dị naanị puku iri na abụọ, narị ise na iri asatọ na abụọ.

    Ajụjụ ndị mmadụ kpọ n'ọnụ bụ 'kedụ etu mmadụ karịrị puku iri na otu ji gbakee n'ime otu ụbọchị? Ọ pụtara na Naịjirịa emeriwala ọrịa coronavirus?

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  17. Unu abọọla chi?

    Anyị ji aka na unu hiri ụra nke ọma? Biko gbalịa nọnyere anyị n'ụbọchị taa.

  18. Ka chị bọọ nụ

    Echi ga-abụ echi ọma...rahụ nụ duu!

  19. Tupu ị fega mba ofesi, lee iwu Coronavirus Emirates, Etihad na ndị ọzọ tinyere

  20. Egwuregwu bọọlụ enweela iwu ọhụrụ

    Onye ogbu bọọlụ

    Ebe foto si, NPC

    Otu ndị na-eti iwu nakwa ndị na-ahasi egwu bọọlụ bụ Football Association, etiela iwu ọ hụrụ nke kwuru na, onye egwu bọọlụ ọbụla mara ụma kwasa ibe ya maọbụ ndị isi ọrụ bọọlụ ụkwara, a ga-enye ya, 'Red Card'.

    Otu 'International Football Association Board (Ifab) na ya bụ iwu esonyela iwu dịka( ịkparị maọbụ ịkpọrị mmadụ maọbụ ime ihe gosiri mkparị."

    Ha kwuru na: "Dịka ọ dị n'iwu ndị ọzọ, na ọ bụ onye na-egbu bọọlụ ga-ekpebi etu o siri hụta ndajọ ọbụla."

    N'akwụkwọ ha depụtara, ha sị: " Ọ bụụ na ihe e mere ezughị ịchụpụ onye mere ya, e nwere ike dọọ ya aka na ntị maka ịkpa agwa megidre egwuregwu."

    Akwụkwọ ahụ kwukwara na ndị ogbu bọọlụ ekwesịghị ị ta onye egwu bọọlụ ahụhụ maka ịkwa ụkwara nkịtị belụsọ ebe e were anya na ọ bụ ihe a ma uma mee iji megide onye ọzọ."