Ndịagha Naịjirịa ruru 26 ebutela ọrịa coronavirus

Ndịagha Naịjirịa ekwupụtala na mmadụ iri abụọ na isii ebutela nje covid-19 n’ime mmadụ narị anọ na iri na asaa ha mere nnyocha.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. WHO ekelela Paris maka iwu ọhụrụ gbasara mkpụchi imi

    Okporoụzọ Paris

    Ebe foto si, Reuters

    Onyeisi ngalaba ahụike mbaụwa niile bụ Tedros Ghebreheyesus ebunyela mba Fransị, ọ kachasị isi obodo ya bụ Paris ụkpa ekele.

    O mere nke a n'ihi iwu ọhụrụ ha manyere gbasara ịkpuchi imi nke kwuru na "ndị mmadụ ga na-ekpuchi imi ha mgbe niile ha nọ na ọha"

    O kwuru na iwu a na ndị yiri ya dị oke mkpa n'ibelata mfesa ọrịa coronavirus.

    Iwu a mba Fransị tinyere metụtara onye ọbụla karịrị afọ iri na otu nọ n'ahịa, n'okporụzọ, nakwa ụgbọala njem ọha.

  2. Etu ụfọdụ ndị ọrụ ahụike si erefusi ngwaọrụ covid ekwesiri inye na nkiti

  3. Ahụrụ nje coronavirus na ahụ mmadụ 437 ụnyaahụ na Naịjirịa

    NCDC

    Ebe foto si, NCDC

    Ndị ụlọọrụ na ahụ mmaka ọkwụkwọ na ịgbochi ọrịa nje na Naịjirịa bụ Nigeria Centre for Desease Control (NCDC) achọpụtala nje coronavirus n'ahụ mmadụ narị anọ iri atọ na asaa (437) ọhụrụ na Naịjirịa ụnyaahụ bụ Sọnde.

    Ọnụọgụ ọhụrụ a wetere ọnụọgụ ndị bụ ya bụ nje na Naịjriịa na puku iri anọ na isii, narị ise, iri asaa na asaa (46,577).

    Ndị gbakegoro na ya bụ ọrịa dị puku iri atọ na atọ, otu narị, iri asatọ na isii (33186), ebe isi mmadụ narị itoolu, iri anọ na ise (945) nagoro na ya bụ ọrịa.

    Naanị Ebonyi steeti bụ ala Igbo nọ n'ime ya bụ ndị chịtara mmadụ iri na itoolu.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  4. Ndị be anyị unu asaala chị e? Ndụ mmiri, ndụ azụ. Taa bụ Nkwọ, Nkwọ biko kwọtara anyị ihe ọma.

  5. I mere ọfụma

    Daalụ maka ịnọnyere anyị taa.

    Igbo sị na onye kwe Chi ya ekwe.

    Chi gị ga-ekwenyere gị n'ihe niile i kwenyere na ya n'izu ọhụrụ a.

    Iseee!

    Ka chi foo!

  6. Malawi emechiela ụlọụka nakwa ụlọ mmanya

    Ìhe na-eme na Malawi

    Ebe foto si, Getty Images

    Gọọmentị Malawi amachiela ụlọụka nakwa ụlọ ebe a na-ere mmanya ọzọ dịka ọnụọgụgụ Coronavirus riri elu ọzọ.

    Nke a na-abịa dịka ọnụọgụgụ ahụ riri elu ruo ugboro abụọ.

    Ọkaịkpe kachasị nke mba Malawi ekwuola na ewepụtala ndị ọrụ nchekwa pụrụiche ga-enye aka hụ na ndị mmadụ debere iwu gbasara coronavirus.

    Nke a gụnyere mmachi ọgbakọ mmadụ iri nakwa iyi mkpuchi mmi mgbe niile.

    Ọnụọgụgụ ndị burula ọrịa coronavirus na mba ahụ bụzi 4624 ugbua.

  7. Coronavirus egbuola ihe karịrị mmadụ otu puku narị na Brazil

    Ọrịa coronavirus egbuola ihe karịrị mmadụ otu puku narị na mba Brazịl iji mee ha mba nke abụọ ebe ọrịa a kacha dulaa ndị mmadụ mmụọ n’ụwa.

    Ọrịa a gburu ihe ruru mmadụ puku iri ise n’ime ọnwa atọ n’izizi, ma gbuzuo ihe karịrị puku iri ise ọzọ n’ime mkpụrụ ụbọchị iri ise.

    Nke a pụtara na Brazil abụrụla mba abụọ n'ụwa niile ebe ọrịa a kacha gbuo ndị mmadụ.

    N'agbnyeghị nke a, ụlọoriri dị icheiche nakwa ụlọahịa niile emeghela n'obodo ahụ dịka emeburu mmechi obodo ọtụtụ oge iji belata mfesa ọrịa ahụ.

    Dịka ọ dị ugbua, ọnụọgụgụ ndị buterela ọrịa a akarịala mmadụ nde atọ na mba ahụ.

  8. Coronavirus egbuola ihe karịrị mmadụ 100,000 na Brazil ma na-akawanye njọ

    Onye ọrụ ahụike na Brazil

    Ebe foto si, Getty Images

    Ihe karịrị mmadụ otu puku narị anwụọla site n'aka ọrịa coronavirus na mba Brazil.

    Ọrịa gburu mmadụ puku iri ise n'ime ọnwa atọ.

    Ọ bịara kawanye njọ ma gbuo karịa n'ime ụbọchi iri ise.

    Brazil nwere ihe dịka mmadụ nde ato buterela ya bụ ọrịa.

    Dịka ọ dị ugbu a, nanị Amerịka ka mba Brazil na ọnụ ọgụgụ ndi buterela ya bụ ọrịa.

  9. Mmadụ 453 ọzọ ebutela ọrịa coronavirus na Naijirịa

    Ngalaba na-ahụ maka nje na ọrịa na Naijirịa bụ NCDC edepụtala n'akara Twitter ha na mmadụ narị anọ na iri ise na atọ ọzọ ebutela ọrịa coronavirus na Naijirịa.

    Ndepụta ha gosiri na mmadụ iri atọ na itolu si Delta steeti, iri abụọ na ise si Enugwu ebe iri na itolu si Abia steeti.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  10. Ụnụ abọọla chi ụmụ Igbo

    Taa bụ ụbọchị ọma...Soro anyị maka akụkọ ga-amasị gị ịkọ taa niile

  11. Buruji Kashamu anwụọla site n'aka Covid-19

    Skip X post, 1
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 1

    Buruji Kashamu bụ nwaafọ Ogun steeti rụrụ ọrụ dịka onye ụlọomeiwuna-anọchịte anya mpaghara Ogun-East anwụọlw n'ụbọchị Satụde nke ọnwa Ọgụsy afọ 2020.

    Akụko na-akọwa na ọ nwụrụ na First Cardiology Hospital Ikoyi, Legọs steeti.

    Kashamu zọrọ ọkwa gọvanọ Ogun steeti n'afọ 2019 n'ọkọlọtọ otu PDP kama emeriri ya.

    Ndị mba Amerịka na-agba mbọ ka agbọta ya Amerịka maka ebubo ibu ọgwụ ike tupu ọ nwụọ.

    Skip X post, 2
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 2

    Skip X post, 3

    End of X post, 3

  12. Ụgbọelu Air Sudan akpọlatala ndị Naijirịa 87 ọzọ

    Skip X post, 1
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 1

    Ụgbọelu Air Sudan akpọlatala ndị naịjirịa mmadụ iri asatọ na asaa ndị tọrọ na mba ọzọ.

    Ọ bụ ngalaba Nigerians In Diaspora Depụtara nke a n'akara Twitter ha dịka ndị a wuchiri n'ọdọ ụgbọelu Nnamdi Azikiwe International Airport nke dị n'Abuja.

    Mmadụ 87 a ga-edopụ onwe ha iche ụbọchị iri na anọ dịka iwu gọọmentị Naijirịa siri di maka nyocha ọrịa coronavirus.

    Skip X post, 2
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 2

    N'otu aka ahụ ka ndị Naijirịa ndị esi mba Briten akpọlata banyere ụgbọelu Airpeace n'ọdọ ụgbọelu London Gatwick Airport United Kingdom.

    A na-atụ anya na ha ga-alọta Naijirịa n'ihe dịka elekere isii nke mgbede.

    Ha ga-edopụkwa onwe ha iche ụbọchị iri na anọ maka nyocha ọrịa coronavirus

  13. Lee etu mkpuchi imi gị ga-esi nyere gị aka igbochi mbute Covid-19

    Ngalaba na-ahụ maka ahụike mbaụwa bụ World Health Organization (WHO), wepụtara ihe nkiri na-egosi etu ihe dị na mkpuchi imi si enyere aka igbochi ọrịa covid-19.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  14. E meela nnyocha coronavirus ugboro 314,632 na Naịjiria

    Ngalaba na-ahụ maka mgbochi ọrịa na Naịjiria bụ Nigeria Centre for Disease Control (NCDC) ekwuola na h emeela nnyocha maka ọrịa coronavirus ihe karịrị puku narị atọ (314,632).

    Ha kwuru nke a dịka ha wepụtara ọnọdụ ihe dị gbasara etu ha si ebuso ọrịa a agha na Naịjiria.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  15. Trump na ndị omeiwu Amerịka enweteghi nkwekọrịta maka inye ndị Amerịka ego iti aka n'obi ọzọ

    Mark Meadows na Steven Mnuchin

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Mark Meadows na Steven Mnuchin nọchitere anya ndị ụlọọrụ onyeisiala n'okwu ahụ

    Donald Trump na ndị omeiwu Amerịka enweteghi nkwekọrịta maka inye ndị Amerịka ego iti aka n'obi ọzọ.

    Nke a na-abịa dịka ndị pati Democrats na ndị Republicans nọ n’ụlọomeiwu na-asụkọta mpi n’ihe gbasara iwepụta ego a ga-ekesara ndị mba ha dịka mkpa mkpa coronavirus na-etisa akụnaụba ọha.

  16. Naịjirịa bụ mba nke atọ ebe ndị mmadụ ka buru coronavirus n'Afrịka

    Dịka ngalaba na-ahụ maka ahụike mbaụwa bụ World Health Organization (WHO) si kwuo, Naịjirịa abụrụla mba nke atọ ebe ndị mmadụ kacha bute ọrịa Covid-19 na mpaghara Afrịka.

    Naanị ndị ka Naịjirịa bụ mba Saụt Afrịka bụ ebe mmadụ 545,476 buterela ya bụ ọrịa, nakwa mba Ijipt bụ ebe mmadụ 95,147 buterela ya, dịka ọnụọgụgụ si na nke ụtụtụ Satọdee bụ asatọ nke ọnwa Ọgọstụ gosiri.

    Mba atọ ndị ọzọ na-eso Naịjiria bụ mba Gana bụ ebe mmadụ 40,097 buterela ya, Ọljiria ebe mmadụ 34,155 buterela ya nakwa Moroko ebe mmadụ 30,662 buterela ya.

    WHO

    Ebe foto si, WHO Africa Twitter

  17. Mmadụ 443 ọhụrụ esorola n'ime ndị ahụrụ covid-19 n'ahụ ha na Naịjirịa

    Ngalaba na-ahụ maka mbgochi ọrịa bụ Nigeria Centre for Disease Control (NCDC) ekwuola ha ahụtala ọrịa coronavirus n'ahụ mmadụ 443 ọhụrụ.

    Nke a butere ndị buterela nje a na Naịjirịa kemgbe ọ batara mba ahụ mmadụ 45,687, nke mmadụ 32,637 agbakeela ma la be ha.

    MMadụ 936 anwụọla site na ọrịa.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  18. Ị bọọla chi e!

    Ị rahụkwara nke ọma n'abalị?

    Ka ụbọchị taa wetara anyị ihe ọma o! Iseee!

    Nọnyere anyị taa ka ị nwee ike ịhụ akụkọ ndị ga-amasị gị ịkọ taa niile.

  19. Ka chi foo!

    I meela!

    Ka echi mụtara anyị ihe ọma.

    Udo!

  20. NCDC esonyela mmemme ịkpuchi ihu bụ World Mask Week.

    World Mask Week

    Ebe foto si, MaskupNaija/

    Ngalaba na-egbochi ọrịa na-efe efe na Naịjirịa bụ NCDC esonyela na mmemme amapụtara na mbaụwa niile iji gwa mmadụ ka ha cheta na-ekpuchi imi ha.

    World Mask Week bụ izuụka amapụtara iche ga-ebido n'ụbọchị 7 ma rue ụbọchị 14 nke ọnwa Ọgọst iji kesaa akụkọ na ncheta nakwa ndụmọdụ gbasara ịkpụchi ihu.

    Ndị kwadoro ihe a bụ ngalaba ahụike dị icheiche gụnyere Pandemic Action Network (PAN) Ngalaba ahụike ụwa niile bụ WHO, Ngalaba ọrịa na-efe efe nke Afrịka bụ CDC na ndị ọzọ.