Unu abọọla chi?
Igbo ndị ọma anyị ekelee unu.
Unu arahụkwara nke ọma?
Nọnyere anyị taa ka anyị wetara gị akụkọ ndị ga-amasị gị.
You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ndịagha Naịjirịa ekwupụtala na mmadụ iri abụọ na isii ebutela nje covid-19 n’ime mmadụ narị anọ na iri na asaa ha mere nnyocha.
Igbo ndị ọma anyị ekelee unu.
Unu arahụkwara nke ọma?
Nọnyere anyị taa ka anyị wetara gị akụkọ ndị ga-amasị gị.
Mba Yuganda adịla njikere ịtule ọgwụ mgbochi coronavirus n'ahụ ndị mmadụ n'ọnwa Novemba.
Ozi a sị n'aka ụlọntaakụkọ Daily Monitor na-ekwu na ọ bụ ngalaba ahụike nke mba ahụ kwuputara nke a.
Ọgwụ mgbochi ahụ nke a kpọrọ "Self Replicating RNA" malitere site na njikọ aka nke Imperial College na mba Briten nakwa ngalaba nyocha nje nke Yuganda.
Ụlọ ntaakụko ahụ kwuru Monica Musenero bụ onyeisi otu na-elekọta mfesa ọrịa coronavirus sị na a ga-etule ya n'ahụ mmadụ iri na mbido.
Dịka ọ kwụ ugbua ihe karịrị mmadụ puku asaa ebutela ọrịa coronavirus na mba ahụ ebe naanị mmadụ iri asaa na ise nwụrụla n'aka ya.
Akụko pụtara na mba Kongo na-akọwa na mba ahụ ewepụla mmachi ngagharị ha tinyeburu na gburugburu ala ha.
Mana obere mmachị ka dị n'obodo Pointe Noire nakwa Brazzaville bụ isi obodo ha nke ga-ebido n'elekere iri na otu nke abalị rụe elekere ise nke ụtụtụ.
Mba ahụ nwere ihe ruru mmadụ puku ise bụ ọrịa coronavirus na mba ha ebe ndị mmadụ na-akatọ mmachi ngagharị maka ahụhụ na enweghi ọrụ nke o butere.
Ọrịa a zuru ụwa ọnụ bụ coronavirus egbuola ihe karịrị mmadụ otu nde n'ụwa ugbua dịka ngụkọ nke mahadum Johns Hopkins si depụta ya.
Ọnụọgụgụ a kachasị njọ na mba Amerịka, Brazil na India, dịka onyeisi ngalaba World Health Organisation bụ António Guterres sị na ọnụọgụgụ na-agbawa obi.
Ndị nchọpụta sị na nke bụ ezi ọnụọgụgụ nwereike ị dị elu karịa dịka ọ ka na-arị elu na mpaghara dị iche iche.
Ọnụọgụgụ a na-abịa n'ime ọnwa iri ọrịa coronavirus seputara isi n'ụwa malite n'obodo Wuhan nke Chaịna
Ọrịa a agbaasala na mba dị 188 n'ụwa ebe ọnụọgụgụ ndị buterela ya akarịala nde iri atọ na abụọ.
Mmechi obodo nakwa ihe ndị ọzọ e mere iji belata mfesasị ọrịa a etinyela ọtụtụ mba n'ụbịam ọnụ ntụ.
Mmaddụ otu narị na iri atọ na isii ọhụrụ butere coronavirus na Naịjirịa n'ụbọchị Mọnde dịka ụlọọrụ na-ahụ maka mgbochi ọrịa bụ NCDC si kwuo.
Ndị buterela ọrịa na Naịjirịa ugbua eruola puku iri ise na asatọ, narị anọ na iri isii, ebe ndị gbakerela dị puku iri anọ na itoolu, narị asatọ na iri itoolu na ise.
Ndị coronavirus gburula na Naịjirịa dị mmadụ otu puku na otu narị na iri na otu.
Ka ụtụtụ a maara gị mma dịka ị na-anọnyere anyị n'ụbọchị taa.
Igbo tụrụ ilu sị na "ọ bịara ije nwe ụna"
Ka ọ dị nụ echi.
Aka na-achị Imo steeti bụ Hope Uzodimma agbapeela ụlọọgwụ mkpagharị na-enye ọgwụgwọ na-efu n'okpuruọchịchị niile dị na steeti ahụ.
O kwuru nke a n'obi gọọmentị steeti ahụ ma gwa ndị ọ bụ ọrụ ha ịhazi ya bụ atụmatụ ha gbaa mbọ hụ na ọ gara nke ọma.
Ọ dọkwara aka na ntị na ọgwụgwọ ọbụla sị n'ụlọọgwụ ndị a ga-abụrịrị n'efu ma kwuo na onye ọbụla dara iwu a ga-erite ntaramahụhụ dị egwu na ya.
Ọ kọwara na ihe mere eji mee nke a bụ n'ihi na ọ dịghịrị ndị bi n'ime obodo mfe ịchọta ebe ha ga-anata ọgwụgwọ maọbụ lekọta ahụike ha anya mgbe niile.
Atụmatụ a ji ụlọọgwụ mkpagharị iri were bido mana ọ ga-ezu iri abụọ na asaa n'oge adịghị anya.
Ụlọ mmanya na mba Kenya ga-emepe n’ụbọchị Tuzde abalị iri abụọ na itoolu n’ọnwa Sepụtemba, dịka ọ gachara ọnwa isii kemge emechiburu ya iji gbochi mfesa ọrịa coronavirus.
Onyeisiala Uhuru Kenyatta kwukwara na mmachi ngagharị ga-ebido n’elekere iri na otu nke abalị ruo elekere anọ nke ụtụtụ n’ụbọchị iri isii na-abịa.
Mana ndị mmadụ na mba ahụ na-akatọ iwu a n’ihi na ha tụrụ anya na ụlọakwụwkọ dị na mba ahụ kwesiri imepe ugbua.
Ndị dọkịta iri si mba Chaịna awụchiela Zimbabwe iji nyere ha aka ibuagha megide ọrịa coronavirus.
Ndị a ga-anọ n'ụlọọgwụ a kpọrọ Parirenyatwa bụ ebe ha ga na-arụ ọrụ ruo ọnwa iri na abụọ dịka ụlọọrụ akwụkwọ ntaakụkọ ha si kwuo.
Onye ndu ndị dọkịta a bụ dọkịta Luo Weiqiang sị na ha ga-akwalite iji mgbọrọgwụ na mkpaa akwụkwọ ndị mba Chaịna arụ ọrụ.
Ụlọọrụ na-anọchiteanya mba Chaịna na Zimbabwe depụtara nke a na twitter.
Ụlọọrụ na-ahụ maka mgbochi ọrịa na Naịjirịa bụ NCDC sị na a chọpụtara ọrịa coronavirus n’ahụ mmadụ otu narị iri abụọ na isii na Sọnde.
N’agbanyeghi na ọrịa a na-agbadata na Naịjirịa ugbua mana ọ taala isi mmadụ otu puku, otu narị na asatọ.
Unu abọọla chi?
Biko n'ọnyere anyị n'ụbọchị taa
Ụzọ dị mma, a gaa ya ugboro abụọ.
Soro anyị echi maka akụkọ niile ga-amasị gị.
Gọọmentị Anambra steeti ehibela ụlọikpe gbatagbata iji kpụpụ ndị dara iwu ịhicha obodo.
Atụmatụ ahụ a kpọrọ ‘Dobe Anambra ọcha’ dịka ha si kwuo bụ maka ịgba mbọ hịchaa steeti ahụ ka ọ dị ọcha.
Ha kwusikwara ike na ịdebe akụkụ gị ọcha so na ihe ndị ga-enye aka ka ọrịa coronavirus laa kpam kpam.
Gọọmentị mba Spain agwaala ndị na-achị obodo Madrid ha machie obodo ahụ iji belata mfesa ọrịa coronavirus.
Nke a na-abịa dịka mba ahụ jụrụ ịmachi obodo ha ọzọ dịka ọnụọgụgụ ndị bu ọrịa ahụ na-arị elu ọzọ.
Mana minista ahụike mba ahụ bụ Salvador Illa kwuru na ihe ndị Madrid tinyere iji nye aka gbochi mfesa ọrịa ahụ.
O kwukwara na oge eruwo a ga-eji tinye anya wetuo obi ma chọọ ụzọ a ga-eji kpochapụ ọrịa ahụ kpam kpam.
Mmadụ atọ ọzọ anwụọla site n’ọrịa coronavirus na Naịjirịa dịka ngalaba NCDC si kwuo.
Ngụkọ ahụ gosikwara na mmadụ otu narị na iri atọ na isii ọzọ butere ya bụ ọrịa n’otu ụbọchị ahụ
Dịka taa bụ ụbọchị ụka nakwa isi mbido izu ụka, ecehzona ịsonye anyị maka akụkọ ndị dị mkpa gbasara ọrịa coronavirus taa n'ụwa niile.
Ndewonu!
Ngalaba na-ahụ maka ahụike na mba ụwa bụ nke Bekee kpọrọ World Health Organisation (WHO) ekwuola na tupu ọgwụ mgbochi ya apụta, covid-19 nwere ike igbu ihe karịrị mmadụ nde abụọ.
Dọkịta Mike Ryan bu onyeisi gbata gbata na WHO sị na ọnụ ọgụgụ a nwereike karịa etu ma ya bụrụ na mba ụwa agbasịghị mbọ ike banyere ọrịa.
Ihe fụrụ obele ka oru mmadụ otu nde anwụọla site na mkpa mkpa coronvirus kemgbe ọ pụtara na Chaịna n'ime afọ gara aga.
Ya bụ ọrịa ka na-abawanyekwa, dịka mmadụ 32 million ebuterela ya na mba ụwa.
Coronavirus malitekwara mbawanye ọzọ na ụfọdụ mba dị na uwgu ụwa dịka oge ntụ oyi na-erute.