You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ndịagha Naịjirịa ruru 26 ebutela ọrịa coronavirus
Ndịagha Naịjirịa ekwupụtala na mmadụ iri abụọ na isii ebutela nje covid-19 n’ime mmadụ narị anọ na iri na asaa ha mere nnyocha.
Mkpuchi Na Eme Ozugbo
Oge erubeghị mgbe ndị mmadụ ga-abatawa ọgbọegwuregwu - Gọọmentị UK
Gọọmentị mba Briten ekwuola na oge erubeghị mgbe ha ga-eamalite ịnabata ndị mmadụ n'ọgbọegwuregwu na mba ahụ.
Nke a bụ maka na ọnụọgụgụ ndị na-ebute nje coronavirus amalitela ịrị elu ọzọ n'ime izuụka olemole gara aga.
Cheta na kamgbe amalitere egwuregwu ọkachasị asọmpi bọọlụ 'English Premier League', anaghị ekwe ka ndị mmadụ bata n'ọgbọ egwuregwu.
Na mbụ, ndị nhazi asọmpi EPL kwuru na ha ga-amalite ịnabata ndị mmadụ n'ọgbọegwuregwu n'ọnwa Ọkụtoba, mana atụmatụ a agaghị enwezi isi ugbua.
Praịm Mịnịsta UK bụ Boris Johnson kwuru na ha kwụsitụrụ atụmatụ iji lebagharịa ya anya ọzọ.
Mmadụ 51 ka a hụrụ nje coronavirus n'ahụ ha n'Enugwu ụbọchị Mọnde
Ọnụọgụgụ ndị a chọpụtara nje coronavirus n'ahụ ha na Naịjirịa n'ụbọchị Mọnde dị otu narị na iri itoolu na ise (195).
Ngalaba 'National Centre for Disease Control' gụpụtara nke a n'akara Twitter ha.
N'ime ndị a, iri ise na otu (51) si Enugwu steeti.
Lee ka ọnụọgụgụ a sị dị n'uju:
Ị saala chi
Ụtụtụ ọma.
Taa bụ Tuzde ahịa Afọ.
Ya gaziere gị.
Ka chi foo
Daalụ dịka ị sonyere anyị taa...ka ọ di echi.
Gere akụkọ gbasara coronavirus dịka ọ dị n’Afrịka taa
Ilkay Gundogan nke Manchester City ebutela ọrịa coronavirus
Ilkay Gundogan nke ManCity gbara afọ iri abụọ na itolu ebutela ọrịa coronavirus.
Dịka ọ dị ugbu a, o bidola idopu onwe ya iche ụbọchị iri.
Nke a pụtara na Ilkay agaghị eso gbaa asọmpị ha na Wolves nwere n'ụbọchị Wenesde.
Ụlọọrụ Manchester City kwuru na ndị otu Mancherster City niile na-ekpere ya ekpere ka ọ gbakee ngwa ngwa.
Gọọmentị ewepụtela atụmatụ 'survival fund' maka ndị coronavirus metụtara
Gọọmentị etiti ewepụtela atụmatụ ha kpọrọ 'survival fund' bụ nke ha ga-eji nyere ndị mmadụ aka ịmalitekwa ndụ ha dịka ọrịa coronavirus ji nwayọ n'ala.
Onye na-elekọta atụmatụ a bụ Mịnịsta na-ahụ maka azụmahịa bụ Mariam Yalwaji Katagum.
Gọọmentị kwuru na ihe ruru mmadụ otu nde na ụma puku narị asaa ga-eketa oke na ya bụ atụmatụ.
Ọ bụrụ na i nwere ụlọ ahịa, ị ga-egosi asambodo i ji debanye aha ụlọọrụ gị bụ nke a kpọrọ 'CAC Certificate'.
Ndị ọzọ ga-eritekwa elele a bụ ndị na-akwọ ụgbọala, ndị ọrụ aka, na ndị chọrọ idebanye aha ụlọọrụ ha ọhụrụ.
Ị ga-enwerịrị akara ụlọakụ a kpọrọ 'Bank verification number' tupu i keta oke.
Lee akara ọba ozi ha: http://survivalfund.ng/
Mmadụ 97 ọhụrụ butere nje coronavirus n'ụbọchị Sọnde
Ngalaba 'National Centre for Disease Control' kwupụtara na ọ bụ naanị mmadụ iri itoolu na asaa (97) ka a hụrụ nje coronavirus n'ahụ ha n'ụbọchị Sọnde.
Na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ, naanị mmadụ atọ n'Imo steeti ka a chọpụtara nje a n'ahụ ha.
Lee ka ndị NCDC si gụpụta ya bụ ọnụọgụgụ:
Ụtụtụ ọma
Igbo ndị ọma, ụnụ abọọla chi?
Ka anyị malite mgbasa ozi nke izuụka ọhụrụ a.
Udo chịa.
Ka chi foo
Ka ọ dị echi.
Nọnyekwara anyị nke ọma
Ị ga-akwụ paụnd 10,000 ma ị daa iwu nnọsapụ na Briten
Ị ga-akwụ paụnd puku iri ma ị daa iwu gọọmentị mba Briten tinyere maka iji aka gị anọsapụ maka mgbochi mfesa coronavirus.
Ọ kwụsịghịkwa ebe ahụ, a ga-akpọkwara gị ndị uweojii iji hụ na i mezuru iwu ahụ.
Mmadụ 189 ọzọ ebutela ọrịa covid-19 na Naijirịa
Ngalaba NCDC edepụtala n'akara Twitter ha na mmadụ otu narị na iri asatọ na itolu ọzo ebutela ọrịa coronavirus na Naijirịa.
Ndepụta ha gosiri na otu onye ọzọ nwụrụ ebe mmadụ otu narị na iri abụọ na isii n'ime ha agbakeela.
Mmadụ iri na abụọ n'ime ha si Rivers, atọ si Ebonyi ebe abụọ si Imo steeti.
Gọọmentị Legọs steeti ewepụla mmachị niile amachịrị ụlọ ofufe na steeti ahụ
Gọvanọ Legọs steeti enye;la ikike ka ewepụ mmachị niile amachiri ụlọ ofufe niile nọ na steeti ahụ.
O kwuru na ụlọ ụka nke Kraist enweela ohere ikpe ụka n'ime izuụka ma ndị nke alakụba nwe kwara ike ikpe ekpere ha ugboro ise n'ụbọchi dịka ha si ekpebu.
Kama o kwuru na ha ga-erubere iwu niile gọọmentị hiwere maka nchekwa na mgbochi ọrịa coronavirus.
Sanwolu kwuru na ọrịa coronavirus bidoro ịkpa ike n'ụfọdụ mba mgbe ha wepụrụ mmachị ndị a ma dọo ndị mmadụ aka na ntị na o nwereike ime na Legọs ma ọ bụrụ na ndị mmadụ erubeghị iwu gọọmentị nyere.
Ụnụ asaala chi!
Soro anyị taa maka akụkọ niile ga-amasị gị.
Ka chi foo
Bịa nọnyere anyị echi.
Ka chi bọọ
Northern Ireland abanyela 'lockdown' ọzọ
Mba Northern Ireland abanyela na mmechi obodo ọzọ dịka ha ọrịa coronavirus ka na-anyụsi ha ịkpakwụ ike.
Nke a na-abịa dịka a chọtara ya bụ ọrịa n'ahụ mmadụ 222 ọzọ, nke mere ya mmadụ 913 na-ebute ọrịa a n'ime otu izu.
Nke a mekwara ya ọnụọgụgụ kachasị kemgbe ngalaba na-ahụ maka ahụike mba ahụ malitere usoro nnyocha ọhụrụ ha.
N'ihi nke a, ha tinyere iwu kwuru na ndị mmadụ agaghị na-apụtazi ezi maọbụghị ma ha a na-aga ọrụ maọbụ ebe dị oke mkpa.
Ọzọ bụkwa na agaghi ekwecha ka ndị mmadụ na-eme njepụ na mba ahụ maọbụghị ma ọ dị ezigbo mkpa.
N'ọgbakọ, ndị mmadụ agaghị akarị 15, wdgz.
Mara na mmadụ 32,538 butere ọrịa a na mba ahụ kemgbe o selitere isi.
Gee akụkọ n'otu nkeji
Gee nchịkọta akụkọ ga-amasị gị n'otu nkeji
Mmadụ iri anọ na isii ọzọ ebutela ọrịa Coronavirus n'Abia steeti.
Ngalaba NCDC edepụtala na site n'ime mmadụ narị abụo na iri abụo na otu ọzọ butere ọrịa coronavirus, na mmadụị iri anọ na isii n'ime ha sị Abia steeti.
Ọnụ ọgụgụha gosiri na otu onye ọzo nwụrụ site n'aka ya bụ ọrịa ebe mmadụ narị abụọ na iri na atọ agbakeela site n'aka ya bụ ọrịa.
Ụtụtụ ọma ụmụ Igbo
Taa bụ ụbọchị ọma...Soro anyị maka akụkọ niile ga-amasị gị n'ụbọchị taa.