You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Ndịagha Naịjirịa ruru 26 ebutela ọrịa coronavirus

Ndịagha Naịjirịa ekwupụtala na mmadụ iri abụọ na isii ebutela nje covid-19 n’ime mmadụ narị anọ na iri na asaa ha mere nnyocha.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. E burula Donald Trump gawa ụlọọgwụ

    E burula onyeisi ala mba Amerịka bụ Donald Trump gawa ụlọọgwụ dịka obere ahụọkụ malitere ime ya.

    Cheta na nnyocha gosiri na Trump na nwunye ya bụ Melania butere ọrịa coronavirus.

    Ụlọọrụ onyeisiala wepụtara akwụkwọ ozi nke kwuru na "obere ike na-agwụ Trump" mana ya bụ ihe erijughị afọ.

    Ha kwuru na ihe e ji buru ya gaa ụlọọgwụ bụ iji kpachapụrụ ya anya.

    Trump n'onwe ya weụtakwara ihe onyonyo n'akara Twitter ya ebe o kwuru sị: "Adị m nnọọ mma, mana anyị chọrọ ịkpachapụ anya ka ihe niile gaa n'anya ya. Nwunye m dịkwa mma. Daalụnụ."

    Ụlọọgwụ e bugara Trump bụ ụlọọgwụ 'Walter Reed', ebe ndị isiala mba Amerịka niile na-anata ọgwụgwọ kwa afọ.

    N'ime abalị ụbọchị Tuzde, o zipuru ozi ọzọ na Twitter na-ekwu na ya dị mma.

    Ọnụ na-ekwuru 'White House' bụ Alyssa Farah kwuru na Donald Trump ahafebeghị ọchịchị n'aka osote ya bụ Mike Pence.

    Dịka iwu mba Amerịka si dị, ọ bụrụ na ọrịa mesiwe Trump ike nke na ọ gaghị enwenwu ike ịrụ ọrụ ya dịka onyeisiala, ọ ga-ahafe ọchịchị n'aka osote ya nwa mgbe nta ruo oge ọ gbakechara nke ọma.

  2. Gọọmentị Ebonyi ewepụtala ijeri naịra anọ maka enyemaka coronavirus nke ugboro abụọ

    Gọọmentị Ebonyi Steetị ewepụtala ego enyemaka maka coronavirus nke ugboro abụọ dị ijeri naịra anọ.

    Nke a dị na mkparịtaụka ndịisi ọchịchị steetị nwere n'ụlọọrụ gọvanọ dị n'Abakaliki.

    Dịka ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu na ngwụcha nzukọ a, odeakwụkwọ gọọmentị steetị a bụ Kenneth Ugballa sị na mere nke a iji belata ahụhụ ndị mmadụ tara n'ihi coronavirus, o kwukwara na ego enyemaka a bụ maka ọnwa Disemba 2020.

    Kọmishọna na-ahụ maka ala bụ Emma Uguru sị na ha mawapụtara okeala dị narị anọ na ise na mpaghara Ochudo Centenary nye ndịisi ọchịchị steetị, nke okenye, ndị odeakwụkwọ ministri na ndị ọzọ.

    Ọ sị na e nyere ndị ketere oke a ọnwa isii ruo otu afọ ka ha bido ọrụ n'ebe ahụ maọbụ gọọmentị anara ha ya bụ ala.

  3. Nkeji Coronavirus

    Gere akụkọ gbasara coronavirus dịka ọ dị n’Afrịka taa.

  4. Joe Biden na nwunye ya ebughi covid-19

    Onye na-azọ ọkwa onyeisiala mba Amerịka bụ Joe Biden ekwuola na ya na nwunye ya bụ Jille Biden ebụghị ọrịa coronavirus.

    O kwuputara ya n'akara Twiter ya ma gwa ndị mmadụ ha echezọna ị dopu onwe ha iche ma kwọ aka ha ma kpuchi kwa ihu ha.

    O jikwa ohere ahụ kelee mmadụ niile maka ekpere ha na obi ọma ha ebe ọ nọ.

  5. Onyeisiala Naịjirịa ezigarala Trump ekpere maka covid-19

    Onyeisiala Muhammadu Buhari esorola nzọmụkwụ ibe ya ndị mba ọzọ n'ịzagara onyeisiala Amerịka bụ Donald Trump ozi maka covid-19.

    Ọ dere n'akara Twitter ya sị "a na m ekpere onyeisiala Amerịka Donald Trump na nwunye ya Melania mgbake dị ọsịsọ n'ọrịa Covid-19"

    Cheta na akụkọ pụtara na-ekwu na Trump na nwunye ya Melania butere ya bụ ọrịa ma kwuo na ha na-edopu onwe ha iche dịka ha na-anata ọgwụgwọ.

    O nweghi onye ọzọ n'ezinaụlọ ya butere ya bụ ọrịa ebe obi gọọmentị ahụ na-ekwu na ha amalitela ịchọta ndị niile ha na Trump nwere mmekọ iji nyocha ha maka ya bụ ọrịa.

  6. MTN Nigeria sị na ha nwetere ego na data n'oge mmachi coronavirus karịa na mbụ

    Nyocha ụlọọrụ ekwentị MTN gosiri na ha nwetere ego buru ibu site n'aka ndị Naịjirịa zụrụ data n'ihi mmachi coronavirus.

    MTN nke Naịjirịa sị na nwetere ego dị ijeri naịra 638.1 n'oge ahụ nke karịrị ijeri naịra 566.9 ha nwetere n'oge ahụ n'afọ 2019. nke bụ na ha ji pasentị 12.5 gbagoo elu.

    Ọ bụ MTN bụ ụlọọrụ mbu na Naịjirịa malitere inye ndị mmadụ ohere izirita ozi n'ekwentị site n'oku ekwentị mbụ e mere n'ụbịọchị 16 ọnwa Mee afọ 2001.

    Ọrịa coronavirus metụtara ọtụtụ ụlọọrụ na azụmaahịa dị iche iche na mbaụwa gụnyere Naịjirịa. Nke a mere e ji na-azụ ahịa n'elu ịntanet n'otu aka ahụ ndị mmadụ malitere iji data ịntanet eme ihe n'ebe o buru ibu.

  7. Dkt Stella Immanuel sị na Trump ekwesighi ibute covid-19 ma ya bụrụ na-ogere ya ntị

    Dọkịta Stella Immanuel bụ onye wuru ewu ọfụma maka okwu o kwuru banyere ọgwụ ịba a kpọrọ Hydroxychloroquine apụtara taa Onyeisiala Donald Trump ụta banyere etu ya na nwunye ya siri bụte coronavirus.

    Dịka Trump dere na ya na nwunye butere nje covid-19, Dkt Immanuel gara n'akara Twitter ya were kwuo na dịka Trump mara maka ọgwụ hydroxycloroquine ya na nwunye ya ekwesighi ibute ọrịa a,

    Dọkịta Immanuel gara n'ihu kwuo ọgwu ọ sị na Trump kwesiri ịnụ iji gbochie ọrịa a.

    Cheta na ngalaba na-ahụ maka ọrịa na mba ụwa bu WHO nakwa ngalaba na-ahụ maka mbochi ọrịa n'Amerịka bụ Centre for Disease Control (CDC) na ọkankụ ndị na-ahụ maka ahụike n'ụwa akpụtala kwuo na enweghị ihe ọbụla gosiri hydroxychloroquine na-arụ ọrụ maka coronavirus.

  8. Ihe karịrị ụmụakwụkwọ 300 na Namibia ebutela ọrịa coronavirus

    Ụmụakwụkwọ karịrị narị atọ ebutela ọrịa coronavirus kamgbe mba ahụ bidoro agụm akwụkwọ.

    Mịnịsta na-ahụ maka ahụike na mba ahụ bụ Kalumbi Shangula kwuru na ọ bụ ụmu akwụkwọ ndị bi n'ụlọ akwụkwọ kacha bute ya bụ ọrịa.

    Namibia mechiri ụlọ akwụkwọ ha n'ọnwa MAchị ma bido kwa agụmakwụkwọ ozọ n'onwa Jun.

    Dịka ọ dị ugbu a, mmadụ puku iri na otu, narị atọ na iri asaa na atọ ebe mmadụ otu narị na iri abụọ na atọ nwụrụla.

  9. Donald Trump sị na ya na nwunye ya ebutela coronavirus

  10. Donald Trump na nwunye ya alakpuola n'ụlọ dịka otu onye enyemaka ya butere coronavirus

    Onyeisiala Amerịka bụ Donald Trump ekwuola na ya na nwunye ya alakpoola n'ime ụlọ ịnọ n'ọnọdụ Bekee kpọrọ "quarantine" dịka otu onye ama dịka aka nri ya bu Hope Hicks butere coronavirus.

    Trump dere n'akara Twitter ya na ya na Melania Trump na-eche mpụtara nyocha e mere ha.

    Hicks.dị afọ 31, bụ onye nọkarịrị Trump nso ọrịa fesarala.

    Ya na Trump so mee njem oge ọ gara nrụrịta ụka n'Ohia ụbọchị Tozde.

    A hụrụ Hicks dịka o si ụgbọelu aritu n'eyighi mpuchi imi n'ụbọchi Tuzde ahụ.

    Ya na Trump sokwa n'ime ụgbọelu helikọpta oge ha na-aga ịchụ nta vootu na Minnesota n'ụbọchị Wenesde.

  11. Mmadụ 153 ọhụrụ ebutela coronavirus na Naịjirịa

    Ngalaba na-ahụ maka mgbochi ọrịa bụ Nigeria Centre for Disease Control (NCDC) ekwuola na mmadụ 153 ọhụrụ esorola na ndi a hụrụ coronavirus n'ahụ ha.

    Ọ bụ Lgọs ka 81 n'ime ndị a nọ.

    Nke a butere ndị a hụru nje ọrịa a n'ahụ ha 59,001. N'ime ndị a 50,452 agbakeela ma la be ha, ebe 1112 lara mụọ site n'ọrịa a.

  12. Unu asaala chi

    Taa ga-abụrụ anyị ụbọchị ọma. Soro anyị maka akụkọ niile ga-amasị gị.

  13. Nkeji Coronavirus nke BBC Igbo

    Gere akụkọ gbasara coronavirus dịka ọ dị n’Afrịka taa.

  14. 'Mmadụ 201 ọzọ ebutela ọrịa coronavirus na Naịjirịa' - NCDC

    Ngalaba NCDC edepụtala n'akara twitter ha na mmadụ narị abụọ na otu ọzọ ebutela ọrịa coronavirus na Naịjirịa.

    Iri atọ na asaa n'ime ha sị Rivas steeti, anọ si Imo steeti ebe otu onye si Abia steeti.

    Dịka ha si gosi, ọ bụzi mmadụ puku iri ise na asatọ, narị asatọ na iri anọ na asatọ bụterela ọrịa coronavirus na Naịjirịa.

  15. Ụnụ abọọla chi

    Ya gaziere anyị taa niile dịka Naịjirịa na-eme ncheta nwereonwe.

  16. Nkeji Coronavirus BBC Igbo

    Gere akụkọ gbasara coronavirus dịka ọ dị n’Afrịka taa.

  17. Thiago Alcantara ebutela ọrịa coronavirus

    N'egwuregwu ka nyocha gosiri na Thiago Alcantara ka batara otu Liverpool ọhụrụ ebutela ọrịa coronavirus. Alcantara onye so na asọmpi Liverpool jị okpu goolu abụọ asaghi ma ncha merie Liverpool edopụla onwe ya iche dịka iwu sịri dị.

  18. Gọọmentị Naijirịa emepụtala akụrụngwa eji eme nyocha coronavirus

    Gọọmentị etiti Naijirịa ekwuola na ha emepụtala akụrụngwa eji eme nyocha coronavirus nke ha kpọrọ SARS-COV-2 Isothermal Molecular Asay (SIMA) nke ga-egosi mpụtara nyocha coronavirus n'ime nkeji iri anọ.

    Ọ bụ mịnịsta na-ahụ maka ahụike bụ Olorunnimbe Mamora kwuru nke a na mkparịta ụka nzụko Presidential Task Force na ndị ntaakụko nwere n'ụbọchi Tuzde.

    Akụrụngwa a dị ọnụ ala ruo ụgboro iri karịa nke PCR.

  19. Mmadụ otu narị na iri asatọ na asaa ọzọ ebutela ọrịa coronavirus na Naijirịa

    Ngalaba NCDC edepụtala na mmadụ otu narị na iri asatọ na asaa ọzọ ebutela ọrịa coronavirus na Naijirịa.

    Ha depụtara nke a n'akara Twitter ha nke gosiri na ọnụ ọgụgụ ndị buterela ya bụ ọrịa na Naijirịa eruola puku iri ise na asatọ, narị isii na iri anọ na asaa.

  20. 'A ga-emegharị ndị si ofesi bata Naijirịa nyocha coronavirus' - PTF

    Nzụkọ onyeisiala maka ịluso ọrịa Coronavirus ọgụị na Naijirịa bụ Presidential Task Force ekwuola na ga-ebido ịmegharịa ndị si ofesi bata Naijirịa nyocha maka ọrịa coronavirus.

    Onyeisi ngalaba a bụ Sani Aliyu kwuru na ihe kpatara nke a bụ maka na mmadụ iri na asatọ si ofesi bata Legọs steeti, rịwara ọrịa coronavirus dịka otu izuụka gachara.

    Aliyu kwuru na nke a mere na-agbanyeghị na ndi a ji asamobodo na ha enweghị ọrịa coronavirus kama mgbe ụbọchị asaa kachara, ha bidoro rịawa ọrịa coronavirus.

    O dọkwara ndị ga-eme nyocha mmegharị a ka ha gaa na ụloọru nyocha nke gọọmentị họpụtara maka ya bụ nyocha.