Ka chi bọọ
Ụbọchị nta ka anyị chụọ n'Owere nchị.
Ndeewo.
You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ndịagha Naịjirịa ekwupụtala na mmadụ iri abụọ na isii ebutela nje covid-19 n’ime mmadụ narị anọ na iri na asaa ha mere nnyocha.
Ụbọchị nta ka anyị chụọ n'Owere nchị.
Ndeewo.
Ngalaba na-ahụ maka nchọpụta ahụike bụ Nigerian Institute of Medical Research maọbụ NIMR n’ịchafụ ekwuola na ha emepụtala ngwa e ji enyocha maka covid-19, nke ha kpọrọ SARS CoV-2 Isothermal Molecular Assay, (SIMA).
Ha kwuru na ngwa a ga-eme ka ọnụego e ji enyocha maka ọrịa a belata.
Coronavirus ka na-anyụ Briten ezigbo ịkpakwụ, dịka a chọtara ọrịa a n’ahụ ihe karịrị mmadụ puku anọ n’otu ụbọchị nke bụ mbụ n’ime ọnwa anọ.
A chọtara ya bụ ọrịa n'ime ahụ mmadụ 4,322, nke butere ọnụọgụgụ mmadụ ole bu ya bụ ọrịa na mba ahụ ruo 385,936.
Ikpeazụ a hụrụ ụdịrị ọnụọgụgụ a bụ n'ụbọchị mbụ nke ọnwa Mee.
Mmadụ 27 nwụkwara n'izu a, nke butere ọnụọgụgụ ndị ọrịa a gburula na mba ahụ ruo 41,732.
Ngalaba na-ahụ maka ahụike mbaụwa bụ World Health Organisation (WHO) ka na-ekwusi ike maka ụzọ ndị mmadụ nwereike isi gbochie mfesa ọrịa Covid-19 na-anyụ ụwa ịkpakwụ.
Ha ka na-ekwusikwa ike sị ka ndị mmadụ gbaa mbọ na-anọsapụ anọsapụ.
Ha wepụtakwara usoro ị nwereike isi kelee mmadụ ghara ịbịa ya nso maọbụ metụ ya aka.
Mmachị ngagharị etinyere n'India maka coronavirus ebuterela ụmụaka nsogbu sike na-ime ka ọnụ ọgụgụ ụmụaka nwaanyị a na-akwanye ịlụ di ria.
Ihe ọzọ ọnọdụ coronavirus mere ka ọ kawanye njọ bụ iji ụmụaka arụ ọrụ ike.
Dịka onye ntaakụkọ BBC Divya Arya siri kọwaa, otu nwata aha ya bụ Rani dị afọ 13 gbanarịrị alụm di n'erughi eru site na-ikpọ okwu nyere aka kwụsị agbamakwụkwọ ya.
Nne na nna Rani chọrọ ịkwanye ya ka ọ lụọ di ka ọ kwụsịrị akwụkwọ maka coronavirus na Maachị.
Nke a bịara ka gọọmentị India gbachiri akwụkwọ, azụmahịa ije kwụsị mbawanye coronavirus.
Ka otu ọnwa gara, nna Rani, bụ onye na-arịa ụkwara nta, chọtara ya di.
Obi adịghị Rani mma maka atụmatụ ahụ.
Ọ sị: "Amaghịm ihe mere ndị mmadụ ji agba ọsọ ịlụ ụmụnwaanyị. Ha amaghị na ọ dị mkpa ị ga akwụkwọ, malite ịkpata ego ga-eme ka mmadụ kwụrụ onwe ya."
Iwu magidere ịlụ nwaanyị erughi afọ 18, mana mba ahụ bụ mbu n'ime mba ndị ụmụaka na alụ di n'ụwa dum.
Dịka Unicef siri kwuo, ụmụaka nwaanyị erubeghị afọ 18 ruru nde 1.5 na-arụ di kwa afọ.
Mana, ọ nwereike kara njọ n'afọ a.
Childline, bụ akara ekwentị eji enyere ụmụaka aka, ekwuola na mkpesa ha na-enweta ejirila pacenti 17 rịa n'ime Juun na Jụlaị nke afọ karịa nke afọ ọzọ.
Ọnụọgụgụ ndị ọhụrụ butere coronavirus n'ụbọchị Tọọsde dị otu narị na iri atọ na otu dịka ụlọọrụ na-ahụ maka mgbochi ọrịa bụ NCDC si kwuo.
Nke a na-abịa dịka nyocha Mahadum Hopkins mere gosiri na ndị buterela ọrịa a n'ụwa ugbua akarịala nde iri atọ.
N'ime ndị a, Legọs steetị ji mmadụ iri anọ na ise karịsịa, Enugwu nwetere mmadụ abụọ ebe Ebonyi ji otu onye.
Ọnụọgụgụ ndị buterela coronavirus na Naịjirịa dị puku iri ise na isii, narị asaa na iri atọ na ise, ndị gbakerela dị puku iri anọ na asatọ na iri itoolu na abụọ, ebe ndị nwụrụla dị otu puku na iri itoolu na atọ.
Biko buru oche gị bịa nọnyere anyị taa maka akụkọ ndị gbapụtara ihe.
Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump ekwusiela ike na o nwere owuwe anya na ọgwụ mgbochi coronavirus ga-apụta n'ọnwa Ọktoba nke katọrọ ihe onyeisi n'ọrụ ahụike kwuru.
Trump katọrọ ihe onyeisi ọrụ ahụike a kwuru na ọgwụ mgbochi ga-apụta n'etiti afọ 2012 nakwa ikpuchi ihu na imi bụ ihe ka m mkpa iji gbochie ibute coronavirus.
Okwu Trump a butere mgbagwoju anya na nkatọ site n'ọtụtụ ndị nke gụnyere Joe Biden nke patị Democratz na-azọsị ya ọkwa Onyeisiala.
"Echere m na o mehiere mgbe o kwuru ihe a. Nke a bụghị eziokwu, " Trump gwara ndị ntaakụkọ gbasara ihe onyeisi ngalaba mgbochi ọrịa bụ Robert Redfield gwara ndị omeiwu.
"Anyị adịwala nso n'inwete ọgwụ mgbochi dịka ị maara...Anyị chere na anyị ga-enwete ihe n'ọnwa Ọktoba" maọbụ oge na-adịghị anya, ka Trump kwuru.
Na nzaghachị Joe Biden sị na ọ tụkwara ihe ndị ngalaba mgbochi ọrịa kwuru na ọ tụkwasịghị Onyeisiala Trump kwuru.
Ụlọọrụ na-ahụ maka mgbochi ọrịa na Naịjirịa bụ NCDC n'ịchafụ sị na ọ bụ mmadụ otu narị na iri abụọ na isii ka a chọpụtara coronavirus n'ahụ ha n'ụbọchị Wenesde.
N'ime ndị a mmadụ asaa si n'Abia Steetị ebe mmadụ ise si n'Imo Steetị.
Ọnụọgụgụ ndị bu ọrịa na Naịjirịa ugbua dị puku iri ise na isii, narị isii na anọ, ndị gbalerela dị puku iri anọ na asaa, narị asatọ nairi asaa na abụọ.
Ndị nke ọrịa a gburula dị otu puku na iri itoolu na otu.
Na nso nso a ọnụọgụgụ ndị na-ebute coronavirus kwa ụbọchị na-arịtu ala nke mere ọtụtụ ndị ji na-ajụ ma Naịjirịa o meriwela ọrịa a?
Anyị ji ekele ọma na-asị unu nnọọ n'ụbọchị taa.
Buru oche gị kpaketa nso maka akụkọ banyere coronavirus.
Igbo tụrụ ilu sị na "ọ bịara ije nwe ụna".
Ka ọ bọọ nụ!
Onyeisiala mba Saut Afrịka bụ Cyril Ramaphosa ekwuola na nke ka nke na coronavirus agafeela n'ala ha.
O kwuru nke a n'ozi ọ gbasaara ndị ala ya iji gwa ha ebe ha na coronavirus jetere be.
Ọ sị na ugbua ha nweziri pasentị iri asatọ na itoolu ndị rịara ọrịa ahụ agbakeela.
Ihe ọzọ okwu ya metụtara bụ na ha na-agbalị ike ha niile ịhụ na ọrịa a efesaghị nke ugboro abụọ.
Ka ọrịa a si kwụrụ na Saụt Afrịka
- Mmadụ 15,000 anwụọla
- Mmadụ 650,000 butere ya bụ ọrịa.
- Emepeela obodo nwayọ nwayọ
- Ụmụakwụkwọ alaghachila akwụkwọ.
Ramaphosa jikwa ohere ahụ kelee ngalaba ahụike dị icheiche gụnyere WHO maka ọsọ enyemaka ha gbataara mba ya mgbe ọrịa ahụ na-eme ha ihe.
Otu ọtawaike onyeisiala na-ebuagha megide coronavirus ekwuola na ọtụtụ ndị si mba ofesi na-abata Naịjirịa na-eweta mpụtara nyocha coronavirus adịgboroja na mbata ha.
Onye nchịkọta otu a bụ Sani Aliyu sị na mmadụ pasentị iri anọ nọ n’otu ụgbọelu batara Naịjirịa bucha ọrịa coronavirus mgbe ha na ndị ọrụ ahụike na ndị ọrụ ụgbọelu dịka a na-agbape ụgbọelu.
Aliyu sị na a hazigharịala usoro nyocha a nke bụ na mpụtara nyocha ga-anọ ụbọchị anọ tupu onye ahụ a na-abanye ụgbọelu.
Ndị ụlọomeiwu sị na obi na-amapụ maka ọnụọgụgụ ụlọ nyocha dị obere na Naịjirịa ma kwuo na a ga-etinye ego ụlọ nyocha 52 n'ime akwụkwọ bọdjetị nke afọ 2021.
Otu ụlọọrụ na Lọndọn na-eresi ndị mmadụ 'bleach' dịka ọgwụ mgbochi coronavirus n'oge a ọrịa na-enye nsogbu dịka nyocha BBC mere si gosi.
Ihe onyonyo nzuzo gosiri ebe mmadụ abụọ dịka ha kwakọgburu ihe abụọ ma kwuo na a ga-eji ya agwọ ndị mmadụ coronavirus.
Otu onye sị na ọ na-erezi ahịa ebe o buru ibu kamgbe Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump na tụsasịa nwere ike ịgwọ coronavirus.
Mana ọ gwara BBC na 'ọgwụ ahụike ya' na-aghị emerụ mmadụ ahụ
Ụlọọrụ na-ahụ maka mgbochi ọrịa na Naịjirịa bụ Nigerian Centre for Disease Control (NCDC) ekwuola na ọ bụ naanị mmadụ iri itoolu ka a chọpụtara coronavirus na-ahụ ha n'ụbọchị Tusde.
Nke a ga-abụ ọnụọgụgụ kachasị pee mpe a ga-enweta kamgbe ọnwa anọ gara aga.
Ọnụọgụgụ ndị buterela ọrịa ugbua puku iri ise na isii, narị anọ na iri asaa na asatọ (56,478), ndị gbakerela dị puku iri anọ na anọ, narị anọ na iri atọ ebe ndị nwụrụla dị otu puku na iri asatọ na asatọ.
Anyị ji aka na ụra nke abalị bụ ekworo ekwo?
Obi ọma ka anyị ji asị unu nnọọọ n'ụbọchị taa.
Ị mere nke ọma wee nọnyere anyị.
Bịakwa wụrụ ọbịa anyị echi ka anyị wetara gị akụkọ ga-amasị gị ịkọ.
Ka chi foo
Ị bụ onye nkuzi? Ngalaba na-ahụ maka ahụike mbaụwa bụ World Health Organisation (WHO) atụpụtala usoro ị nwereike iji chekwaa onwe gị.
Site n'ozi ha ziputara na Twitter ha, ha ka kwụsịkwa n'ihe gbasara ịkwọ aka nakwa nnọsapụ.
Lee ihe ha kwuru ebe a: