You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Ndịagha Naịjirịa ruru 26 ebutela ọrịa coronavirus

Ndịagha Naịjirịa ekwupụtala na mmadụ iri abụọ na isii ebutela nje covid-19 n’ime mmadụ narị anọ na iri na asaa ha mere nnyocha.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Trump agbakeela rue ị ga mmemme na ihe ndị ọzọ - Dọkịta na-agwọ ya

    Sean Conley bụ dọkịta na-eleta onyeisiala Donald Trump nke mba Amerịka ekuwola na ọ ṅụchaala ọgwụ ya niile dịka a na-agwọ ya ọrịa coronavirus.

    O kwukwara na Trump agbakeela mana a ka ga-eme ya nyocha ọrịa ahụ ọzọ n’ụbọchị Fraịde maka adị ama ama.

    Trump na onwe ya na-ekwu na o nwere olileanya ị ga mmemme achụmnta vootu ya nke ga-eme na ngwụcha izuụka.

    Na ngwụcha, Conley kwuru na ọ bụrụ na ahụike onyeisiala dịrị gawa etu a rue ụbọchị Monde n'izu ọhụrụ na ọ ga-ekutu ume mara na ọ dịchala mma.

  2. Coronavirus egbuola ndị mmadụ ugboro atọ karịa azụzụ na ọrịa ngụ n'Amerịka

    Ngalaba na-ahụ maka ọnu ọgụgụ n'Amerịka bụ 'office for National Statistics' ekwuola na ọrịa coronavirus egbuola ndị mmadụ ugboro atọ ma etịkọta nke ọrịa azụzụ na ọrịa ngụ.

    Ha kwuru na mmadụ puku iri anọ na asatọ, otu nari na iri isii na asatọ anwụọla n'aka Coronavirus ebe mmadụ puku iri na atọ, narị isii na iri na itolu nwụrụla site na ọrịa ngụ ebe mmadụ narị atọ na iri itolu na anọ nwụrụ n'aka ọrịa influenza.

  3. Mmadụ 103 ọzọ ebutela ọrịa coronavirus na Naịjirịa

    Ngalaba NCDC edepụtala n'akara twitter ha na mmadụ otu narị na atọ ọzọ ebutela ọrịa coronavirus na Naịjirịa.

    Ọnụ ọgụgu ha gosiri na-enweghi onye ọzọ nwụrụla site na ya bụ ọrịa ebe mmadụ otu narị na iri anọ na asatọ esila na ya bu ọrịa pụta.

  4. Unu asaala chí

    Igbo bụ Igbo! Soro anyị taa maka akụkọ niile ga-amasị gị.

  5. Onweghị ndị egwubọolụ Super Eagles bu nje coronavirus

    N'egwuregwu, otu na-ahụ maka egwu bọọlụ na Naịjirịa bụ NFF ekwuola na o nweghi onye otu egwu bọọlụ Super Eagles butere nje coronavirus.

    Kepukepu pụtara n'ehihie a bụ na mmadụ anọ n'ime otu Super Eagles butere ya bụ nje.

  6. Nkeji Coronavirus

    Nke a bụ nkeji coronavirus.

  7. E chere m na ọ bụ ihe ngọzi na m butere ọrịa coronavirus - Donald Trump

    Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump ewepụtala ihe onyonyo ebe o na-ekwu na ọ chere na ya ibute ya bụ ọrịa dịka ihe ngọzi si n'aka Chukwu bia.

    Ọ bụ dịka ọ lahachịrị ọrụ awa ole gara aga ka o kwuru nke a.

    Akụkọ na-akọwa na Trump anaghị egosi njirimara ọrịa coronavirus

    O kwukwara na ọgwụ enyere ya dị ire ịgwọ coronavirus ma sị kwa na-emepụtala ya bụ ọgwụ n'igwe maka ndị mba Amerịka.

    Dịka ọ dị ugbu a, ụfọdụ ndị ọrụ na-arụ n'ụlo onyeisiala mba ahụ ebutela ọrịa coronavoirus nke gụnyere onyeisi nchekwa na ya bụ ụlo.

  8. Donald Trump alaghachila ọrụ n'Oval Office

    Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump alahachila ọrụ ya dịka onyeisiala naanị abalị asaa akụkọ pụtara na o butere ọrịa coronavirus.

    Trump egosighi njirimara ọrịa ahụ ọbụla n'ime otu abalị ebe ịba na-arịa ya kwụsịrị kemgbe abalị anọ gara aga.

    N'ime ihe onyonyo o ziputere, o kwuru na mgbake ya bụ "ngozi si n'aka chineke" ma kwuo na ọ chọrọ ka ndị Amerịka niile nweta ụdịrị ọgwụgwọ o nwetara mgbe ọ nọ n'ụlọọgwụ.

  9. Mmadụ 155 ọhụrụ ebutela coronavirus na Naịjirịa

    O nweghi onye nwụrụ ọhụrụ site n'ọrịa a na Naịjirịa dịka ọnụọgụgụ nke ngalaba NCDC si kwuo.

    Mana mmadụ ruru otu narị na iri ise na ise ebutela ya bụ ọrịa dịka emechara nnyocha.

  10. Unu abọọla chi

    Soro anyị maka akụkọ niile ga-amasị gị taa

  11. Nkeji Coronavirus

    Gere nkeji Coronavirus ka o si dị n'Afrịka taa.

  12. Gọọmenti mba Kenya ekwuola na ha ga-enye ụmụakwụkwọ mkpuchi ihu maka agha covid-19

    Na Kenya, mịnịstrị agụmakwụkwọ ekwuputela ebumnobi ha inye ụmụakwụkwọ ndị ogbenye mkpuchi imi.

    Minista agụmakwụkwọ mba ahụ bụ George Magoha kwuru na ha ga-amalite iziga ego maka ya n’ụlọakwụkwọ gọọmenti n’ụbọchị Tọzde.

    Mkpuchi ihu ga-enye aka ịme ka asụmmiri sị n'ọnụ maọbụ nke si n'ime ghara ịtụkwasa onye ọzọ.

    A na-eyikarị ya maka igbochi ife onye ọzọ ya bụ nje.

  13. Legọs steeti nyere ndị na-azụ ahịa na ndị ọrụaka ihe mmachị akpa covid-19

    Ka anyị malite na Naịjirịa ebe gọomentị Legọs steetu nyere ndị na-azụ ahịa na ndị ọrụ aka ihe enyemaka maka Covid-19 ruru puku iri na abụọ.

    Gọọmentị ahụ kwuru na ha na-atụ anya ikewapụta ọgbakọ azụmahịa ebe ndị ọrụ aka na ndị chọrọ inye ha ọrụ ga na-ezute n’elu ịntanetị.

  14. Mmadụ 118 ebutela coronavirus ọhụrụ na Naịjirịa

    Ndekọ nke NCDC wepụtara gosiri na ọnuọgụgụ ndị butere ọrịa a bụ otu narị na iri na asatọ.

    Legọs ka bụ ebe mmadụ kachasị bute ya dịka enyochapụtara mmadụ 41 bu ya na steeti ahụ.

    Mana ọnụọgụgụ ndị nwụrụla site n'ọrịa ahụ eruola otu puku na otu narị na iri na atọ.

  15. Unu asaala Chi!

    Soro anyị taa maka akụko ihe na-eme n'ụwa niile.

    Ya gaziere gị taa!

  16. Ndewo nụ

    Ụmụ ibe, n'ebe a ka anyị ga-awụsa ọwa maka nke taa.

    Ka ọ dịnụ echi.

    Daalụ nụ.

  17. Madagascar ewepụla mmachi maka ọrịa coronavirus

    Onyeisiala mba Madagascar bụ Andry Rajoelina ewepụla mmachị ngagharị ehiwere maka ọrịa coronavirus.

    Ugbu a, ihe egwuregwu niile ga-ebido kama ọ gaghị akarị mmadụ narị abụọ biara ikiri ya.

    Ndị niile chọrọ isi Madagascar mee jem ga-emeriri nyovha maka coronavirus awa iri anọ na asatọ tupu ha efepụ. Nyocha kwesị kwara igosi na onye ahụ ebughị coronavirus.

    Kama ọ bụ kwa nanị otu ọdọ ụgbọelu ka gọọmentị nyere ikike ifepụ mba ofesi.

    Gọọmentị Madagascar tinyere mmachị dịka ọnụ ọgụgụ ndị butere coronavirus na mba ahụ bịara rịa elu.

    Rajoeline wepụtara ọgwụ mmiri ọ si na-agwọ ọrịa coronavirus mana ngalaba WHO na-ekwu na ya bụ ọgwu anaghị agwo ọrịa coronavirus.

    Dịka ọ dị ugbu a, a na-emepụta ya dịka mkpụrụ ọgwụ ma na-ekesa ya na mba ahụ niile.

  18. Donald Trump alọhachila 'White House' !

    Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump alọhachịla ụlọ obibi onyeisiala eji White House mara dịka ọ nọ chara abalị atọ n'ụlọ ọgwụ.

    Trump pụtara na mbara ezi white House, yipu mkpuchi imi ya ma kelee ndị na-akwado ya.

    Ọ mere ihe onyonyo were gwa ndị mmadị sị; " Atụla ụjọ, ekwela ka coronavirus chịa na ndụ gị".

  19. Gọọmentị ewepụtala ndi ọrụ mbara-ezi 60,000 iji kwado mmepe ụlọakwụkwọ

    Gọọmentị Naijirịa ekwuola na ha ga-ewepụta ndị ọrụ mbara ezi ga-enyere aka iji hụ na ụlọakwụkwọ niile rubere isi n'atụmatụ nchekwa maka coronavirus.

    Ọ bụ mịnịsta mbara ezi bụ Mohammed Abubakar kwuru nke a n'ụbọchi mọnde ma sị na mmadụ puku iri isii a ga-arụ ọrụ n'okpuru ọchịchị narị asaa na iri asaa na anọ niile nọ na Naịjirịa.

    Nke a na-eme dịka gọọmentị nyere iwu ka ụlo akwụkwọ gọọmentị etiti niile mepee ma bido gụwa akwụkwọ n'ụbọchi iri na abụọ nke ọnwa Oktoba afọ 2020.

  20. Unu asaala chi

    Unu abọọla chi, biko soro anyị taa maka akụkọ niile ga-amasị gị