Akụkọ si mba Amerịka apụta ugbua na-ekwu na ọtụtụ ndị ha na onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump so arụkọ ọrụ ebutekwala ọrịa coronavirus.
Ọtụtụ n'ime ndị a bụ ndị ha na Trump sonyere n'otu ọgbakọ e nwere n'ụbochị Satọde gara aga, ebe onyonyo gosiri na onweghị onye ọbụla n'ime ha chekwara onwe ya dịka ngalaba ahụike mba Amerịka si nye ntuziaka.
Ọgbakọ ahụ bụ ebe Donald Trump nọrọ họpụta Ọkaikpe Amy Coney Barrett dịka onye ọkaikpe nke ụlọikpe kachasị nke mba Amerịka.
Ndị a kpọpụtara aha ha butere nje a gụnyere: onye nhazi achụmnta vootu Trump bụ Bill Stepien; ọnụ na-ekwuburu Trump n'oge gara aga bụ Kellyanne Conway, ndị omeiwu otu Repọlikan bụ Mike Lee na Thom Tilis, na ọtụtụ ndị ọzọ.
Onye ntaakụkọ ụlọọrụ PBS aha ya bụ Lisa Desjardins depụtara aha ndị butere nje a oge ha sonyechara n'ọgbakọ ahụ e mere n'izuụka gara aga: