Ị saala chi?
O tetara ụra kelee Chi ya.
Ka ụbọchị taa wetara anyị ihe ọma, Iseeee!
Nọnyekwara anyị taa dịka anyị ga-ewetara gị akụkọ ndị ị kwesịrị ịma banyere mkpamkpa coronavirus.
You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ndịagha Naịjirịa ekwupụtala na mmadụ iri abụọ na isii ebutela nje covid-19 n’ime mmadụ narị anọ na iri na asaa ha mere nnyocha.
O tetara ụra kelee Chi ya.
Ka ụbọchị taa wetara anyị ihe ọma, Iseeee!
Nọnyekwara anyị taa dịka anyị ga-ewetara gị akụkọ ndị ị kwesịrị ịma banyere mkpamkpa coronavirus.
Akụkọ gbasara coronavirus dịka ọ dị n’Afrịka taa
Kọmịshọna agụmakwụkwọ na Legọs steeti bụ Folasade Adefisayo ekwuola na ụlọakwụkwọ ndị fọrọ afọ ga-emepecha ụbọchị Monde, ụbọchị iri na itoolu nke ọnwa Ọktoba. Mmepe akwụkwọ ga-agụnye ndị ọtaakara na ndị praịmarị ga-abụ agba nke 2020/2021.
Kọmishọna ahụ na-akọwa na ya bụ alo ha tuputara bịara ka ha nwechere mkparịta ụka puruiche ha na ndị ọnụ na-eru n'okwu nakwa ndị ọrụ nchekwa doro anya.
Nke a nyere ndị niile nwere ụlọakwụkwọ nakwa ụlọakwụkwọ nke ndị gọọmentị ikike ịmepe ma gbaambọ tinye usoro mgbochi niile nke COVID-19 n'ọrụ.
O kwukwara na ngalaba Education Quality Assurance (OEQA) ga na-enyocha ịmata ka ndị ụlọakwụkwọ ndị si eruwe isi n'usoro a.
Ọ gwakwara ndị ụlọakwụkwọ abụghị nke ndị gọọmentị ha gbaambọ nata ikike n'aka ụlọrụ (OEQA) tupu ha amalite.
Obodo Qingdao dị na mba Chaịna na-akwado iji ụbọchị ise nyochaa ihe ruru mmadụ nde itoolu bi n’obodo ahụ maka ọrịa Covid-19.
Nke a na-abịa dịka a chọpụtara na mmadụ iri na abụọ butere ya bụ ọrịa n’ụlọọgwụ ebe a na-achọ ọrịa a n’ahụ ndị si ofesi bata.
Ndị ọkachamara na nnyocha na-akọwa na nje na-ebute coronavirus bụ SARS-Cov-2 nwereike ịnọgide n’elu ihe dịka ego nakwa ekwentị, ihe ruru abalị iri abụọ na asatọ.
Mana ndị ọkachamara ọzọ na-ekwukwa na o doghi anya ma ọrịa a ọ na-esinwu n’aka fere n’aka.
Dịka ozi si na ngalaba Nigeria Centre for Disease Control (NCDC) pụta na-akọwa, mmadụ iri abụọ na anọ ọzọ agbakekwuola n'ọrịa coronavirus n'ime otu ụbọchị.
Nke a ebutela ọnụọgụgụ ndị sirila n'ọrịa a gbakee na Naịjiria ruo 51, 735.
Marakwa na a chọtara ọrịa a n'ahụ mmadụ 163 ọhụrụ ọzọ ụnyaahụ.
Ka ụbọchị taa maara gị mma o! Iseee!
Nọnyere anyị taa ka anyị wetere gị akụkọ ndị ị kwesịrị ịma gbasara ọrịa coronavirus na gburugburu mbaụwa.
Igbo ndị ọma, ka anyị dọbiri ya ebe a taa.
Echi ga-abụ echi ọma.
N'ofesi, otu onye sayensi doroanya na mba UK bụ ọkammụta Peter Horby adọọla aka na ntị na-akpachaghị anya ịkpọchị akụ na ụba mba ahu nke ugboro abụọ ya nwereike ịbịa na mmezu dịka ọnụọgụ ndị bu nje coronavirus na-arị n'ike n'ike.
A na-atụanya na Prime Minster mba ahụ bụ Boris nwa Johnson ga-ekwuputa ụzọ ndị mmadụ ga-esi akpachapụa anya maka igbochi nfesa nje coronavirus n'ime obodo ụbọchị Mọnde.
A ga-enyocha ndị Super Eagles ahụ maka coronavirus tupu ha na-ezute Tunisia n’asọmpi enyi na enyi n’ụbọchị Tuzde.
Cheta na akụkọ pụtaburu na mmadụ anọ n’ime ha butere ọrịa a mana o mechara bụrụ asị.
Etu a ka e si nyochaa ha ahụ tupu ha na mba Ọjerịa agbaa asọmpi n'ụbọchị Fraịde bụ nke e ji otu ọkpụ merie ha.
Onye dọkịta obi ọchịchị Amerịka bụ ‘White House’ ekwuola na Onyeisiala Donald Trump agaghịzi ebunyenwu mmadụ ọrịa coronavirus.
Ozi si n’aka dọkịta Sean Conley bụ ozi mbụ banyere ahụike Trump ga-apụta kamgbe ụbọchị Tọsde.
N'ụbọchị Satọde ka onyeisiala Trump gbasara ozi n'ihu ọha na-akwado ya n'obi ọchịchị ya bụ nke mbụ ọ na-apụta ihe kamgbe ọ gachara ụlọọgwụ.
E nwere egwu na o nwereike ibunye ndị mmadụ coronavirus site n'ụbọchị atọ ọ nọrọ n'ụlọọgwụ.
Mana dọkịta sị na nyocha e mere Trump gosiri na o nweghi nje a na-akpaike n'ahụ ya na ndị nọ zi ya n'ahụ na-agbatu ala.
Mmadụ otu narị na iri na otu butere ọrịa coronavirus na Naịjirịa n’ụbọchị Satọde dịka ụlọọrụ na-ahụ mgbochi ọrịa bụ NCDC si kwuo.
Ọnụọgụgụ a mere ka ndị buterela ọrịa a na Naịjirịa ugbua dị puku iri isii na otu narị na atọ ebe ndị nwụrụla dị otu puku na otu narị na iri na ise.
Mmadụ puku iri ise na narị asaa na iri na otu.
Obi aṅụrị ka anyị ji anabata gị n'ọgbakọ anyị taa.
Igbo ndị ọma, daalụnụ maka isonyere anyị taa.
Ka anyị mekwaa ya etu a echi.
Rahụ ọfụma.
Dọkịta ọnụ na-eru n'okwu n'ihe gbasara nje n'Amerịka bụ Anthony Fauci akatọọla ụlọọrụ onyeisiala ha bụ Donald Trump maka ịhazi ọgbakọ ọ sị butere mfesa coronavirus n'ọnwa gara aga.
Fauci sị na mgbe onyeisiala Trump gbara onyeisi ndị ụlọikpe ọ hụpụtara n'anwụ na ọ bụ emume ifesasị coronavirus.
N'emume a, ọtụtụ ndị enyemaka pụrụiche n'ụlọọrụ onyeisiala butechara coronavirus.
Mana dọkịta ahụike Onyeisiala Donald Trump asịla ya gaa n'ihu n'ịhazi ọgbakọ n'ọha dịka o sila n'ute ọrịa coronavirus gbakee.
Onyeisiala Trump bụ onye ka si n'ụlọọgwụ pụta na Mọnde dịka ọ nọchara abalị atọ sị na-agbanyeghi na ahụ esighi ya ike na o nweghi nsogbu ọbụla n'iku ume.
O kwuru nke a mgbe ndị ntaakụkọ Fox News jụrụ ya etu ahụ si na-eme ya mgbe o butere ọrịa a.
Mgbe a jụrụ ya ma o nyochaala ahụ ya ọzọ, ọ zaghị ajụjụ mana ọ sị na onweghi ihe na-eme ya.
A na-atụ anya na Trump ga-ahazi emume ihu n'ihu n'ụlọọrụ ya bụ 'White House' na Satọde.
Ngalaba na-ahụ maka mgbochi ọrịa bụ Nigeria Centre for Disease Control (NCDC) ekwuola na ọ bụ mmadụ 151 butere ya bụ nje ọhụrụ site na mkpọpụta ha mere n'ụbọchị itoolu nke ọnwa Ọktoba.
Nke butere ọnụ ọgụgụ ndi ọrịa fesarala 59,992 ebe ndị gbakerela ma laa be ha dị 51,614
Mmadụ 1,113 nwụru site n'ọrịa na Naịjirịa.
Akuko metụtara coronavirus ga-esi ebe rute unu aka.
Daalụ nu.
Igbo ndị ọma, n'ebe a ka anyị ga-akwụsị nke taa.
Ka chi fonu
Ndị ọrụahụike Naịjirịa ekwuola na WHO enyela ikike ka ha malite usoro nnyocha ọhụrụ abụọ maka ọrịa coronavirus.
Ndị ọrụ NCDC sị na ha ka na-achọ ịmụta ka nnyocha ọhụrụ a si arụ ọrụ, mana ọ agaghị anọchị nke ha na-emebu.