You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ndịagha Naịjirịa ruru 26 ebutela ọrịa coronavirus
Ndịagha Naịjirịa ekwupụtala na mmadụ iri abụọ na isii ebutela nje covid-19 n’ime mmadụ narị anọ na iri na asaa ha mere nnyocha.
Mkpuchi Na Eme Ozugbo
Enweghi ndị a chọtara Covid-19 n'ahụ ha n'Ọwụwa-anyanwụ ụnyaahụ
Mpaghara ọwụwa-anyanwụ eketeghi oke dịka a chọtara ọrịa covid-19 n’ahụ mmadụ iri abụọ na ise ọhụrụ ụnyaahụ.
Ụlọọrụ NCDC wepụtara ọnụọgụgụ gosiri na ọ bụ na Legọs, Taraba, Kaduna, Rivas na Kwara ka a chọtara ndị bu ya bụ ọrịa.
'Anyị na-enyocha ihe mere otu onye n'ime anyị ji gbuo mmadụ anọ' - Ndịagha Naịjirịa
Lee ka ọkụ si gbaa ụfọdụ akụkụ ahịa Ladipo dị na Lagos
Onyeisiala Buhari anatala ọgwụ mgbochi Astrazeneca nke abụọ
Onyeisiala Muhammadu Buhari anatala ọgwụ mgbochi Covid-19 ya nke abụọ.
A gbara ya nke AstraZeneca/Oxford n'obi gọọmentị ya taa bụ ụbọchị 29 nke ọnwa Mee.
Akụkọ gbasara coronavirus dịka ọ dị n'Afrịka taa
Ihe Buhari gara ime na mba Paris
Ọ bụ nanị nje Covid-19 ọhụrụ butere ọtụtụ ọnwụ na mba India?
'Etu nsogbu Covid-19 n'India si metụta anyị bụ ndị Igbo bi ebe ahụ'
Mmadụ 2,345 ebutela ọrịa coronavirus n'Enugwu kemgbe o selitere isi
A chọtakwuru ọrịa coronavirus n'ahụ mmadụ iri ise na atọ n'Enugwu steeti n'izu gara aga, site n'ụbọchị 14 ruo 19 nke Epreelụ.
Nke a emeela ya mmadụ puku abụọ na narị atọ na iri anọ na ise (2,345) buterela ya bụ ọrịa na steeti ahụ.
Ka ọ dị ugbua, mmadụ 164,423 ebutela ọrịa a na Naịjiria.
Ebe o gburula ihe karịrị mmadụ nde atọ na mbaụwa.
Ndị dọkịta Naịjiria amalitela abụbụọrụ
Ndị dọkịta na-arụ n'ụlọọgwụ ndị gọọmentị na Naịjiria a kpọrọ National Association of Resident Doctors (Nard) amalitela ịgba abụbụọrụ n'ihi ụgwọ e ji ha nakwa enwezughi ngwa mkpuchi nchekwa ahụ.
Ha na-ekwukwa ka a kwụọ ha ụgwọ maka ihe ndapụta nke mkpamkpa coronavirus.
Ọtụtụ ụlọọgwụ enweghi ihe ndị dị mkpa dịka akwa nakwa ọgwụ.
Ndị nọ n'ọkwa na-ekwu na abụbụọrụ a ga-abụ ọgbatuhie nye agha a na-ebuso ọrịa ozuruụwaọnụ coronavirus, nke gụnyekwara atụmatụ ikesa ọgwụ mgbochi Oxford-AstraZeneca ruru nde 40, mana ngalaba Nard ekwuola na ke a abụghị eziokwu.
Ka ngalaba Nard si kwuo, ọrịa Covid-19 egbuola ndị dọkịta 17 kemgbe ya bụ ọrịa selitere isi n'ọnwa Maachị 2020.
Ha kwuru na a na-akwụbu ha dọla iri na abụọ ($12) kwa ọnwa mbụ maka ihe ndapụta, mana a kwụsịrị ịkwụ ha ya ka naanị ọnwa atọ gachara.
Mara na ihe karịrị mmadụ 160,000 ebutela ọrịa covid-19 a ebe ọ tarala isi ihe karịrị mmadụ puku abụọ na Naịjiria kemgbe o selitere isi.
Covid-19 Vaccines FAQ: Ajụjụ niile i nwere maka ọgwụ mgbochi covid-19
Ahụhụ coronavirus butere kamgbe otu afọ ọ batara na Naịjriịa
Naịjirịa ga-anabata ọgwụ mgbochi ruru 3 million na ụma si n'aka WHO na Tusde
Etu Afrịka si eche ebighebi maka ọgwụ mgbochi covid-19
"Ihe mere coronavirus ejighị kpa ike n' Afrika ka mba ofesi " - Esther Osemwegie
Gọvanọ Ebonyi steeti amachiela ụlọ oringo niile
Gọvanọ Ebonyi steeti bụ Dave Umahi amachiela ụlọ oringo niile nakwa ọgbakọ ọha niile na steeti ahụ maka igbochi ọrịa coronavirus.
Ọ gakwara n’ihu kwuo na ụlọụka niile ga na-eme nzukọ naanị awa abụọ tupu ha agbasaa ụbọchị ụka ọbụla n’ihi otu ihe ahụ.
Umahi mere ka ndị mmadụ mata nke a dịka ọ na-ebido usoro ihe gbasara mfesagharị ọrịa covid-19 nke ugboro abụọ ga-esi aga na steeti ahụ.
O kwukwara na ha na-atụ anya ịmalite na-arụpụta 'oxygen' na steeti ahụ, iji belatatu ego eji ebuso ọrịa coronavirus agha na steeti ahụ.
Umahi kwuru na gọọmentị na-anwa ike ha ịhụ na ha welitere aka n'ime nnyocha maka ya bụ ọrịa ozuruụwaọnụ na steeti ahụ.
Ihe mere m mgbe a gbachara m ọgwụ mgbochị maka covid 19 - Dọkịnta Ije Akunyili
School Resumption Day: Ndị n'ọchị ndị n'akwa dịka ụlọakwụkwọ ga-eme ọzọ na 18 Jenuwarị
Ihe mere ụfọdụ mmadụ enweghị ike ibute nje Coronavirus