You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Ndịagha Naịjirịa ruru 26 ebutela ọrịa coronavirus

Ndịagha Naịjirịa ekwupụtala na mmadụ iri abụọ na isii ebutela nje covid-19 n’ime mmadụ narị anọ na iri na asaa ha mere nnyocha.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Agadi nwoke gbara afọ 114 agbakeele n'ọrị coronavirus

    N’Afrịka, otu nwoke gbara afọ otu narị na iri anọ agbakeela na mba Ethiopia.

    Dibịa oyibo gwọrọ ya bụ nwoke n'ụlọọgwụ ya bụ Yared Agidew gbara ama a na facebook.

    Ọ na-ahịaahụ ndị gbara afọ iri asatọ maọbụ karịa ịgbake n'aka ọrịa coronavirus.

    Dọkịnta Yared, dere n'asụsụ Amharic, " ọ gbakeela nke ọma. Anyị na-arịọ ogologo ndụ na ahụisiike n'isi ndị ọrụ ahụike anyị".

    Mba Ethiopia gụnyere coronavirus dịka ọrịa e kwesiri ibuso agha ọkụ ọkụ kemgbe ọnwa Apreelu iji beleta mgbasa ya bụ nje n'obodo ha.

    Agbanyeghị na ahịa ka na-azụ, mana ụlọakwụkwọ ka mechiri emechi.

    Ahụrụ nje coronavirus n’ahụ mmadụ puku ise, otu narị, iri asaa na ise, ebemmadụ mmadụ iri asatọ na otu n’aka nje ahụ.

  2. Coronavirus amalitela ịbawanye ọzọ n'ọtụtụ steeti nke Amerịka

    A hụrụ coronavirus n'ahụ ihe karịrị mmadụ puku 37 ọhụrụ na mba Amerịka n'ụbọchị Tọzde.

    Ọnụọgụgụ a fọrọ obere ka ọ ruo nke kachasị a hụrụ n'otu ụbọchị n'oge ọrịa a na-enye nsogbu n'ọnwa Eprelu.

    Mgbakọ na mwepụ sị n'aka New York Times gosiri na nfesa ọrịa a na-abanwanye na steeti 29 gunyere Kalifonịa, Texas nakwa Flọrịda.

    Mana n'agbanyeghị mbanwanye a na-ahụta, ọnụọgụgụ ndị na-anwụ kwa ụbọchị ka na-ada kemgbe ọ malitere ịda n'ọnwa Eprelu.

    E nwere ọnwụ 692 sitere n'aka coronavirus n'ụbọchị Tọzde.

    N'ọnwa Eprelu, ọ na-erucha puku abụọ kwa ụbọchị.

  3. Mmadụ 594 ọhụrụ esorola na ndị ahụrụ coronavirus n'ahu ha na Naịjirịa

    Ụlọọrụ na-ahụ maka ịnyọcha nje na Naịjirịa bụ Nigeria Centre for Disease Control (NCDC) ahụla nje coronavirus n’ahụ mmadụ narị ise, iri itoolu na anọ (594) ọhụrụ na Naịjirịa.

    N’ime ndị a Enugu chitara iri abụọ na ise (28), Imo iri abụọ na abụọ (22), Abịa asatọ (8).

    Ọgụ ọhụrụ a wetere ọnụọgụ ndị bu ya bụ nje Naịjirịa puku iri abụọ na abụọ, narị isii, na iri na anọ (22614) n’ụbọchị iri abụọ na ise nke ọnwa Juun afọ 2020.

    N’ime ndị a, mmadụ narị ise na iri anọ na itoolu anwụọla ebe mmadụ puku asaa, narị asatọ na iri abụọ na anụọ (7822) gbakerela.

  4. Unu asaala chi

    Daalụ nụ maka isonye anyị taa.

    Ya gaziere onye ọbụla.

  5. Rivas steeti ewepụtala iwu ọhụrụ maka agbamakwụkwọ

    Gọọmenti Rivas steeti ewepụtala iwu ọhụrụ maka akwamozu na emume ndị ọzọ na steeti ahụ.

    Dịka Kọmishọna mgbasaozi na steeti ahụ bụ Paulinus Nsirim siri kwuo, ndị na-akwado agbamakwụkwọ ga-anata ikike n'aka gọọmenti tupu ha agba akwụkwọ.

    A na-atụ anya na ha ga-edegara gọọmentị akwụkwọ kọwaa; ebe ọ ga-eme, mmadụ ole ga-abịa nakwa akara ekwenti ha.

    Nsirim gara n'ihu kwuo na ndị ga-abụ ọbịa agbamakwụkwọ agaghị akarị 50.

    Agbamakwụkwọ agaghị akarị awa atọ( 9am-12pm), n'otu aka ahụ, omenala ga-abụ na mgbede (4pm-7pm.)

  6. Gọọmenti Ebonyi steeti achabiela amụma mmefụ ha nke 2020

    Gọọmentị Ebonyi steeti ewerela ihe ruru pasenti iri abụọ na isii megharịa mamụma ego mmefụ nke afọ 2020 na steeti ha.

    Gọvanọ steeti ahụ David Umahi kwuru nke a mgbe ọ ba egosi ndị ọnụ na-eru n’okwu na steeti ahụ ya bụ amụma ọhụrụ bụ nke ọ sị na ọ bụ ndọchị azụ sitere n’aka agha coronavirus butere ya.

  7. Onyeisiala mba Senigaalụ abaala n'ọnọdụ ndopu onwe iche

    Onyeisiala mba Senegaalụ bụ Macky Sall edopula onwe ya iche dịka ya na onye bu coronavirus nwechara mmekọ.

    N'agbanyeghi na e nyochara onyeisiala a ahụ ma hụ na o bughi coronavirus mana ọ ga-edopu onwe ya iche ruo izuụka abụọ.

    Onye omeiwu na mba Senigaalụ bụ Yeya Diallo kwuru n'ụbọchị Wenesde na o butere coronavirus na onyonyo television.

    Ọ kpọkuru ndị mmadụ ka ha gbalịa na-eme ihe ndị dị mkpa iji dopu onwe iche ma ghara ikesasị maọbụ bute ọrịa a.

    Mmadụ ruru 6,129 ebutela coronavirus na Senigaalụ ebe mmadụ 93 anwụọla na ya bụ ọrịa.

  8. 'Etu m si bute ọria Coronavirus ma merie ya'

  9. A chọpụtala coronavirus n'ahụ mmadụ 649 ọhụrụ na Naịjirịa

    Ụlọọrụ na-ahụ maka mgbochi ọrịa na Naịjirịa bụ Nigeria Centre for Disease Control (NCDC) ahụla nje cornonavirus n’ahụ mmadụ narị isii, iri anọ na itoolu ụnyaahụ bụ ụbọchị iri abụọ na ise nke ọnwa Juun, afọ 2020.

    N’ime ndị a, Abịa chịtara mmadụ iri abụọ na asatọ, Enugu iri na anọ, Anambra mmadụ anọ, ebe Imo chịtara naanị otu onye onye.

    Nke a mere ọnụọgụ ndị buterela ya bụ nje ji ruo puku iri abụọ na abụọ na iri abụọ.

    N'ime ndị a mmadụ narị ise, iri anọ na abụọ anwụọla ebe mmadụ puku asaa, narị isii na iri na atọ gbakelera.

  10. Igbo ndị nwee anyị na ndị anyị nwee, ndewo nu oooo!

    Ka ụbọchị taa maara anyị niile na mma.

    Biko buru oche gị bịa soro anyị n'ụbọchị taa maka akụkọ coronavirus ndị gbara ọkpụrụkpụrụ.

  11. Etu ndị omeiwu Imo steeti si bute coronavirus- Maurice Iwu

  12. Naịjirịa Labour Congress arịọla ndị isi ọrụ ka ha ghara ịchụ ndị mmadụ n'ọrụ

    Nigeria Labour Congress bụ otu jikọtara ndị ọrụ oyibo niile na Naịjirịa etiela mkpu maka ọtụtụ ndị mmadụ ana achụ n’ọrụ ugbua maka ihe osisiike coronavirus butere.

    Onyeisi ndị otu a bụ Ayuba Wabba na-arịọ ndị isi ọrụ ka ha were nwayọ na-achụ dị ọrụ ghara ịṅomi ihe ndị mba ọzọ na-eme.

    Wabba na-akọwata na mba ndị ahụ ha na eṅomi nwere mgbadume ndị gọọmenti ha na-enye.

    Wabba kwuru na, "mana Naịjirịa, anyị enweghị ụdị mgbadume a anyị ji echere onwe anyị. Onye achụrụ n'ọrụ na Naịjirịa enweghị ihe nchere onwe ọbụla ọ nwere".

    Ọ sị na ịchụ ndị mmadụ n'ọrụ ga-ebuta ọtụtụ nsogbu.

  13. Ahịa ebe a na-ere 'bushmeat' ka na-azụ na Naịjirịa

    Ndị mmadụ ka kachiri ntị na-ere anụmanụ agbanyeghị aka na ntị United Nations Biodiversity Office dọrọ ndị mmadụ maka nke a.

    Ahịa ebe ana ere ụmụanụ a ka na-azụ n'Epe, Legọs steeti kwa ụbọchị.

    Ndị na-ere ya bụ anụ sị na-ọnweghị ihe mere anụọhịa agbanyeghị na-ekwuru na ọ bụ na ụmụanụọhịa na Wuhan, Chaịna ka coronavirus si pụta.

    Onye ntaakụkọ BBC hụrụ nchi, okeọhịa, agwọ, ele, aghụ, agụiyi na anụ ndị ọzọ ha na-ere ahụ.

    Ọtụtụ ndị na-ere ya bụ anụ azụọla ahịa ahụ ihe karịrị afọ iri.

    Otu onye n'ime ha bụ Lateefat Olowu sị na "tupu coronavirus abịa, anyị na-ereru ihe ruru anụmanụ dị otu narị (100), mana ugbua, anyị anaghị ereli iri abụọ n'ụbọchị.

    Ọnụ na-ekwuru ndị Legọs steeti sị na enweghị iwu medigere ya bụ ahịa.

  14. Mmadụ 533 anwụọla n'ọrịa coronavirus na Naịjirịa

    Ụlọọrụ na-ahụ maka mgbochi ọrịa na Naịjirịa bụ Nigerian Centre for Disease Control (NCDC) sị na mmadụ narị anọ, iri ise na abụọ ọhụrụ butere coronavirus na Naịjirịa.

    Nke a mere ọnụọgụgụ ndị buterela ji ruo puku iri abụọ na otu, narị atọ na iri asaa na otu.

    Ndị nwụrụla dị narị ise, iri atọ na atọ ebe ndị gbakerela dị puku asaa, narị atọ na iri atọ na asatọ.

  15. Igbo ndị ọma ndewo nụ oooooo

    Anyị ụkpa ekele na-asị unu "Unu abịla n'ụbọchị taa"?

    Soro anyị taa ka ị gụrụ akụkụ banyere coronavirus n'ụwa niile.

  16. Echi ga-abụ echi ọma...Ka chi foo nụ

    Ka anyị piachie ya ebe a. Rahụ nụ duu!

  17. Ndị uweojii azọpụtala ndị ọrụ 300 akpọchịrị ọnwa atọ

    Ndị uweojii atọhapụla ndị ọrụ narị atọ akpọchidere n'ụlo ọrụ na-emepụta osikapa dị na Kano steeti kamgbe ọnwa Maachị 2020.

    Ụlọọrụ a bụ Popular Farm nke onye nwe ya bụ onye mba India kwere ndị ọrụ narị ato a nkwa dọlla iri na atọ ọzọ nke a ga-etinyere ha n'ụgwọ ọnwa ha ma yie ndị na-achọghị iru ọrụ a egwu ọchụhcụ.

    Ụlọọrụ a gara n'ihu na-arụ ọrụ na-agbanyeghị mmachị gọọmenti hiwere maka ọrịa coronavirus.

    Dịka ọ dị ugbu a, ndị uweojii anwụchiela mmadụ ise na-elekọta ya bụ ụlọọrụ.

    Mbọ niile BBC gbara ka ha na ndị ụlọọrụ Polura Farms nwee mkparịta ụka amụtaghi mkpụrụ.

    Ndị uweojii kwuru na ha emechiela ya bụ ụloọrụ ma bido kwa nyocha maka ebubo na ha jikpara ndị ọrụ narị atọ a.

    Nzọpụta ndi a biara dịka otu onye ha kpọtụrụ ngalaba nọrọ onwe na-alụ ọgụ ịkwụsị mmegbu mmadụ na ikike dịri onwe bụ Global Human Rights Network.

    Onye ọrụ ụlọọrụ Global Human Rights Network bụ Karibu Yahaya kwuru sị " Obi gbawara m mgbe m hụrụ etu ọnọdụ ndi a dị. Nrị ha pere mpe, ha enweghị kwa ọgwụ maka ndị na-arịa ọrịa".

    Otu onye ha zọpụtara bụ Mansur Abubakar kwuru sị "Ha anaghị ekwe anyị zuo ike nke ọma, maọbụ kpee ekpere ma ha ekweghị kwa ka ndi ezinụlọ anyị bia leta anyị".

  18. Mmadụ 183,000 butere ọrịa coronavirus ụnyaahụ - WHO, WHO ekwela ka e nye ndị Covid-19 jisi ike ọgwụ Dexamethasone

    Ngalaba na-ahụ maka ahụike mbaụwa bụ World Health Organisation (WHO) ekwuola na ihe karịrị mmadụ otu puku narị na iri asatọ na atọ (183k) butere ọrịa coronavirus na mbaụwa ụnyaahụ.

    Onyeisi ngalaba ahụ bụ Tedros Adhanom Ghebreyesus kwuputere nke a ka ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu taa.

    O kwukwara na ka ọ dị ugbua, ọrịa a ataala isi ihe karịrị mmadụ puku narị ise na gburugburu mbaụwa.

    Nke a na-abịa dịka ha kwetara ka a malite inye ndị ọrịa coronavirus jisi ike ọgwụ dexamethasone.

    Lee ihe ị kwesịrị ịma maka ya bụ ọgwụ nwereike ịgwọ coronavirus.

  19. Ebonyi nwere 30, Abia nwee 10 ebe Imo nwere mmadụ 9 ọhụrụ butere coronavirus

    Mmadụ narị isii, iri asaa na ise ọhụrụ butere coronavirus na Naịjirịa dịka ụlọọrụ mgbochi ọrịa bụ Nigerian Centre for Disease Control si kwuo?

    Mmadụ iri atọ n’ime ha si Ebonyi Steeti, mmadụ iri si n’Abia ebe mmadụ itoolu si n’Imo Steetị

    Nke a mere ọnụọgụgụ ndị buterela ya ugbua ji dị puku iri abụọ, narị itoolu na iri na itoolu, ndị gbakerela dị puku asaa, otu narị na itoolu ebe mmadụ narị ise na iri abụọ na ise anwụọla.

  20. Kokoroko ooo! Chi abọọla

    Ụmụ Igbo anyị na-ekele unu n'ụtụtụ na-asị "Ọ ga-adịrị onye ukwu na onye nta na mma".

    Biko gbalịa sonyere anyị n'ụbọchị taa maka akụkọ ndị hiri odo gbasara coronavirus.