FAAN emeela nwale maka imalite njem ụgbọelu
N'oge na adịghị anya enwereike imalite njem ụgbọelu ọzọ n'ime Naijirịa.
Nke a bụ dịka ngalaba Federal Airport Authority of Nigeria ebidola ime nkwado ibido njem ụgbọelu ọzọ.
Ọ bụ nzụkọ onyeisiala hiwere maka iluso coronavirus ọgụ gara mee nyocha n'ọdọ ụgbọelu Murtala Mohammed International nke dị na Legọs.
Nyocha a bụ maka ị mata ma ụlọọrụ na-elekọta ọdọụgbọelu ma ha erubere atụmatụ niile ehiwere maka nchekwa coronavirus isi.
Amachiri njem ụgbọelu niile maka nchekwa ọrịa coronavirus.